Ego
Nsogbu ọtụtụ ndị na-enwe banyere ego ebelatala n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru.
NA-EME EZIGBO ATỤMATỤ
IHE BAỊBỤL KWURU: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.”—Ilu 21:5.
IHE Ọ PỤTARA: I mee atụmatụ, mezuokwa ya, ọ ga-eme ka ihe na-agaziri gị. N’ihi ya, tupu gị emefuwa ego, buru ụzọ hazie otú ị ga-esi emefu ya. Cheta na ọ bụghị ihe niile ị chọrọ ka ị ga-azụtali. N’ihi ya, chee echiche nke ọma tupu gị emefuwa ego.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Kpebie ego ole ị ga na-emefu, na-emekwa ihe i kpebiri. Depụta otú ị chọrọ isi emefu ego gị, haziekwa ha ahazie. Dị ka ihe atụ, depụta ego ole ị ga-emefu ná nri, n’uwe nakwa n’ịkwụ ụgwọ ụlọ. Ọ bụrụ na ego i mefuru n’otu ihe karịrị ihe ị chọrọ imefu na ya, si n’ego i wepụtara maka ihe ọzọ dochie ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i mefuru ego karịrị akarị n’ịzụ mmanụ ụgbọala, si n’ego i wepụtara maka ihe ndị ọzọ na-adịchaghị mkpa, dị ka ego i ji azụ ihe mmegharị ọnụ, dochie ya.
-
Gbalịa zere ịna-eji ụgwọ. Ọ bụrụ na o kwe mee, zere iji ụgwọ chaa chaa. Kama iji ụgwọ, chekwawa ego gị ruo mgbe o zuru ihe ị chọrọ ịzụ. Ná mba ụfọdụ, ọ na-abụ mmadụ jiri kaadị e ji azụ ihe n’aka zụọ ihe ma ọ́ kwụghị ya ma ọnwa gwụ, a naa ya ọmụrụ nwa. Ọ bụrụ na ị na-esi otú a azụ ihe, gbalịa kwụchaa ego i ji n’ụgwọ ma ọnwa gwụ ka ị ghara ịkwụ ọmụrụ nwa. Ọ bụrụ na i ji ụgwọ, hazie otú ị ga-esi akwụghachi ya, gbaakwa mbọ kwụọ ya.
Otu nchọpụta e mere gosiri na iji kaadị e ji azụ ihe n’aka azụ ihe na-eme ka ndị mmadụ na-emefukarị ego. N’ihi ya, ọ bụrụ na i nwere kaadị e ji azụ ihe n’aka, azụla ihe ọ bụla ị hụrụ.
ZERE ÀGWÀ NDỊ NWERE IKE ỊKPATARA GỊ NSOGBU
IHE BAỊBỤL KWURU: “N’ihi oge oyi, onye umengwụ agaghị akọ ihe; ọ ga na-arịọ arịrịọ n’oge owuwe ihe ubi, ma ọ dịghị ihe ga-adị.”—Ilu 20:4.
IHE Ọ PỤTARA: Umengwụ nwere ike ime ka mmadụ daa ogbenye. N’ihi ya, na-arụsi ọrụ ike, zerekwa imefusi ego aghara aghara ka i nwee ego ị ga-eji eme ihe ndị dị gị mkpa n’ọdịnihu.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Na-arụsi ọrụ ike. Na-arụsi ọrụ ike, bụrụkwa onye a ga-atụkwasịli obi n’ọrụ gị. Ọ ga-eme ka ndị were gị n’ọrụ jiri gị kpọrọ ihe ma ghara ịchụ gị n’ọrụ.
-
Na-akwụwa aka ọtọ. Ezula onye ị na-arụrụ ọrụ ohi. Akwụwaghị aka ọtọ nwere ike ime ka i nwee aha ọjọọ, meekwa ka o siere ndị mmadụ ike inye gị ọrụ.
-
Adịla anyaukwu. Ịchụ ego ọnwụ ọnwụ nwere ike ime ka ị daa ọrịa, mebiekwa adịm ná mma gị na ndị ọzọ. Cheta na ego abụghị ihe niile.
IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
EJILA EGO GỊ NA OGE GỊ EME IHE NDỊ NA-ABAGHỊ URU.
“Onye aṅụrụma na onye na-eribiga nri ókè ga-ada ogbenye, ụra ga-eme ka mmadụ yiri naanị nkịrịka ákwà.”—ILU 23:21.
ECHEGBULA ONWE GỊ.
“Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.”—MATIU 6:25.
ENWELA ANYAỤFỤ.
“Onye anyaụfụ na-achụsosi ihe dị oké ọnụ ahịa ike, ma ọ maghị na ya ga-anọ n’ụkọ.”—ILU 28:22.