Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe Ya
‘Unu ga-ahụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume.’—MAL. 3:18.
1, 2. Olee ihe nwere ike ịkpa ndị na-efe Chineke aka ọjọọ taa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
ỌTỤTỤ ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-elekọta ndị na-arịa ọrịa na-efe efe. Ha na-elekọta ndị a n’ihi na ha chọrọ inyere ha aka. Ma ha kwesịkwara ichebe onwe ha ka ha ghara ibute ọrịa ha na-achọ ịgwọ. Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova nọkwa n’ụdị ọnọdụ a. Ọtụtụ n’ime anyị na ndị na-akpa àgwà ọjọọ bi, ma na-arụkọ ọrụ. Iso ndị dị otú a emekọ ihe nwere ike ịkpa anyị aka ọjọọ.
2 N’oge Ikpeazụ a, ọtụtụ ndị na-ahụghị Chineke n’anya ejighị iwu ya kpọrọ ihe. N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti, ọ kọwara àgwà ndị e ji mara ndị na-anaghị efe Chineke. O kwukwara na àgwà ndị a ga na-akakwu njọ n’oge ikpeazụ. (Gụọ 2 Timoti 3:1-5, 13.) Ọ bụ eziokwu na àgwà ndị a nwere ike ịna-awụ anyị akpata oyi n’ahụ́, anyị nwekwara ike ịkpawa ha. (Ilu 13:20) N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú àgwà e ji mara ndị na-anaghị efe Chineke n’oge ikpeazụ a si dị iche n’àgwà ndị na-efe Chineke. Anyị ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi chebe onwe anyị ka anyị ghara ịkpawa àgwà ndị ahụ ka anyị na-agbalị inyere ndị ọzọ aka ịmata Jehova.
3. Olee ndị na-akpa àgwà ndị e kwuru banyere ha na 2 Timoti 3:2-5?
Ndị Rom 1:29-31. Ma àgwà ụfọdụ Pọl kwuru na ndị mmadụ ga na-akpa n’akwụkwọ ozi o degaara Timoti adịghị ebe ọ bụla ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Pọl si otú a bido ikwu banyere àgwà ndị ahụ: “N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ” Ma, ọ bụghị mmadụ niile na-akpa àgwà ndị ahụ. Ndị Kraịst anaghị akpa ha.—Gụọ Malakaị 3:18.
3 Pọl onyeozi kwuru na “n’oge ikpeazụ,” a ga-enwe “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” O kwuziri àgwà ọjọọ iri na itoolu ndị mmadụ ga na-akpa n’oge ikpeazụ a. Ihe ndị o kwuru ebe ahụ yiri ihe ndị e kwukwara náOTÚ ANYỊ SI ELE ONWE ANYỊ ANYA
4. Olee otú ị ga-esi akọwa ndị nganga fụliri elu?
4 Mgbe Pọl kwuchara na ọtụtụ ndị ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya na ndị hụrụ ego n’anya, o kwukwara na ha ga-abụ ndị na-anya isi, ndị mpako na ndị nganga fụliri elu. Ndị na-akpa àgwà ndị a na-echekarị na ha ka ndị ọzọ n’ihi otú ha dị n’anya, ihe ndị ha nwere ike ime, ihe ndị ha nwere ma ọ bụkwanụ ọkwá ha nọ na ya. Ha na-achọkarịkwa ka ndị ọzọ na-eto ha ma ọ bụ na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Otu onye ọkà mmụta kwuru na mpako bụ otu ụzọ mmadụ si efe onwe ya kama ife Chineke. Ụfọdụ ekwuola na mpako bụ àgwà jọgburu onwe ya n’ihi na ndị dị mpako anaghị achọ iji anya ahụ ndị ọzọ dị mpako.
5. Olee otú ụfọdụ ndị fere Chineke n’oge ochie si dịrị mpako?
5 Jehova kpọrọ mpako asị. Ọ kpọkwara “anya dị elu” asị. (Ilu 6:16, 17) Mpako na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. (Ọma 10:4) Ọ bụ àgwà e ji mara Ekwensu. (1 Timoti 3:6) Ma ọ dị mwute na ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie ghọrọ ndị mpako. Dị ka ihe atụ, Ọzaya bụ́ eze Juda, jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Ma Baịbụl kwuru, sị: “Otú ọ dị, ozugbo o siri ike, obi ya wee dị mpako nke na ọ kpataara onwe ya mbibi, o wee meso Jehova bụ́ Chineke ya omume ekwesịghị ntụkwasị obi wee bata n’ụlọ nsọ Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” Eze Hezekaya mechakwara dịrị mpako, ruo oge ụfọdụ.—2 Ihe 26:16; 32:25, 26.
