Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 49

Jehova Ọ̀ Ga-aza Ekpere M?

Jehova Ọ̀ Ga-aza Ekpere M?

“Unu ga-akpọku m, bịakwa rịọ m arịrịọ. M ga-egekwa unu ntị.”​—JERE. 29:12.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Gịnị mere anyị nwere ike iji chee na Jehova anaghị aza ekpere anyị?

 “NA-ENWE ezigbo obi ụtọ n’ihi Jehova. Ọ ga-emere gị ihe obi gị chọrọ.” (Ọma 37:4) Nkwa a Baịbụl kwere magburu onwe ya. Ma, ànyị kwesịrị ịtụwa anya na Jehova ga-emere anyị ihe niile anyị rịọrọ ya ozugbo? Gịnị mere ihe a ji bụrụ ezigbo ajụjụ? Ka anyị legodị ihe atụ ndị a. Otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di kpere ekpere ka ọ gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ma, ọtụtụ afọ agafeela, a kpọbeghị ya. Otu nwanna bụ́ nwa okorobịa rịọrọ Jehova ka o mee ka ọrịa ọjọọ na-arịa ya kwụsị ka o nwee ike ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ. Ma, ọ gbakeghị. Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kpere ekpere ka nwa ha nọsie ike n’ọgbakọ. Ma, nwa ha ahụ mechara kwụsị ife Jehova.

2 O nwere ike ịbụ na gịnwa arịọla Jehova ka o meere gị ihe, ma e mebereghị gị ya, ya emee ka i chee na Jehova na-aza ekpere ndị ọzọ, ma ọ naghị aza nke gị. I nwekwara ike ịna-eche na e nwere ihe ọjọọ i mere. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Janice b chere otú ahụ. Ya na di ya kpere ekpere na ha chọsiri ike ije ozi na Betel. Ọ sịrị: “Obi siri m ike na anyị ga-aga Betel n’oge na-adịghị anya.” Ma, ọtụtụ afọ agafeela, a kpọbeghị ha ka ha jewe ozi na Betel. Nwanna Nwaanyị Janice sịrị: “Obi jọrọ m njọ, amaghịkwa m ihe m ga-eme eme. M chere na e nweela ihe m mere kpasuru Jehova iwe. M kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka m jee ozi na Betel. Gịnị mere Jehova azabeghị ekpere m?”

3. Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a?

3 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche ma Jehova ọ̀ na-anụkwa ekpere anyị. E nwedịrị ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie ọ dị otú ahụ. (Job 30:20; Ọma 22:2; Hab. 1:2) Olee ihe nwere ike ime ka obi sie gị ike na Jehova ga-aza ekpere gị? (Ọma 65:2) Iji nyere anyị aka ịmata azịza ya, anyị kwesịrị ibu ụzọ zaa ajụjụ ndị a: (1) Gịnị ka anyị kwesịrị ịtụ anya ka Jehova mee? (2) Gịnị ka Jehova na-atụ anya ka anyị mee? (3) Gịnị mere o nwere ike iji dị mkpa ka anyị gbanwee ihe ụfọdụ anyị na-ekpe n’ekpere?

GỊNỊ KA ANYỊ KWESỊRỊ ỊTỤ ANYA KA JEHOVA MEE?

4. Dị ka e kwuru na Jeremaya 29:12, gịnị ka Jehova kwere nkwa ime?

4 Jehova kwere nkwa na ọ ga-ege ntị n’ekpere anyị. (Gụọ Jeremaya 29:12.) Chineke anyị hụrụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’anya. N’ihi ya, ọ na-ege ntị n’ekpere ha. (Ọma 10:17; 37:28) Ma, ihe a apụtaghị na ọ ga-emere anyị ihe niile anyị na-arịọ ya. Ọ bụ n’ime ụwa ọhụrụ ka ọ ga-emere anyị ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị na-arịọ ya.

