Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ònye Dịnyeere Jehova?”

“Ònye Dịnyeere Jehova?”

“Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu. Ọ bụ ya ka ị ga-ejere ozi, n’ahụ́ ya ka ị ga-araparakwa.”—DIUT. 10:20.

ABỤ: 28, 32

1, 2. (a) Olee uru ijidesi Jehova aka ike bara? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

Ọ BARA uru ijidesi Jehova aka ike. O nweghị onye siri ike, mara ihe, ma ọ bụ hụ anyị n’anya karịa Chineke. Ò nwere onye n’ime anyị na-agaghị achọ ịdịnyere ya? (Ọma 96:4-6) Ma, ụfọdụ ndị ohu Chineke hapụrụ ịdịnyere Chineke mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ.

2 N’isiokwu a, anyị ga-atụle banyere ụfọdụ ndị kwuru na ha dịnyeere Chineke, ma na-eme ihe ndị na-adịghị ya mma. Ihe ndị dị mkpa anyị ga-amụta n’akụkọ ha ga-enyere anyị aka ịnọgide na-erubere Jehova isi.

JEHOVA NA-ENYOCHA OBI

3. Olee ihe mere Jehova ji gbalịa ka o nyere Ken aka? Olee ihe Jehova gwara ya?

3 Chegodị banyere Ken. O nweghị onye ọzọ o kwuru na ya na-efe ma ọ bụghị Jehova. Ma, Chineke anabataghị ofufe ya. Jehova hụrụ na Ken nọ na-eche ihe ọjọọ n’obi ya. (1 Jọn 3:12) Ọ dọrọ Ken aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu? Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ezi ihe, lee, mmehie makpu n’ọnụ ụzọ, ọ bụkwa gị ka ọ na-achọsi ike inweta; ma gị onwe gị, ị̀ ga-emeri ya?” (Jen. 4:6, 7) Ihe Jehova na-agwa Ken bụ, “Ọ bụrụ na i chegharịa ma kwụsie ike n’ebe m nọ, m ga-anọnyere gị.”

4. Olee ihe Ken mere mgbe a chọrọ ka ọ kwụsie ike n’ebe Jehova nọ?

4 Ọ bụrụ na Ken agbanwee ihe ọjọọ ọ nọ na-eche n’obi ya, Jehova ga-anabatakwa ofufe ya. Ma Ken emeghị ihe Jehova gwara ya. Ihe ọjọọ ọ nọ na-eche n’obi ya na nke na-agụ ya agụụ mere ka o mee ihe na-adịghị mma. (Jems 1:14, 15) Mgbe Ken ka na-eto eto, o nwere ike o chetụdịghị echiche na ya ga-emehie Jehova. Ma ka oge na-aga, o mere ihe a na-atụghị anya ya. O nupụụrụ Chineke isi ma gbuo nwanne ya.

5. Olee ụdị ihe anyị nwere ike ịna-eche n’echiche nke nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdịzi ná mma?

5 Taa, Onye Kraịst nwekwara ike ime ka Ken. O nwere ike na-eme ihe ọjọọ ma na-ekwu na ya na-efe Chineke. (Jud 11) O nwere ike ịna-ejechi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya. Ma, n’otu mgbe ahụ, o nwere ike na-eche omume rụrụ arụ na otú ọ ga-esi baa ọgaranya n’obi ya. O nwekwara ike ịkpọ nwanna ya asị n’obi ya. (1 Jọn 2:15-17; 3:15) Ihe ndị a ọ na-eche nwere ike ime ka o mee mmehie. Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị ama ihe ndị anyị na-eche ma ọ bụ na-eme, ma Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ makwa ma ànyị ji obi anyị niile na-efe ya.—Gụọ Jeremaya 17:9, 10.

6. Olee otú Jehova si enyere anyị aka imeri ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ?

6 Jehova anaghị ajụ anyị ozugbo anyị mere ihe ọjọọ. Mgbe mmadụ na-eme ihe ga-eme ka ọ hapụ Jehova, Jehova na-agwa onye ahụ, sị: ‘Lọghachikwute m, m ga-alọghachikwutekwa gị.’ (Mal. 3:7) Jehova ma na e nwere àgwà ọjọọ ndị anyị na ha na-alụ. Ma ọ chọrọ ka anyị kwụsị ha. (Aịza. 55:7) Anyị mee otú ahụ, o kwuru na ọ ga-enyere anyị aka ma nye anyị ike anyị ga-eji merie ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ.—Jen. 4:7.

“UNU EKWELA KA E DUHIE UNU”

7. Olee otú Sọlọmọn si hapụ Jehova?

7 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ihe Eze Sọlọmọn mere. Mgbe ọ na-eto eto, o lekwasịrị Jehova anya ka o duzie ya. Chineke nyere ya amamihe dị egwu ma kwe ka o wuoro ya ụlọ nsọ magburu onwe ya na Jeruselem. Ma o mechara hapụ Jehova. (1 Eze 3:12; 11:1, 2) Iwu Chineke kwuru hoo haa na eze Izrel ekwesịghị ‘ịlụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ n’ebe Chineke nọ.’ (Diut. 17:17) Sọlọmọn emeghị ihe a Chineke kwuru. O mechara lụọ narị ụmụ nwaanyị asaa, nweekwa narị ndị iko atọ. (1 Eze 11:3) Ọtụtụ ndị nwunye ya abụghị ndị Izrel, ha na-efekwa chi ọzọ. Sọlọmọn mebikwara iwu Chineke mgbe ọ lụrụ ụmụ nwaanyị ala ọzọ.—Diut. 7:3, 4.

8. Olee otú Sọlọmọn si mejọọ Jehova?

8 Sọlọmọn ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịhụ Jehova n’anya, kwụsịkwa iji iwu ya kpọrọ ihe. O wukwaara chi nwaanyị Ashtọret ebe ịchụàjà, wuokwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu ebe ịchụàjà ọzọ maka chi ụgha bụ́ Kimọsh. O sooro ndị nwunye ya fee chi ụgha. Ebe o lechara anya wuoro chi ụgha ndị ahụ ebe ịchụàjà bụ n’ugwu dị n’ihu Jeruselem, bụ́kwanụ ebe o wuuru Jehova ụlọ nsọ. (1 Eze 11:5-8; 2 Eze 23:13) O nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche na Jehova ga-eleghara ihe ọjọọ a o mere anya ebe ọ bụ na ọ ka na-achụ àjà n’ụlọ nsọ. Ihe a o mere bụ ịghọ onwe ya aghụghọ.

9. Olee ihe mere mgbe Sọlọmọn nupụụrụ Chineke isi?

9 Ma Jehova anaghị eleghara ihe ọjọọ anya. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova wee weso Sọlọmọn oké iwe, n’ihi na obi ya apụwo n’ebe Jehova . . .  nọ, bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya ugboro abụọ. Ọ bụkwa banyere ihe a ka o nyere ya iwu ka ọ ghara iso chi ọzọ dị iche iche; ma o debeghị ihe ahụ Jehova nyere ya n’iwu.” Ihe a Sọlọmọn mere mere ka Chineke kwụsị ịnọnyere ya ma na-enyere ya aka. Ụmụ Sọlọmọn achịghịzi Izrel niile. Ha takwara ahụhụ ruo ọtụtụ narị afọ.—1 Eze 11:9-13.

10. Olee ihe nwere ike ịkpa adịm ná mma anyị na Jehova aka ọjọọ?

10 Ihe kacha eme ka ndị ohu Chineke kwụsị ife ya bụ ma ha na ndị na-amaghị iwu ya ma ọ bụ ndị na-ejighị iwu ya kpọrọ ihe na-akpachi anya. Ọ bụ ụdị ihe a mere Sọlọmọn. Ụfọdụ nwere ike ịnọ n’ọgbakọ, ma ha na Chineke adịghị n’ezigbo mma. Ndị ọzọ nwere ike ịbụ ndị ikwu anyị, ndị agbata obi anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-anaghị efe Jehova. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ bụrụ na ndị anyị na ha na-akpa ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe, ka oge na-aga, ha nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma.

Ndị mụ na ha na-akpa, hà na-emebi adịm ná mma mụ na Chineke ka hà na-eme ka mụ na ya dịrịkwuo ná mma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịma ma ànyị kwesịrị ịkwụsị iso ụfọdụ ndị na-akpa?

11 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Ọtụtụ ndị taa nwere ụfọdụ àgwà ọma ndị ha na-akpa. Ọtụtụ ndị na-anọghị n’ọgbakọ anaghị eme ihe ọjọọ mgbe niile. O nwere ike ịbụ na ị ma ụfọdụ n’ime ha. Nke a ọ̀ pụtara na gị na ha kwesịrị ịna-akpa? Jụọ onwe gị ma gị na ha na-akpa, hà ga-emebi adịm ná mma mụ na Jehova ka hà ga-eme ka mụ na ya dịrịkwuo ná mma? Gịnị ka ha na-eche n’obi ha? Dị ka ihe atụ, hà na-ekwukarị gbasara ejiji, ego, ngwá elektrọniks, ntụrụndụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ yiri ha? Hà na-akatọkarị ndị ọzọ ma ọ bụ na-ekwu okwu rụrụ arụ? Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Ọ bụrụ na ị chọpụta na ndị gị na ha na-akpa na-emebi adịm ná mma gị na Jehova, mee ihe ozugbo. Selata aka n’otú gị na ha si akpa. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, kwụsị gị na ha ịna-akpa.—Ilu 13:20.