6. Olee ihe ụfọdụ Devid nwere nke nwere ike ime ka ọ dị mpako? Gịnị mere na ọ dịghị mpako?
6 Ụfọdụ ndị na-adị mpako n’ihi na ha mara mma, bụrụ ndị a ma ama, mara otú e si akụ egwú ma ọ bụ agụ egwú, sie ike ma ọ bụkwanụ nọrọ n’ọkwá dị elu. Devid nwechara ihe niile a ma o nweghị mgbe ọ dịrị mpako ná ndụ ya niile. Mgbe o gbuchara Golayat, Eze Sọl a gwa ya ka ọ lụwa nwa ya nwaanyị, Devid kwuru, sị: “Ònye ka m bụ, ònyekwa ka ndị ikwu m na ezinụlọ nna m, bụ n’Izrel, nke na m ga-abụ ọgọ eze?” (1 Sam. 18:18) Gịnị nyeere Devid aka ịdị umeala n’obi? Devid ma na àgwà ọma o nwere, ike ya na ọkwá ọ nọ na ya bụ n’ihi na Chineke ‘weturu onwe ya ala,’ ka ya na ya mekọọ ihe. (Ọma 113:5-8) Devid ma na ọ bụ Jehova nyere ya ihe ọma ọ bụla o nwere.—Tụlee 1 Ndị Kọrịnt 4:7.
7. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-adị umeala n’obi?
7 Ndị na-efe Jehova taa na-agbalị ka ha dịrị umeala n’obi ka Devid. Ọ na-emetụ anyị n’ahụ́ ịmara na Jehova, bụ́ Onye kacha elu n’eluigwe na ụwa, dị umeala n’obi. (Ọma 18:35) Anyị na-agbalị ime ihe a Baịbụl kwuru: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe.” (Kọl. 3:12) Anyị makwa na ịhụnanya ‘adịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu.’ (1 Kọr. 13:4) Ndị ọzọ hụ na anyị dị umeala n’obi, o nwere ike ime ka ha chọọ iso anyị fewe Jehova. Otú ahụ àgwà ọma ndị bụ́ nwunye nwere ike ime ka ndị di ha bịa fewe Chineke, ka ịdị umeala n’obi anyị nwere ike ịdọta ndị ọzọ ifewe Jehova.—1 Pita 3:1.
OTÚ ANYỊ SI EMESO NDỊ ỌZỌ
8. (a) Olee otú ụfọdụ ndị taa si ele mmadụ inupụrụ ndị mụrụ ya isi, anya? (b) Olee ihe Akwụkwọ Nsọ gwara ụmụaka ka ha na-eme?
8 Pọl kwuru otú ndị mmadụ ga-esi na-emeso ibe ha ihe n’oge ikpeazụ a. O kwuru na ụmụaka ga-abụ ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ọtụtụ akwụkwọ, fim na ihe omume tiivi ụfọdụ na-eme ka o yie ka ọ̀ dị mma ụmụaka inupụrụ ndị mụrụ ha isi, nke bụ́ eziokwu bụ na nnupụisi na-eme ka ezinụlọ ghara ịdị n’otu. Nke a na-akpakwa obodo aka ọjọọ. Kemgbe ụwa, ndị mmadụ ma na ihe a bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, na Gris oge ochie, mmadụ kụọ ndị mụrụ ya ihe, a ga-anapụ ya ihe niile ruuru ya dị ka nwa amaala. N’iwu ndị Rom, a na-ewere onye kụrụ nna ya ihe ka onye gburu ọchụ. Ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a gwara ụmụaka ka ha na-asọpụrụ ndị mụrụ ha.—Ọpụ. 20:12; Efe. 6:1-3.
9. Gịnị ga-enyere ụmụaka aka ịna-erubere ndị mụrụ ha isi?
9 Olee ihe ga-enyere ụmụaka aka ịna-erubere ndị mụrụ ha isi ọ bụrụgodị na ndị ọzọ anaghị eme otú ahụ? Ọ bụrụ na ha ana-echebara ihe ọma ndị mụrụ ha meere ha echiche, obi kwesịrị ịdị ha ụtọ, ya emee ka ha na-erubere ha isi. Ụmụaka kwesịkwara ịghọta na Chineke, bụ́ Nna anyị, chọrọ ka ha na-erubere ndị mụrụ ha isi. Ọ bụrụ na ụmụaka ana-ekwu okwu ọma banyere nne na nna ha, ụmụaka ibe ha ga-amụtakwa ịsọpụrụ ndị nne na nna nke ha. Ma ọ bụrụ na ndị nne na nna enweghị obi mmadụ ma ọ bụ ghara ịna-egosi ụmụ ha na ha hụrụ ha n’anya, ọ ga-esiri ụmụ ha ike iji obi ha niile na-asọpụrụ ha. Ma nwatakịrị chọpụtakwanụ na ndị mụrụ ya hụrụ ya n’anya n’eziokwu, ọ ga-eme ka ọ na-asọpụrụ ha ma mgbe ọ na-adịghịrị ya mfe ime otú ahụ. Otu nwata aha ya bụ Austin kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na m na-achọkarị ime ihe papa m gwara m emela, ma, papa m na mama m na-agwa m ihe dị mma m kwesịrị ịna-eme, na-agwakwa m ihe mere m ji kwesị ime ya. Ha na-emekwa ka ọ dịrị m mfe mụ na ha ịna-ekwurịta okwu. Ihe a nyeere m aka ịna-erubere ha isi. M chọpụtara na ha hụrụ m n’anya, ya emeekwa ka m na-erubere ha isi.”
