ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 24
Ị Ga-esili n’Ọnyà Setan Pụta
‘Si n’ọnyà Ekwensu pụta.’—2 TIM. 2:26.
ABỤ NKE 36 Anyị Na-echebe Obi Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee ihe mere anyị nwere ike iji jiri Setan tụnyere dinta?
IHE na-abụ mkpa dinta bụ ijide ma ọ bụ igbute anụ. O nwere ike iji ọnyà dị iche iche mee nke a otú ahụ otu n’ime ndị enyi ụgha Job bịara ịkasi ya obi kwuru. (Job 18:8-10) Olee otú dinta si arata anụ ka ọ ma n’ọnyà ya? Ọ na-amụ gbasara anụmanụ ahụ. Olee ebe anụ ahụ na-agakarị? Olee ihe na-amasị ya? Olee ihe ga-ejide ya na mberede? Setan yiri dinta ahụ. Ọ na-amụ gbasara anyị. Ọ na-achọpụta ebe anyị na-aga nakwa ihe na-amasị anyị. Ọ na-esiziri anyị ọnyà o chere ga-ama anyị na mberede. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị ama n’ọnyà ya, anyị nwere ike isi na ya pụta. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi ghara ịma n’ọnyà ya chaa chaa.
2. Olee ihe abụọ Setan kacha eji arata ndị mmadụ?
2 Ihe abụọ Setan kacha eji esiri ndị mmadụ ọnyà bụ mpako na anyaukwu. * Kemgbe ọtụtụ puku afọ, Setan ejirila àgwà ọjọọ ndị a nwata ndị mmadụ. Setan dị ka onye na-achụ nta nnụnụ na-arata nnụnụ ịma n’ọnyà ya ma ọ bụkwanụ ịbata n’ụgbụ ya. (Ọma 91:3) Ma, anyị ekwesịghị ịma n’ọnyà Setan. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova emeela ka anyị mara ọnyà dị iche iche Setan na-esiri ndị mmadụ.—2 Kọr. 2:11.
3. Gịnị mere Jehova ji mee ka e dee akụkọ ụfọdụ na Baịbụl?
3 Otu ụzọ Jehova si adọ anyị aka ná ntị ka anyị zere mpako na anyaukwu bụ ịgba anyị ume ka anyị mụta ihe n’ihe ndị mere ndị ọzọ. N’ihe atụ ndị anyị ga-eleba anya na ha, 1 Kọr. 10:11) Ọ ma na anyị nwere ike ịmụta ihe ga-enyere anyị aka ịghara ịdaba n’ọnyà Setan n’ihe mere ndị ahụ.
ị ga-achọpụta na Setan ratara ụfọdụ ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ. Ihe a ọ̀ pụtara na anyịnwa agaghị ezereli anyaukwu na mpako? Mba. Jehova mere ka e dee ihe ndị a na Baịbụl ka e jiri ha “kụziere anyị ihe.” (MPAKO BỤ ỌNYÀ
4. Gịnị ka mpako nwere ike ịkpatara anyị?
4 Setan chọrọ ka anyị dịrị mpako. Ọ ma na ọ bụrụ na anyị adịrị mpako, anyị ga-adị ka ya. Anyị agakwaghị adị ndụ ebighị ebi. (Ilu 16:18) Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dọọ aka ná ntị na mmadụ nwere ike “ịdị mpako, a maa ya otu ikpe ahụ a mara Ekwensu.” (1 Tim. 3:6, 7) Ihe a nwere ike ime onye ọ bụla n’ime anyị ma ànyị ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ ma ọ bụkwanụ na anyị anọọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ.
5. Dị ka e kwuru n’Ekliziastis 7:16, 20, olee ihe nwere ike igosi na mmadụ dị mpako?
5 Ndị dị mpako na-achọkarị ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Setan chọrọ ka onwe anyị dịrị anyị mkpa karịa Jehova, karịchaa, mgbe anyị nọ ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, è botụla gị ebubo ụgha ma ọ bụkwanụ mejọọ gị? Obi ga-atọgbu Setan atọgbu ịhụ ka ị na-ata Jehova ma ọ bụ ụmụnna gị ụta. Ọ chọkwara ka i chee na naanị ihe ga-eme ka obi dị gị mma bụ ime ihe otú ị chọrọ kama iso ntụziaka Jehova nyere anyị n’Okwu ya.—Gụọ Ekliziastis 7:16, 20.
6. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe otu nwanna nwaanyị bi na Nedalandz kọrọ?
6 Ka anyị lee ihe mere otu nwanna nwaanyị bi na Nedalandz. Iwe were ya mgbe ndị ọzọ mere ya ihe na-adịghị ya mma. O kpebiri na ya agaghịzi edi ihe ahụ ha mere ya. Ọ sịrị: “Owu mara m, mụ ana-eche na o nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka m gbaghara ha. M gwara di m ka anyị gafee n’ọgbakọ ọzọ.” Nwanna nwaanyị ahụ leziri Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova nke ọnwa Mach afọ 2016. Ihe omume ahụ kwuru ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime iji die ezughị okè ndị ọzọ. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “M ghọtara na m kwesịrị ịdị umeala n’obi ma lekwasị anya n’ịgbanwe ihe ndị m mejọrọ kama ịgbalịwa ka m gbanwee ụmụnna nọ n’ọgbakọ. Ihe omume ahụ nyeere m aka ịtụkwasị Jehova obi nakwa ịma na ọ bụ ya kwesịrị ịna-agwa anyị ihe anyị ga na-eme.” Ị̀ ghọtara ihe a na-ekwu ebe a? Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara gị, na-eche gbasara Jehova. Rịọ ya ka o nyere gị aka ile ndị ọzọ anya otú yanwa si ele ha. Nna gị nke eluigwe na-ahụ ihe ndị ha na-emejọ. Ma ọ chọrọ ịgbaghara ha, chọọkwa ka i mee otú ahụ.—1 Jọn 4:20.
7. Gịnị mere Eze Ọzaya?
7 Mpako mere ka Ọzaya bụ́ eze Juda jụ ige ndụmọdụ ma mee ihe ọ na-ekwesịghị ime. Ọzaya na-eme nnọọ nke ọma. O meriri n’ọtụtụ agha, rụọ ọtụtụ obodo, nweekwa ọtụtụ ubi. “Ezi Chineke mere ka ihe gaziere ya.” (2 Ihe 26:3-7, 10) Baịbụl sịrị: “Ma ozugbo o siri ike, ọ bịara dị mpako, si otú ahụ kpatara onwe ya nsogbu.” Jehova nyere iwu na ọ bụ naanị ndị nchụàjà ga na-amụnye insens ọkụ n’ụlọ nsọ. Ma, Eze Ọzaya bara n’ụlọ nsọ mụnye insens ọkụ, bụ́kwanụ ihe ọ na-ekwesịghị ime. Ihe a o mere adịghị Jehova mma, ya emee ka Ọzaya rịawa ekpenta. Ọzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ.—2 Ihe 26:16-21.
8. N’ihi ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:6, 7, olee otú anyị nwere ike isi zere ịdị mpako?
8 Mpako ò nwere ike ime ka anyị ma n’ọnyà otú ahụ o mere Ọzaya? Ka anyị lee ihe mere otu nwanna aha ya bụ José. Ọ na-eme nke ọma n’azụmahịa ya, bụrụkwa okenye a na-akwanyere ùgwù. O kwuru okwu n’ọtụtụ mgbakọ. Ndị nlekọta sekit na-agakwa ajụta ya ihe ụfọdụ. Ọ sịrị: “Ma, onwe m bịara na-eju m afọ. Ekweghịzi m ka Jehova na-eduzi m. Atụkwasịghịzi m Jehova obi. M chere na e nweghị ihe ọ bụla ga-emeli m. N’ihi ya, egeghị m aka ná ntị Jehova nọ na-adọ m.” José mere mmehie dị oké njọ, a chụọkwa ya n’ọgbakọ. A nabatakwala ya afọ ole na ole gara aga. O kwuziri, sị: “Jehova akụzierela m otu ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ, na ihe ka mkpa abụghị ịza aha, kama ọ bụ ime ihe ọ sịrị anyị mee.” Ka anyị na-echeta na nkà ọ bụla anyị nwere ma ọ bụ ọrụ ọ bụla anyị na-arụ n’ọgbakọ si n’aka Jehova. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 4:6, 7.) Anyị dịrị mpako, Jehova agaghị eji anyị na-arụ ọrụ.
