Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ ỌNỤ | MASSIMO TISTARELLI

Otu Nwoke Mụrụ Gbasara Rọbọt Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

Otu Nwoke Mụrụ Gbasara Rọbọt Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

Prọfesọ Massimo Tistarelli bụ ọkà mmụta sayensị. Ọ na-akụzi nkụzi na mahadum Saserii nke dị n’Ịtali. O so ede akwụkwọ atọ ndị na-ekwu gbasara sayensị. Ọtụtụ ndị na-agụkwa ha n’ụwa niile. O sokwa dee ihe dị ka otu narị akwụkwọ ndị ọzọ kwuru gbasara sayensị. Ọ mụrụ otú anyị si ahụwa ihe anyị hụrụ ama na otú anyị si enwe ike aghọrọ ihe dị ka bọl ma a tụọrọ anyị ya. Mgbe ọ mụchara ihe ndị a, o dere otú e nwere ike isi soro otú anyị si eme ihe mepụta rọbọt na-ahụwa ihe ama. Ndị na-ede Teta! jụrụ ya ihe mere o ji kwere na Chineke nakwa ihe ọ na-arụ mgbe ọ ghọrọ ọkà mmụta sayensị. Lee ihe ọ gwara ha.

Olee okpukpe ndị i kpere n’oge gara aga?

Papa m na mama m bụ ndị Katọlik. Ma, ha anaghị aga chọọchị. Mgbe m dị obere, ekweghị m na e nwere onye kere anyị. A kụziiri m na mmadụ si n’enwe pụta, m kwetakwara na ọ bụ eziokwu. N’agbanyeghị na ekweghị m na e nwere onye kere anyị, ama m na o nwere onye ka mmadụ. Ka m nwee ike ịmata onye onye ahụ bụ, m kpere okpukpe Buda, okpukpe Hindu, na okpukpe Tao. Ma, ha enyereghị m aka ịmata onye ọ bụ.

Gịnị mere i ji gaa mụwa gbasara sayensị?

Mgbe m dị obere, m na-eji ihe ndị dị ka moto ụmụaka egwu egwu. Ọ na-abụ m hịọkasịchaa ha, mụ arụzie ha. M na-ajụkarịkwa papa m ọtụtụ ajụjụ gbasara otú redio na fon si arụ ọrụ n’ihi na ọ na-arụzi fon.

Olee ihe ndị ị mụrụ?

Agara m akwụkwọ na Mahadum Jenua. N’ebe ahụ, amụrụ m gbasara ngwá elektrọniks. M mechakwara gaghachi mahadum mụọ gbasara rọbọt. Amụrụ m otú mmadụ si ahụwa ihe ọ hụrụ ama nakwa otú a ga-esi mepụta rọbọt na-emekwa otú ahụ.

Gịnị mere i ji gaa mụwa otú anyị si ahụwa ihe anyị hụrụ ama?

Otú e si kee anya anyị dị egwu. O nwere ihe dị n’anya anyị nke na-enyere anyị aka ịhụwa ihe anyị hụrụ ama. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a tụọrọ gị bọl, gị agbara gawa ka ị ghọrọ ya, anya gị ga-elegide ya ma gwa ụbụrụ gị ihe ọ hụrụ. Nke a ga-enyere gị aka ịma otú bọl ahụ dị, gị ahụwa ya ama.

Ihe ọzọ bụ na anya gị na-ahụ ebe bọl ahụ na-aga, na otú onye tụrụ ya si tụọ ya. Ya mata ihe ndị a, ya agwazie ụbụrụ gị. Ọ bụzi ụbụrụ gị ga-agwa gị gaa ghọrọ bọl ahụ. Otú ihe a niile si eme dị egwu.

Olee ihe mere i ji kweta na e nwere onye kere anyị?