10, 11. (a) Olee àgwà ọjọọ ndị mmadụ ga na-akpa nke na-egosi na ha ahụghị ibe ha n’anya? (b) Olee otú Ndị Kraịst hụruru ndị ọzọ n’anya?
10 Pọl kwukwara àgwà ọjọọ ndị ọzọ na-egosi na ndị mmadụ ahụghị ibe ha n’anya. Mgbe o kwuchara na a ga-enwe “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,” o kwuru banyere ndị na-enweghị ekele. Otú a o si kwuo ya dabara adaba n’ihi na ndị na-enweghị ekele anaghị eji ihe ọma mmadụ meere ha akpọrọ ihe. O kwukwara na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe. Ha ga-abụkwa ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ya bụ na ha agaghị achọ ime ihe ga-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ndị mmadụ ga-abụkwa ndị nkwulu na ndị na-arara mmadụ nye. Ọ pụtara na ha ga na-ekwu okwu ọjọọ gbasara mmadụ ibe ha nakwa Chineke. Ihe ọzọ o kwukwara bụ na a ga-enwe ndị nkwutọ, ya bụ ndị ga na-ekwu okwu ụgha iji mebie aha ndị ọzọ. *
Mat. 22:38, 39) Jizọs kwukwara na ihe a ga-eji ama ezigbo Ndị Kraịst bụ na ha ga na-ahụ ibe ha n’anya. (Gụọ Jọn 13:34, 35.) Ezigbo Ndị Kraịst ga na-ahụdị ndị iro ha n’anya.—Mat. 5:43, 44.
11 Ndị na-efe Jehova dị nnọọ iche n’ebe ndị ọzọ nọ n’ihi na ha hụrụ mmadụ ibe ha n’anya n’eziokwu. Otú a ka ọ dị kemgbe ụwa. Jizọs kwuru na naanị iwu karịrị mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya n’Iwu Mozis bụ mmadụ ịhụ Chineke n’anya. (12. Olee otú Jizọs si gosi ndị ọzọ na ọ hụrụ ha n’anya?
12 Jizọs hụrụ ndị ọzọ n’anya nke ukwuu. Ọ gara obodo dị iche iche na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. O mepere anya ndị ìsì, mee ka ndị ngwọrọ gaa ije, gwọọ ndị ekpenta ma mee ka ndị ogbi kwuwa okwu. Ọ kpọlitekwara ndị nwụrụ anwụ. (Luk 7:22) Jizọs nwụdịrị maka ụmụ mmadụ n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị kpọrọ ya asị. Otú a Jizọs si hụ ndị mmadụ n’anya gosiri otú Nna ya si hụ anyị n’anya. N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-eṅomi Jizọs ma na-egosi ndị ọzọ na ha hụrụ ha n’anya.
13. Olee otú anyị igosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya ga-esi eme ka ha chọọ ife Jehova?
13 Ọ bụrụ na anyị egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, o nwere ike ime ka ha chọọ ịmata Nna anyị nke eluigwe. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke onye Taịland gara mgbakọ ukwu anyị, obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ hụrụ otú ụmụnna anyị si hụ ibe ha n’anya. Mgbe ọ lara n’ụlọ ya, ọ gwara ụmụnna ka ha mụwara ya Baịbụl ugboro abụọ n’izu. Ọ malitere izi ndị ikwu ya ozi ọma. Mgbe ọnwa isii gachara, ọ gụrụ ọgụgụ Baịbụl mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịma ma ànyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-agbalị inyere ndị ezinụlọ m, ndị ọgbakọ anyị na ndị m na-ezi ozi ọma aka? M̀ na-agbalị ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha anya?’
ANỤ ỌHỊA WOLF NA NWA ATỤRỤ
14, 15. Olee àgwà anụ ọhịa ọtụtụ ndị na-akpa? Olee otú ụfọdụ sirila gbanwee àgwà ha?