5. Gịnị ka Jehova na-echebara echiche ma ọ na-ege ntị n’ekpere anyị? Kọwaa.

5 Jehova na-echebara otú ekpere anyị si gbasa nzube ya echiche. (Aịza. 55:8, 9) Ihe so ná nzube ya bụ ime ka ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị ji otu obi na-efe ya ju n’ụwa, ya ana-achị ha. Ma, Setan kwuru na ihe ga-akara ụmụ mmadụ mma ma ha chịwa onwe ha. (Jen. 3:1-5) Iji gosi na Setan bụ onye ụgha, Jehova kwere ka ụmụ mmadụ na-achị onwe ha. Ma, ọchịchị ụmụ mmadụ akpatala ọtụtụ nsogbu ndị anyị na ha na-alụ taa. (Ekli. 8:9) Anyị ghọtara na Jehova agaghị ewepụrụ anyị nsogbu niile taa. Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọchịchị ụmụ mmadụ na-azụta ihe a tụrụ ya n’ahịa, nakwa na ọ ga-akwụsịli nsogbu ụmụ mmadụ.

6. Olee ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe ọ bụla Jehova na-eme na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi?

6 Otú Jehova nwere ike isi aza otu ihe ndị ohu ya rịọrọ ya nwere ike ịdị iche iche. Mgbe Eze Hezekaya nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịgbake. Jehova zara ekpere ya, mee ka ọ gbakee. (2 Eze 20:1-6) Ma, mgbe Pọl onyeozi rịọrọ Jehova ka o wepụrụ ya ‘nsogbu dị ka ogwu na-adụ ya n’ahụ́,’ nke nwere ike ịbụ ọrịa na-arịa ya, Jehova ewepụrụghị ya nsogbu ahụ. (2 Kọr. 12:7-9) Ndị ọzọ bụ Jems onyeozi na Pita onyeozi. Eze Herọd chọrọ igbu ha abụọ. Ọgbakọ kpeere Pita ekpere. Ọ ga-abụkwa na ha kpeere Jems. Ma, e gburu Jems, Chineke arụọ ọrụ ebube napụta Pita. (Ọrụ 12:1-11) Anyị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Gịnị mere Jehova ji napụta Pita, mana ọ napụtaghị Jems?’ Baịbụl agwaghị anyị. c Ma, otu ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya bụ na Jehova “anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.” (Diut. 32:4) Anyị makwa na Jehova hụrụ ma Pita ma Jems n’anya. (Mkpu. 21:14) Mgbe ụfọdụ, Jehova nwere ike ịza ekpere anyị otú na-abụghị otú anyị tụrụ anya ya. Ma, ebe obi siri anyị ike na ihe niile Jehova na-eme bụ maka na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, anyị anaghị eme mkpesa maka otú o kpebiri isi aza ekpere anyị.​—Job 33:13.

7. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? Maka gịnị?

7 Anyị ekwesịghị iji otú Jehova si za ekpere anyị na-atụnyere otú o si za ekpere ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o meere anyị otu ihe, ma o mereghị anyị ya. E mechaa, anyị achọpụta na e nwere onye ọzọ rịọrọ otu ụdị ihe ahụ, ya eyie ka Jehova ò meere ya ihe ahụ. Ihe a mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anna. O kpere ekpere ka Jehova mee ka di ya aha ya bụ Matthew gbakee n’ọrịa kansa ọ na-arịa. N’otu oge ahụ, e nwere ụmụnna nwaanyị abụọ mere agadi na-arịakwa kansa. Nwanna Nwaanyị Anna kpesiri ekpere ike ka Jehova nyere di ya na ụmụnna nwaanyị ndị ahụ aka. Ụmụnna nwaanyị ndị ahụ gbakere, ma di Anna nwụrụ. Ná mmalite, Nwanna Nwaanyị Anna jụrụ onwe ya ma ihe mere ụmụnna nwaanyị ahụ ji gbakee ọ̀ bụ na Jehova nyeere ha aka ịgbake. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere Jehova azaghị ekpere o kpere ka di ya gbakee? N’eziokwu, anyị agaghị ekwuli ihe mere ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ ji gbakee. Ihe anyị ma bụ na oge na-abịa mgbe Jehova ga-ewepụrụ anyị nsogbu anyị niile. Ọ na-agụsikwa ya agụụ ike ịkpọlite ndị enyi ya nwụrụ anwụ.​—Job 14:15.

