IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE
Otú Unu Ga-esi Ghara Ịna-Emefusị Ego
IHE BỤ́ NSOGBU
Ka e were ya na ị gbakọọla ego ole unu nwere wee chọpụta na ọ na-agbada n’ike n’ike ka a ga-asị na akpa unu puru epu. O tebeghịkwanụ aka unu gbara akwụkwọ, ma ego unu na-emefu karịrị akarị. Ọ̀ bụ nwunye gị na-emefusị ego unu? Kama ichewe otú ahụ, burunụ ụzọ chọpụta ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ. Ka anyị kwuo ụfọdụ ihe ndị nwere ike ịbụ ha kpatara ya. *
IHE NA-AKPATA YA
Ihe maara mmadụ ahụ́. Ọ bụrụ na gị na nne gị na nna gị bibu tupu ị lụọ nwunye, o nwere ike ịbụ na ị naghị akwụ ụgwọ ụlọ, ụgwọ ọkụ na ihe ndị yiri ha. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụghị otú i si ele ego anya ka nwunye gị si ele ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị na-azụkarị ihe ma nwunye gị na-achọ ka unu na-edebe ego unu. Ọ gaghị adịrị unu mfe ịgbanwe ma ọ bụ kwekọrịta otú unu ga-esi jiri ego unu na-azụ ihe.
Emeghị ihe n’oge ya. Otu nwoke ji ego achụ ego aha ya bụ Jim kwuru na mgbe ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ, ọ fọrọ obere ka ego ya gwụ n’ihi na ha anaghị eme ihe ụfọdụ mgbe ha kwesịrị. Ọ sịrị, “Anyị kwụrụ nnukwu ọmụrụ nwa n’ihi na anyị akwụghị ụgwọ ndị anyị ji n’oge. Ihe malitere isiri anyị ike.”
Ịzụ ihe n’aka. Ị ga na-emefu nnukwu ego ma ọ bụrụ na ị naghị akwụ ụgwọ ihe ọ bụla ị zụrụ ozugbo. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-abụ ha zụọ ihe n’Ịntanet ma ọ bụ na nnukwu ụlọ ahịa, ha enye ha nọmba ha ga-eji dọrọ ego n’ụlọ akụ̀. Ịzụ ihe otú a nwere ike ime ka mmadụ na-emefusị ego n’ihi na o nwere ike ịna-eche na ọ bụghị n’akpa ya ka ego ahụ si apụta. Ịzụ ihe n’aka nwekwara ike ime ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ banye n’ụgwọ.
Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya mere unu ji emefu ego, okwu ego nwere ike ịkpatara unu nsogbu. Otu akwụkwọ kwuru gbasara di na nwunye sịrị na ihe na-esekarịrị di na nwunye okwu bụ ego, ma hà nwere ego ma ọ bụ na hà enweghị. Ọ na-eme ka ha na-arụ ụka.
IHE I NWERE IKE IME
Kpebienụ ihe ndị unu na-agaghị na-azụ. Kama ịtawa nwunye gị ụta na ọ na-emefusị ego, gbakọọnụ aka chọpụta ihe na-eri unu ego nakwa ihe unu ga-eme ka unu kwụsị ịna-emefusị ego. Kpebiekwanụ na ego agaghị esere unu okwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Efesọs 4:32.
Kpebienụ ego ole unu ga-eji azụ ihe. A banye ọnwa ọhụrụ, dee ihe ndị unu ga-azụ n’akwụkwọ nakwa ego ole unu ga-eji azụ ha, ya sọkwa ihe ahụ ya dịrị obere. Ime otú a ga-enyere unu aka ịmata ihe na-eri ego unu. Ọ ga-emekwa ka unu mata ihe ndị unu na-ekwesịghị ịna-azụ.
Depụta ihe ndị unu kwesịrị iji ego eme dị ka ịzụ nri, ịzụ ákwà, ịkwụ ụgwọ ụlọ, ịzụ mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ. Dee ego ole i chere nke ọ bụla ga-eri unu kwa ọnwa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 14:28.
‘Onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’—Ilu 22:7
Wepụta ego unu ga-eji azụ ihe ndị ahụ i depụtara. Ụfọdụ na-etinye ego nke ọ bụla n’envelopu nke ya, dee ihe a ga-eji ego ahụ eme n’elu ya. Ọ bụrụ na ego dị n’envelopu nke ọ bụla agwụ, ha nwere ike kwụsị ịzụ ihe ahụ ma ọ bụkwanụ ha amanye aka n’ego dị n’envelopu ọzọ.
Chebaranụ otú unu si ele ihe onwunwe anya echiche. Ọ bụghị ịzụ ihe ọ bụla gbara n’ahịa na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Cheta na Jizọs sịrị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Ọ bụ otú i si azụ ihe ga-egosi ma ì kwetara ihe a Jizọs kwuru.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Timoti 6:8.
Kwụsịnụ ịzụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Otu nwoke lụrụla nwaanyị afọ abụọ aha ya bụ Aaron kwuru, sị: “Onye lụrụ nwaanyị ọhụrụ nwere ike iche na itinye steshịọn tiivi a na-akwụ ụgwọ ya na iri nri ahịa agaghị efu ya nnukwu ego, ma e mechaa, kpọtọkpọtọ agbaa n’ihu ehi. Mmadụ kwesịrị ịna-ekowe akpa ya ebe aka ya ga-eru.”
^ para. 4 N’agbanyeghị na ọ bụ nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ ka anyị ga-agwa okwu n’isiokwu a, ihe anyị ga-ekwu ga-abara nwaanyị lụrụ di ọhụrụ uru, bakwaara di na nwunye ndị lụrụ kemgbe uru.