ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16
Nọgide Na-eji Ihe Mgbapụta Ahụ Akpọrọ Ihe
‘Nwa nke mmadụ bịara ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’—MAK 10:45.
ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1-2. Gịnị bụ ihe mgbapụta, gịnịkwa mere o ji dị anyị mkpa?
MGBE Adam bụ́ nwoke zuru okè mehiere, ọ tụfuru ohere ya na ụmụ ọ ga-amụta n’ọdịnihu nwere ịdị ndụ ebighị ebi. E nweghị ihe Adam ga-eji gọrọ isi ya n’ihe o mere. Ọ kpachaara anya mehie. Oleekwanụ maka ụmụ ya? O nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ọ bụghị ha mere ka Adam mehie. (Rom 5:12, 14) Ò nwere ihe e nwere ike ime iji napụta ha n’ikpe ọnwụ a mara nna ha nke bụ́kwanụ ihe kwesịịrị ya? Ee. Obere oge Adam mehiechara, Jehova ji nwayọọ nwayọọ kpughee otú ọ ga-esi napụta ọtụtụ nde ụmụ Adam n’aka mmehie na ọnwụ. (Jen. 3:15) Mgbe oge ruru, Jehova ga-ezite Ọkpara ya ka o nye “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Mak 10:45; Jọn 6:51.
2 Gịnị bụ ihe mgbapụta? N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ihe mgbapụta pụtara ụgwọ Jizọs kwụrụ iji zụtaghachi ihe Adam tụfuru. (1 Kọr. 15:22) Gịnị mere ihe mgbapụta ji dị anyị mkpa? Ọ bụ n’ihi na dị ka e kwuru n’Iwu Mozis, Jehova bụ́ Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi chọrọ ka e jiri ndụ kwụọ ụgwọ ndụ. (Ọpụ. 21:23, 24) Adam tụfuru ndụ ya zuru okè. Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ àjà iji kwụọ ụgwọ ndụ ahụ zuru okè Adam tụfuru. (Rom 5:17) O si otú ahụ ghọọ “Nna Mgbe Ebighị Ebi” nke ndị niile nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ.—Aịza. 9:6; Rom 3:23, 24.
3. Dị ka e kwuru na Jọn 14:31 na 15:13, gịnị mere Jizọs ji dị njikere iji ndụ ya zuru okè chụọ àjà?
3 Jizọs dị njikere iji ndụ ya chụọ àjà n’ihi na ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe na anyịnwa n’anya nke ukwuu. (Gụọ Jọn 14:31; 15:13.) Ịhụnanya ahụ mere ka Jizọs rubere Jehova isi ruo ọgwụgwụ, nyekwara ya aka ime uche Nna ya. Ihe a o mere ga-eme ka ihe Jehova bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ mezuo. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe mere Jehova ji kwe ka Jizọs taa ezigbo ahụhụ tupu ya anwụọ. Anyị ga-atụlekwa gbasara otu onye so dee Baịbụl ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ nakwa otú anyị ga-esi jiri ihe mgbapụta ahụ Jehova na Jizọs nyere anyị kpọrọkwuo ihe.
GỊNỊ MERE JEHOVA JI KWE KA JIZỌS TAA AHỤHỤ?
4. Kọwaa otú Jizọs si nwụọ.
4 Chegodị ihe mere Jizọs n’ụbọchị ikpeazụ o biri ndụ n’ụwa. N’agbanyeghị na o nwere ike ịkpọ ìgwè ndị mmụọ ozi ka ha bịa chebe ya, o kwere ka ndị agha Rom jide ya, kụọkwa ya isi aba okpu. (Mat. 26:52-54; Jọn 18:3; 19:1) Ha ji ụtarị merụọ ya ezigbo ahụ́. Ha mechakwara bo ya otu osisi dị ezigbo arọ n’azụ ya ahụ na-agba ọbara. Jizọs buuru osisi ahụ gawa ebe a ga-eji ya kpọgbuo ya. Ma o teghị aka, ndị agha ahụ amanye otu nwoke ka o buru osisi ahụ. (Mat. 27:32) Mgbe Jizọs rutere n’ebe a ga-egbu ya, ndị agha ahụ ji ntu kpọgide aka ya na ụkwụ ya n’osisi ahụ. Otú ahụ́ ya si nyịgide n’ebe ahụ a kpọgidere ya mere ka ntu ahụ merụkwuo ya ahụ́. Ndị enyi ya nọ na-eru uju, mama ya ana-ebe ákwá. Ma, ndị ndú ndị Juu nọ na-akwa ya emo. (Luk 23:32-38; Jọn 19:25) Jizọs tara ahụhụ ruo ọtụtụ awa. Otú ahụ o si nọrọ mere ka o siere ya ike iku ume. Jizọs ma na ya anọgidela na-erubere Chineke isi. O kpere ekpere ikpeazụ tupu ya ekubie ume. O hulataziri isi ya kubie ume. (Mak 15:37; Luk 23:46; Jọn 10:17, 18; 19:30) N’eziokwu, Jizọs ji nwayọọ nwayọọ tara ahụhụ nwụọ ọnwụ ihere.