8. (a) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 43:2, olee otú Jehova si akwado anyị? (b) Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka n’oge ọnwụnwa tara akpụ bịaara anyị? (Kwuokwa ihe dị na vidio bụ́ Ekpere Na-enyere Anyị Aka Idi Nsogbu.)

8 Jehova ga-akwado anyị mgbe niile. Ọ na-ewute Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova ma anyị na-ata ahụhụ. (Aịza. 63:9) Ma, ọ naghị ewepụrụ anyị nsogbu anyị niile. E nwere ike iji nsogbu ndị ahụ tụnyere osimiri ma ọ bụ ọkụ. (Gụọ Aịzaya 43:2.) Ma, o kwere anyị nkwa na ọ ga-enyere anyị aka ‘ịgafe’ ha. Ọ gaghị ekwe ka nsogbu ndị na-abịara anyị mee ka anyị kwụsị ife ya. Jehova na-enyekwa anyị mmụọ nsọ ya nke na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị nwere. (Luk 11:13; Fil. 4:13) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji die nsogbu anyị, nọsiekwa ike n’ofufe ya. d

GỊNỊ KA JEHOVA NA-ATỤ ANYA KA ANYỊ MEE?

9. Dị ka e kwuru na Jems 1:6, 7, gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka?

9 Jehova chọrọ ka anyị tụkwasị ya obi. (Hib. 11:6) Mgbe ụfọdụ, nsogbu na-abịara anyị na-eyi ihe anyị na-agaghị edili. Anyị nwedịrị ike ịna-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-enyekwara anyị aka. Ma, Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji ‘wụfee mgbidi.’ (Ọma 18:29) N’ihi ya, kama ịnọ na-enwe obi abụọ, anyị kwesịrị ikpe ekpere, nwee okwukwe siri ike na Jehova ga-aza ekpere anyị.​—Gụọ Jems 1:6, 7.

10. Mee ihe atụ otú anyị nwere ike isi eme ihe dabara n’ekpere anyị.

10 Jehova na-atụ anya ka anyị mee ihe dabara n’ekpere anyị. Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ike ịgwa Jehova ka o mee ka onye ọ na-arụrụ ọrụ nye ya oge ọ ga-eji aga mgbakọ ukwu. Olee otú Jehova nwere ike isi aza ekpere ya? O nwere ike ime ka nwanna ahụ nwee obi ike ọ ga-eji gakwuru onye ọ na-arụrụ ọrụ. Ma, ọ bụ nwanna ahụ ka ọ dị n’aka ịgakwuru onye ọ na-arụrụ ọrụ ma gwa ya ihe ọ chọrọ ka e meere ya. O nwere ike ịrịọ onye ọ na-arụrụ ọrụ ọtụtụ ugboro. O nwedịrị ike ikwu ka onye ọrụ ibe ya rụchitere ya, e mechaa, ya arụọ nke onye ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, o nwere ike ikwu ka a ghara ịkwụ ya ụgwọ n’oge ahụ ọ na-agaghị anọ ya.

11. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro gbasara nsogbu anyị?

11 Jehova chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro gbasara ihe ndị dị anyị mkpa. (1 Tesa. 5:17) Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ bụghị ihe niile anyị kpere n’ekpere ka a ga-emere anyị ozugbo. (Luk 11:9) N’ihi ya, adala mbà. Na-ekpesi ekpere ike, na-ekpekwa ya ọtụtụ ugboro. (Luk 18:1-7) Ọ bụrụ na ike agwụghị anyị ikpe ekpere gbasara ihe anyị na-arịọ, anyị na-egosi Jehova na ihe ahụ anyị rịọrọ ya dị anyị ezigbo mkpa. Ọ na-egosikwa na anyị nwere okwukwe na Jehova ga-enyeliri anyị aka.

