Olee Otú Krismas Si Bido?
Olee Otú Krismas Si Bido?
Ọ BỤRỤ na mmadụ agwa gị na o nweghị ihe jikọrọ Jizọs Kraịst na Krismas, ị̀ ga-ekwe? Ị̀ ga-achọ ịma azịza nke ajụjụ ndị a: (1) À mụrụ Jizọs na Disemba 25? (2) Ole ndị bụ “ndị amamihe” ahụ, hà dị atọ n’eziokwu? (3) Olee ụdị “kpakpando” dugara ha n’ebe Jizọs nọ? (4) Gịnị jikọrọ fada Krismas na Jizọs nakwa ọmụmụ Jizọs? (5) Olee otú Chineke si ele ndị mmadụ inye ibe ha onyinye n’oge Krismas anya?
Ugbu a, ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a ma mara ihe Baịbụl kwuru nakwa ihe akụkọ ndị mere eme kwuru.
(1) À Mụrụ Jizọs na Disemba 25?
Ihe ndị mmadụ kweere: Ọtụtụ ndị kweere na a mụrụ Jizọs na Disemba 25, ọ bụkwa n’ụbọchị ahụ ka ha na-agba Krismas. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion kwuru na “Krismas, pụtara ‘mas a na-edoro Kraịst,’ ya bụ, mas e ji akpọ oriri maka ọmụmụ Kraịst.”
Otú o si malite: Akwụkwọ bụ́ The Christmas Encyclopedia kwuru ‘na ọ bụghị na Baịbụl ka e si nweta Disemba 25, kama ebe e si nweta ya bụ n’ememme ndị Rom na-ekpere arụsị na-eme ná ngwụcha afọ mgbe oyi kacha atụ. Ụfọdụ n’ime ememme ndị ahụ bụ nke ha ji echeta ọmụmụ Saturn, bụ́ chi ọrụ ubi, nakwa ọmụmụ chi anyanwụ ndị Rom bụ́ Sol na nke ndị Peshia bụ́ Mitra.’ A na-eme ncheta ọmụmụ chi ndị a na Disemba 25, bụ́ oge oké oyi ma e jiri kalenda ndị Rom gụkọọ ya.
Ọ bụ n’afọ 350 ka poopu Julius nke mbụ gụgharịrị ememme ndị ahụ ndị na-ekpere arụsị na-eme aha ma kwuzie na Disemba 25 bụ ụbọchị e ji echeta ọmụmụ Kraịst. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion kwuru, sị: ‘Ememme Krismas jizi nwayọọ nwayọọ nọchie anya ememme ahụ e ji echeta chi anyanwụ. A bịaziri na-esenye anyanwụ na-awapụta awapụta n’isi Kraịst (bụ́ onye ha na-akpọkwa Sol Invictus) iji gosi na o sila n’ọnwụ bilie, ọ bụkwa anyanwụ ahụ bụ ihe ahụ dị okirikiri a na-ese n’isi ndị senti.’
Ihe Baịbụl kwuru: Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ma e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo hoo haa na a mụghị ya na Disemba 25. Gịnị ka ọ bụ? Baịbụl gwara anyị na mgbe a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ “bi n’ọhịa” na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị n’obodo Betlehem. (Luk 2:8) Udu mmiri na oyi na-amalitekarị n’ọnwa Ọktoba. Ma, ọ bụ n’ọnwa Disemba ka oyi kacha atụ, snoo ana-adakwa mgbe ụfọdụ. Ndị ọzụzụ atụrụ, karịchaa ndị bi n’ugwu bụ́ ebe oyi na-atụkarị, dị ka ndị bi n’obodo ndị dị gburugburu Betlehem, na-akpọba atụrụ ha n’ime ụlọ ebe oyi na-agaghị atụ ha n’abalị. *
Ọ dị mma ịmara na Ndị Kraịst oge mbụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha so Jizọs kwusaa ozi ọma, enweghị ụbọchị ọ bụla ha mere ememme ncheta ọmụmụ Jizọs. Kama, ihe ha mere bụ ihe Jizọs nyere ha iwu ka ha na-eme, ya bụ, ịna-echeta ọnwụ ya. (Luk 22:17-20; 1 Ndị Kọrịnt 11:23-26) Ma ụfọdụ ndị nwere ike ịsị, ‘Ò nwekwaranụ ihe o mere na e si n’ememme ndị na-ekpere arụsị nweta ememme Krismas?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke anaghị ele ya anya ọma. Jizọs Kraịst sịrị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu.”—Jọn 4:23.
