Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ihe M Mere Bụ Ihe M Kwesịrị Ime

Ihe M Mere Bụ Ihe M Kwesịrị Ime

Ruo ihe karịrị iri afọ atọ, Nwanna Donald Ridley kpechitere ọnụ Ndịàmà Jehova n’ụlọikpe. Ọ gbara ezigbo mbọ n’inyere ndị dọkịta, ndị ọkaiwu na ndị ọzọ aka ịmata na mmadụ nwere ike ikwu ka a ghara ịmịnye ya ọbara. O nyeere nzukọ a aka imeri ọtụtụ ikpe n’ụlọikpe kasị elu n’Amerịka. Ndị enyi ya na-akpọ ya Don. Ọ na-arụsi ọrụ ike, dịrị umeala n’obi, na-achọkwa imere ndị ọzọ ihe n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya.

N’afọ 2019, a chọpụtara na Nwanna Don na-arịa ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ. Ọrịa ahụ bịara ka njọ, ya anwụọ n’abalị iri na isii n’ọnwa Ọgọst n’afọ 2019. Ka anyị lee ihe ọ kọrọ.

A mụrụ m na Sent Pọl dị na Minesota dị n’Amerịka n’afọ 1954. Nne na nna anyị ejichaghị ego, ha na-ekpekwa Katọlik. Abụ m nwa nke abụọ n’ime ụmụ ise ha mụrụ. Agara m ụlọ akwụkwọ praịmarị ndị Katọlik. M na-ejekwara ụkọchukwu ozi n’ọlta. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị oké ihe m ma na Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na m kwetara na a ga-enwerịrị Chineke kere ihe niile, ekwetaghị m na chọọchị Katọlik ga-enyere m aka ife ya.

OTÚ M SI MỤTA EZIOKWU

N’afọ nke mbụ n’oge m na-agụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ọkàiwu aha ya bụ William Mitchell, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ m. M nọ na-asụ ákwà mgbe ha bịara, ha agwa m na ha ga-abịaghachi. Mgbe ha bịaghachiri, m jụrụ ha ajụjụ abụọ: “Gịnị mere ihe ji agaziri ndị ajọ mmadụ karịa ndị ezi mmadụ?” na “Gịnị ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ?” Ha nyere m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke azụ ya na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. M kwetakwara ka ha mụwara m Baịbụl. Baịbụl ha mụụrụ m mepere anya m. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m mụtara na ọ bụ Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-achị ụwa. Achọpụtala m na ọchịchị ụmụ mmadụ akụọla afọ n’ala nakwa na naanị ihe ọ na-akpatara ụmụ mmadụ bụ ihe mgbu, ahụhụ, ikpe na-ezighị ezi, na ọdachi.

M nyefere Jehova onwe m ná mmalite afọ 1982 ma mee baptizim ná mgbakọ e mere n’afọ ahụ nke isiokwu ya bụ “Eziokwu Alaeze.” E mere mgbakọ a n’ụlọ ezumeezu dị na Sent Pọl. N’izu ọzọ ya, m laghachikwara n’ụlọ ezumeezu ahụ ka m lee ule ga-eme ka m ghọọ ọkàiwu. Ná mmalite ọnwa Ọktoba, m matara na m mere nke ọma n’ule ahụ, nke pụtara na m nwere ike ịbụ ọkàiwu.

Ná mgbakọ “Eziokwu Alaeze” ahụ, m hụrụ otu nwanna na-eje ozi na Betel dị na Bruklin aha ya bụ Mike Richardson. Ọ gwara m na e nweela ngalaba na-ahụ maka okwu ikpe n’isi ụlọ ọrụ anyị. M chetara ihe ọnaozi Itiopia kwuru n’Ọrụ Ndịozi 8:36 ma jụọ onwe m, sị: ‘Gịnị na-egbochi m itinye akwụkwọ ka m gaa rụọ ọrụ na ngalaba ahụ?’ N’ihi ya, m tinyere akwụkwọ ịga jewe ozi na Betel.

Obi adịghị nne na nna m mma na m ghọrọ Onyeàmà Jehova. Papa m jụrụ m ma ịrụ ọrụ na Betel ọ̀ ga-enyere m aka ebe m bụ ọkàiwu. M gwara ya na ọrụ m ga na-arụ na Betel bụ ọrụ m wepụtara onwe m ịrụ, gwakwa ya na ihe a ga na-enye m kwa ọnwa bụ dọla iri asaa na ise, bụ́kwanụ ihe a na-enye ndị na-eje ozi na Betel kwa ọnwa n’oge ahụ.