5. Gịnị wutere Jizọs karịa otú e si gbuo ya?
5 Ihe kacha wute Jizọs abụghị otú e si gbuo ya, kama, ọ bụ ebubo e ji maka ya gbuo ya. E boro ya ebubo na ọ na-ekwulu Chineke, ya bụ, na o nweghị nsọpụrụ ọ bụla maka Chineke ma ọ bụ aha ya. (Mat. 26:64-66) Iche ihe a n’echiche wutere Jizọs nke ukwuu nke na ọ chọrọ ka Nna ya mee ka ọ ghara ịnwụ ụdị ọnwụ ihere a. (Mat. 26:38, 39, 42) Gịnị mere Jehova ji kwe ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya taa ahụhụ ma nwụọ? Ka anyị tụlee ihe atọ kpatara ya.
6. Gịnị mere e ji kpọgide Jizọs n’osisi ịta ahụhụ?
6 Nke mbụ, a kpọgidere Jizọs n’elu osisi ka e nwee ike ịnapụta ndị Juu n’otu ọnụ a bụrụ ha. (Gal. 3:10, 13) Ha kwere Chineke nkwa idebe iwu ya, mana ha emeghị ya. Ihe a meziri ka Chineke bụọ ha ọnụ n’elu mmehie ha ketara n’aka Adam. (Rom 5:12) Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie kwesịrị ọnwụ, a ga-egbu ya. E mechaa, e nweziri ike ịkpọgide ya n’elu osisi. * (Diut. 21:22, 23; 27:26) N’elu osisi a kpọgidere Jizọs mere ka o buru ọnụ ahụ a bụrụ ndị Juu ka e nwee ike ịnapụta ha n’ọnụ ahụ a bụrụ ha. Ihe ahụ meziri ka ọnwụ ya baara ha uru n’agbanyeghị ha na anabataghị ya.
7. Olee ihe nke abụọ mere Chineke ji kwe ka Ọkpara ya taa ahụhụ?
7 Ihe nke abụọ mere Chineke ji kwe ka Ọkpara ya taa ahụhụ bụ na o ji ya zụọ ya maka ọrụ ọ ga-arụ n’ọdịnihu, ya bụ, ịbụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị. Jizọs hụrụ otú o si esiri mmadụ ike irubere Chineke isi mgbe ọnwụnwa tara akpụ bịaara ya. Hib. 2:17, 18; 4:14-16; 5:7-10.
Otú o si siere ya ike mere ka o jiri “ibesi ákwá ike na anya mmiri” kpee ekpere ka Chineke nyere ya aka. O doro anya na ahụhụ ndị a Jizọs tara mere ka ọ ghọta mkpa anyị, nweekwa ike “ịgbatara [anyị] ọsọ enyemaka” mgbe ‘a na-ele anyị ule.’ Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova họpụtaara anyị Nnukwu Onye Nchụàjà na-eme ebere onye nwere ike “imere anyị ebere n’adịghị ike anyị.”—8. Olee ihe nke atọ mere Chineke ji kwe ka Jizọs taa ezigbo ahụhụ?
8 Ihe nke atọ mere Jehova ji kwe ka Jizọs taa ezigbo ahụhụ bụ iji zaa otu ajụjụ dị mkpa bụ́: Ụmụ mmadụ hà ga-anọgide na-erubere Chineke isi ma mgbe ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ha? Setan sịrị na e nweghị. O kwuru na ụmụ mmadụ na-efe Chineke naanị n’ihi ihe ndị ọ na-enye ha. O kwukwara na ụmụ mmadụ ahụghị Jehova n’anya otú ahụ Adam na-ahụghị ya. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Obi siri Jehova ike na Ọkpara ya ga-erubere ya isi. Ọ bụ ya mere o ji kwe ka a nwaa ya ọnwụnwa kachanụ e nwere ike ịnwa mmadụ. Jizọs rubeere Chineke isi ma gosi na Setan bụ onye ụgha.