14 E nwekwara àgwà ndị ọzọ ndị bi n’oge ikpeazụ a na-akpa anyị kwesịrị izere. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị ga-abụ
ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya. Ha kpọrọ ihe ọma asị, na-emesikwa ndị na-eme ihe ọma ike. Ụdị ndị a anaghị ejide onwe ha, ha na-emekwa ihe ike. Ụfọdụ n’ime ha bụkwa ndị isi ike. Ha anaghị eche echiche eme ihe, ha achọghịkwa ịma otú ihe ha na-eme si emetụta ndị ọzọ.15 Ọtụtụ ndị na-akpabu àgwà ka anụ ọhịa agbanweela ghọọ ezigbo mmadụ. E buru mgbanwe a n’amụma n’ime Baịbụl. (Gụọ Aịzaya 11:6, 7.) Baịbụl kwuru na anụ ọhịa ndị dị ka anụ ọhịa wolf na ọdụm na anụ ụlọ ndị dị ka nwa atụrụ na nwa ehi ga-adị n’udo. Ihe mere ihe a ga-eji ekwe omume bụ “n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịza. 11:9) Ma ebe ọ bụ na ụmụ anụmanụ anaghị amụ gbasara Jehova, ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu ga-agbanwe àgwà ha.
16. Olee otú Baịbụl sirila nyere ụfọdụ ndị aka ịgbanwe àgwà ha?
16 E nwere ọtụtụ ụmụnna anyị na-emebu ihe ike ka anụ ọhịa wolf, ma ugbu a ha na ndị ọzọ na-adị n’udo. I nwere ike ịgụ gbasara ha n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agba na jw.org. Ndị matara Jehova ma na-efe ya abụghị ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya. Ụdị ndị ahụ na-eme ka hà na-efe Chineke, ma otú ha si akpa àgwà na-egosi na ha anaghị efe ya. Ma ọtụtụ n’ime ndị na-efe Chineke na-emebu ihe ike, ma ugbu a, ha ‘eyirila mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’ (Efe. 4:23, 24) Mgbe ndị mmadụ matara Jehova, ha na-aghọta na ha kwesịrị ime ihe o kwuru. Nke a na-enyere ha aka ịgbanwe ihe ndị ha kweere, otú ha si eche echiche, nakwa otú ha si akpa àgwà. Ma, ọ dịghị mfe ime mgbanwe ndị a, ma mmụọ Chineke ga-enyere ndị chọrọ iji obi ha niile na-efe ya, aka.
“ZERE NDỊ DỊ OTÚ A”
17. Olee otú anyị ga-esi ezere ịkpa àgwà ndị na-anaghị efe Chineke na-akpa?
17 Ihe dị iche ná ndị na-efe Chineke na ndị na-anaghị efe ya na-edokwu ndị mmadụ anya taa. Anyịnwa bụ́ ndị na-efe Chineke kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkpawa àgwà ọjọọ ndị na-anaghị efe Chineke na-akpa. Ọ bụ ya mere e ji dọọ anyị aka ná ntị ka anyị zere ndị na-akpa àgwà ndị ahụ e kwuru gbasara ha na 2 Timoti 3:2-5. Ma anyị agaghị ezereli ndị na-akpa àgwà ndị a kpamkpam. Anyị na ha nwere ike ịna-arụkọ ọrụ, na-agakọ akwụkwọ ma ọ bụ biri n’otu ebe. Ma anyị ekwesịghị ịna-eche echiche ma ọ bụ na-eme ihe ka ha. Ihe ga-enyere anyị aka bụ ịna-amụchi Baịbụl anya nakwa anyị na ndị hụrụ Jehova n’anya ịna-akpachi anya.
18. Olee otú okwu ọnụ anyị na àgwà anyị nwere ike isi mee ka ndị ọzọ chọọ ife Jehova?
18 Anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha bịa fewe Jehova. Na-achọ ohere ị ga-eji ezi ozi ọma, na-arịọkwa Jehova ka o nyere gị aka ikwu ihe kwesịrị ekwesị nakwa n’oge kwesịrị ekwesị. Anyị kwesịrị ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị mee ya, àgwà ọma anyị ga-eme ka ha too Chineke, ọ bụghị anyị. Jehova akụzierela anyị ka anyị “jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.” (Taịtọs 2:11-14) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jehova, ndị ọzọ ga-ahụ ya. Ha nwedịrị ike ikwu, sị: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zek. 8:23.
^ para. 10 Okwu Grik a sụgharịrị “onye nkwutọ” ma ọ bụ “onye ebubo” bụ di·aʹbo·los. Nke a bụ utu aha e ji mara Setan na Baịbụl, bụ́ onye kwutọrọ Chineke.