Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Bụ Ezigbo Ndị Enyi M?

Ole Ndị Bụ Ezigbo Ndị Enyi M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ole Ndị Bụ Ezigbo Ndị Enyi M?

“Cori akụzierela m ọtụtụ ihe ndị m na-amabughị. Mgbe ọ bụla m so ya pụọ, ọ na-eme ka m mata ndị m na-amabughị, ọ na-azụtara m ụdị nri m na-eritụbeghị, o nwekwara ọtụtụ ihe ndị na-eme anyị obi ụtọ anyị na-eme. Kemgbe mụ na Cori ghọrọ enyi, ndụ m agbanweela!”—Tara. *

Ì chere na gị na mmadụ enweghị ike ịbụ enyi otú ahụ Cori na Tara bụ? Ya bụrụ na i chere otú ahụ, obi ajọkwala gị njọ. E nwere ọtụtụ ndị bụ́ ezigbo mmadụ bi ebe i bi. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịmata ha.

E NWERE nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu, aha ya bụ Shayna. Nwa agbọghọ a kwuru na ya ma ọtụtụ ndị, ma, o nweghị nke n’ime ha ọ ga-asị na ọ bụ ezigbo enyi ya. Ndị ụdị ihe a na-emekarị bụ ndị nwere ndị ha na ha na-akparịta ụka n’Ịntanet. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ, aha ya bụ Chinenye, kwuru, sị: “I nwere ike nwee ọtụtụ ndị i denyere aha ha na ha bụ ndị enyi gị, ma o nweghị otu n’ime ha bụ́ enyi gị.” *

Olee nke ga-akara gị mma, ọ̀ bụ inwe ìgwè ndị ị kpọrọ ndị enyi gị n’Ịntanet ka ọ̀ bụ inwe mmadụ ole na ole ndị bụ́ ezigbo ndị enyi gị? Ọ bụ eziokwu na nke ọ bụla n’ime ha nwere uru ọ bara, ma, onye bụ́ ezigbo enyi gị ga-enyere gị aka mgbe i nwere nsogbu, o nwekwara ike ime ka ị kpawa àgwà dị mma. (1 Ndị Kọrịnt 16:17, 18) Jiri ihe ndị a anyị ga-ekwu ugbu a mara ma ò nwere onye bụ́ ezigbo enyi gị n’ime ndị niile gị na ha dị ná mma.

EZIGBO ENYI KWESỊRỊ ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊ OBI

“O nweghị ihe enyi m na-ezoro m ezo, ọ bụ ya mere m ji na-akọrọ ya ihe m na-achọghị ka onye ọzọ mara. Ma, otu ụbọchị, agwara m ya na o nwere otu nwa okorobịa m na-anwụrụ. Amaghị m na ihe ahụ m gwara ya bụ imerụ ala. Enyi m a gara kọsaa ihe ahụ m gwara ya.—Chinwendu.

“O nweghị ihe m na-anaghị akọrọ enyi m Obinna, amakwa m na ọ gaghị aga kọsawara ndị ọzọ ihe ọ bụla m kọọrọ ya.”—Emeka.

N’ime mmadụ abụọ a kwuru okwu, olee onye nke ị ga-asị na o nwere ezigbo enyi? A bịa ná ndị enyi gị niile, olee onye nke n’ime ha obi ga-ekwe gị ịkọrọ ihe ị na-achọghị ka ndị ọzọ mara? * Baịbụl kwuru na “ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile.”—Ilu 17:17.

N’okpuru ebe a, dee aha ndị enyi gị abụọ ị ma na ị ga-atụkwasịli obi.

1 ․․․․․

2 ․․․․․

EZIGBO ENYI ANAGHỊ EME IHE GA-ADỊ NAANỊ ONWE YA MMA

“Mmadụ abụọ bụrụ enyi, ihe nwere ike isiri otu onye ike mgbe ụfọdụ. Ezigbo enyi na-achọpụta mgbe nsogbu bịaara enyi ya, ya agbatara ya ọsọ enyemaka. Onye bụ́ ezigbo enyi gị ga-ama mgbe i nwere nsogbu, ya enyere gị aka. Nke bụ́ eziokwu bụ na enyi gị ahụ ga-achọkwa ka i nyere ya aka ma yanwa nwee nsogbu.”—Chidimma.

“E nwere onye m metara enyi mgbe mama m nwụrụ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ezigbo enyi m mgbe ahụ, anyị kwuru na anyị ga-aga otu agbamakwụkwọ. Ma, ụbọchị anyị chọrọ ịga agbamakwụkwọ ahụ dabara n’ụbọchị a ga-eli mama m. Ọ tụrụ m n’anya na enyi m ahụ hapụrụ agbamakwụkwọ ahụ ọ chọrọ ịga bịa olili mama m. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka m matara na ọ bụ ezigbo enyi.”—Chiamaka.

