Ihe Ga-eme Ka Ịkpọasị Kwụsị Kpamkpam
Ọtụtụ nde mmadụ emeela ihe ndị e kwuru n’isiokwu ndị bu nke a ụzọ. Ha agbasiekwala mbọ ike wepụ ịkpọasị n’obi ha. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị emeli ka ịkpọasị laa kpamkpam. Ọ̀ pụtaziri na ịkpọasị agaghị akwụsịli?
Ọchịchị Kacha Mma
Ọchịchị ụmụ mmadụ enwebeghị ike ime ka ịkpọasị kwụsị. Ma, ọ̀ pụtara na e nweghị ọchịchị ga-enwe ike ịkwụsị ya?
Ọchịchị ọ bụla ga-emeli ka ịkpọasị kwụsị kwesịrị
1. Ime ka ndị mmadụ gbanwee ihe na-ezighị ezi ha na-eche n’obi ha gbasara ndị ọzọ na otú na-adịghị mma ha si ele ndị ọzọ anya.
2. Ime ka obi ndị e mejọrọ jụrụ ka ha nwee ike ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị.
3. Inwe ezigbo ndị ọchịchị na-akpọghị ndị ọzọ asị.
4. Ime ka agbụrụ niile dịrị n’otu.
Baịbụl gwara anyị na Chineke ehiwela ọchịchị ga-emeli ihe a niile. A na-akpọ ya “Alaeze Chineke.”—Luk 4:43.
Legodị ihe ọchịchị ahụ ga-eme.
1. Ọ Ga-akụziri Ndị Mmadụ Ịna-eme Ihe Ọma
“Ọ bụ ezi omume ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.”—AỊZAYA 26:9.
“Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe ga-esikwa n’ezi omume ahụ pụta bụ ịnọ jụụ na ịnọ n’obi iru ala ruo mgbe ebighị ebi.”—AỊZAYA 32:17.
Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Alaeze Chineke ga-akụziri ndị mmadụ ịna-eme ihe ọma. Ndị mmadụ mụta ịna-eme ihe dị mma, ha ga-agbanwe otú ha si emeso ibe ha. Onye ọ bụla ga-aghọta na ihe kacha mma ime bụ ịhụ ụdị mmadụ niile n’anya.
2. Ọ Ga-akwụsị Mmegbu
Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—MKPUGHE 21:4.
Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu niile mmegbu kpatara kwụsị. O nweghịzi ihe ga-eme ka ndị niile e megburu buwere ndị ọzọ iwe n’obi.
3. Ọ Ga-enwe Ezigbo Onye Ọchịchị
“Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị. Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume, ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa.”—AỊZAYA 11:3, 4.
Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Jizọs Kraịst, onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke, ga na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ gaghịkwa ele mmadụ anya n’ihu. Jizọs ahụghị otu agbụrụ n’anya karịa ibe ya, ọ ga-ahụkwa na mmadụ niile ga na-erubere ya isi.
4. Ọ Ga-eme Ka Mmadụ Niile Dịrị n’Otu
Alaeze Chineke na-akụziri ndị mmadụ ‘ịna-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti ha, kama ka ha dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.’—1 NDỊ KỌRỊNT 1:10.
Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ihe ndị ga-ebi n’Alaeze Chineke ga-eme abụghị naanị ịna-ekwu na ha dị n’otu. Ha ga-adị n’otu n’eziokwu n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya.