Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi Mụtanụ Ihe n’Aka Timoti
N’AFỌ gara aga, a họpụtara ọtụtụ puku ụmụnna n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile ka ha bụrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Ọ bụrụ na i so na ha, o doro anya na obi na-atọ gị ụtọ maka ya.
Ma, ụjọ nwere ike ịna-atụ gị mgbe ụfọdụ. Otu nwa okorobịa bụ́ okenye aha ya bụ Jason sịrị: “Mgbe a họpụtara m ka m bụrụ okenye, ọ bịara dị m ka m gaghị arụli ọrụ ndị e nyere m.” Mgbe Jehova nyere Mozis na Jeremaya ọrụ ha ga-arụ, ha chere na ha agaghị arụli ya. (Ọpụ. 4:10; Jere. 1:6) Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ, olee ihe ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ịtụ ụjọ ma na-eme nke ọma n’ọrụ gị? Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka otu Onye Kraist aha ya bụ Timoti.—Ọrụ 16:1-3.
NA-EṄOMINỤ TIMOTI
O nwere ike ịbụ na Timoti eruchabeghị afọ iri abụọ ma ọ̀ bụ ya abụrụ na ọ ka dị ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ mgbe Pọl gwara ya ka o soro ya gawa ozi ala ọzọ. Ebe ọ bụ na Timoti ka bụ nwa okorobịa, o nwere ike ịbụ na obi akachaghị ya, o nwekwara ike ịbụ na o gbutụrụ oge ịrụ ọrụ ọhụrụ a e nyere ya. (1 Tim. 4:11, 12; 2 Tim. 1:1, 2, 7) Ma, mgbe afọ iri gachara, Pọl gwara ọgbakọ dị na Filipaị, sị: “Enwere m olileanya n’ime Onyenwe anyị Jizọs izitere unu Timoti n’oge na-adịghị anya . . . N’ihi na enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi o nwere.”—Fil. 2:19, 20.
Gịnị mere Timoti ji bụrụ okenye e ji ama atụ? Ka anyị tụlee ihe isii anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.
1. Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Pọl gwara ụmụnna nọ na Filipaị, sị: “Ihe banyere unu ga-emetụ [Timoti] n’obi n’ezie.” (Fil. 2:20) N’eziokwu, ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ Timoti n’obi. O lekwasịrị anya n’ihe ga-eme ka okwukwe ụmụnna ya sie ike, jirikwa obi ya niile jeere ha ozi.
Adịla ka ọkwọ ụgbọala na-ebu ndị njem, bụ́ onye ihe na-aka ya mkpa bụ iru ebe ọ na-aga n’oge, ma ò butere ndị mmadụ ma ọ bụ na o buteghị. Otu nwanna aha bụ William abụrụla okenye ihe karịrị afọ iri abụọ, ndị mmadụ na-akwanyekwara ya ùgwù. Ọ na-agwa ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi a họpụtara ọhụrụ, sị: “Hụnụ ụmụnna n’anya. Lekwasịnụ anya ná mkpa ha, ọ bụghị naanị n’ịhazi ihe n’ọgbakọ.”
2. O ji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Pọl kwuru ihe mere Timoti ji dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ sịrị: “N’ihi na ndị ọzọ niile na-achọ ọdịmma nke onwe ha, ọ bụghị nke Kraịst Jizọs.” (Fil. 2:21) Ebe Pọl nọ dee akwụkwọ ozi a bụ na Rom. Ọ chọpụtara na ihe ka ụmụnna ndị bi ebe ahụ mkpa bụ ihe gbasara onwe ha. Ha ejichaghị ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Ma, Timoti emeghị otú ahụ. Mgbe Pọl chọrọ ka o soro ya gaa kwusaa ozi ọma, ọ kpara àgwà ka Aịzaya, bụ́ onye sịrị: “Lee m! Ziga m.”—Aịza. 6:8.
Gịnị ka ị ga-eme ka ọrụ ị na-arụ ghara ịkpa ọrụ ị na-arụ n’ọgbakọ aka ọjọọ? Nke mbụ, depụta ihe ndị ị ga-eme ma buru ụzọ rụọ ndị ka mkpa. Pọl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10) Ka ihe ndị gbasara ofufe Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị. Nke abụọ, hapụtụ ihe ụfọdụ ị na-eme. Etinyela ike gị na oge gị n’ihe ndị na-abaghị uru. Pọl gwara Timoti, sị: “Gbaara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ, kama chụsoo ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo.”—2 Tim. 2:22.
3. Ọ gbasiri mbọ ike n’ozi ndị ọ na-ejere Chineke. Pọl gwara ndị Filipaị, sị: “Unu maara ihe àmà [Timoti] nyere banyere onwe ya, na dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Fil. 2:22) Timoti adịghị umengwụ. Ọ gbasiri mbọ ike mgbe ya na Pọl na-eje ozi, nke ahụ mekwara ka ha abụọ hụkwuo ibe ha n’anya.
Ọrụ juru eju bara abara taa ná nzukọ Jehova. Ọrụ ndị ahụ na-eme obi ụtọ. Ha na-emekwa ka gị na ụmụnna gị dịkwuo ná mma. Gbalịsie ike ka i nwee ‘ọtụtụ ihe ị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58.
4. O mere ihe ndị ọ mụtara. Pọl gwara Timoti, sị: “Ị gbasochiwo ozizi m anya, ya na ụzọ ndụ m, nzube m, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m.” (2 Tim. 3:10) Ọ bụ maka na Timoti mere ihe ndị ọ mụtara mere ka e nyekwuo ya ọrụ ndị ọzọ n’ọgbakọ.—1 Kọr. 4:17.
Ì nwere nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ na-enyere gị aka? Ọ bụrụ na i nweghị, gbalịa ka i nweta. Nwanna Tom, bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Okenye ma nke a na-akọ bịara nwee mmasị n’ebe m nọ, ma kụziere m ihe nke ọma. M na-agakwuru ya ka ọ gwa m ihe ndị m ga-eme, na-emekwa ihe ndị ọ gwara m. Ihe a mere ka obi sikwuo m ike.”
5. Ọ nọgidere na-azụ onwe ya. Pọl gwara Timoti, sị: “Na-azụ onwe gị ka i wee bụrụ onye na-asọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 4:7) Onye na-asọ mpi egwuregwu nwere ike inwe onye na-enye ya ọzụzụ, ma, ọ ka kwesịrị ịna-enye onwe ya ọzụzụ. Pọl gbara Timoti ume, sị: “Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. . . . Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.”—1 Tim. 4:13-15.
Gịnwa kwesịkwara ịna-eme ka otú i si ezi ihe na-akakwu mma. Na-amụchi ihe anya ka i nwee ike ịna-aghọta mgbanwe ọhụrụ ọ bụla nzukọ Jehova mere. Echela na ị marachaala ihe niile, ikekwe, na-eche na ị ma ihe ị ga-eme n’ihe ọ bụla merenụ n’emereghị ya nchọnchọ. Dị ka Timoti mere, “na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.”—1 Tim. 4:16.
6. O kwere ka mmụọ nsọ Jehova duzie ya. Pọl gwara Timoti gbasara ozi ọ na-eje, sị: “Na-eche ezi ihe a nke e nyefere n’aka gị nche site na mmụọ nsọ nke dị n’ime anyị.” (2 Tim. 1:14) Ihe ga-eme ka Timoti chee ozi ya nche bụ ikwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi ya.
Otu okenye jerela ozi ọtụtụ afọ aha ya bụ Donald kwuru, sị: “Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị iji adịm ná mma ha na Chineke kpọrọ ihe. Ndị mere otú ahụ ga ‘na-enwewanye ike.’ Ọ bụrụ na ha arịọ Chineke ka o nye ha mmụọ ya ma na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ha ga-abara ọgbakọ uru.”—Ọma 84:7; 1 Pita 4:11.
JIRI IHE ÙGWÙ E NYERE GỊ KPỌRỌ IHE
Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi a họpụtara ọhụrụ ka gịnwa, na-eme nke ọma n’ozi ha na-ejere Jehova. Jason anyị kwuru gbasara ya ná mmalite sịrị: “Kemgbe m bụ okenye, amụtala m ọtụtụ ihe, obi esikwuokwala m ike. Ugbu a, ọrụ ndị m na-arụ n’ọgbakọ na-atọ m ezigbo ụtọ, ọ bụ ihe magburu onwe ya Jehova meere m.”
Ị̀ ga-achọ ịna-emekwu nke ọma n’ozi ị na-ejere Jehova? Gbaa mbọ mụta ihe n’aka Timoti. Ị ga-ahụ na ị ga-abara ụmụnna gị ezigbo uru.