“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”
“Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu.”—1 TESA. 5:11.
1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụ otú anyị ga-esi kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Susi kwuru, sị: “Mgbe nwa anyị nwoke nwụrụ, obi gbawara anyị ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu afọ.” Nwanna ọzọ kwuru na mgbe nwunye ya nwụrụ na mberede, “ụdị ọrịa ọ kpataara ya enweghị atụ.” Ọ dị mwute na ụdị ihe a na-eme ọtụtụ ndị. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ụmụnna atụghị anya na ndị ha hụrụ n’anya ga-anwụ tupu Amagedọn abịa. Ma ò nweela mgbe mmadụ nwụnahụrụ gị ma ọ bụ na ị ma onye mmadụ nwụnahụrụ, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú a ga-esi nyere ndị na-eru uju aka ịkara obi?’
2 O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ebe e kwuru na e mechaa, ọ ga-adị mma. Ma, ọ̀ pụtara na ihe gbawaa mmadụ obi, oge gatụhaala, obi adị ya mma? Otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ sịrị: “Achọpụtala m na ọ ka mma ikwu na ọ bụ ihe mmadụ ji oge ya na-eme ga-enyere ya aka inweta onwe ya.” O yiri ebe mmadụ merụrụ ahụ́. Ị chọọ ka o jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị igbu gị mgbu, i kwesịrị ilebara ya anya.
Otú ahụ ka onye ihe gbawara obi kwesịrị ime. Olee ihe ga-enyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka ịkara obi?JEHOVA BỤ “CHINEKE NKE NKASI OBI NIILE”
3, 4. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ghọtara na e kwesịrị ịkasi onye mmadụ nwụnahụrụ obi?
3 O doro anya na onye kacha akasi anyị obi bụ Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) Ọ bụkwa ya kacha nwee ọmịiko. Ọ gwara ndị ya, sị: “Ọ bụ mụ onwe m bụ Onye na-akasi unu obi.”—Aịza. 51:12; Ọma 119:50, 52, 76.
4 E nweekwala ndị nwụnahụrụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Onye obi ebere. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ebreham, Aịzik, Jekọb, Mozis, na Eze Devid. (Ọnụ Ọgụ. 12:6-8; Mat. 22:31, 32; Ọrụ 13:22) Baịbụl mesiri anyị obi ike na Jehova na-atụsi anya ike mgbe ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Obi ga-adị ha ụtọ, ahụ́ agbasiekwa ha ike. Chetakwa na Ọkpara Chineke hụrụ n’anya nwụrụ ọnwụ ike. Baịbụl kwuru na ‘ihe ya masịrị Chineke karịsịa.’ (Ilu 8:22, 30) Otú ihe ahụ si gbawaa Chineke obi abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.—Jọn 5:20; 10:17.
5, 6. Olee otú Jehova si akasi anyị obi?
5 Obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova ga-enyere anyị aka. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpe ekpere kọọrọ ya otú obi si gbawaa anyị. Obi ga-adị anyị mma ma anyị cheta na Jehova ghọtara otú ihe si ewute anyị ma na-akasi anyị obi. Ma, olee otú o si eme ya?
6 Otu n’ime ụzọ Chineke si enyere anyị aka bụ na ọ na-eji ‘mmụọ nsọ akasi anyị obi.’ (Ọrụ 9:31) Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na Nna anyị nke eluigwe ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ’ ha na-arịọ ya. (Luk 11:13) Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Susi sịrị: “Ọtụtụ mgbe, anyị na-egbu ikpere n’ala, rịọ Jehova ka ọ kasie anyị obi. Mgbe ọ bụla anyị kpere ekpere, udo nke Chineke na-eche obi anyị na echiche anyị nche.”—Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.
JIZỌS BỤ NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ NWERE ỌMỊIKO
7, 8. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jizọs ga-akasi anyị obi?
7 Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere gosiri na otú o si ṅomie Nna ya enweghị atụ. (Jọn 5:19) Ihe mere Chineke ji zite ya n’ụwa bụ ka ọ kasie “ndị e tiwara obi” na “ndị niile na-eru uju” obi. (Aịza. 61:1, 2; Luk 4:17-21) N’ihi ya, ihe e ji mara ya bụ ọmịiko. Ọ ghọtara otú ọ dị ndị na-ata ahụhụ, jirikwa obi ya niile chọọ inyere ha aka.—Hib. 2:17.
