Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Jizi Agba Krismas?

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Jizi Agba Krismas?

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Jizi Agba Krismas?

Ọ̀ NA-ADỊ gị ka Krismas ruwe eruwe? Ka ọ̀ na-abụ Krismas ruwe, obi ana-amapụ gị? Krismas ruwe, ọtụtụ nde mmadụ na-ebido ichegbu onwe ha. Ihe ndị ha na-eche bụ: ‘Olee ndị m ga-azụtara ihe? Gịnị ka m ga-azụtara ha? Ènwekwara m ego ga-ezu ịzụ ha? Olee mgbe m ga-akwụcha ụgwọ ihe ndị m zụrụ n’oge Krismas?’

N’agbanyeghị ihe ndị a na-echegbu ndị mmadụ, Krismas ka na-ewusi ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na a na-agbazi Krismas ná mba ọtụtụ ndị bi na ha na-ekweghị na Kraịst. Na Japan, ọtụtụ ezinụlọ na-agbazi Krismas, ọ bụghị n’ihi na ha ji ya echeta ọmụmụ Jizọs, kama, n’ihi na ọ bụ oge oriri na nkwari. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal kwuru na ná mba Chaịna, ị ga-ahụ ebe e sere “ihu fada Krismas n’ụlọ ahịa ndị dị n’obodo ukwu ndị e nwere ná mba ahụ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ọtụtụ ndị bi n’obodo ndị mepere emepe na Chaịna na-ejizi oge Krismas emere oge oriri na nkwari na oge ịzụ ihe aghara aghara.”

N’ọtụtụ ebe n’ụwa, oge Krismas bụ oge akụnụba obodo ji amụba. Nke ahụ bụ nnọọ eziokwu ná mba Chaịna, n’ihi na, dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ anyị kwuru na mbụ si kwuo, mba Chaịna ‘na-emepụtazi ọtụtụ ihe ndị e ji achọ ụlọ mma n’oge Krismas ma na-ebuga ha mba ndị ọzọ. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha na-emepụta bụ osisi e ji plastik mee, ọkụ ndị na-egbuke egbuke na ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ e ji achọ ihe mma.’

Ná mba ndị e nwere ọtụtụ ndị Alakụba, a na-emekwa ememme yiri Krismas n’agbanyeghị na a dịghị eme ya na Disemba 25. N’obodo Ankara, nke dị na Tọki, nakwa na Beirut, nke dị na Lebanọn, a na-ahụkarị ụlọ ahịa ndị e ji ụmụ ihe ndị na-egbuke egbuke na onyinye ndị e kechiri ekechi chọọ windo ha mma. N’Indonisha, ụlọ ahịa na họtel dị iche iche na-ahazi egwuregwu ụfọdụ, ebe ụmụaka na fada Krismas ga-anọ rikọọ ma ṅụkọọ ma ọ bụ ha esoro ya see foto.

N’ọtụtụ mba, oge Krismas enwekarịghịzi ihe jikọrọ ya n’okpukpe, kama ọ bụ oge e ji erepụ ahịa. Otu akwụkwọ kwuru na ‘ọ bụ ụmụaka ka a na-ebu n’obi ịrata’ ka ha zụọ ọtụtụ n’ime ngwá ahịa ndị a na-akpọsa. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị ka na-aga ege okwuchukwu n’ụlọ ụka n’ụbọchị Krismas, ma ọ bụ n’ụlọ ahịa, bụ́ ebe a na-akpọnyekarị egwú Krismas, ka ndị mmadụ na-aka aga. Gịnị mere ihe ji gbanwee otú a? Ihe nwere ike ịkpata ya ọ̀ bụ n’ihi otú ịgba Krismas si bido? Olee otú Krismas si bido?

Tupu anyị elebawa anya n’ajụjụ ndị a, ọ ga-adị mma ịgụ ihe Baịbụl kọrọ banyere ihe ndị mere n’oge a mụrụ Jizọs, bụ́kwanụ nke ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ebe ha gbakwasịrị ụkwụ na-eme ọtụtụ ihe ndị ha na-eme n’oge Krismas.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

IHE MATIU NA LUK DERE

Matiu onyeozi dere, sị: “Mgbe a mụrụ Jizọs na Betlehem nke Judia n’oge Herọd bụ́ eze, lee! ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ, bịara Jeruselem, sị: ‘Olee ebe onye ahụ a mụrụ ịbụ eze ndị Juu nọ? N’ihi na anyị hụrụ kpakpando ya mgbe anyị nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ, anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.’ Mgbe Eze Herọd nụrụ ihe a, ahụ́ erughị ya ala.” N’ihi ya, Herọd malitere ịjụ “ndị isi nchụàjà . . . ebe a ga-amụ Kraịst.” Mgbe Herọd matara na ọ bụ “na Betlehem,” ọ gwara ndị ahụ na-agụ kpakpando, sị: “Gaanụ chọọ nwatakịrị ahụ nke ọma, mgbe unu chọtara ya, bịanụ kọọrọ m.”

“Ha gawara; ma, lee! kpakpando ahụ ha hụrụ mgbe ha nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nọ na-aga ha n’ihu, ruo mgbe ọ kwụsịrị n’elu ebe nwatakịrị ahụ nọ. . . . Mgbe ha banyere n’ụlọ, ha hụrụ nwatakịrị ahụ na nne ya bụ́ Meri.” Mgbe ha nyechara Jizọs onyinye, “Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, [n’ihi ya,] ha si ụzọ ọzọ laghachi n’ala ha.”

“Mgbe ha lawara, lee! mmụọ ozi Jehova bịakwutere Josef ná nrọ, sị: ‘Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya gbaga n’Ijipt . . . ’ O wee bilie kpọrọ nwatakịrị ahụ na nne ya n’abalị gawa . . . Mgbe Herọd hụrụ na ndị ahụ na-agụ kpakpando aghọgbuwo ya, o were oké iwe. O wee zipụ ozi ma mee ka e gbuo ụmụaka niile bụ́ ndị nwoke na Betlehem na ógbè niile gbara ya gburugburu, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa.”—Matiu 2:1-16.

Luk onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Josef sikwa na Galili gawa, hapụ obodo Nazaret, banye Judia, n’obodo Devid, nke a na-akpọ Betlehem, . . . ka e wee deba aha ya na Meri n’akwụkwọ . . . Ka ha nọ n’ebe ahụ, . . . [Meri] wee mụọ nwa ya nwoke, bụ́ nwa mbụ ya, o wee jiri ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri, n’ihi na ọ dịghị ebe ha ga-anọ n’ụlọ ndị njem.”

“N’otu obodo ahụkwa, e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị. Na mberede, mmụọ ozi Jehova guzoro ha n’akụkụ, . . . oké egwu wee jide ha. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha: ‘Unu atụla egwu, n’ihi na, lee! ana m ezisara unu ozi ọma banyere oké ọṅụ nke ndị niile ga-enwe, n’ihi na a mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị, n’obodo Devid.’” N’ihi nke ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ “gara ngwa ngwa hụ Meri na Josef nakwa nwa ọhụrụ ahụ nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.”—Luk 2:4-16.