GỊNỊ MERE O NWERE IKE IJI DỊ MKPA KA ANYỊ GBANWEE IHE ỤFỌDỤ ANYỊ NA-EKPE N’EKPERE?

12. (a) Olee otu ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị gbasara ekpere anyị? N’ihi gịnị? (b) Olee otú anyị ga-esi hụ na ekpere anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị M Na-arịọ Jehova Hà Na-egosi na M Na-akwanyere Ya Ùgwù?”)

12 Ọ bụrụ na e mereghị anyị ihe anyị na-ekpe n’ekpere, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ atọ. Nke mbụ bụ, ‘Ọ̀ bụ ihe a ka m kwesịrị ikpe n’ekpere?’ Ọtụtụ mgbe, anyị na-eche na anyị ma ihe ga-akacha baara anyị uru. Ma ihe ahụ anyị na-arịọ nwere ike ịbụ ihe na-agaghị abara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere gbasara otu nsogbu anyị nwere, o nwere ike ịbụ na e nwere ụzọ ka mma nsogbu ahụ ga-esi kwụsị karịa nke anyị na-arịọ. Ụfọdụ ihe anyị na-arịọ nwekwara ike ịbụ na ha adabaghị n’uche Jehova. (1 Jọn 5:14) Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara nne na nna ahụ anyị kwuru okwu ha ná mmalite. Ha rịọrọ Jehova ka o nyere nwa ha aka ịnọsi ike n’ọgbakọ. Ihe a yiri ihe ha kwesịrị ịrịọ. Ma, Jehova agaghị amanye onye ọ bụla n’ime anyị ife ya. Ọ chọrọ ka anyị niile, ma ụmụ anyị, jiri aka anyị kpebie ife ya. (Diut. 10:12, 13; 30:19, 20) N’ihi ya, ihe nne na nna ahụ gaara arịọ Jehova bụ ka o nyere ha aka ka ihe ha na-akụziri nwa ha ruo ya n’obi, nke ga-eme ka ọ hụ Jehova n’anya ma bụrụ enyi ya​—Ilu 22:6; Efe. 6:4.

13. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 4:16, olee mgbe Jehova ga-enyere anyị aka? Kọwaa.

13 Ajụjụ nke abụọ bụ, ‘Ihe a ọ̀ bụ oge Jehova chọrọ imere m ihe m na-arịọ ya?’ Anyị nwere ike iche na e kwesịrị imere anyị ihe anyị na-ekpe n’ekpere ozugbo. Ma, n’eziokwu, Jehova ma oge kacha mma ọ ga-eji enyere anyị aka. (Gụọ Ndị Hibru 4:16.) Ọ bụrụ na e mereghị anyị ihe anyị na-arịọ ozugbo, anyị nwere ike iche na Jehova azaghị ekpere anyị. Ma, o nwere ike ịbụ na oge erubeghị ka ọ za anyị ekpere ahụ. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara nwanna nwoke ahụ kpere ekpere ka Jehova gwọọ ya ọrịa ya. Ọ bụrụ na Jehova arụọ ọrụ ebube gwọọ ya, Ekwensu nwere ike ịsị na ihe mere nwanna ahụ ji na-efe Jehova bụ naanị n’ihi na Jehova gwọrọ ya. (Job 1:9-11; 2:4) Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ewepụtala oge ọ ga-eji gwọọ ọrịa niile. (Aịza. 33:24; Mkpu. 21:3, 4) Ruokwa oge ahụ, anyị agaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị ọrịa. N’ihi ya, nwanna nwoke ahụ nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye ya ike ọ ga-eji die nsogbu ahụ nakwa ka o mee ka obi ruo ya ala ka o nwee ike iji obi ya niile na-efe Jehova.​—Ọma 29:11.

14. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Janice?