Ebe ọ bụ na mụ agwala otu ụlọikpe na m ga-arụrụ ha ọrụ tupu mgbe ahụ, enweghị m ike ịga Betel n’oge ahụ. M malitere ije ozi na Betel dị na Bruklin, Niu Yọk n’afọ 1984. A gwara m ka m rụwa na Ngalaba Na-ahụ Maka Okwu Ikpe. Ihe m mụtara n’ebe mbụ ahụ m rụrụ nyeere m aka n’ihe ndị mechara mee.

ỊRỤZIGHARỊ STANLEY THEATER

Otú Stanley Theater dị mgbe a zụrụ ya

Anyị zụrụ Stanley Theater dị na Jesi Siti dị na Niu Jesi n’ọnwa Nọvemba afọ 1983. Ụmụnna anyị tinyere akwụkwọ ka ndị ọchịchị obodo ahụ nye ha ikike ịrụgharị ihe ụfọdụ n’ụlọ ahụ. Mgbe ụmụnna anyị gakwuuru ha gwa ha na ha chọrọ iji ụlọ ahụ mere ụlọ mgbakọ Ndịàmà Jehova, ha jụrụ. Iwu Jesi Siti kwuru na naanị ebe a ga-enwe ụlọ okpukpe bụ ebe iwu kwadoro ka a na-arụ ụlọ obibi. Stanley Theater dị n’ebe a na-azụ ahịa na ebe e nwere ụlọ ọrụ. N’ihi ya, ha jụrụ inye anyị ikike ịrụzigharị ya. Ụmụnna anyị rịọrọ ha ka ha lebagharịa okwu ahụ anya, ha ajụ.

N’izu mbụ m bịara Betel, nzukọ a wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe. Ebe m ka rụchara ọrụ afọ abụọ n’ụlọikpe dị n’obodo Sent Pọl dị na Minesota, ụdị okwu a doro m anya. Otu n’ime ndị ọkàiwu anyị kwuru na e nwere ọtụtụ ihe a na-anọbu na Stanley Theater eme nke ọhaneze na-abịa, dị ka ile fim na ịkụ egwú. Oleezi ihe mere anyị agaghị anọ na ya na-eme ihe gbasara okpukpe? Ụlọikpe ahụ lebara okwu ahụ anya ma kwuo na ihe ndị ọchịchị Jesi Siti mere megidere iwu obodo kwuru na anyị nweere onwe anyị ikpe okpukpe anyị otú anyị chọrọ. Ha nyeziri obodo ahụ iwu ka ha nye anyị ikike ahụ anyị na-achọ n’aka ha. Ikpe a mere ka m ghọtakwuo otú Jehova si jiri iwu na-enyere nzukọ ya aka ịna-enwe ọganihu n’ọrụ ha na-arụrụ ya. Obi dị m ezigbo ụtọ na m so ná ndị o ji na-arụ ọrụ a.

Ụmụnna anyị malitere ịrụgharị nnukwu ụlọ ahụ. Mgbe ihe na-erughị otu afọ gara, a nọ ebe ahụ bụ́zi Ụlọ Mgbakọ mee ememme ngụcha akwụkwọ nke klas nke iri asaa na itoolu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’abalị asatọ n’ọnwa Septemba afọ 1985. Obi dị m ụtọ na m so na-enye aka n’ọrụ Jehova. Ọrụ m na-arụ ugbu a na-eme m obi ụtọ karịa ọrụ ọkàiwu m na-arụbu tupu mụ abịa Betel. Amaghị m na e nwere ọtụtụ ọrụ Jehova ka ga-eji m rụọ.

IKPECHITE ỌNỤ NDỊ MMADỤ N’IHE GBASARA ỌBARA

N’agbata afọ 1980 na afọ 1989, ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ dị iche iche anaghị ekwe ege Onyeàmà Jehova ntị ma o kwuo ka a gwọọ ya n’amịnyeghị ya ọbara. Ihe a kacha njọ n’ebe ụmụ nwaanyị dị ime nọ n’ihi na ndị ọkàikpe na-ekwukarị na iwu akwadoghị ha ikwu ka a ghara ịmịnye ha ọbara. Ndị ọkàikpe na-ekwu na ha nwere ike ịnwụ ma ọ bụrụ na a mịnyeghị ha ọbara, ya emezie ka nwa ha ghara inwe nne.

N’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Disemba afọ 1988, nnukwu ọbara gbara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Denise Nicoleau mgbe ọ mụchara nwa ya nwoke. Ọbara fọrọ ya n’ahụ́ ebuchaghị ibu, dọkịta ya agwa ya ka a mịnye ya ọbara, ya ajụ. N’ụtụtụ echi ya, ndị nwe ụlọ ọgwụ ahụ gara ka ha nata ụlọikpe ikike ịmịnye ya ọbara. Ọkàikpe ahụ nyere ha ikike ịmịnye nwanna nwaanyị ahụ ọbara n’ebughị ụzọ nụ olu Nwanna Nwaanyị Nicoleau ma ọ bụ di ya, ma ọ bụdị gwa ha agwa.