JEHOVA CHỌRỌ OFUFE A NA-EKEWAGHỊ EKEWA

12. (a) Olee ihe Jehova gwara ndị Izrel obere oge ha hapụchara Ijipt? (b) Olee ihe ndị Izrel mere mgbe Chineke gwara ha na ya chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa?

12 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere obere oge Jehova napụtachara ndị Izrel n’Ijipt. Ndị Izrel zukọtara n’ihu Ugwu Saịnaị. Ka ha nọ ebe ahụ, Jehova mere ihe ndị dị egwu mere ka ha mata na ha nọ n’ihu ya. Ígwé ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Jehova mekwara ka égbè eluigwe malite ịgba, àmụ̀mà ana-egbu, anwụrụ ọkụ ana-akwụ. Ihe dị ka opi na-adasikwa ụda ike n’akwụsịghị akwụsị. (Ọpụ. 19:16-19) Ndị Izrel nụrụ ka Jehova gwara ha na ya bụ “Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” O mere ka obi sie ha ike na ya ga-adịnyere ndị hụrụ ya n’anya ma na-edebe iwu ya. (Gụọ Ọpụpụ 20:1-6.) Ihe Jehova na-agwa ndị ya bụ na, “ọ bụrụ na ha erubere ya isi na ya ga-akwụ ha n’azụ.” Ọ bụrụ na ị nọ ebe ahụ, olee ihe ị gaara eme mgbe ị nụrụ ihe a Jehova Chineke kwuru? O doro anya na ị ga-ekwu ihe a ndị Izrel kwuru. Ha ‘ji otu olu zaa, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.”’ (Ọpụ. 24:3) Ma, obere oge ihe a mechara, ihe a na-atụghị anya ya mere nke mere ka a mata ma hà kwụ Jehova n’azụ.

13. Olee ihe merenụ nke mere ka o siere ndị Izrel ike irubere Jehova isi?

13 Ụjọ tụrụ ndị Izrel mgbe ha hụrụ ígwé ojii, àmụ̀mà na ihe ndị ọzọ dị egwu Chineke mere. Ha gwara Mozis ka ọ na-ekwuchitere ha ọnụ ha n’ihe niile ya na Jehova ga-ekwu n’Ugwu Saịnaị, Mozis ekweta. (Ọpụ. 20:18-21) Mozis nọ n’ugwu ahụ ruo ogologo oge. Ndị Izrel hà tọrọ atọ n’ugwu ahụ ebe ọ bụ na onye ndú ha tụkwasịrị obi anọkwaghị ya? Ọ ga-abụ na ha tụkwasịrị Mozis obi karịa. Ha malitere ichegbu onwe ha ma gwa Erọn, sị: “Meere anyị chi nke ga na-ebutere anyị ụzọ, n’ihi na Mozis a, bụ́ onye dupụtara anyị n’ala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.”—Ọpụ. 32:1, 2.

14. Olee ihe ndị Izrel nọ na-eche ma si otú ahụ ghọọ onwe ha aghụghọ? Olee ihe Jehova mere?

14 Ndị Izrel ma na ikpere arụsị bụ ihe ọjọọ n’anya Jehova. (Ọpụ. 20:3-5) Ma obere oge, ha malitere ife nwa ehi ọlaedo ahụ ha kpụrụ. N’agbanyeghị na ha dara iwu Jehova, ha na-eche na ha ka na-efe ya, ma si otú ahụ ghọọ onwe ha aghụghọ. Erọn kpọdịrị nwa ehi ahụ ha na-efe, “ememme a ga-emere Jehova.” Olee ihe Jehova mere? O weere ya na ha gbara ya mgba okpuru. Ọ gwara Mozis na ndị Izrel “emewo omume na-eweta mbibi,” nakwa na ha ‘ahapụla ụzọ o nyere ha n’iwu ka ha na-agbaso.’ O wesoro ha “iwe dị ọkụ,” ma chewe echiche ibibi mba Izrel.—Ọpụ. 32:5-10.

15, 16. Olee otú Mozis na Erọn si gosi na ha dịnyeere Jehova? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

15 Jehova kpebiri na ya agaghị ebibi ndị Izrel. Ebere o meere ha mere ka ha nwee ohere igosi na ha chọrọ ịdịnyere ya. (Ọpụ. 32:14) Mgbe Mozis hụrụ ka ndị Izrel na-eti mkpu, na-agba egwú n’ihu arụsị ahụ, o gweriri nwa ehi ahụ, ya aghọọ ntụ. Mozis gwaziri ha, sị: “Ònye dịnyeere Jehova? Ya bịakwute m!” Ihe a o kwuru mere ka ‘ụmụ Livaị niile malite izukọta n’ebe ọ nọ.’—Ọpụ. 32:17-20, 26.

