Ị̀ Gbabala n’Ime Jehova?
“Jehova na-agbapụta mkpụrụ obi ndị ohu ya; ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ndị gbabara n’ime ya a ga-ama ikpe.”—ỌMA 34:22.
1. Olee ihe ndị na-efe Chineke na-eche mgbe ha mere mmehie?
PỌL ONYEOZI kwuru, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya!” (Rom 7:24) Ọtụtụ ndị na-efe Chineke ekwuokwala ihe a Pọl onyeozi kwuru. Ezughị okè na-akpa anyị niile aka ọjọọ. Anyị nwere ike ịda mba ma ọ bụrụ na àgwà anyị adabaghị n’ihe anyị bu n’obi ime ka obi na-atọ Jehova ụtọ. Ụfọdụ Ndị Kraịst emeela mmehie dị oké njọ ma na-eche na Chineke emekataghị gbaghara ha.
2. (a) Olee otú Abụ Ọma 34:22 si gosi na obi ekwesịghị ịna-ama ndị na-efe Chineke ikpe? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ò Nwere Ihe Ọ Na-anọchi Anya Ya Ka Ọ̀ Bụ na E Ji Ya Kụziere Anyị Ihe?”)
2 Ma, Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị agbaba n’ime Jehova, obi ekwesịghị ịna-ama anyị ikpe. (Gụọ Abụ Ọma 34:22.) Gịnị ka ịgbaba n’ime Jehova pụtara? Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova meere anyị ebere ma gbaghara anyị? Otú anyị ga-esi amata azịza ajụjụ ndị a bụ ileba anya ná ndokwa e mere maka obodo mgbaba ndị dị n’Izrel oge ochie. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndokwa ahụ so n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, bụ́ nke a kagburu na Pentikọst afọ 33. Ma, cheta na ọ bụ Jehova nyere Iwu ahụ. N’ihi ya, ndokwa ndị e mere maka obodo mgbaba na-akụziri anyị otú Jehova si ele mmehie, ndị mere mmehie, nakwa ndị chegharịrị ná mmehie ha, anya. Ka anyị bu ụzọ leba anya n’ihe mere ndị Izrel ji nwee obodo mgbaba ndị ahụ na ihe ndị a na-eme na ha.
“WEPỤTARANỤ ONWE UNU OBODO MGBABA”
3. Olee ihe ndị Izrel na-eme ma mmadụ kpachara anya gbuo mmadụ ibe ya?
3 Obi anaghị adị Jehova mma ma mmadụ gbuo mmadụ ibe ya. Ọ bụrụ na onye Izrel akpachara anya gbuo mmadụ ibe ya, nwanne onye ahụ e gburu egbu nke a na-akpọ “onye ọbọ ọbara” ga-egbu onye ahụ gburu nwanne ya. (Ọnụ Ọgụ. 35:19) Onye ahụ gburu mmadụ ga-eji ndụ ya kwụọ ụgwọ ọbara ahụ ọ wụfuru. Ọ bụrụ na e gbughị onye ahụ ozugbo, ọ ga-eme ka Ala Nkwa ahụ gharazie ịdị nsọ. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye iwu, sị: “Unu emerụla ala unu bi; n’ihi na ọ bụ [ịwụfu] ọbara na-emerụ ala.”—Ọnụ Ọgụ. 35:33, 34.
4. Olee ihe ndị Izrel na-eme ma mmadụ gbuo mmadụ n’amaghị ama?
4 Ma, olee ihe ndị Izrel na-eme ma mmadụ gbuo mmadụ n’amaghị ama? Ọ bụ eziokwu na ọ maghị ama gbuo mmadụ, ma ikpe ọbara ka mara onye ahụ. (Jen. 9:5) Ma, a ga-emere onye ahụ ebere. O nweere onwe ya ịgbaga n’otu n’ime obodo mgbaba isii e nwere. Ọ gbaba ebe ahụ, o nweghị ọkọ ga-akọ ya. Ọ ga-anọ ebe ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ.—Ọnụ Ọgụ. 35:15, 28.
5. Olee otú ndokwa e mere maka inwe obodo mgbaba ga-esi nyere anyị aka ịghọtakwu Jehova?
5 Ọ bụ Jehova kwuru ka e nwee obodo mgbaba ndị ahụ. Ọ gwara Jọshụa, sị: “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Wepụtaranụ onwe unu obodo mgbaba.’” E mere ka obodo ndị ahụ bụrụ “ebe dị nsọ.” (Jọsh. 20:1, 2, 7, 8) Ebe ọ bụ Jehova kwuru ka e nwee obodo ndị ahụ maka ihe pụrụ iche, anyị nwere ike na-ajụ: Olee otú ndokwa a Jehova mere ga-esi nyere anyị aka ịghọta ụdị obi ebere Jehova nwere? Gịnị ka ọ na-akụziri anyị banyere otú anyị ga-esi gbaba n’ime Jehova taa?