14 Chegodị gbasara Nwanna Nwaanyị Janice bụ́ onye kpere ekpere ka o jewe ozi na Betel. Afọ ise gafere tupu ya amata otú Jehova si za ekpere ya. Ọ sịrị: “Jehova ji oge ndị ahụ kụziere m ihe, nyekwara m aka ịghọkwu ezigbo Onye Kraịst. M kwesịrị ịtụkwasịkwu ya obi, mụta otú m ga-esi na-amụ ihe n’onwe m, mụtakwa na m kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ebe m nọ na-ejere Jehova ozi.” E mechara kpọọ Nwanna Nwaanyị Janice na di ya ka ha rụwa ọrụ sekit. Nwanna Nwaanyị Janice kwuru gbasara oge ahụ, sị: “Jehova zara ekpere m, ọ bụ eziokwu na ọ bụghị otú m tụrụ anya ya ka o si za m ya. O were m oge ịghọta na otú ahụ Jehova si za ekpere m bụ onyinye magburu onwe ya o nyere m. Obi dị m ezigbo ụtọ ịchọpụta na Jehova hụrụ m n’anya ma na-enwere m obiọma.”

Ọ bụrụ na i chee na Jehova emebeghị ihe ị rịọrọ ya n’ekpere, rịọ maka ihe ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) f

15. Gịnị mere o ji dị mkpa mgbe ụfọdụ ka anyị ghara ịkapịcha ihe anyị na-ekpe n’ekpere ọnụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

15 Ajụjụ nke atọ bụ, ‘M̀ kwesịrị ikpewe ekpere gbasara ihe ọzọ?’ Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma ịna-akapị okwu ọnụ ma anyị kpewe ekpere, ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịka mma ka anyị ghara ịkapịcha ya ọnụ ka anyị nwee ike ịchọpụta ihe Jehova chọrọ imere anyị. Chegodị gbasara nwanna nwaanyị ahụ kpere ekpere na ya chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ihe mere o ji chọọ ịga ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ka o nwee ike gaa ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. N’ihi ya, ka ọ na-ekpe ekpere ka a kpọọ ya ka ọ gaa ụlọ akwụkwọ ahụ, o nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka ịchọpụta ohere ndị ọzọ o nwere ike iji jekwuoro ya ozi. (Ọrụ 16:9, 10) Ihe o nwere ike ime maka ekpere ahụ o kpere bụ ịjụ onye nlekọta sekit ha ma è nwere ọgbakọ dị nso chọkwuru ndị ọsụ ụzọ. O nwekwara ike idegara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi jụọ ha ma è nwere ebe a chọkwuru ndị nkwusa. e

16. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

16 Dị ka anyị mụtarala, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-aza ekpere anyị otú na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Ọma 4:3; Aịza. 30:18) Mgbe ụfọdụ, ọ bụghị otú anyị tụrụ anya ya ka Jehova ga-esi aza anyị ekpere. Ma, Jehova anaghị eleghara ekpere anyị anya. Ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ọ gaghịkwa ahapụ anyị. (Ọma 9:10) N’ihi ya, ‘tụkwasị ya obi mgbe niile,’ na-ekpe ekpere na-akọrọ ya otú ọ dị gị n’obi.​—Ọma 62:8.

ABỤ NKE 43 Ekpere E Ji Ekele Chineke

a N’isiokwu a, anyị ga-aghọta ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-aza ekpere anyị mgbe niile otú gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ò Siri Gị Ike na Jehova Na-eme Ihe Dị Mma Mgbe Niile?” nke gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 2022, paragraf nke 3 ruo na nke 6.

d Ị chọọ ịmatakwu otú Jehova si enyere anyị aka idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, lee vidio dị na jw.org isiokwu ya bụ Ekpere Na-enyere Anyị Aka Idi Nsogbu.

e Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi jee ozi ná mba ọzọ, gụọ akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, isi nke 10, paragraf nke 6 ruo na nke 9.

f NKỌWA FOTO: Ụmụnna nwaanyị abụọ kpere ekpere tupu ha edejupụta fọm ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. E mechara kpọọ otu onye, mana a kpọghị onye nke ọzọ. Kama onye nke ahụ a na-akpọghị iwewe iwe, o kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere ya aka ịchọpụta ụzọ ndị ọzọ ọ ga-esi jekwuoro ya ozi. O degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi ma kwuo na ọ chọrọ ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.