Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE

Desiderius Erasmus

Desiderius Erasmus

DESIDERIUS ERASMUS dịrị ndụ malite n’ihe dị ka n’afọ 1469 ruo n’afọ 1536. N’oge ahụ ọ dịrị ndụ, e weere ya ka onye kacha gụọ akwụkwọ na Yurop. Ma, e mechara werezie ya ka onye ụjọ na onye na-emegide okpukpe. N’oge a na-arụrịta ụka n’ihe ụfọdụ gbasara okpukpe, Desiderius Erasmus mere ka a mata ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ndị Katọlik na ndị chọrọ ka a gbanwee ihe ụfọdụ na Katọlik na-eme. Taa, ndị mmadụ weere ya ka onye bụ́ isi mere ka a gbanwee ihe ụfọdụ n’okpukpe ndị dị na Yurop. N’ihi gịnị?

IHE NDỊ Ọ MỤRỤ NA IHE NDỊ O KWEERE

Otú Erasmus si mara Grik na Latịn nke ọma mere ka o nwee ike ịtụle Baịbụl ndị e dere n’asụsụ Latịn, dị ka Baịbụl Latịn Vulgate, na ihe odide Grik nke Ndị Kraịst nke a maara ka Agba Ọhụrụ. Ihe ọ mụtara mere ka o kweta na onye ọ bụla kwesịrị ịmata ihe dị na Baịbụl. N’ihi ya, o kwuru ka a sụgharịa Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-asụ n’oge ahụ.

Erasmus maliteziri ikwu ka a gbanwee ihe ụfọdụ n’okpukpe Katọlik. Ihe mere o ji kwuo otú ahụ bụ na ọ ghọtara na iso ụzọ Kraịst abụghị ịna-agbaso omenala ụfọdụ ndị mmadụ chepụtara, kama o kwesịrị imetụta ihe ọ bụla mmadụ na-eme ná ndụ. Ọ bụ ya mere mgbe ndị ụfọdụ bidoro ịgba ihe Chọọchị Katọlik na-akụzi ụkwụ, ndị Katọlik nọ na-eche na ọ ga-abụ Erasmus nọ n’isi ya.

Desiderius Erasmus mere ka a mata ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ndị Katọlik na ndị chọrọ ka a gbanwee ihe ụfọdụ na Katọlik na-eme

N’ihe ndị Erasmus dere, ọ gbara arụrụala ndị ụkọchukwu n’anwụ, katọọkwa ndụ okomoko ha na-ebi, na ọchịchọ ọjọọ nke ndị poopu na-akwado ịlụ agha. Ọ katọrọ ndị ụkọchukwu ndị na-eji omenala ndị dị ka ikwupụta mmehie, ife ndị sent, ibu ọnụ nakwa ime njem ala nsọ na-erigbu ndị òtù ha. Ọ katọkwara ihe ụfọdụ a na-eme na Chọọchị, dị ka ịkwụ ụgwọ maka mgbaghara mmehie nakwa ịmanye mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye.

BAỊBỤL AGBA ỌHỤRỤ

N’afọ 1516, Erasmus bipụtara Baịbụl Agba Ọhụrụ mbụ o dere n’asụsụ Grik. Ọ bụ ya bụ Baịbụl Agba Ọhụrụ mbụ e bipụtara. Erasmus dekwara akwụkwọ ebe ọ kọwara okwu ụfọdụ dị na Baịbụl, sụgharịakwa Akwụkwọ Nsọ Grik n’asụsụ Latịn. Otú o si sụgharịa ya dịtụ iche n’otú e si sụgharịa Baịbụl Latịn Vulgate. Ọ nọ na-edezigharị ya, mechazie bipụta nke dị ezigbo iche na Baịbụl Latịn Vulgate.

Baịbụl Agba Ọhụrụ Erasmus bipụtara n’asụsụ Grik

Otu ebe e nwere ezigbo ihe dị iche bụ na 1 Jọn 5:7. Na Baịbụl Latịn Vulgate, a gbakwunyere okwu ụfọdụ n’amaokwu a iji kwadoo nkụzi Atọ n’Ime Otu. A na-akpọ okwu ndị ahụ comma Johanneum. Otú ha si dee ya bụ: “N’eluigwe, Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ ahụ: ha atọ bụkwa otu.” Ma, Erasmus wepụrụ okwu ndị ahụ na Baịbụl Agba Ọhụrụ abụọ mbụ o bipụtara n’ihi na ha adịghị n’ihe odide Grik ndị o leere anya dee nke ya. Ma, ndị Katọlik mechaara manye ya itinye okwu ndị ahụ na Baịbụl nke atọ o bipụtara.

Baịbụl Agba Ọhụrụ ndị ka mma Erasmus mechara bipụta, bịaziri bụrụ ihe ndị nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ ji sụgharịa Baịbụl ndị ka mma e nweziri ugbu a n’asụsụ ndị dị na Yurop. Matịn Luta, Wiliam Tindel, Antonio Brucioli, na Francisco de Enzinas ji Baịbụl ndị a sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Grik, Jaman, Bekee, Ịtalian na Spanish.

Erasmus Biri ndụ n’oge e nwere ọtụtụ nsogbu n’okpukpe. Baịbụl Agba Ọhụrụ Grik ahụ ọ sugharịrị nyekwaara ọtụtụ ndị chọrọ ka a gbanwee ihe ụfọdụ aka. Tupu ndị chọrọ ka a gbanwee ihe n’okpukpe ebido nyewe nsogbu, a nọ na-ele Erasmus anya ka otu n’ime ha. Ma, Erasmus jụrụ iso ná nrụrịta ụka ndị nkà mmụta okpukpe na-arụ. Ọ dị mma ịmara na n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, otu okà mmụta aha bụ David Schaff mechara kwuo na Erasmus “nwụrụ na-enweghị okpukpe nke ọ nọ na ya. O soghị ndị Katọlik, o soghịkwanụ ndị Protestant.”