Na Fraịdee, abalị iri atọ n’ọnwa Disemba, ndị ụlọ ọgwụ ahụ mịnyere Nwanna Nwaanyị Nicoleau ọbara n’agbanyeghị na di ya na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ nọ ebe ahụ ekweghị. Ná mgbede ụbọchị ahụ, a nwụchiri ụfọdụ ndị ezinụlọ ya na ụfọdụ ndị okenye n’ihi na e boro ha ebubo na ha chọrọ igbochi ndị ụlọ ọgwụ ahụ ịmịnye nwanna nwaanyị ahụ ọbara. N’ụtụtụ Satọdee, abalị iri atọ na otu n’ọnwa Disemba, ọ bụzi akụkọ ụlọ ọrụ tiivi, redio na akwụkwọ akụkọ kpụ n’ọnụ na Niu Yọk Siti.

Mụ na Nwanna Philip Brumley, mgbe anyị ka bụ okorobịa

N’ụtụtụ Mọnde, mụ na ọkàikpe ji okwu ahụ aha ya bụ Milton Mollen kwurịtara okwu. M kọwaara ya ihe merenụ, meekwa ka o doo ya anya na ọkàikpe ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ e ji nye ikike ka a mịnye nwanna nwaanyị ahụ ọbara n’ebughị ụzọ nụ olu ya na di ya. Mollen gwara m ka m bịa n’ọfis ya n’ehihie ka anyị kwurịta ihe ndị ahụ na ihe iwu kwuru gbasara ha. Mụ na onye nlekọta ngalaba anyị aha ya bụ Philip Brumley so gaa n’ọfis Mollen ná mgbede ahụ. Ọkàikpe ahụ kpọkwara ọkàiwu ụlọ ọgwụ ahụ ka ọ bịa. Okwu ahụ bịara sie ike. E nwere ebe o ruru, Nwanna Brumley edee ihe n’akwụkwọ ya, gwa m ka m wetuo olu. Ndụmọdụ ahụ o nyere m dị mma n’ihi na iwe bịara m ebe m na-achọ igosi na ihe ọkàiwu ụlọ ọgwụ ahụ mere adịghị mma.

Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Richard Moake, Gregory Olds, Paul Polidoro, Philip Brumley, mụnwa na Mario Moreno. Mụ na ha bụ ndị ọkàiwu kpechitere ọnụ nzukọ a n’ụbọchị e kpere ikpe gbasara Watchtower na Village of Stratton n’ụlọikpe kacha elu n’Amerịka.—Gụọ Teta! January 8, 2003

Mgbe ihe dị ka otu awa gara, Mollen kwuru na okwu ahụ ga-abụ nke mbụ a ga-eleba anya n’ụtụtụ echi ya. Mgbe anyị na-apụ n’ọfis ya, ọ sịrị na ọkàiwu ndị ụlọ ọgwụ ahụ nwere “ọrụ siri ike ọ ga-arụ echi.” Ihe ọ pụtara bụ na ọ gaghị adịrị ọkàiwu ahụ mfe igosi na ndị ụlọ ọgwụ ahụ nwere ikike ịmanye nwanna nwaanyị ahụ ịnara mminye ọbara. Ihe ahụ o kwuru mere ka m mata na Jehova na-eme ka obi sie m ike na anyị ga-emeri. Ọ tụrụ m n’anya ịhụ otú Jehova si jiri anyị na-emezu uche ya.

N’abalị ahụ, anyị alakpughị n’oge ebe anyị na-akwado ihe anyị ga-ekwu n’ụtụtụ echi ya. Ụlọikpe ahụ adịghị anya na Betel dị na Bruklin. N’ihi ya, ihe dị ka mmadụ iri na abụọ na Ngalaba Na-ahụ Maka Okwu Ikpe bịara. Mgbe ndị ọkàikpe anọ na-eleba okwu ahụ anya nụrụ ihe anyị kwuru, ha kpebiri na ụlọikpe ahụ ekwesịghị inye ndị ụlọ ọgwụ ahụ ikike ịmịnye nwanna nwaanyị ahụ ọbara. Ụlọikpe ahụ kpelaara Nwanna Nwaanyị Nicoleau ikpe ma kwuo na inye ikike ka a mịnye mmadụ ọbara n’ebughị ụzọ nụ olu onye ahụ megidere iwu kwuru gbasara ihe ruuru mmadụ.