(2) “Ndị Amamihe” ahụ—Hà Dị Ole? Olee Ndị Ha Bụ?
Ihe ndị mmadụ kweere: A na-egosikarị ebe “kpakpando” nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ duuru “ndị amamihe” atọ gaa n’ebe e nyiwere Jizọs n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Mgbe ụfọdụ, a na-egosikwa ndị ọzụzụ atụrụ bịara n’ebe ahụ.
Otú o si malite: E wezụga obere ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị amamihe ahụ, akwụkwọ bụ́ The Christmas Encyclopedia kwuru na ‘ihe ndị ọzọ niile a kọrọ banyere ha bụ akụkọ ifo.’
Ihe Baịbụl kwuru: Baịbụl ekwughị ole “ndị amamihe” ahụ gara leta Jizọs dị. O nwere ike bụrụ na ha dị abụọ, atọ, anọ, ma ọ bụ karịa. Ọ bụ eziokwu na a kpọrọ ha “ndị amamihe” na Baịbụl ụfọdụ, n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, ihe a kpọrọ ha bụ magoi, nke pụtara ndị na-agụ kpakpando ma ọ bụ ndị dibịa afa. Baịbụl kwukwara na ọrụ ndị a bụ “ihe arụ n’anya Jehova.” (Diuterọnọmi 18:10-12) Ebe ọ bụ na ndị ahụ na-agụ kpakpando si n’ebe ọwụwa anyanwụ gaa ogologo ije, ha eruteghị Betlehem mgbe Jizọs ka nọ n’ụlọ anụ. Kama nke ahụ, mgbe o werela ha, ikekwe, ọnwa ole na ole iji ruo ebe ahụ, ha “banyere n’ụlọ” ebe Jizọs nọ. Ha hụkwara “nwatakịrị ahụ na nne ya bụ́ Meri.”—Matiu 2:11.
(3) Olee Ụdị Kpakpando Dugara Ndị ahụ Na-agụ Kpakpando n’Ebe Jizọs Nọ?
Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ụdị kpakpando ọ bụ bụ ichegodị ebe kpakpando ahụ dugara ha. Otu ihe bụ na kpakpando ahụ edugaghị ha Betlehem ozugbo, kama o dugara ha Jeruselem bụ́ ebe Eze Herọd nọ nụ na ha na-achọ ịhụ Jizọs. Herọd kpọziri “ndị ahụ na-agụ kpakpando na nzuzo,” bụ́ ndị gwara ya na a mụrụ nwa ọhụrụ ga-abụ “eze ndị Juu.” Herọd gwaziri ha, sị: “Gaanụ chọọ nwatakịrị ahụ nke ọma, mgbe unu chọtara ya, bịanụ kọọrọ m.” Ma Herọd ebughị ihe ọma n’obi na-achọ Jizọs. Ihe eze a dị mpako ma dị obi ọjọọ bu n’obi bụ igbu Jizọs!—Matiu 2:1-8, 16.
Ọ dị mma ịmara na ọ bụ mgbe ahụ ndị ahụ na-agụ kpakpando si na nke Herọd pụta ka “kpakpando” ahụ duziiri ha gawa Betlehem. O mechaziri ‘kwụsị n’elu’ ụlọ ebe Jizọs nọ.—Matiu 2:9, 10.
O doro anya na kpakpando a abụghị kpakpando nkịtị! Ebe ọ bụ na Chineke ji ndị mmụọ ozi gwa ndị ọzụzụ atụrụ na a mụrụ Jizọs, gịnịzi ga-eme ka o jiri kpakpando duga ndị ọgọ mmụọ na-agụ kpakpando n’ebe onye ga-achọ igbu Jizọs nọ, mechaakwa duga ha n’ebe Jizọs nọ? Naanị ihe nke a na-agwa anyị bụ na kpakpando ahụ bụ ihe Setan, bụ́ onye nwere ike ime ụdị ihe ịrịba ama ahụ, chọrọ iji gbuo Jizọs. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:9, 10) A sị na ndị mmadụ ma ebe kpakpando a si, o nwere ike ha agaaraghị enwe ihe a na-akpọ kpakpando Betlehem bụ́ nke a na-ekonyekarị n’elu osisi ndị e ji achọ ụlọ mma n’oge Krismas.
(4) Gịnị Jikọrọ Fada Krismas na Jizọs nakwa Ọmụmụ Jizọs?
