Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àgwà ọma ga-enyere nwa gị aka ime ihe dị mma otú ahụ kọmpas ma ọ bụ ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịchọta ụzọ si eme ka mmadụ mata ebe ọ na-aga

MAKA NDỊ NNE NA NNA

7: Kụziere Ụmụ Gị Ịna-akpa Àgwà Ọma

7: Kụziere Ụmụ Gị Ịna-akpa Àgwà Ọma

IHE Ọ PỤTARA

Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere otú i kpebiri isi na-ebi ndụ. Di ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị na-agba mbọ ịna-ekwu eziokwu n’ihe niile, ọ pụtakwara na ị ga-achọ ịkụziri ụmụ gị ka ha na-ekwu eziokwu n’ihe niile.

Kụziekwara ha na ọ dị mma ịna-arụsi ọrụ ike, ịna-echebara ndị ọzọ echiche nakwa na imegbu mmadụ adịghị mma. Ihe ndị a bụ àgwà ndị ọ kacha mma ka ha mụta mgbe ha ka dị obere.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso. Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.”—Ilu 22:6.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ịkụziri ụmụaka àgwà ọma dị ezigbo mkpa n’oge a ọtụtụ ndị nwere ekwentị, nweekwa ike ịga n’Ịntanet. Otu nwaanyị aha ya bụ Karyn kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike isi n’ekwentị mụta ihe ndị na-adịghị mma mgbe ọ bụla. Ụmụ anyị nwedịrị ike ịnọ anyị n’akụkụ ma jiri ekwentị ha na-ele ihe na-adịghị mma.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ndị tozuru etozu na-echebara ihe echiche nke ọma ka ha mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.’—Ndị Hibru 5:14.

Ịna-echebara ndị ọzọ echiche dị mkpa. Anyị kwesịrị ịna-asị ndị ọzọ “biko” na “i meela.” Anyị kwesịkwara ịna-echebara ha echiche. Àgwà a dịzi ụkọ n’ihi na o yiri ka ndị mmadụ jizi ekwentị na ihe ndị yiri ya kpọrọ ihe karịa mmadụ ibe ha.

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Na-emesonụ ndị mmadụ otú unu chọrọ ka ha na-emeso unu.’—Luk 6:31.

IHE I NWERE IKE IME

Gwa ụmụ gị otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà. Dị ka ihe atụ, nchọpụta e mere gosiri na ọ na-adịrị ndị na-eto eto mfe izere inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụrụ na e mee ka o doo ha anya na ọ dịghị mma.

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA: E nwee ihe ọjọọ mere n’obodo unu ma ọ bụ nke a kọrọ n’akụkọ ụwa, jiri ya mere isiokwu i nwere ike iji kụziere nwa gị ịna-akpa àgwà ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị nta akụkọ kwuru na o nwere onye gburu mmadụ, i nwere ike ịsị: “Otú ndị mmadụ si na-akpọ ibe ha asị dịkwa egwu. Olee ihe i chere mere ndị mmadụ ji ebido ịkpa àgwà otú a?”

Otu nwoke aha ya bụ Brandon kwuru, sị: “Ọ na-aka esiri ụmụaka ike ime ihe ọma ma ọ bụrụ na ha amaghị ihe bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.”

Kụziere ụmụaka ịna-echebara ndị ọzọ echiche. Obere ụmụaka nwedịrị ike ịmụta ịna-asị “biko” na “i meela” nakwa ịna-asọpụrụ ndị ọzọ. Otu akwụkwọ aha ya bụ Parenting Without Borders kwuru, sị: “Ka ụmụaka na-amụta na ihe ha na-eme nwere ike ịbara ndị ezinụlọ ha, ndị ụlọ akwụkwọ ha, nakwa ndị obodo ha uru, ọ ga-eme ka ha na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru, ọ bụghị naanị onwe ha.”

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA: Kenye ụmụ gị ọrụ ndị ha ga na-arụ n’ụlọ. Ọ ga-eme ka ha mụta ịna-emere ndị ọzọ ihe.

Otu nwaanyị aha ya bụ Tara kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ụmụ anyị amụta ịna-arụ ọrụ n’ụlọ ugbu a, mgbe ha ga-ebiri onwe ha, ọ gaghị esiri ha ike n’ihi na ọ marala ha ahụ́.”