MAKA NDỊ DI NA NWUNYE
2: Na-emekọnụ Ihe Ọnụ
IHE Ọ PỤTARA
Ọ bụrụ na di na nwunye ana-emekọ ihe ọnụ, ha ga-adị ka mmadụ abụọ gbakọrọ aka nyara ụgbọelu na-aga otu ebe. Nsogbu dapụta, ha na-ejikọ aka dozie ya, onye nke ọ bụla anaghị emere otú dị ya mma.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu anụ ahụ́.”—Matiu 19:6.
Otu nwoke aha ya bụ Christopher kwuru, sị: “Di na nwunye kwesịrị ịna-emekọ ihe ọnụ. Ha kwesịrị ịgbakọ aka na-eme ka alụmdi na nwunye ha sie ike.”
IHE MERE O JI DỊ MKPA
Ọ bụrụ na nsogbu adapụta n’ezinụlọ, ihe di na nwunye na-anaghị emekọ ihe ọnụ na-emekarị bụ ịta ibe ha ụta, kama ịchọwa otú a ga-esi dozie ya. Obere ihe na-aghọrọ ha nnukwu nsogbu.
Otu nwaanyị aha ya bụ Alexandra kwuru, sị: “Imekọ ihe ọnụ dị ezigbo mkpa n’alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na mụ na di m anaghị emekọ ihe ọnụ, anyị ga-adị ka mmadụ abụọ bi n’otu ọnụ ụlọ, ma onye nke ọ bụla ana-eme otú masịrị ya.”
IHE I NWERE IKE IME
CHEBARA IHE NDỊ A ECHICHE
-
M̀ na-ewere ego m na-akpata ka nke “naanị m”?
-
Ọ̀ bụ naanị mgbe di m ma ọ bụ nwunye m na-anọghị ya ka m na-atụsara ahụ́?
-
M̀ na-agbara ụmụnne di m ma ọ bụ ụmụnne nwunye m ọsọ n’agbanyeghị na ya na ha dị ná mma?
GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ ZAA AJỤJỤ NDỊ A
-
Olee ihe ndị ọ na-abụ anyị mewe, anyị ejikọọ aka mee ha ka di na nwunye?
-
Olee ebe ndị anyị kwesịrị imezikwu ihe?
-
Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị na-emekọkwu ihe ọnụ?
IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA
-
Weregodị ya na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akụ tenis, onye nke ọ bụla ana-achọ imeri ibe ya. Olee ihe ndị i nwere ike ime ka unu abụọ nọrọ n’otu akụkụ na-akụ?
-
Kama ị na-eche, sị, ‘Olee otú m ga-esi emeri?’ ọ ka mma ịna-eche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi emeri?’
Otu nwoke aha ya bụ Ethan kwuru, sị: “Unu nwee nghọtahie, kama ịchọwa onye ikpe mara na onye ikpe na-amaghị, ihe kacha mkpa bụ ịchọ otú unu ga-esi mee ka udo dịrị n’etiti unu.”
IHE BAỊBỤL KWURU: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.