Ihe ndị mmadụ kweere: N’ọtụtụ mba, e weere na ọ bụ fada Krismas na-ewetara ụmụaka onyinye. Ihe ụmụaka na-eme bụ idegara fada Krismas akwụkwọ ozi ma gwa ya ka o wetara ha onyinye ma o si n’ebe o bi, bụ́ ebe kacha jụọ oyi n’ụwa, na-abịa.
Otú o si malite: Otú fada Krismas si malite bụ n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke a kọrọ banyere otu senti a na-akpọ Nikọlas, onye bụ́ Achịbishọp nke obodo Maịra dị n’Eshia Maịnọ, ebe a na-akpọ Tọki ugbu a. Akwụkwọ bụ́ The Christmas Encyclopedia kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ihe niile a kọrọ banyere senti ahụ a na-akpọ Nikọlas bụrụ akụkọ ifo.” Ma akụkọ ihe mere eme ma Baịbụl enweghị nke gosiri na e nwere ihe jikọrọ fada Krismas na Jizọs Kraịst.
Ihe Baịbụl kwuru: “Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” Ndị kacha bụrụ ‘ndị agbata obi’ anyị bụ ndị ezinụlọ anyị. (Ndị Efesọs 4:25) Baịbụl kwukwara na anyị kwesịrị ‘ịhụ eziokwu n’anya,’ “na-ekwukwa eziokwu n’obi [anyị].” (Zekaraya 8:19; Abụ Ọma 15:2) N’eziokwu, mmadụ nwere ike ịsị na ịgwa ụmụaka na ọ bụ fada Krismas na-ewetara ha onyinye n’oge Krismas bụ ihe egwuregwu, ma ọ̀ dị mma ịghọgbu ụmụaka, ọ sọgodị ya ya bụrụ na e nweghị ihe ọjọọ anyị bu n’obi kwuo ya? Ò juru gị anya otú ememme e kwuru na e ji akwanyere Jizọs ùgwù sizi bụrụ ihe e ji aghọgbu ụmụaka?
(5) Olee Otú Chineke Si Ele Ndị Mmadụ Inye Ibe Ha Onyinye n’Oge Krismas Anya?
Ihe ndị mmadụ kweere: Ndị mmadụ kweere na onyinye a na-enye n’oge Krismas pụrụ iche n’ihi na ọ na-abụ otu onye nye ibe ya ihe, ibe ya enyekwa ya. Ha wekwaara oge Krismas ka oge oriri na nkwari.
Otú o si malite: N’ememme Saturnalia ndị Rom oge ochie na-eme, oriri na nkwari na-ebido na Disemba 17 ruo Disemba 24, ha na-enyerịtakwa ibe ha onyinye. Ma n’ụlọ ma n’okporo ámá, ndị mmadụ na-eri, na-aṅụ, na-eme mkpọtụ, ma na-akpa aghara. Ihe na-esochi ememme Saturnalia a bụ ememme ọzọ e ji echeta ụbọchị mbụ n’ọnwa Jenụwarị. A na-emekwa oriri na nkwari ruo ihe dị ka ụbọchị atọ. Ememme Saturnalia na ememme a e ji echeta ụbọchị mbụ n’ọnwa Jenụwarị yiziri ka hà ghọrọ otu oge oriri.
Ihe Baịbụl kwuru: Inwe obi ụtọ na imesapụ aka bụ ihe e ji mara ndị na-efe Chineke ezi ofufe. Baịbụl sịrị: “[Nweenụ] obi ụtọ, unu ndị ezi omume; tienụ mkpu ọṅụ.” (Abụ Ọma 32:11) Ndị na-emesapụ aka na-enwekarị ụdị obi ụtọ a. (Ilu 11:25) Jizọs Kraịst sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ sịkwara: “Na-enyenụ ihe,” ma ọ bụ na-emesapụnụ aka mgbe niile.—Luk 6:38.
Ụdị inye ihe a na-ekwu okwu ya ebe a abụghị nke e yiri oge e ji enye ya eyi ma ọ bụ nke a manyere mmadụ amanye inye, ikekwe, n’ihi na ọ bụ ihe a na-atụ anya ka onye ọ bụla mee. Baịbụl kọwara otú e kwesịrị isi na-enye ihe. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Ndị na-eme ihe a Baịbụl kwuru na-enye ihe n’ihi na o si ha n’obi, ha nwekwara ike inye ya n’oge ọ bụla n’afọ. O doro anya na Chineke na-agọzi inye ihe e si n’obi nye, ọ dịghịkwa ihe ga-eme ka onye na-enye ihe otú a chegbuwe onwe ya.