16 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Erọn kpụrụ nwa ehi ahụ, o chegharịrị ma soro ndị Livaị ndị ọzọ dịnyere Jehova. Ọ bụghị naanị na ha dịnyeere Jehova, ha kewapụkwara onwe ha n’ebe ndị ahụ mere ihe ọjọọ nọ. Ihe a ha mere gosiri na ha ma ihe. N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ puku ndị Izrel nwụrụ n’ihi ikpere arụsị. Ma, Jehova kwere ndị niile dịnyeere ya nkwa na ya ga-agọzi ha.—Ọpụ. 32:27-29.

17. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe Pọl kwuru banyere nwa ehi ọlaedo ahụ a kpụrụ akpụ?

17 Olee ihe anyị na-amụta n’ihe a? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ihe ndị a ghọọrọ anyị ihe atụ, ka anyị wee ghara ịbụ . . . ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’ime ha mere. Ihe ndị a nọ na-adakwasị ha dị ka ihe atụ, e dekwara ha ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo. Ya mere, ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Kọr. 10:6, 7, 11, 12) Dị ka Pọl kwuru, ezigbo ndị ohu Chineke nwedịrị ike ime ihe ọjọọ. Ha nwere ike na-eche na ihe ha na-eme dị Jehova mma. Ma mmadụ ịchọ ịbụ enyi Jehova ma ọ bụ ikwu na ya na-erubere ya isi apụtaghị mgbe niile na ihe onye ahụ na-eme dị Jehova mma.—1 Kọr. 10:1-5.

18. Olee ihe nwere ike ime ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ hapụ Jehova? Olee ihe o nwere ike ịkpatara anyị?

18 Mgbe Mozis gburu oge isi na Saịnaị gbadata otú ndị Izrel na-atụghị anya ya, ha malitere ichegbu onwe ha. Ọ bụrụ na Jehova ebibighị ụwa ochie a ngwa ngwa otú anyị tụrụ anya ya, anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị. Anyị nwere ike ịna-eche na ọdịnihu ahụ magburu onwe ya Chineke kwere anyị ná nkwa ka dị anya, ma ọ bụdị na ọ gaghị abịa abịa. Nke a nwere ike ime ka anyị mewe ihe anyị chọrọ kama ime ihe Jehova chọrọ. Ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, anyị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ hapụ Jehova ma malite ime ihe ndị anyị na-echetụbeghị n’echiche na anyị nwere ike ime.

19. Olee ihe dị mkpa anyị na-ekwesịghị ichefu? Maka gịnịkwa?

19 Anyị ekwesịghị ichefu na Jehova chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-erubere ya isi ma na-efe naanị ya. (Ọpụ. 20:5) Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe Jehova chọrọ, anyị ga na-eme ihe Setan chọrọ, nke a ga-akpatakwara anyị nsogbu. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Unu apụghị ịdị na-aṅụ iko Jehova na iko ndị mmụọ ọjọọ; unu apụghị ịdị na-eri na tebụl Jehova na-erikwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.”—1 Kọr. 10:21.

JIDESIE JEHOVA AKA IKE

20. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ọ bụrụgodị na anyị emee mmehie?

20 E nwere ihe dị mkpa jikọrọ ihe Baịbụl kwuru banyere Ken, Sọlọmọn, na ndị Izrel mgbe ha nọ n’Ugwu Saịnaị. Ha niile nwere ohere ‘ichegharị na ichigharị.’ (Ọrụ 3:19) O doro anya na mmadụ mee mmehie, Jehova anaghị ajụ ya ozugbo. Ọ gbaghaara Erọn ihe ahụ o mere. Taa, Jehova nwere ike iji ụmụnna anyị, ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, na akwụkwọ anyị dọọ anyị aka ná ntị. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Jehova gwara anyị, obi na-esi anyị ike na ọ ga-emere anyị ebere.

21. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebi ime mgbe ọnwụnwa ndị ga-eme ka a mata ma ànyị na-efe naanị Jehova bịaara anyị?

21 E nwere ihe mere Jehova ji emere anyị ebere. (2 Kọr. 6:1) Ọ na-enye anyị ohere ‘ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa.’ (Gụọ Taịtọs 2:11-14.) Ka anyị na-ebi “n’ime usoro ihe dị ugbu a,” ọnwụnwa ndị ga-eme ka a mata ma ànyị na-efe naanị Jehova ga-abịara anyị. Ka anyị kpebisie ike ịdịnyere Jehova n’ihi na ọ bụ ‘Jehova bụ́ Chineke anyị ka anyị ga-atụ egwu. Ọ bụ ya ka anyị ga-ejere ozi, n’ahụ́ ya ka anyị ga-araparakwa.’—Diut. 10:20.