N’afọ 1990, m ji ọnwa ole na ole gaa mee nchọpụta n’otu mahadum dị na Dọblịn. Mgbe mụ na nwunye m nọ n’ụzọ na-alọta, anyị nọ na-ekwu ihe ụmụ anyị ga-aghọ ma ha too. Anyị gakwara hụ nwanne m nwaanyị. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Mgbe anyị ruru na nke ya, o nyere m otu akwụkwọ Ndịàmà Jehova. Aha akwụkwọ ahụ bụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Otú ndị dere akwụkwọ ahụ si dee ya tọrọ m ezigbo ụtọ. O mere ka m ghọta ozugbo na m gaara ebu ụzọ chọpụta ma mmadụ ò si n’enwe pụta tupu mụ ekwere na ọ bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ọkpụkpụ ndị e gwupụtara n’ala. Echeburu m na ha na-akwado na mmadụ si n’enwe pụta. Ma, ọ bụ mgbe m bịara lerukwuo ihe ahụ a kụziiri m na mmadụ si n’enwe pụta anya, ka m bịara ghọta na ndị na-akụzi ya achịtaghị ájá ọ bụla.

Echebaara m ọrụ m na-arụ gbasara rọbọt echiche. M na-ede otú e nwere ike isi rụọ rọbọt na-ahụwa ihe ama. Ma, ònye kere mmadụ?

Ihe ọzọ m mere bụ ichebara ọrụ m na-arụ gbasara rọbọt echiche. M na-ede otú e nwere ike isi rụọ Rọbọt na-ahụwa ihe ama. Ma, ònye kere mmadụ? O nweghị onye ga-arụli rọbọt ga-aghotali bọl otú anyị si aghọta. Ma, e nwere ike rụọ rọbọt, gwa ya ka ọ na-aghọta bọl. Ọ bụkwa onye rụrụ ya ga-agwa ya otú ọ ga-esi eme ya. Ọ naghị echere onwe ya echiche. Anyị ka rọbọt mara ihe, ma rọbọt anyị ka mara ihe nwere onye rụrụ ya. Ihe a so n’ihe ndị mere ka m kwetasie ike na o nwere onye kere anyị.

Gịnị mere i ji ghọọ Onyeàmà Jehova?

Otu n’ime ihe ndị mere m ji ghọọ Onyeàmà Jehova bụ na otú Ndịàmà Jehova si amụ Baịbụl masịrị mụ na nwunye m. Ihe kacha masị m bụ otú ha si ede akwụkwọ ha. Mgbe ọ bụla mmadụ kwuru ihe, m na-achọkarị ịma otú o si nweta ihe ahụ o kwuru. Dị ka ihe atụ, m gụrụ akwụkwọ ha ndị kwuru gbasara amụma ndị e buru na Baịbul. Mgbe m gụrụ ha, ọ bịara doo m anya na Baịbụl bụ Okwu Chineke. N’ihi ya, e mere mụ na nwunye m baptizim n’afọ 1992.

Sayensị ò meela ka ị ghara ikwere na Chineke dị?

Mba. O meela ka m kwetasie ike na Chineke dị. Dị ka ihe atụ, m kwuburu gbasara otú anyị si ahụwa ihe ama. A mụọ nwatakịrị, ọ naghị adị anya, ya amalite ịhụwa ihe ama. Anyị hụ onye anyị ma, anyị na-amata ya ozugbo, ọ bụrụgodị na ìgwè mmadụ gbara ya gburugburu. Anyị nwedịrị ike ịma otú obi dị ya. Ma, o nwere ike anyị agaghị ama na ihe mere anyị ji enwe ike eme ihe a niile bụ otú e si kee anya anyị. Ọ na-eme ya hụ ihe ọ hụrụla mbụ ya amata ya ozugbo.

O doola m anya ugbu a na ọ bụ Jehova kere ihe ahụ na-enyere anyị aka ịhụwa ihe ama. O nwekwara ihe ndị ọzọ o nyere anyị. Dị ka ihe atụ, o nyere anyị Baịbụl. Nke a emeela ka m na-ekele ya mgbe niile ma na-agwa ndị ọzọ gbasara ya. N’obi m, ama m na m kwesịrị ikele ya maka ihe niile o kere.