Ememme Ndị Kraịst Adịgboroja!
E jiri ihe Baịbụl kwuru leba anya n’ememme Krismas, a ga-achọpụta na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ihe niile a na-eme n’oge Krismas si n’aka ndị na-ekpere arụsị ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ihe ụfọdụ a na-eme n’oge ahụ abụghị otú e si kọọ ya na Baịbụl. N’ihi ya, ọ bụ n’ọnụ nkịtị ka a na-akpọ ememme Krismas ememme Ndị Kraịst. Oleedị otú e si malite ịkpọ Krismas ememme Ndị Kraịst? Ọtụtụ narị afọ ka Kraịst nwụchara, ọtụtụ ndị ozizi ụgha pụtara dị nnọọ ka Baịbụl buru amụma na ọ ga-adị. (2 Timoti 4:3, 4) Ihe ka ndị ozizi ụgha ahụ mkpa bụ ime ka ndị ọgọ mmụọ nwee mmasị ịbịawa chọọchị, ọ bụghị ịkụziri ha eziokwu Baịbụl. N’ihi ya, ha ji nwayọọ nwayọọ nabata ememme ndị na-ewu ewu ndị ọgọ mmụọ na-eme ma kpọwazie ha ememme “Ndị Kraịst.”
Baịbụl dọrọ aka ná ntị na “ndị ozizi ụgha . . . ga-eji okwu nrafu rigbuo unu n’ihi anyaukwu ha. Ma, ikpe nke si n’oge ochie ga-abịakwasị ha n’egbughị oge, mbibi ha adịghịkwa ero ụra.” (2 Pita 2:1-3) Ndịàmà Jehova ejighị ihe a Baịbụl kwuru egwuri egwu, dịkwa ka ha na-anaghị eji ihe ndị ọzọ niile e dere na Baịbụl egwuri egwu, n’ihi na ha ma na ọ bụ Okwu Chineke. (2 Timoti 3:16) N’ihi ya, ha adịghị eso eme ememme ma ọ bụ omenala ọ bụla si n’aka ndị okpukpe ụgha. Nke a ò meela ka ha ghara inwe obi ụtọ? Mbanụ! N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ otú ịmụta eziokwu Baịbụl si tọhapụ ha n’agbụ!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 O yiri ka à mụrụ Jizọs n’ọnwa ndị Juu oge ochie a na-akpọ Etanim (nke na-amalite ná ngwụcha Septemba ma banye mbido Ọktoba).
[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]
Ị KỤỌ ATA, Ị GHỌRỌ ATA
E nwere oge ndị isi chọọchị “gbalịsiri ike ka a ghara inwe ihe ọ bụla ndị ọgọ mmụọ na-eme e kwere ka e mewe na chọọchị.” Ihe ahụ ka otu akwụkwọ kọrọ otú Krismas si bido kwuru. Ma ka oge na-aga, kama ịkụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl, ihe ka ndị isi chọọchị mkpa bụ ịhụ na ụlọ ụka juru eju. Ọ bụ nke a mere ha ji gbachiwe nkịtị ka e mewe ihe ụfọdụ ndị ọgọ mmụọ na-eme. Ha mechadịrị nabatawachaa ha.
Baịbụl sịrị na ‘mkpụrụ mmadụ ghara ka ọ ga-aghọrọ.’ (Ndị Galeshia 6:7) Ebe ọ bụ na ndị isi chọọchị ghara mkpụrụ ndị e nwetara n’aka ndị na-ekpere arụsị, o kwesịghị iju ndị chọọchị anya na ọ bụ “ata” ka ha na-aghọrọ. Oge ememme a sị na e ji echeta ọmụmụ Jizọs ka ndị mmadụ jizi mere oge e ji aṅụbiga mmanya ókè, oge oké oriri na oké mkpọtụ, oge ịzụ ihe ka atọ ndị mmadụ ụtọ karịa ịga chọọchị, oge ezinụlọ dị iche iche ji abanye n’ụgwọ nakwa oge a na-eji akụkọ fada Krismas emegharị ụmụaka anya, na-agwa ha na e nwere ihe jikọrọ ya na Jizọs Kraịst. N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere Chineke ji kwuo, sị: ‘Kwụsịnụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’—2 Ndị Kọrịnt 6:17.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Oge Krismas dị ka oge ememme Saturnalia a na-eme n’oge ochie, ihe e ji mara ya bụ oriri na nkwari
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Mary Evans Picture Library