‘Ọ GA-EKWU IHE O NWERE IKWU NÁ NTỊ NDỊ OKENYE OBODO AHỤ’
6, 7. (a) Kọwaa otú ndị okenye ga-esi ekpe onye gburu mmadụ n’amaghị ama ikpe. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere onye gburu mmadụ gbaga n’obodo mgbaba ji kwesị ịhụ ndị okenye?
6 Ọ bụrụ na onye Izrel egbuo mmadụ n’amaghị ama, ọ ga-ebu ụzọ “kwuo ihe o nwere ikwu ná ntị ndị okenye obodo ahụ” ọ gbabara na ya. O kwuchaa, ndị okenye ahụ ga-anabata ya. (Jọsh. 20:4) Mgbe obere oge gara, ha ga-akpọgara ya ndị okenye nke obodo ahụ ọ nọ gbuo mmadụ, ha ekpee ya ikpe. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 35:24, 25.) Ọ bụrụ na ha kpechaa ya ikpe ma chọpụta na o gburu mmadụ n’amaghị ama, ha ga-ezighachi ya n’obodo mgbaba ahụ ọ gbabara.
7 Gịnị mere onye ahụ ga-eji kọọrọ ndị okenye obodo ahụ ọ gbagara ihe merenụ? Ọ bụ ka ha mee ka nzukọ Izrel dị ọcha, nakwa ka Jehova meere onye ahụ gburu mmadụ n’amaghị ama ebere. Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na onye ahụ gburu mmadụ agakwughị ndị okenye, “e nwere ike gbuo ya.” O kwukwara, sị: “Ọbara ya ga-adị n’isi ya n’ihi na o meghị ihe Chineke gwara ya.” Onye gburu mmadụ n’amaghị ama ga-ekwu ka e nyere ya aka, nabatakwa aka ahụ a ga-enyere ya ka o nwee ike ịdị ndụ. Ọ bụrụ na ọ gbabaghị n’otu n’ime obodo mgbaba ndị ahụ Jehova mere ndokwa ya, iwu ejighị nwanne onye ahụ o gburu igbu ya.
8, 9. Gịnị mere Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ kwesịrị iji gakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka?
8 Taa, Onye Kraịst mere mmehie dị oké Jems 5:14-16) Nke abụọ bụ na ndị okenye ga-enyere onye mere mmehie dị oké njọ ma chegharịa aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma, nakwa ka ọ ghara ime mmehie ahụ ọzọ. (Gal. 6:1; Hib. 12:11) Nke atọ bụ na a họpụtara ndị okenye ma kụziere ha ka ha mee ka obi sie onye mere mmehie ma chegharịa ike, nyekwara ya aka ka obi ghara ịna-ama ya ikpe. Jehova kpọrọ ndị okenye dị otú ahụ “ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo.” (Aịza. 32:1, 2) O doro anya na ndokwa a bụ otu ụzọ Chineke si emere anyị ebere.
njọ kwesịrị ịga hụ ndị okenye ka ha nyere ya aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Gịnị mere nke a ji dị ezigbo mkpa? Nke mbụ bụ na ọ bụ Jehova mere ndokwa ka ndị okenye kpee Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ ikpe otú Okwu ya kwuru. (9 Ọtụtụ ndị na-efe Chineke achọpụtala na ahụ́ ruru ha ala mgbe ha kọọrọ ndị okenye mmehie ha mere, ndị okenye enyere ha aka. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Daniel mere mmehie dị oké njọ, ma ọ chọghị ịga kọọrọ ya ndị okenye ọtụtụ ọnwa o mechara mmehie ahụ. O kwuru, sị: “Mgbe ọtụtụ oge gachara, m chere na ọ baghịzi uru ịga kọọrọ ya ndị okenye. Ma, ụjọ ka na-atụ m na mmadụ nwere ike ịmata ihe ahụ m mere. N’ihi ya, m chọọ ikpe ekpere, ihe mbụ m na-arịọ Jehova bụ ka ọ gbaghara m.” Daniel mechara gakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka. Ọ na-echeta ihe ndị mere mgbe ahụ. O kwuru, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na ụjọ nọ na-atụ m ịgakwuru ndị okenye. Ma, mgbe ha nyechaara m aka, ya adị m ka mmadụ ọ̀ bịara butuo m ibu na-anyịgbu m. Ugbu a, m nweziri ike ịgwa Jehova okwu n’enweghị ihe na-enye m nsogbu n’obi.” Taa, Daniel nwere akọnuche dị ọcha. Ọ ghọrọ ohu na-eje ozi n’oge na-adịghị anya.