ANYAUKWU BỤ ỌNYÀ
9. Gịnị ka anyaukwu mere ka ma Setan ma Iv mee?
9 E kwuwe okwu anyaukwu, o nwere ike ịbụ Setan bụ́ Ekwensu na-agbatakarị anyị n’obi. Mgbe ọ bụ mmụọ ozi Jehova, ọ ga-abụ na e nwere ọtụtụ ọrụ Jehova nyere ya. Ma, nke ahụ ezughịrị ya. Ọ chọrọ ka e fewe ya ofufe ruuru naanị Jehova. Setan chọrọ ka anyị dịrị ka ya. N’ihi ya, ọ na-agbalị ime ka ihe anyị nwere ghara iju anyị afọ. Ọ malitere ime ihe a mgbe ọ nwara Iv. Jehova nyere Iv na di ya ọtụtụ ihe oriri na-atọ ezigbo ụtọ, ya bụ, “mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi” ahụ, e wepụ otu. (Jen. 2:16) N’agbanyeghị nke ahụ, Setan ghọgburu Iv ma mee ka o chee na naanị ihe ga-eme ka obi dị ya mma bụ ma o rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke sị ha erila. Ihe Iv nwere ejughị ya afọ. Anyị ma ihe nke ahụ kpatara. Iv mere mmehie, mechaakwa nwụọ.—Jen. 3:6, 19.
10. Olee otú anyaukwu si ghọọrọ Eze Devid ọnyà?
10 Anyaukwu mere ka Eze Devid chefuo ihe ndị Jehova meere ya. Jehova mere ka ọ baa ọgaranya, bụrụ onye a ma ama, meekwa ka o merie ọtụtụ ndị iro ya. Obi dị Devid ụtọ, ya ekwuodị na ihe Chineke meere ya dị ‘nnọọ ọtụtụ nke na ya enweghị ike ikwucha ha.’ (Ọma 40:5) Ma, e nwere mgbe o ruru, Devid echefuo ihe niile Jehova meere ya. Ihe ndị ahụ ejughịzi ya afọ. N’agbanyeghị na Devid nwere ọtụtụ ndị nwunye, o kwere ka nwunye nwoke ọzọ gụwa ya agụụ. Aha nwaanyị ahụ bụ Bat-shiba, aha di ya abụrụ Yuraya, onye Het. Devid na Bat-shiba kwara iko, ya adịrị ime. O nweghị ihe ihe ọjọọ ahụ bụ n’anya Devid, ya ahazie ka e gbuo Yuraya. (2 Sam. 11:2-15) Gịnị ka Devid nọ na-eche? Ọ̀ nọ na-eche na Jehova enweghị ike ịhụ ihe ahụ o mere? Ohu Jehova a na-erubeburu ya isi kwere ka anyaukwu rafuo ya. Ọ kwụkwara ụgwọ ya. Ma, obi dị anyị ụtọ na Devid mechara kweta na o mejọrọ ihe ma chegharịa. Obi dịkwa ya ụtọ na Jehova gbaghaara ya.—2 Sam. 12:7-13.
11. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 5:3, 4, gịnị nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịdị anyaukwu?
11 Gịnị ka ihe mere Devid na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ihe ga-eme Ndị Efesọs 5:3, 4.) Ihe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ. Anyị nwere ike ịgba ndị anyị malitere ịmụrụ Baịbụl ọhụrụ ume ka ha na-eche gbasara otu ihe Jehova meere ha ma kelee ya maka ya. Ọ bụrụ na mmadụ ana-eme ihe a n’ụbọchị ọ bụla n’izu, ihe ọ pụtara bụ na o keleela Chineke maka ihe asaa dị iche iche o meere ya. (1 Tesa. 5:18) Ị̀ na-eme ụdị ihe a? Ọ bụrụ na ị na-atụgharị uche n’ihe niile Jehova meere gị, ọ ga-enyere gị aka ịna-ekele ya maka ha. Ọ bụrụ na ị na-ekele ya maka ha, ihe i nwere ga-eju gị afọ. Ọ bụrụkwa na ihe i nwere eju gị afọ, ị gaghị adị anyaukwu.
ka anyị ghara ịdị anyaukwu bụ inwe obi ụtọ maka ihe niile Jehova meere anyị ma na-ekele ya maka ha. (Gụọ12. Gịnị ka anyaukwu mere ka Judas Iskarịọt mee?