JỌN ONYEOZI JI IHE MGBAPỤTA AHỤ KPỌRỌ EZIGBO IHE
9. Olee ihe Jọn onyeozi mere anyịnwa kwesịrị ime?
9 Okwukwe ọtụtụ Ndị Kraịst esikwuola ike n’ihi ihe ha mụtara gbasara ihe mgbapụta ahụ. Ha anọgidela na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide, diekwa ụdị mkpagbu dị iche iche ná ndụ ha niile. Ka anyị leba anya n’akụkọ Jọn onyeozi. O kwusara eziokwu gbasara Jizọs na ihe mgbapụta ahụ ruo ihe nwere ike ịkarị afọ iri isii. Mgbe ọ fọrọ obere ka ọ gbaa otu narị afọ, ọ ga-abụ na ndị Rom chere na ọ na-agba ọchịchị ha mgba okpuru, ha atụọ ya mkpọrọ n’Agwaetiti Patmọs. N’ihi gịnị? “N’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.” (Mkpu. 1:9) Jọn bụ onye e ji ama atụ n’inwe ezigbo okwukwe na ịtachi obi.
10. Olee otú ihe ndị Jọn dere si gosi na o ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe?
10 N’akwụkwọ ozi ndị Jọn dere, o dere otú o si hụ Jizọs n’anya nke ukwuu nakwa otú o si jiri ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe. Ihe ndị o kwuru gbasara ihe mgbapụta ahụ ma ọ bụkwanụ uru ndị anyị na-erite na ya karịrị otu narị. Dị ka ihe atụ, Jọn dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye ezi omume.” (1 Jọn 2:1, 2) Jọn kwusikwara okwu ike gbasara “ịgba àmà banyere Jizọs” n’ihe ndị o dere. (Mkpu. 19:10) O doro anya na Jọn ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị jikwa ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe?
OLEE OTÚ Ị GA-ESI GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ MAKA IHE MGBAPỤTA AHỤ?
11. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịgbara ọnwụnwa ọsọ?
11 Gbaara mmehie ọsọ. Ọ bụrụ na anyị ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe n’eziokwu, anyị agaghị na-eche, sị: ‘Ọ baghị uru ka m gbalịsie ike ka m ghara ime ihe ọjọọ ma ọnwụnwa bịara m. M nwere ike ime ihe ọjọọ ahụ, e mechaa mụ arịọ Chineke ka ọ gbaghara m.’ Kama, ọ bụrụ na a nwaa anyị ka anyị mee ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ịsị: ‘Mba. Olee otú m ga-esi eme ihe a n’agbanyeghị ihe niile Jehova na Jizọs meere m?’ Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nye anyị ike. Anyị nwere ike ịrịọ ya, sị: ‘Ekwela ka m daba n’ọnwụnwa.’—Mat. 6:13.
12. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru na 1 Jọn 3:16-18?
1 Jọn 3:16-18.) Otú anyị si emeso ụmụnna anyị ihe na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya. (Efe. 4:29, 31–5:2) Dị ka ihe atụ, anyị na-enyere ha aka ma ha rịawa ọrịa ma ọ bụkwanụ ma ha na-edi ọnwụnwa bịaara ha, dị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ma, oleekwanụ ihe anyị kwesịrị ime ma nwanna anyị mee ma ọ bụ kwuo ihe were anyị iwe?
12 Hụ ụmụnna gị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ahụ ụmụnna anyị n’anya, o gosiri na anyị ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs nwụrụ maka anyị na ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na ọ dị njikere ịnwụ maka ha, ọ pụtara na ha bara ezigbo uru n’anya ya. (Gụọ13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agbaghara ụmụnna anyị?
13 È nwere mgbe ọ na-esiri gị ike ịgbaghara nwanna gị? (Lev. 19:18) Ọ bụrụ otú ahụ, mee ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Kọl. 3:13) Mgbe ọ bụla anyị gbaghaara nwanna anyị, anyị na-egosi Nna anyị nke eluigwe na anyị ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe. Olee otú anyị ga-esi jiri onyinye a Chineke nyere anyị kpọrọkwuo ihe?
OLEE OTÚ Ị GA-ESI JIRI IHE MGBAPỤTA AHỤ KPỌRỌKWUO IHE?
