Chineke “Ga-agọzi” Onye Na-emesapụ Aka
KEMGBE ụwa, mmadụ iji ihe ndị o nwere chụọrọ Chineke àjà bụ otu ụzọ dị mkpa e si na-efe Chineke. Ndị Izrel chụrụ ụmụ anụmanụ n’àjà. A makwa Ndị Kraịst ama ka ndị na-achụrụ Chineke “àjà otuto” mgbe niile. Ma, e nwere àjà ndị ọzọ na-adị Chineke ezigbo mma. (Hib. 13:15, 16) Àjà ndị a na-eme ka Chineke gọzie anyị ma na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ihe ndị anyị na-aga ịkọ na-egosi na ọ bụ eziokwu.
N’oge ochie, Hana ji obi ya niile fee Jehova. Ọ chọsiri nwa ike, ma o nweghị nke ọ mụtara. O kwere Jehova nkwa n’ekpere na ọ bụrụ na ọ mụta nwa nwoke, na ọ “ga-enye ya Jehova ụbọchị ndụ ya niile.” (1 Sam. 1:10, 11) Ka oge na-aga, Hana dịrị ime ma mụta nwa nwoke aha ya bụ Samuel. Mgbe a napụrụ ya ara, Hana kpọtara ya n’ụlọikwuu otú ahụ o kwere Chineke ná nkwa. Jehova gọziri Hana maka onyinye a o ji obi ya niile nye ya. Jehova mere ka ọ mụta ụmụ ise mgbe ọ mụchara Samuel. Samuel ghọkwara onye amụma na onye so dee Baịbụl.—1 Sam. 2:21.
Ndị Kraịst n’oge anyị a na-enyefe Onye kere ha onwe ha ma jiri ndụ ha niile na-ejere ya ozi otú ahụ Hana na Samuel mere. Jizọs kwekwara anyị nkwa na ihe ọ bụla anyị chụrụ n’àjà iji fee Jehova na ọ ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji.—Mak 10:28-30.
N’oge ndịozi Jizọs, a ma Onye Kraịst aha ya bụ Dọkas ama ka onye “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere nke ọ na-enye” iji nyere ndị ọzọ aka. Ma, ọ dị mwute na “ọ dara ọrịa wee nwụọ.” Ọnwụ ya gbawara ndị nọ n’ọgbakọ ha obi. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs nụrụ na Pita nọ nso n’ebe ahụ, ha gwara ya ka ọ bịa ozugbo nyere ha aka. Obi tọgburu ha atọgbu mgbe Pita kpọlitere Dọkas n’ọnwụ. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ mbụ Baịbụl kọrọ na onyeozi Jizọs kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. (Ọrụ 9:36-41) Chineke echefubeghị ihe ọma Dọkas meere ndị mmadụ. (Hib. 6:10) E dere ihe ọma ndị ahụ na Baịbụl ka anyị nwee ike ịna-eme ka ya.
Pọl onyeozi bụ onye ọzọ mere ihe anyị kwesịrị iṅomi. O ji oge ya niile nyere ndị mmadụ aka. Mgbe o degaara ụmụnna ya nọ na Kọrịnt akwụkwọ ozi, ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-eji oké ọṅụ mefuo ihe niile, kwekwa ka e jiri m mee ihe n’ụzọ zuru ezu n’ihi mkpụrụ obi unu.” (2 Kọr. 12:15) Ihe ndị Pọl meere ndị mmadụ mere ka ọ mata na mmadụ iji oge ya niile nyere ndị ọzọ aka na-eme ka onye ahụ na-enwe obi ụtọ. Ma, nke ka nke bụ na ọ na-eme ka onye ahụ na Jehova dịrị ná mma, ya agọziekwa ya.—Ọrụ 20:24, 35.
O doro anya na obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị jiri oge anyị na ike anyị na-akwado ihe gbasara Alaeze Chineke ma na-enyere ụmụnna anyị aka. Ma, è nwere ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi kwado ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi? Ee, e nwere. E wezụga iji oge anyị na ike anyị na-ejere Chineke ozi, anyị nwekwara ike iji ihe ndị anyị nwere jeere ya ozi. Anyị na-eji ha na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịkwado ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile pụrụ iche. Ihe ọzọ bụ na a na-eji onyinye si anyị n’obi enye aka akwadebe akwụkwọ na vidio anyị, nakwa ịsụgharị ha. A na-ejikwa ya agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka na iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ. Ka obi sie anyị ike na Chineke “ga-agọzi” onye na-emesapụ aka. Ihe ọzọ bụ na anyị na-asọpụrụ Jehova ma anyị nye ya ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa.—Ilu 3:9; 11:25.