12 Anyaukwu mere ka Judas Iskarịọt mee ihe ọjọọ ma rara Jizọs nye. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ná mmalite. (Luk 6:13, 16) Jizọs họọrọ ya ka ọ bụrụ onyeozi. Ọ tụkwasịrị ya obi n’ihi na ọ bụ ya na-eji igbe ego ha. Jizọs na ndịozi ndị ọzọ na-eji ego ahụ egbo mkpa ha ma ha na-ekwusa ozi ọma. E nwere ike iji ego ndị ahụ tụnyere onyinye ndị e nyere maka ọrụ zuru ụwa ọnụ taa. Ma, o nwere mgbe o ruru, Judas amalite izuru ego ahụ n’agbanyeghị na Jizọs ekwuola okwu ọtụtụ ugboro gbasara anyaukwu. (Mak 7:22, 23; Luk 11:39; 12:15) O nweghị ihe Judas ji ihe ndị ahụ Jizọs kwuru kpọrọ.
13. Olee mgbe anyaukwu Judas pụtara ìhè?
13 Otu ihe merenụ tupu e gbuo Jizọs mere ka anyaukwu Judas pụta ìhè. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, ma Meri na nwanne ya nwaanyị Mata, gara n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta. Mgbe ha nọ na-eri nri, Meri biliri ọtọ ma were mmanụ na-esi ísì ụtọ dara oké ọnụ na-awụ n’isi Jizọs. Ihe a were Judas na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ iwe. O nwere ike ịbụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ na-eche na a gaara eji ego ahụ mee ihe ndị dị mkpa n’ozi ha. Ma, ihe na-ewe Judas iwe dị iche. Ọ bụ “onye ohi.” Ọ chọkwara izuru ego n’igbe ego ahụ. Mgbe e mechara, anyaukwu mere ka Judas rara Jizọs nye n’ọnụ ego e ji ere ohu.—Jọn 12:2-6; Mat. 26:6-16; Luk 22:3-6.
14. Olee otú otu di na nwunye si mee ihe e kwuru na Luk 16:13?
14 Jizọs chetaara ndị na-eso ụzọ ya otu eziokwu dị mkpa. Ọ sịrị: “Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Gụọ Luk 16:13.) Ihe ahụ ka bụkwa eziokwu ruo taa. Ka anyị lee otú otu nwanna na nwunye ya bi na Romenia si mee ihe a Jizọs kwuru. Ha nwetara ọrụ ha ga-arụ nwa oge n’otu obodo bara ọgaranya karịa nke ha. Ha sịrị: “E nwere nnukwu ego anyị gbazitere ụlọ akụ̀ anyị kwesịrị ịkwụghachi. N’ihi ya, anyị chere na ọrụ a anyị nwetara bụ ngọzi Jehova.” Ma, e nwere nsogbu dịnụ. Ọrụ ọhụrụ a agaghị ekwe ka ha jiri oge buru ibu na-ejere Jehova ozi. Mgbe ha gụchara isiokwu bụ́ “Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2008, ha kpebiri ihe ha ga-eme. Ha sịrị: “Ọ bụrụ na ihe anyị bu n’obi aga ịrụ ọrụ ná mba ọzọ bụ ka anyị nwetakwuo ego, ọ pụtara na adịm ná mma anyị na Jehova abụghị ihe mbụ ná ndụ anyị. Anyị ma na ịrụ ọrụ ahụ ga-akpa ofufe anyị na-efe Chineke aka ọjọọ.” N’ihi ya, ha kpebiri ịhapụ ọrụ ahụ. Gịnị mechara mee? Nwanna ahụ nwetara ọrụ ọzọ ga-enyere ya aka ịna-egbo mkpa ha n’obodo ha. Nwunye ya sịrị: “Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ.” Obi dị di na nwunye a ụtọ na ha họọrọ ịbụ ndị ohu Jehova kama ịbụ ndị ohu akụnụba.