N’oge na-adịghị anya ihe a mechara, ụlọikpe kacha elu na Niu Yọk mekwara ka o doo anya na Nwanna Nwaanyị Nicoleau nwere ikike ikwu ka a gwọọ ya n’amịnyeghị ya ọbara. Ikpe a bụ nke mbụ n’ime ikpe anọ gbasara ọbara ụlọikpe kacha elu na steeti dị iche iche n’Amerịka kpere m so gaa okwu ya. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Mmeri Ndị Anyị Nwetara n’Ụlọikpe Kasị Elu.”) Esorokwala m ndị ọkàiwu ndị ọzọ nọ na Betel gaa okwu ikpe gbasara onye kwesịrị ịkpọrọ nwa, ịgba alụkwaghịm, ụlọ na ala.

NWUNYE M NA EZINỤLỌ M

Mụ na Dawn nwunye m

Nwunye m aha ya bụ Dawn na di ya agbaala alụkwaghịm mgbe mbụ m hụrụ ya. O nwekwara ụmụ atọ. Ọ na-akpa afọ ya na ụmụ ya, na-asụkwa ụzọ. Ihe siiri ya ike. Otú o si kpebisie ike ife Jehova masịrị m. N’afọ 1992, mgbe anyị gara mgbakọ distrikti isiokwu ya bụ “Ndị Na-enye Ìhè” na Niu Yọk Siti, m jụrụ ya ma ànyị nwere ike ịmatakwu onwe anyị. Anyị lụrụ mgbe otu afọ gara. Nwunye m bụ onyinye si n’aka Jehova n’ihi na o ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, na-emekwa ihe ọchị. Nwunye m ejirila ihe ọma kwụọ m ụgwọ kemgbe mụ na ya lụrụ.—Ilu 31:12.

Mgbe anyị lụrụ, nwa ya nke kacha okenye dị afọ iri na isii, nke na-eso ya adịrị afọ iri na atọ, nke ikpeazụ adịrịkwa afọ iri na otu. M chọrọ ịbụrụ ha ezigbo nna. N’ihi ya, m wepụtara oge na-agụ ma na-eme ihe niile m hụrụ nzụkọ a bipụtara gbasara ịbụ nna nkuchi. Ọ dịcharaghị m mfe. Ma, obi dị m ụtọ na ụmụaka ahụ ewerela m ka nna hụrụ ha n’anya na enyi ha tụkwasịrị obi. Anyị na-anabata ndị enyi ha n’ụlọ anyị. Obi na-atọkwa anyị ụtọ anyị na ụmụaka ndị a ume ka dị n’ahụ́ ịna-anọrị.

N’afọ 2013, mụ na nwunye m kwagara Wiskọnsịn ịga lekọta nne na nna anyị merela agadi. Ọ tụrụ m n’anya na ihe a emeghị ka m kwụsị ịga ọrụ na Betel. A gwara m ka m ka na-enyere nzukọ a aka n’okwu ikpe dị iche iche.

OTÚ IHE SI GBANWEE NA MBEREDE

N’ọnwa Septemba afọ 2018, m chọpụtara na m na-akwachakarị akpịrị m. Dọkịta anyị lere m ahụ́, ma o nweghị ike ịchọpụta ihe kpatara ya. Na Jenụwarị afọ 2019, Dọkịta ọzọ gwara m na ọ dị ka m̀ nwere ọrịa ga-emecha zuo m ahụ́.

Mgbe ụbọchị atọ gachara, n’oge m na-egwu egwuregwu, m merụrụ ahụ́ n’aka. Ihe a bụ egwuregwu m na-egwu kemgbe ụwa, amakwa m otú e si egwu ya nke ọma. M chọpụtara na ọ na-esiziri m ike imegharị ahụ́ m otú m chọrọ. Otú ọrịa m ahụ si na-aka njọ n’ike n’ike juru m anya. O mere ka o siwere m ike ikwu okwu, ịgagharị agagharị, na ilo ihe.

Obi dị m ezigbo ụtọ na m ji ihe m mụtara banyere iwu nye aka ná nzukọ Jehova. Edeekwala m ọtụtụ isiokwu na magazin ndị dọkịta, ndị ọkàiwu na ndị ọkàikpe. Agaakwala m kwuo okwu n’ebe dị iche iche n’ụwa, na-akọwara ndị mmadụ na Ndịàmà Jehova nwere ike ikwu ka a gwọọ ha ma ọ bụ waa ha ahụ́ n’amịnyeghị ha ọbara. N’agbanyeghị nke ahụ, m na-ekwu ihe yiri ihe e kwuru na Luk 17:10: ‘Abụ m ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe m mere bụ ihe m kwesịrị ime.’