8 Mgbe Jizọs ka bụ nwata, ọ ga-abụ na ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya nwụnahụrụ ya. O nwere ike ịbụ mgbe Jizọs ka bụ nwa okorobịa ka Josef, bụ́ nna ya n’ụwa, nwụrụ. * Ebe Jizọs bụ onye ihe na-emetụ n’obi, chegodị otú o si siere ya ike n’oge ahụ idi ọnwụ Josef, ya ana-agbalịkwa ịkasi nne ya na ụmụnne ya obi.
9. Mgbe Lazarọs nwụrụ, olee otú Jizọs si gosi na o nwere ọmịiko?
9 Mgbe Jizọs na-eje ozi ya, o mere ihe gosiri na ọ ghọtara otú obi dị ndị mmadụ, nweekwara ha ọmịiko. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Ọ bụ eziokwu Jọn 11:33-36.
na Jizọs ma na ya ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, uju Meri na Mata na-eru gbawara ya obi. Otú o si wute ya mere ka anya mmiri gbaa ya.—10. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jizọs na-enwere ndị mmadụ ọmịiko taa?
10 Olee otú ọmịiko Jizọs nweere ndị mmadụ na otú o si kasie ha obi ga-esi nyere anyị aka taa? Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na “Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ ọ bụ ụnyaahụ na taa, ruokwa mgbe ebighị ebi.” (Hib. 13:8) Baịbụl kpọrọ ya “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ.” Ọ ghọtakwara otú iru uju na-adị. N’ihi ya, “o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.” (Ọrụ 3:15; Hib. 2:10, 18) Ọ bụ ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na uju ndị mmadụ na-eru na-emetụ ya n’obi, na ọ ghọtara otú ọ dị ha nakwa na ọ ga-akasi ha obi ‘n’oge ha chọrọ ka e nyere ha aka.’—Gụọ Ndị Hibru 4:15, 16.
‘NKASI OBI SI N’AKWỤKWỌ NSỌ’
11. Olee amaokwu Baịbụl ndị kacha akasi gị obi?
11 Ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú o si wute Jizọs mgbe Lazarọs nwụrụ bụ otu n’ime ọtụtụ ihe na-akasi obi a kọrọ n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. O kwesịghị iju anyị anya “n’ihi na ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Rom 15:4) Ọ bụrụ na ị na-eru uju, ụdị amaokwu Baịbụl ndị a e depụtara nwere ike ịkasi gị obi:
-
“Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Ọma 34:18, 19.
-
“Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị [Jehova] malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.”—Ọma 94:19.
-
“Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke bụ́ Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya ma nye nkasi obi ebighị ebi na ezi olileanya site n’obiọma na-erughịrị mmadụ, kasiekwa unu obi ma mee ka unu guzosie ike.”—2 Tesa. 2:16, 17. *
ỌGBAKỌ NA-AKASI ANYỊ EZIGBO OBI
12. Olee otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị nwere ike isi kasie ndị ọzọ obi?
12 Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ihe ọzọ na-akasi Ndị Kraịst na-eru uju obi. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:11.) Olee otú ị ga-esi mee ka onye “dara mbà” dị ike, kasiekwa ya obi? (Ilu 17:22) Cheta na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) Otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Dalene sịrị: “Ndị na-eru uju kwesịrị ikwu ihe ha chere na otú ọ dị ha n’obi. N’ihi ya, ihe kacha mkpa ị ga-emere onye na-eru uju bụ ige ya ntị. Ma anapụla ya okwu n’ọnụ.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Junia, bụ́ onye nwanne ya gburu onwe ya, sịrị: “Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na ị ghọtachaghị otú o si ewute ha, ihe dị mkpa bụ na ị chọrọ ịghọta otú obi dị ha.”