N’ime ndị enyi gị niile, olee nke na-anaghị eme ihe ga-adị naanị onwe ya mma? Ezigbo enyi “na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

N’okpuru ebe a, dee aha enyi gị abụọ ndị ị ma na ha anaghị eme ihe ga-adị naanị onwe ha mma.

1 ․․․․․

2 ․․․․․

EZIGBO ENYI GA-ENYERE GỊ AKA ỊNA-AKPA EZIGBO ÀGWÀ

“Ụfọdụ ndị na-achọ ka m na-eme ihe ọ bụla ha chọrọ, a sịgodị na ọ dịghị mụ mma ma ọ bụkwanụ na ọ ga-enye m nsogbu n’obi ma m mee ya. Ụdị ndị ahụ abụghị ezigbo ndị enyi.”—Adugo.

“Nwanne m nwaanyị bụ ezigbo enyi m. Ọ na-enyere m aka ịna-eme ezigbo ihe n’agbanyeghị na ọ naghị adịrị m mfe mgbe ụfọdụ. Ọ na-akụzikwara m otú mụ na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma. Ọ na-agwa m nke bụ́ eziokwu, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ọ dịghị mụ mma ná ntị.”—Ebere.

“Mgbe m mere ihe ọjọọ, ezigbo ndị enyi m abịaghị na-emere m ọnụ mmiri mmiri, kama, ha gwara m hoo haa ihe m kwesịrị ime. Ihe ndị nke ọzọ mere bụ ịgbanye aka n’úkwù na-eche ka mụ na nsogbu m lụchaa. Ma ọ bụkwanụ ha bịa, ha ana-egwusa m egwuregwu ka m chefuo ihe ahụ merenụ. Ha nọ na-eme ka à ga-asị na o nweghị ihe ọjọọ m mere.”—Ijeoma.

“M gwa enyi m ezigbo ihe m chọrọ ime, ọ na-agwa m na m ga-emeli ihe ahụ, gwakwa m otú m ga-esi mee ya. M mee ihe na-adịghị mma, ọ na-agwa m hoo haa na ihe ahụ m mere adịghị mma. Otú ahụ o si agwa m ya na-atọ m ezigbo ụtọ.”—Nkiru.

Ndị enyi gị hà na-enyere gị aka ka ị na-akpa ezigbo àgwà ka hà na-achọ ka ị na-eme ihe na-adịghị mma, ka gị na ha nwee ike na-adị ná mma? Ilu 13:20 kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”

N’okpuru ebe a, dee aha ndị enyi gị abụọ ndị nyeerela gị aka ịna-akpa àgwà dị mma.

1 ․․․․․

2 ․․․․․

Gaghachi n’ebe atọ ahụ a gwara gị dee aha ndị enyi gị, legodị ma è nwere onye nke i dere aha ya na ha niile. Ọ bụrụ na e nwere, mara na onye ahụ bụ ezigbo enyi gị. Ma, ọ bụrụ na o nweghị onye n’ime ndị enyi gị ị ga-asị na ha na-eme ihe ndị ahụ e kwuru e ji ama ezigbo enyi, echegbula onwe gị. O nwere ike ịbụ na e nwere ndị ezigbo mmadụ bi ebe i bi, naanị na ọ ga-ewetụ gị oge tupu ị mata ha. * Ka ọ dịgodị, gbalịa bụrụ ezigbo mmadụ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ, aha ya bụ Adaku, kwuru, sị: “M na-agbalị mgbe niile ịhụ na m nyeere ndị enyi m aka mgbe ọ bụla ha nwere nsogbu. O nwee ihe ha chọrọ ka e nyere ha aka mee, m na-enyere ha aka. Ha chọọ onye ha ga-akọrọ mkpa ha, m na-ewepụta oge gee ha ntị. O nwee ihe na-ewute ha, m na-akasi ha obi.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ka mma inwe ọtụtụ ndị enyi karịa imete mkpụrụ mmadụ ole na ole enyi, jụzie ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrịnt 6:13) Ma, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị gị mma inwe mmadụ ole na ole, ndị bụ́ ezigbo ndị enyi gị, ndị ị ga-asị na ha bụ ndị “a mụrụ maka oge nsogbu”? (Ilu 17:17) Nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ, aha ya bụ Ngozi, kwuru, sị: “Ọ dị mma ịma ọtụtụ ndị, ma, o yiri mmadụ inweju ákwà enweju n’enweghị otu n’ime ha na-adị ya mma n’ahụ́ ma o yiri ya. Onye ahụ jikewe ịpụ, ọ ga-aga ebe o kosara efe ole na ole ndị ahụ na-adị ya mma n’ahụ́ gaa chọrọ nke ọ ga-eyi. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara ndị enyi.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 5 Ị chọọ ịgụkwu gbasara ịkparịta ụka n’Ịntanet, gụọ isiokwu ndị dị na peeji nke 16 na nke 26 na magazin a.