“Ọ GA-AGBAGAKWA N’OTU N’IME OBODO NDỊ A”
10. Gịnị ka onye gburu mmadụ n’amaghị ama ga-eme ka Chineke nwee ike imere ya ebere?
10 Onye gburu mmadụ n’amaghị ama ga-eme ihe ka Chineke nwee ike imere ya ebere. Ọ ga-agbaga n’obodo mgbaba kacha dịrị ya nso. (Gụọ Jọshụa 20:4.) Ka o nwee ike ịdị ndụ, ọ ga-agbagarịrị n’obodo mgbaba ahụ ma nọrọ ebe ahụ. Nke a pụtara na ọ ga-ahapụ ihe niile gbaga ebe ahụ. Ọ ga-ahapụ ọrụ ya, nakwa ezigbo ụlọ ya. Ọ gaghịkwa enwere onwe ya ịga ebe ọ bụla ọ chọrọ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ. * (Ọnụ Ọgụ. 35:25) Ma, ime ihe ndị ahụ baara ya uru. Ọ bụrụ na ọ hapụ obodo ahụ ọ gbagara, ọ pụtara na mmadụ ahụ o gburu ewuteghị ya. O nwekwara ike ịta isi ya.
11. Olee ihe Onye Kraịst mere mmehie ma chegharịa ga-eme iji gosi na o ji ebere Chineke meere ya kpọrọ ihe?
11 Taa, onye mere mmehie ma chegharịa ga-eme ihe ka Chineke nwee ike ịgbaghara ya. Ọ ga-akwụsịrịrị mmehie ahụ. Ọ ga-agbara ma mmehie dị oké njọ, ma obere mmehie ndị na-emekarị ka mmadụ mee mmehie dị oké njọ, ọsọ. Pọl onyeozi kwuru ihe Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt mere mmehie ma chegharịa mere. O kwuru, sị: “Lee ihe mwute unu nwere dị ka uche Chineke si dị rụpụtara: ọ rụpụtara n’ime unu oké ịdị ọkụ n’obi, ee, iwepụ onwe unu n’ụta, ee, iwe, ee, egwu, ee, inwe agụụ siri ike, ee, ịnụ ọkụ n’obi, ee, imezi ihe e mejọrọ!” (2 Kọr. 7:10, 11) Ọ bụrụ na anyị agbalịa kwụsị ihe ọjọọ anyị na-eme, anyị na-egosi Jehova na ihe ahụ anyị mere na-ewute anyị, nakwa na anyị ji ebere o meere anyị kpọrọ ihe.
12. Gịnị ka Onye Kraịst nwere ike ịhapụ ka Jehova nwee ike imere ya ebere?
12 Gịnị ka Onye Kraịst nwere ike ịhapụ ka Jehova nwee ike ịna-emere ya ebere? Ọ ga-adị njikere ịhapụ ihe ndị na-atọ ya ụtọ ọ na-eme ma ọ bụrụ na ha ga-eme ka o mee mmehie. (Mat. 18:8, 9) Ọ bụrụ na ndị enyi gị achọọ ka i mee ihe na-adịghị Jehova mma, ị̀ ga-akwụsị gị na ha ịna-akpa? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịkwụsị ịṅụ oké mmanya, ị̀ ga-akwụsị ịga ebe ụfọdụ nwere ike ime ka ị ṅụọ oké mmanya? Ọ bụrụ na gị na agụụ ịkwa iko na-alụ, ị̀ ga-akwụsị ile fim, ịga ebe ụfọdụ n’Ịntanet, ma ọ bụ ime ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ị na-eche ime ihe ọjọọ? Cheta na ihe ọ bụla anyị mere iji rubere Jehova isi, efughị ọhịa. E nweghị ihe na-ewute mmadụ karịa onye ahụ iche na Jehova ajụla ya. E nweghịkwa ihe na-eme mmadụ obi ụtọ karịa mmadụ inwe “obiọma ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Aịza. 54:7, 8.
‘HA GA-ABỤKWARA UNU EBE MGBABA’
13. Kọwaa ihe mere obi ga-eji ruo onye gbabara n’obodo mgbaba ala, ya ana-enwekwa obi ụtọ.
13 Onye gburu mmadụ n’amaghị ama gbabahaala n’obodo mgbaba, o nweghịzi ihe ga-eme ya. Jehova kwuru banyere obodo ndị ahụ, sị: ‘Ha ga-abụkwara unu ebe mgbaba.’ (Jọsh. 20:2, 3) Jehova achọghị ka e kpee onye gburu mmadụ n’amaghị ama ikpe ọzọ maka ihe ahụ o mere. A gaghịkwa ekwe nwanne onye ahụ e gburu egbu ka ọ bata n’obodo mgbaba gbuo onye ahụ. Ụjọ ekwesịghị ịna-atụ onye ahụ gbabara n’obodo mgbaba. Jehova ga-echebe ya n’obodo ahụ. Ma, ọ nọghị na mkpọrọ. O nwere ike ịrụ ọrụ, nyere ndị ọzọ aka, na-efekwa Jehova, obi eruo ya ala. O doro anya na ọ ga na-enwe obi ụtọ, ndụ ya enweekwa isi.
