MAKA NDỊ NA-ETO ETO
12: Nwee Ihe Ndị I Bu n’Obi Imezu ná Ndụ
IHE Ọ PỤTARA
Ihe mmadụ bu n’obi imezu dị iche na ihe onye ahụ chọrọ ka o meere ya. E nwee ihe mmadụ bu n’obi imezu, ọ ga-eme atụmatụ otú ọ chọrọ isi mee ya, dịrị njikere ime mgbanwe ma ọ́ dị mkpa, rụsiekwa ọrụ ike iji mezuo ya.
Mmadụ nwere ike nwee ihe o bu n’obi ịrụzu n’ụbọchị ole na ole ma ọ bụ n’izu ole na ole. O nwekwara ike nwee ihe o bu n’obi ịrụzu n’ọnwa ole na ole, ma ọ bụkwanụ n’ime otu afọ ma ọ bụ karịa. Ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịrụzu ihe ndị ga-ewe ya otu afọ ma ọ bụ karịa bụ ibu ụzọ mee ndị nke na-agaghị ewecha oge.
IHE MERE O JI DỊ MKPA
Ọ bụrụ na mmadụ ana-emezu ihe ndị o bu n’obi ime, obi ga na-esikwu ya ike, ya na ndị enyi ya ana-adịkwu ná mma, ya ana-enwekwukwa obi ụtọ.
Obi ịna-esi mmadụ ike: Ọ bụrụ na i mezuo obere ihe i bu n’obi ime, ọ ga-eme ka obi kaa gị imewe ndị nke buru ibu. Ọ ga-emekwa ka obi sikwuo gị ike na ị ga-emerili nsogbu ndị nwere ike ịbịara gị n’ụbọchị, dị ka ihe atụ, ma ndị ọgbọ gị na-anwa gị ime ihe na-adịghị mma.
Gị na ndị enyi gị ịna-adị ná mma: Ndị mmadụ na-achọ ka ha na onye ma ihe ọ chọrọ ime ma dịkwa njikere ịrụ ọrụ iji mezuo ya bụrụ enyi. Ihe ọzọkwa bụ na otu n’ime ihe na-akacha enyere ndị enyi aka ịdị n’ezigbo mma bụ ịgbakọ aka iji mezuo otu ihe.
Ịna-enwe obi ụtọ: E nwee ihe i bu n’obi ime ma mechaa mezuo ya, obi ga-atọ gị ezigbo ụtọ.
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Christopher kwuru, sị: “Ọ na-amasị m inwe ihe ndị m bu n’obi imezu. Ha na-eme ka m nwee ihe m ji n’aka ime nakwa ihe m na-atụ anya ịrụzu. Mmadụ hụ na o mezuola ihe o bu n’obi ime, obi na-atọ ya ezigbo ụtọ. O nwedịrị ike ịsị: ‘Ọ̀ bụ m mechara mee ihe a? Amaghị m na m ga-emecha mee ihe a.’”
IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye na-ele ifufe anya agaghị agha mkpụrụ, onye na-elekwa ígwé ojii anya agaghị ewe ihe ubi.”—Ekliziastis 11:4.
IHE I NWERE IKE IME
Ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị ị chọrọ ime na otú ị ga-esi emezu ha.
Kpebie ihe ndị ị ga-achọ ime. Depụta ihe ndị ị ga-achọ ime, hazie ha n’usoro ha si dị gị mkpa.
Hazie otú ị ga-esi emezu ya. Na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ị chọrọ ime, mee ihe ndị a na-esonụ:
-
Kwuo oge ị ga-emechali ya.
-
Hazie otú ị ga-esi eme ya.
-
Chee banyere ihe ndị nwere ike ime ka o siere gị ike imezu ya na otú ị ga-esi emeri ha.
Malite ozugbo. Echela ka ihe niile ga-adị gị mkpa iji mezuo ihe ị chọrọ zuchaa tupu gị ebido. Jụọ onwe gị, sị: “Olee ihe mbụ m kwesịrị ime iji mezuo ihe m bu n’obi ime? Mezie ihe ahụ. Nke ọ bụla i mechara, kanye ihe na ya.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya.”—Ilu 21:5.