14. Olee otu ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike jiri ihe mgbapụta ahụ kpọrọkwuo ihe?
14 Na-ekele Jehova maka ihe mgbapụta ahụ. E nwere otu nwanna nwaanyị bi n’India aha ya bụ Joanna. Ọ dị afọ iri asatọ na atọ. Ọ sịrị: “Echere m na ọ dị ezigbo mkpa icheta ihe mgbapụta ahụ n’ekpere m kwa ụbọchị ma kelee Jehova maka ya.” I kpewe ekpere, gwa Jehova ihe ndị i mejọrọ n’ụbọchị ahụ ma rịọ ya mgbaghara maka ha. Ma, ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, i kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere gị aka. Ha ga-ege gị ntị ma jiri Okwu Chineke nye gị ndụmọdụ. Ha ga-ekpere gị ekpere rịọ Jehova ka ọ nọgide na-eji ihe mgbapụta ahụ na-eme ka gị na ya dịrị ná mma.—Jems 5:14-16.
15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji wepụta oge na-agụ gbasara ihe mgbapụta ahụ ma na-echebara ya echiche?
15 Chebara ihe mgbapụta ahụ echiche. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rajamani
dị afọ iri asaa na atọ sịrị: “Mgbe ọ bụla m na-agụ otú Jizọs si taa ahụhụ, anya mmiri na-eju m anya.” O nwekwara ike ịna-ewute gị mgbe ọ bụla ị na-eche otú Ọkpara Chineke si taa ahụhụ. Ma, ọ bụrụ na ị na-echebakwuru àjà Jizọs chụrụ echiche, ọ ga-eme ka ị hụkwuo ya na Nna ya n’anya. Mụọ gbasara isiokwu a ka o nyere gị aka ichebara ihe mgbapụta ahụ echiche.16. Olee otú ịkụziri ndị ọzọ gbasara ihe mgbapụta ahụ ga-esi baara anyị uru? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
16 Na-akụziri ndị ọzọ gbasara ihe mgbapụta ahụ. Mgbe ọ bụla anyị na-akụziri ndị ọzọ gbasara ihe mgbapụta ahụ, anyị na-eji ya akpọrọkwu ihe. E nwere ụfọdụ ihe magburu onwe ha anyị ga-eji enyere ndị ọzọ aka ịghọta ihe mere Jizọs ji nwụọ maka anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iji isi nke anọ nke broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! kụziere ha ya. Isiokwu ya bụ “Ònye Bụ Jizọs Kraịst?” Anyị nwekwara ike iji isi nke ise nke akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Isiokwu ya bụ “Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị.” N’afọ ọ bụla, anyị na-eji ihe mgbapụta ahụ akpọrọkwu ihe ma anyị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa ma anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi kpọọ ndị ọzọ ka ha soro anyị cheta ya. Ọ bụ ezigbo ihe ọma ka Jehova meere anyị kwe ka anyị na-akụziri ndị mmadụ gbasara Ọkpara ya.
17. Gịnị mere ihe mgbapụta ahụ ji bụrụ onyinye kachanụ Chineke nyere ụmụ mmadụ?
17 O doro anya na e nwere ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji nọgide na-eji ihe mgbapụta ahụ akpọrọkwu ihe. Ihe mgbapụta ahụ mere ka anyị na Chineke nwee ike ịbụ enyi n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. Ọ bụkwa ihe mgbapụta ahụ mere a ga-eji bibie ọrụ Ekwensu niile kpamkpam. (1 Jọn 3:8) Ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka ihe Jehova bu n’obi kee ụwa a mezuo. Ụwa niile ga-aghọ paradaịs. Onye ọ bụla ị ga-ahụ n’oge ahụ ga-abụ onye hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Ka anyị niile na-achọ ụzọ anyị ga-esi na-egosi na anyị ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe kwa ụbọchị n’ihi na ọ bụ onyinye kachanụ Chineke nyere anyị.
ABỤ NKE 20 I Nyere Anyị Ọkpara Ị Hụrụ n’Anya
^ par. 5 Gịnị mere e ji taa Jizọs ahụhụ ma gbuo ya? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a. Isiokwu a ga-enyekwara anyị aka iji ihe mgbapụta ahụ kpọrọkwuo ihe.
^ par. 6 Ọ bụ omenala ndị Rom ịkpọgide onye ha mara ikpe ọnwụ n’osisi ma ọ bụkwanụ kegide ya n’osisi mgbe ọ dị ndụ. Jehova kwekwara ka e si otú a gbuo Ọkpara ya.
^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nke ọ bụla na-agbara ọnwụnwa ọsọ, ọnwụnwa ndị dị ka ile ihe ndị na-adịghị mma, ịṅụ sịga, ma ọ bụ ịnara aka azụ.