13. Olee ihe anyị kwesịrị icheta gbasara iru uju?
13 Chetakwa na otú ndị mmadụ si eru uju na otú obi na-adị ha na-adị iche iche. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ naanị onye ihe mere na-ama otú obi si gbawaa ya. O nwekwara ike isiri ya ike ikwucha otú obi dị ya. Baịbụl kwuru, sị: “Obi na-amata na mkpụrụ obi mmadụ nọ ná mwute, onye ọzọ agaghịkwa ekere òkè n’ịṅụrị ọṅụ ya.” (Ilu 14:10) Ọ bụrụgodị na mmadụ ekwuo otú obi dị ya, ọ naghị adịchara ndị ọzọ mfe ịghọta ihe ọ na-agbalị ikwu.
14. Olee otú anyị ga-esi mata ihe na-akasi obi anyị ga-agwa ndị mmadụ nwụnahụrụ?
Ilu 12:18) Ọtụtụ ndị ahụla ihe na-akasi obi ha ga-agwa ndị ọzọ na broshọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. * Ma, ọtụtụ mgbe, ihe na-akacha aba uru ị ga-eme bụ ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.’ (Rom 12:15) Otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ, aha ya bụ Gaby, sịrị: “Ọ na-abụ, o ju m obi, naanị ihe na-eme ka obi dị m mma bụ ibe ákwá. Ọ bụ ya mere obi ji adịtụ m mma ma ndị enyi m soro m bee ákwá. N’oge ahụ, ọ naghịzi adị m ka ọ̀ bụ naanị m na-eru uju a.”
14 O doro anya na ọ naghị adị mfe ịma ihe ị ga-agwa onye na-eru uju. Ma, Baịbụl kwuru na “ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” (15. O siere anyị ike ịga kasie onye na-eru uju obi ihu na ihu, olee otú anyị nwere ike isi kasie ya obi? (Kwuokwa ihe dị n’igbe bụ́ “ Okwu Ọma Ndị Ị Ga-eji Kasie Mmadụ Obi.”)
15 O siere gị ike ịma ihe ị ga-agwa onye na-eru uju ihu na ihu, o nwere ike ịkara gị mfe ide ihe ị chọrọ iji kasie ya obi na kaadị, n’ozi iimel, n’ekwentị, ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi. I nwere ike ide ihe otu amaokwu Baịbụl kwuru, àgwà ọma ụfọdụ pụrụ iche onye ahụ nwụrụ anwụ na-akpabu, ma ọ bụ ihe na-eme gị obi ụtọ ị na-echeta gbasara ya. Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Junia kwuru, sị: “Nwanna zitere m ozi dị nkenke ma ọ bụ kpọọ m ka mụ na ya nọrịa, ọ na-abara m uru karịa otú m ga-akọwali. Ụdị ihe ahụ na-eme ka m ghọta na a hụrụ m n’anya nakwa na ihe gbasara m na-emetụ ndị ọzọ n’obi.”
16. Olee otú ọzọ bara ezigbo uru anyị ga-esi kasie ndị ọzọ obi?
16 Echefula uru ekpere gị ga-abara nwanna na-eru uju, ma nke gị na ya
kpekọrọ ma nke i chetara ya n’ekpere. I kpewe ekpere mgbe gị na onye ahụ nọ, o nwere ike isiri gị ike ikwucha otú ọ dị gị n’obi. Ma, i jiri obi gị niile kpee ekpere ahụ, o nwere ike ịkasi ya ezigbo obi, ọ bụrụgodị na anya mmiri juru gị n’anya mgbe ị na-ekpe ya ma ọ bụ na ị na-ekwu ákwá ákwá. Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Dalene sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ụmụnna nwaanyị bịa ịkasi m obi, m na-ajụ ha ma hà ga-achọ ikpe ekpere. Ha bido ikpe ekpere, ọ na-esitụrụ ha ike. Ma, ihe na-eme mgbe ọ bụla bụ na, ha kpere na-aga, olu ana-esikwu ha ike, ha ejiri obi ha niile kpee ya. Otú okwukwe ha si sie ike, otú ha si hụ m n’anya, na otú ihe gbasara m si emetụ ha n’obi emeela ka okwukwe m sie ike.”NA-AKASI NDỊ ỌZỌ OBI
17-19. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akasi onye na-eru uju obi?
17 O nweghị otú anyị ga-esi amata ụbọchị ole onye ọ bụla kwesịrị iji ruo uju. Ọtụtụ ndị ikwu na ibe na-abịara onye mmadụ nwụnahụrụ mgbaru ka ha kasie ya obi. Ha na-emechakwa gaa rụwa ọrụ ndị dịịrị ha. Ma a ka kwesịrị ịna-akasi onye na-eru uju obi. N’ihi ya, wepụta onwe gị ịna-akasi ya obi. Ilu 17:17 sịrị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” Anyị niile kwesịrị ịna-akasi ndị na-eru uju obi ruo mgbe ha nwetara onwe ha.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 3:7.
18 Cheta na onye na-eru uju nwere ike ịnọkata bewe ákwá. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ ụbọchị ndị ọ na-echetakarị n’afọ, egwú ụfọdụ, foto, ihe ndị ọ na-eme, ísì, ụda, ma ọ bụkwanụ oge ụfọdụ n’afọ. Obi nwere ike ịgbawa onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ ma o mewe ihe ha abụọ na-emekọbu ọnụ, dị ka ịga mgbakọ ma ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs. Otu nwanna kwuru, sị: “Mgbe nwunye m nwụrụ, m tụrụ anya na obi ga-ajọ m ezigbo njọ ma o ruo n’ụbọchị anyị kwesịrị icheta agbamakwụkwọ anyị. Ọ dịghịrị m mfe. Ma, ụfọdụ ụmụnna haziri obere nnọkọ, kpọọ ndị bụ́ ezigbo enyi m ka m ghara ịnọ naanị m.”
19 Ma, cheta na ọ bụghị naanị n’oge pụrụ iche ka e kwesịrị ịna-akasi ndị na-eru uju obi. Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Junia sịrị: “Inyere onye na-eru uju aka na ịnọnyere ya n’ụbọchị na-abụghị ụbọchị pụrụ iche ga-abara ya ezigbo uru. Ụdị oge ahụ dị ezigbo mkpa. Ọ ga-akasikwa onye ahụ obi.” N’eziokwu, anyị agaghị ewepụli uju ndị mmadụ na-eru ma ọ bụkwanụ mee ka ha chefuchaa onye nwụnahụrụ ha. Ma, anyị ga-akasili ha obi ma anyị gbalịsie ike ịna-emere ha ihe ụfọdụ. (1 Jọn 3:18) Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Gaby sịrị: “M na-ekele Jehova n’eziokwu maka ndị okenye nyeere m ezigbo aka n’oge ahụ ọ na-adịghịrị m mfe. Ha mere ka ọ dị m ka Jehova ò ku m eku.”
20. Gịnị mere nkwa ndị Jehova kwere ji akasi anyị ezigbo obi?
20 Obi dị anyị ụtọ na Jehova Chineke, bụ́ Onye na-akasi anyị obi, ga-ewepụ iru uju niile ma kasie ndị mmadụ obi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-eme ka ‘ndị niile nọ n’ili ncheta nụ olu Jizọs wee pụta.’ (Jọn 5:28, 29) Chineke kwere nkwa na “ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.” (Aịza. 25:8) N’oge ahụ, kama ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá,’ ndị niile bi n’ụwa ‘ga-eso ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.’—Rom 12:15.
^ para. 8 Ebe ikpeazụ Baịbụl kpọrọ Josef aha bụ mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ. Mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya, nke bụ́ ime ka mmiri ghọọ mmanya, Baịbụl ekwughị gbasara Josef, ma n’oge ahụ ma n’oge ndị ọzọ. Mgbe a kpọgidere Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ gwara Jọn onyeozi ka o lekọtawa Meri. Jizọs agaraghị eme otú ahụ ma a sị na Josef ka nọ ndụ.—Jọn 19:26, 27.
^ para. 11 Amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kasirila ọtụtụ ndị obi bụ Abụ Ọma 20:1, 2; 31:7; 38:8, 9, 15; 55:22; 121:1, 2; Aịzaya 57:15; 66:13; Ndị Filipaị 4:13; na 1 Pita 5:7.
^ para. 14 Gụọkwa isiokwu bụ́ “Kasie Ndị Na-eru Uju Obi Otú Jizọs Mere,” n’Ụlọ Nche November 1, 2010.