^ par. 10 E nwere mgbe i kwesịrị ịkọrọ onye ọzọ ihe enyi gị gwara gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na enyi gị gwara gị ezigbote ihe ọjọọ o mere, ma ọ bụ gwa gị na ya chọrọ igbu onwe ya, i kwesịghị imechi ọnụ. Ya bụrụkwa na enyi gị na-eme ihe ị ma na o nwere ike igbu ya, i kwesịghị ịgbachi nkịtị. Ị chọọ ịghọtakwu gbasara ihe a anyị kwuru, gụọ Teta! January–March 2009, peeji nke 19-21, na July–September 2008, peeji nke 16-19.

^ par. 30 Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi enweta ezigbo ndị enyi, gụọ Teta! April–June 2009, peeji nke 23. Isiokwu ya bụ, “M̀ Kwesịrị Inwe Ezigbo Ndị Enyi?”

[Igbe dị na peeji nke 14]

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IMETE EZIGBO ENYI

1. Mete mmadụ ole na ole bụ́ ezigbo mmadụ enyi. “Ịma ọtụtụ mmadụ adịghị njọ. Ma, n’ime ndị ahụ ị ma, gbalịa mete mmadụ ole na ole ihe kacha adabara gị na ha enyi.”—Karen.

2. Bụrụ ezigbo enyi. “M na-achọ ka ndị enyi m na-akpaso m ezigbo àgwà, ka ha na-emekwa ihe m ga-eji na-atụkwasị ha obi. Mụnwa na-emekwa ihe ahụ m chọrọ ka ha na-eme.”—Evelyn.

3. Kelee onye meere gị ihe ọma. “Ọ bụrụ na enyi m emeere m ihe, obi na-adị m ụtọ, m na-ezigakwara ya kaadị ma ọ bụkwanụ nye ya onyinye iji kelee ya.”—Kellie.

[Igbe dị na peeji nke 14]

IHE GỊ NA NDỊ MỤRỤ GỊ NWERE IKE ỊKPA

Mgbe unu hà ka m, olee otú unu na ndị enyi unu si gaa? Ò nwere ihe unu kọọrọ ndị enyi unu, ha agaa kọọrọ ya ndị ọzọ? Ọ bụrụ na o nwere, gịnị ka ihe ahụ merenụ kụziiri unu? Olee ndị mechara bụrụ ndị ezigbo enyi unu, oleekwa otú unu na ha si malite tọwa?

[Igbe dị na peeji nke 15]

IHE KWESỊRỊ IME KA GỊ NA MMADỤ BỤRỤ ENYI

Ihe na-eme ka mmadụ abụọ bụrụ ezigbo enyi bụ ha abụọ ikwere n’otu ihe. Ya bụ na i kwesịrị imete onye gị na ya na-ekpe otu okpukpe enyi. Onye ahụ kwesịrị ịkpọ ihe ọjọọ ihe ọjọọ ka gịnwa, kwesịkwa ịna-akpa ezigbo àgwà otú gịnwa na-akpa.

Ọ dịchaghị mkpa na onye ahụ ga na-eme ihe otú i si eme.

Na ihe na-amasị gị anaghị amasị ya ekwesịghị ime ka gị na ya ghara ịbụ enyi. A sị ka e kwuwe, mmadụ nwere ike imete onye na-anaghị eme ụdị ihe ọ na-eme enyi. O nwekwara ike mete onye na-enweghị ụdị onyinye o nwere enyi.

I kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara ịbụ na ihe mere gị na mmadụ ji bụrụ enyi bụ naanị na ihe na-amasị ya na-amasị gị. Ọ bụrụ na gị na onye ahụ ekweghị n’otu ihe, enyi unu nwere ike ọ gaghị adịte aka. Adịm ná mma unu abụọ nwedịrị ike ime ka ị banye ná nsogbu.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 15]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Ọ bụrụ na ị bụ onye oké ezi omume, ị gaghị enwe ndị enyi n’ihi na o nweghị ihe ha mere ga-adị gị mma. Ya bụrụkwa na ihe ọ bụla e mere na-adị gị mma, o nweghị ụdị onye gị na ya na-agaghị abụ enyi, nke ahụ adịghịkwa mma.”

“Ihe na-abụ mkpa ụfọdụ ndị bụ ka ha nwee ọtụtụ ndị ha na ha nwere ike ịna-akparịta ụka n’Ịntanet, ha achọghịdị ịma ma ndị ahụ hà bụ ezigbo mmadụ. A bịa n’ihe enyi na enyi, i kwesịghị ịchọwa ka i nwee ha nwejuo abọ, kama chọọ mmadụ ole na ole bụ́ ezigbo mmadụ ị ga-emete enyi.”

“Ọ bụrụ na mmadụ agbaara m asịrị gbasara enyi ya, ọ pụtara na onye ahụ ga-agbakwara ndị enyi ya asịrị gbasara m. Ihe ụdị onye ahụ anaghị amasị m. Ezigbo enyi mmadụ ekwesịghị iji ya na-agba asịrị.”

[Foto]

Dominique

Lianne

Brieanne