TETA! Nke 2 n'Afọ 2018 | Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ
Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ
Anyị na-anụkarị ọtụtụ ihe mere ọtụtụ ezinụlọ ji enwe nsogbu. Ma, oleekwanụ ihe mere ezinụlọ ụfọdụ ji enwe obi ụtọ?
N’Amerịka, n’agbata afọ 1990 na afọ 2015, otú ndị di na nwunye dị ihe karịrị afọ iri ise si na-agba alụkwaghịm ji okpukpu abụọ karịa otú ọ dịbu, ndị nke dị ihe karịrị afọ iri isii na ise ji okpukpu atọ karịa otú ọ dịbu.
Ndị nne na nna amaghịzi nke ha ga-eso eso n’ihi na ụfọdụ ndị ọkachamara sịrị na ọ kacha mma ịna-apa ụmụaka apa, ndị ọzọ ekwuo na ọ ka mma iji aka ike na-azụ ha.
Ụmụaka na-eto, ghọọ dimkpa n’enwetaghị ọzụzụ ga-enyere ha aka ná ndụ.
N’agbanyeghị ihe a niile, nke bụ́ eziokwu bụ na . . .
Di na nwunye nwere ike ịna-enwe obi ụtọ, gharakwa itisa.
Ndị nne na nna nwere ike ịmụta otú ha ga-esi eji ịhụnanya na-agbazi ụmụ ha.
Ụmụaka nwekwara ike ịmụta ihe ndị ga-enyere ha aka ibi ndụ dị mma ma ha too.
Olee otú ihe ndị a ga-esi kwe omume? Teta! a lebara anya n’ihe iri na abụọ ga-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ.
1: Kpebie Na Ị Gaghị Ahapụ Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị
Ihe atọ nwere ike inyere di na nwunye aka ka ha ghara ịhapụ ibe ha.
2: Na-emekọnụ Ihe Ọnụ
Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ùnu dị naanị ka mmadụ abụọ bi n’otu ọnụ ụlọ?
3: Na-akwanyerenụ Ibe Unu Ùgwù
Gụọ ihe a ka ị mụta otú ị ga-esi na-ekwu okwu ma ọ bụ ihe ndị ga-eme ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara na ị na-akwanyere ya ùgwù.
4: Na-agbagharanụ Ibe Unu
Gịnị ga-enyere gị aka ịna-eleghara mmejọ di gị ma ọ bụ nwunye gị anya?
5: Gị na Ụmụ Gị Na-ekwurịta Okwu
E nwere ihe atọ nwere ike inyere gị aka ịbịarukwu ụmụ gị nso, marakwa obi ha.
6: Na-agbazi Ụmụ Gị
Ịgbazi ụmụaka ọ̀ na-eme ka ha chewa na ha abaghị uru?
7: Kụziere Ụmụ Gị Ịna-akpa Àgwà Ọma
Olee ụdị àgwà i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị ka ha na-akpa?
8: Na-eme Ihe Ị Na-akụziri Ụmụ Gị
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị na-eme ihe ị na-ekwu, i kwesịrị ịna-eme ihe ị na-akụziri ha eme.
9: Chọpụta Ụdị Onye Ị Bụ
Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ịkwụsi ike n’ihe ndị ha kweere?
10: Ikwesị Ntụkwasị Obi
Ime ka ndị mụrụ gị na-atụkwasị gị obi ga-enyere gị ezigbo aka ịghọ dimkpa.
11: Na-arụsi Ọrụ Ike
Ọ bụrụ na ị mụta ịna-arụsi ọrụ ike mgbe ị ka na-eto eto, ọ ga-enyere gị aka n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ.
12: Nwee Ihe Ndị I Bu n’Obi Imezu ná Ndụ
I mezuo ihe i bu n’obi ime, obi ga-esikwu gị ike, gị na ndị enyi gị adịkwuo ná mma, gị ana-enwekwu obi ụtọ.
Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka
Ihe Baịbụl kwuru ga-enyeliri unu aka n’alụmdi na nwunye unu, meekwa ka unu na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ unu.