Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị

Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị

“Ihe a bụ akụkọ otú e si kee eluigwe na ụwa n’oge e kere ha.” (Jenesis 2:4) Ọ bụ otú a ka Baịbụl si kọwaa otú eluigwe na ụwa si malite. Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ dabara n’ihe ndị sayensi chọpụtara? Lee ihe atụ ụfọdụ.

Ná Mmalite: E kere eluigwe na ụwa

Eluigwe na ụwa hà nwere mmalite?

Jenesis 1:1 kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.”

Tupu afọ 1950, ọtụtụ ndị sayensị a ma ama kweere na eluigwe na ụwa enweghị mmalite. Ma, n’ihi ihe ndị a chọpụtara na nso nso a, ọtụtụ ndị sayensị ekwetala na n’eziokwu, eluigwe na ụwa nwere mmalite.

Olee otú ụwa dị ná mmalite?

Jenesis 1:2, 9 kwuru na ná mmalite “e nweghị ihe dị n’ụwa. Ọ tọgbọ chakoo,” mmiri kpuchikwara ya.

Ihe ndị sayensị chọpụtarala ná nso nso a dabara n’ihe a Baịbụl kọwara. Patrick Shih, onye mụrụ banyere ihe ndị dị ndụ, sịrị na ụwa anyị a ‘enweghị ikuku oxygen na mbụ, ọ dịghịkwa mma ile anya. Ọ tọgbọ chakoo.’ Otu magazin aha ya bụ Astronomy kwuru, sị: “Ihe ndị a chọpụtara na nso nso a na-egosi na ụwa jupụtara ná mmiri n’oge mbụ. Ọ fọkwara ntakịrị ka ọ bụrụ na e nweghị ala nkịtị dịnụ.”

Olee otú ìhè si rute n’ụwa?

Ihe e dere na Jenesis 1:3-5 gosiri na mgbe mbụ ìhè rutere n’ụwa, e nweghị ike ịnọ n’ụwa hụ ebe ìhè ahụ si na-abịa. Ọ bụ mgbe e mechara ka e nwere ike ịnọ n’ụwa na-ahụ anyanwụ na ọnwa.​—Jenesis 1:14-18.

Baịbụl ekwughị na e ji ụbọchi isii nkịtị nwere awa iri abụọ na anọ kee ihe ndị dị ndụ n’ụwa

Ụlọ ọrụ a na-akpọ The Smithsonian Environmental Research Center kwuru na ìhè mbụ rutere n’ụwa anaghị achasi ike. O kwukwara, sị: “Ikuku a na-akpọ Methane kpuchiri ụwa n’oge ahụ, nke mere ka ebe niile dị inyoghị inyoghị. Ma, ikuku ahụ mechara kusaa, eluigwe agbachapụ.”

Olee usoro e ji kee ihe ndị dị ndụ n’ụwa?

Jenesis 1:20-27 kwuru na e bu ụzọ kee azụ̀, bịazie kee ụmụ nnụnụ, kee anụ ndị bi n’elu ala, kezie mmadụ n’ikpeazụ. Ndị sayensị kwetakwara na azụ̀ mbụ e nwere adịla adị ogologo oge tupu e nwee anụ ndị bi n’elu ala, nakwa na o were ogologo oge tupu ụmụ mmadụ emechaa dịrị.

Baịbụl ekwughị na ihe ndị dị ndụ enweghị ike ịgbanwetụ ka oge na-aga

Gịnị Ka Baịbụl Na-ekwughị?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe Baịbụl kwuru adabaghị n’ihe ndị sayensị chọpụtara n’oge a. Ma, ihe na-emekarị ka ha na-ekwu ihe a bụ na ha aghọtachaghị ihe Baịbụl kwuru.

Baịbụl ekwughị na eluigwe ma ọ bụ ụwa dị naanị puku afọ isii (6,000). Ihe Baịbụl kwuru bụ na e kere eluigwe na ụwa “ná mmalite.” (Jenesis 1:1) Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem mgbe e kere ha.

Baịbụl ekwughị na ọ bụ ụbọchị isii nkịtị nwere awa iri abụọ na anọ ka Chineke ji kee ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Kama, Baịbụl ji okwu bụ́ “ụbọchị” kọwaa oge ndị e ji kee ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke kechara eluigwe na ụwa, Jenesis isi nke 1 kwuru na o ji “ụbọchị” isii kee ihe ndị dị n’ụwa. Ma, Baịbụl kpọkwara oge e ji kee ihe ndị a niile “ụbọchị Jehova * Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 2:4) N’ihi ya, nke ọ bụla n’ime “ụbọchị” isii ahụ Chineke ji kwadebe ụwa ka e nwee ike ibi na ya, keekwa ihe ndị dị ndụ dị n’ụwa nwere ike ịpụta ogologo oge buru ezigbo ibu.

Baịbụl ekwughị na ihe ndị dị ndụ enweghị ike ịgbanwetụ ka oge na-aga. Akwụkwọ Jenesis kwuru na Chineke kere ụmụ anụmanụ “n’ụdị ha dị iche iche.” (Jenesis 1:​24, 25) Okwu bụ́ “n’ụdị ha dị iche iche” e dere na Baịbụl abụghị okwu ndị sayensị. Kama, ọ dị ka è ji ya na-akọwa “ụdị” ihe dị iche iche e kere eke. N’ihi ya, ụfọdụ ihe bụ́ otu “ụdị” nwere ike ịgbanwetụ ntakịrị ka oge na-aga. Ma, ọ pụtaghị na ha ga-aghọ ihe ọzọ.

Gịnị ka i chere?

Ihe ndị anyị ka kwupụrụ ugbu a gosiri na Baịbụl ji okwu ndị dị mfe nakwa okwu ndị dabara adaba kọwaa otú eluigwe na ụwa si malite, otú ụwa dịbu na mbụ, nakwa otú ihe ndị dị ndụ si malite dịwa n’ụwa. Baịbụl ò kwukwara Onye ọ bụ ya n’eziokwu kere ihe ndị a? Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Echiche bụ́ na o nwere onye karịrị mmadụ kere ihe niile dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtarala n’oge a.” *

^ Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

^ Akwụkwọ a bụ́ Encyclopædia Britannica anaghị akụzi na o nwere onye kere ihe ndị dị ndụ.