ZERE ỌNYÀ SETAN
15. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na anyị nwere ike isi n’ọnyà Ekwensu pụta?
15 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị adịwala mpako ma ọ bụ anyaukwu? Anyị nwere ike ịgbanwe. Pọl kwuru na ndị ‘Ekwensu jidere ná ndụ’ nwere ike isi n’ọnyà ya pụọ. (2 Tim. 2:26) Ọ bụ ụdị ihe a ka Devid mere. Ọ nabatara aka ná ntị Netan dọrọ ya, chegharịa ma kwụsị ịdị anyaukwu, meekwa ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Echefukwala na Jehova ka Setan ike. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova nyere anyị aka, anyị nwere ike isi n’ọnyà Ekwensu ọ bụla anyị nọ na ya pụta.
16. Gịnị ga-enyere anyị aka izere ọnyà Setan?
16 Ma, kama ịchọwa otú anyị ga-esi si n’ọnyà Ekwensu pụta, anyị kwesịrị izere ya kpamkpam. Ọ bụ naanị n’enyemaka Chineke ka anyị ga-emeli ya. Ma anyị ekwesịghị iche na o nweghị ihe ga-eme anyị. E nweedịla ụfọdụ ndị fere Jehova ruo ogologo oge mechara dị mpako ma ọ bụ anyaukwu. N’ihi ya, na-arịọ Jehova kwa ụbọchị ka o nyere gị aka ịchọpụta ma otú i si akpa àgwà na otú i si eche echiche ò gosiwela na ị dịwala mpako ma ọ bụ anyaukwu. (Ọma 139:23, 24) Gbaa mbọ ka ị ghara ịdị mpako ma ọ bụ anyaukwu.
17. Gịnị ga-eme onye iro anyị bụ́ Ekwensu n’oge na-adịghị anya?
17 Ekwensu anọrọla na-achụ nta kemgbe ọtụtụ puku afọ. Ma, n’oge na-adịghị anya, a ga-eke ya agbụ ma mechaa bibie ya. (Mkpu. 20:1-3, 10) Anyị na-atụsi anya ike ka ụbọchị ahụ ruo. Ma tupu mgbe ahụ, mụrụ anya maka ọnyà Setan. Gbalịsie ike ka ị ghara ịdị mpako ma ọ bụ anyaukwu. Kpebisie ike na ị ga na-alụso “Ekwensu ọgụ. Ọ ga-esikwa ebe unu nọ gbapụ.”—Jems 4:7.
ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ
^ par. 5 Setan bụ dinta aka siri ike. Ọ chọrọ ịmata anyị n’ọnyà n’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Ekwensu si achọ iji mpako na anyaukwu emebi mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị ga-amụtakwa ihe n’aka ụfọdụ ndị Setan ji mpako na anyaukwu mata n’ọnyà, hụkwa otú anyị nwere ike isi zere ọnyà Setan ndị a.
^ par. 2 NKỌWAKWU: Isiokwu a lekwasịrị anya ná mpako, ya bụ, mmadụ iche na ya ka ndị ọzọ mma, nakwa anyaukwu, ya bụ, mmadụ ịchọsi ike ka o nwetakwuo ego ma ọ bụ ikike, nakwa mmadụ ịchọsi ike ka ya na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ yiri ya.
^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwoke jụrụ ịnabata ndụmọdụ a na-enye ya n’ihi na ọ dị mpako. Ebe nwanna nwaanyị nwere ọtụtụ ihe chọrọ inwetakwu ihe.
^ par. 55 NKỌWA FOTO: Otu mmụọ ozi dị mpako. Eze Ọzaya dịkwa mpako. Anyaukwu mere ka Iv rie mkpụrụ osisi Chineke sịrị ha erila, mee ka Devid na Bat-shiba kwaa iko, meekwa ka Judas zuo ego.