14. Olee ihe ga-emesi Onye Kraịst mere mmehie ma chegharịa obi ike?
14 Obi ka na-ama ụfọdụ ndị ohu Jehova mere mmehie dị oké njọ ikpe n’agbanyeghị na ha echegharịala. Ụfọdụ na-eche na Jehova emekataghị chefuo ihe ahụ ha mere. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova gbaghara gị, ọ gbagharala gị kpamkpam. N’ihi ya, obi ekwesịghị ịna-ama gị ikpe. Daniel anyị kwuburu okwu ya chọpụtara na ọ bụ eziokwu. Mgbe ndị okenye gbazichara ya ma nyere ya aka ka akọnuche ya dị ọcha, Abụ Ọma 103:8-12.
ọ sịrị: “Obi bịara ruo m ala. Mgbe ha lebachara okwu ahụ anya, obi kwụsịrị ịma m ikpe. Jehova gbaghara gị, nke ahụ agaala. Ọ na-eburu ibu ahụ na-anyịgbu gị buga ebe dị anya. Ị gaghị ahụ ya ọzọ.” Ozugbo onye ahụ gburu mmadụ gbabara n’obodo mgbaba, ọ gaghị na-atụ ụjọ na onye ọbọ ọbara ga-abịa gbuo ya. Otú ahụ ka Jehova na-emekwa anyị. Ozugbo ọ gbaghaara anyị, anyị ekwesịghị ịna-atụ ụjọ na ọ ga-echetakwa ya ọzọ ma ọ bụ taa anyị ahụhụ maka ya.—Gụọ15, 16. Ebe Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà ma jiri ndụ ya chụọ àjà n’ihi anyị, gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na Chineke ga-emere gị ebere?
15 Anyị nwere ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike karịa otú ndị Izrel nwere na Jehova ga-emere anyị ebere. Mgbe Pọl kwuchara otú o si hụsie anya n’ihi na o rubereghị Jehova isi otú kwesịrị ekwesị, o kwuru, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị.” (Rom 7:25) Ọ bụ eziokwu na Pọl nọ na-alụso agụụ ihe ọjọọ na-agụ ya ọgụ, meekwa mmehie n’oge gara aga, ma chegharịa, obi sikwara ya ike na Chineke agbagharala ya n’ihi Jizọs. Jizọs na-eme ka anyị nwee akọnuche dị ọcha, na-emekwa ka obi na-eru anyị ala n’ihi na ọ bụ Onye Mgbapụta anyị. (Hib. 9:13, 14) Ebe ọ bụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, “o nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.” (Hib. 7:24, 25) N’oge ochie, nnukwu onye nchụàjà mere ka obi sie ndị Izrel ike na Jehova ga-agbaghara ha mmehie ha. Ebe Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, obi kwesịrị isi anyị ike karịa ndị Izrel na ‘a ga-emere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.’—Hib. 4:15, 16.
16 Ka anyị nwee ike ịgbaba n’ime Jehova, anyị kwesịrị inwe okwukwe n’àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. Echela naanị na ihe mgbapụta ahụ baara ọtụtụ ndị uru. Nwee okwukwe na ọ baara gịnwa uru. (Gal. 2:20, 21) Nweekwa okwukwe na Jehova na-agbaghara gị mmehie gị n’ihi ihe mgbapụta ahụ. Nwee okwukwe na o mere ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ bụ onyinye Jehova nyere gị.
17. Gịnị mere ị ga-eji gbaba n’ime Jehova?
17 Obodo mgbaba ndị ahụ na-eme ka anyị ghọta na Jehova na-emere anyị ebere. Ndokwa a Chineke mere na-akụziri anyị na ndụ dị nsọ. Ọ na-egosikwa otú ndị okenye nwere ike isi nyere anyị aka, ihe mmadụ ichegharị ná mmehie ya pụtara, nakwa ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ezigbo ike na Jehova na-agbaghara anyị mmehie. Ị̀ gbabala n’ime Jehova? O nweghị ebe ị ga-agbaba ahụ́ eruo gị ala karịa ya. (Ọma 91:1, 2)N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’otú obodo mgbaba ndị ahụ ga-esi nyere anyị aka iṅomi Jehova, bụ́ onye ikpe ziri ezi ya na onye ebere ya n’enweghị atụ.
^ para. 10 Ndị ọkà mmụta ndị Juu kwuru na onye ahụ gburu mmadụ n’amaghị ama na ezinụlọ ya nwere ike ibi n’obodo mgbaba ahụ.