Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Inwe Okpukpe Ị Na-ekpe?

Ì Kwesịrị Inwe Okpukpe Ị Na-ekpe?

Echiche Baịbụl

Ì Kwesịrị Inwe Okpukpe Ị Na-ekpe?

OBI adịghị ọtụtụ ndị mma taa n’ihi ihe a na-eme n’okpukpe. Ndị ọzọ chere na mmadụ inwe okpukpe ọ na-ekpe abaghị uru. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị. N’eziokwu, ọtụtụ ndị achọghị inwe okpukpe ha na-ekpe.

Ụfọdụ enweghịzi okpukpe ha na-ekpe n’ihi na ha chere na ndị okpukpe bụ ndị ihu abụọ nakwa na ha kpọrọ ndị na-abụghị ndị okpukpe ha asị. E nwekwara ndị ikpe okpukpe na-agwụ ike. Ndị ọzọ chere na ọ bụghị naanị ndị nwere okpukpe ha na-ekpe ka Chineke na-anabata ofufe ha. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere mmadụ inwe okpukpe ọ na-ekpe?

Otú Ndị Ohu Chineke Si Fee Ya n’Oge Ochie

Baịbụl kwuru otú ndị mmadụ si fee Chineke n’oge ochie. Ọ gwara anyị otú Ebreham, Aịzik, na Jekọb si fee Chineke. Dị ka ihe atụ, e nwere otu oge Chineke kwuru, sị: “Amarawo m [Ebreham] ka o wee nye ụmụ ya nakwa ezinụlọ ya ga-anọchi ya iwu ka ha debe ụzọ Jehova iji na-eme ezi omume ma na-eme ihe n’ikpe ziri ezi.” (Jenesis 18:19) Ebreham bụ enyi Chineke, nke pụtara na ya na ya dị n’ezigbo mma. E nwere oge ndị o fere Chineke naanị ya, nweekwa oge ndị ya na ndị ezinụlọ ya nọkọrọ fee Chineke. Ndị ọzọ bụ́ ndị enyi Chineke n’oge ochie zukọkwara fee ya, ha na ndị ikwu na ibe ha na ndị na-agbara ha ohu.

Ka oge na-aga, Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-ezukọ na-efe ya. O mechakwara gwa Ndị Kraịst oge ochie ka ha na-eme otú ahụ. (Levitikọs 23:2, 4; Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ na-abụ ha bịa ife Chineke, ha abụọ abụ, gụọ Akwụkwọ Nsọ, kpeekwa ekpere. (Nehemaya 8:1-8; Ndị Kọlọsi 3:16) Baịbụl kwukwara na ọ bụ ụmụ nwoke ruru eru kwesịrị ịna-akụzi ihe ma a bịa ife Chineke.—1 Timoti 3:1-10.

Ihe Mere Izukọ Na-efe Chineke Ji Dị Mma

N’ihi otú ahụ ndị mmadụ si fee Chineke n’oge ochie, o ziri ezi ikwu na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya taa nwee okpukpe ha na-ekpe. Izukọ na-efe Chineke bakwara uru.

Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na onye na-efe Chineke dị ka onye na-eje ije n’ụzọ dị warara. E nwekwara ebe o ji onye na-efe Chineke tụnyere onye na-agba ọsọ n’ọsọ egwuregwu. (Matiu 7:14; 1 Ndị Kọrịnt 9:24-27) Ọ bụrụ na mmadụ gba ọsọ na-aga ebe dị anya, ma, ụzọ adịghị mma, ike nwere ike ịgwụ ya ngwa ngwa, ya akwụsị n’ụzọ. Ma, onye ahụ nwere ike jisie ike gbaruo ọsọ ahụ n’isi ma ọ bụrụ na e nwere ndị na-akụrụ ya aka. Otú ahụ ka ọ dị onye chọrọ ime ihe dị Chineke mma. O nwere ike nọgide na-efe Chineke ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-agba ya ume, ọ̀ sọkwa ya ya bụrụ na ihe adịghịrị ya mfe.

Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo ná Ndị Hibru 10:24, 25, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.” Ihe ọ pụtara bụ na ezigbo Ndị Kraịst ga na-ezukọ na-efe Chineke. Ha ga-adị n’otu otú ahụ ahụ́ mmadụ si arụkọ ọrụ.

Baịbụl kwukwara na ịhụnanya na udo na-eme ka ha dịrị n’otu. Dị ka ihe atụ, Ndị Efesọs 4:2, 3 gwara ezigbo ndị na-efe Chineke ka ha na-eme ihe ‘n’ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu, n’ogologo ntachi obi, jirikwa ịhụnanya na-ediri ibe ha ihe, na-agbasi mbọ ike ka ha nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’ Ì chere na mmadụ ga-eme ihe a Baịbụl kwuru ma ọ bụrụ na o nweghị okpukpe ọ na-ekpe?

Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-ezukọ na-efe ya, ọ bụghị ka onye ọ bụla n’ime ha na-efe ya otú onye ahụ si chọọ. Baịbụl gwara ndị na-efe Chineke ka ha na-ekwu otu ihe, ka a ghara inwe nkewa n’etiti ha. Ọ gwakwara ha ka ha “dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.” (1 Ndị Kọrịnt 1:10) A sị na Chineke chọrọ ka onye ọ bụla nọpụ iche na-efe ya, ọ pụtaranụ na onye ahụ agaghị eme ihe a Baịbụl kwuru.

Ihe ndị a anyị tụlere gosiri na ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-ezukọ na-efe ya. Ị nọrọ n’okpukpe Chineke kwadoro na-efe ya, ị ga-amụta ihe ga-eme ka gị na ya dị ná mma.—Matiu 5:3.

Nke bụ́ eziokwu bụ na omume ihu abụọ juru n’ọtụtụ okpukpe taa, ọtụtụ okpukpe na-akpakwa arụ. Ma, ọ bụghị nke a ga-eme ka i chee na okpukpe niile dị njọ. A ga-enwerịrị okpukpe na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi hụ mmadụ ibe ha n’anya. Okpukpe ahụ na-akụzikwara ndị mmadụ otú ha ga-esi na-akpa àgwà ọma. Okpukpe ahụ ga-emekwa ka okwukwe gị sie ike n’ebe Chineke nọ. Baịbụl kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata okpukpe nke bụ́ nke ezigbo ya.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee ihe Baịbụl kwuru nke gosiri na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ nwee okpukpe ha na-ekpe?​—Levitikọs 23:2, 4.

● Olee otu n’ime uru ndị anyị ga-erite ma anyị na-ezukọ na-efe Chineke?​—Ndị Hibru 10:24, 25.

● Gịnị na-eme ka ndị nọ n’otu okpukpe dịrị n’otu?​—Ndị Efesọs 4:2, 3.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ì kwesịrị ịnọ naanị gị na-efe Chineke n’enweghị okpukpe ị nọ na ya?