ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32
Ndị Na-eto Eto, Na-emekwunụ Nke Ọma ma Unu Mechaa Baptizim
“Ka ịhụnanya mee ka anyị tozuo etozuo n’ụzọ niile.”—EFE. 4:15.
ABỤ NKE 56 Ka Eziokwu Bamie Gị n’Obi
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ụfọdụ ihe ọma ọtụtụ ndị na-eto eto merela?
KWA afọ, ọtụtụ ụmụnna na-eto eto na-eme baptizim. Ì meela baptizim? Ọ bụrụ na i meela, ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ ji gị eme ọnụ. Obi dịkwa Jehova ụtọ. (Ilu 27:11) Chetụgodị gbasara ihe ọma ndị i merela. Ị mụọla Baịbụl nke ọma. O nwekwara ike ịbụ na o were gị afọ ole na ole. Ihe ndị ị mụtara mere ka obi sie gị ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Ihe ọzọkwa bụ na ị mụtala gbasara onye e dere uche ya n’Akwụkwọ Nsọ ma hụ ya n’anya. Otú i si hụ Jehova n’anya mere ka i nyefee ya onwe gị, e meekwa gị baptizim. Ihe a i mere magburu onwe ya.
2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
2 O doro anya na tupu e mee gị baptizim, e nwere nsogbu ndị bịaara gị mere ka irubere Jehova isi siere gị ike. Ma ka ị na-anọkwu n’ọgbakọ, nsogbu ndị ọhụrụ ga-abịakwa. Setan ga-agbalị ime ka ị kwụsị ịhụ Jehova n’anya otú ị hụburu ya, nakwa ime ka ị kwụsị ife ya. (Efe. 4:14) Ekwekwala ka o nweta gị. Gịnị nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị irubere Jehova isi ma mezuo nkwa ahụ i kwere ya mgbe i nyefere ya onwe gị? Ị ga-agbasi mbọ ike ka ị “na-eme nke ọma” ruo mgbe ị ghọrọ Onye Kraist tozuru etozu. (Hib. 6:1) Olee otú i nwere ike isi eme ya? Anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a.
OLEE OTÚ Ị GA-ESI NA-EMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ?
3. Gịnị ka Ndị Kraịst niile kwesịrị ime ma e mechaa ha baptizim?
3 Anyị mechaa baptizim, anyị niile kwesịrị ime ihe ahụ Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs ka ha mee. Ọ gbara ha ume ka ha bụrụ Ndị Kraịst bụ́ “dimkpa.” (Efe. 4:13) Ihe ọ pụtara bụ na ha ga-agbalị ‘na-emekwu nke ọma.’ Pọl ji otú Onye Kraịst si eme nke ọma tụnyere otú nwatakịrị si eto. A mụọ nwa ọhụrụ, obi na-adị nne na nna ya ezigbo ụtọ, ha na-ejikwa ya eme ọnụ. Ma, nwa ahụ agaghị abụ taata ruo mgbe ebighị ebi. Ka oge na-aga, ọ ga-akwụsị ‘ịna-eme ka nwatakịrị.’ (1 Kọr. 13:11) Otú ahụ ka ọ dịkwa Ndị Kraịst. Anyị ga-agbalị na-emekwu nke ọma ma e mechaa anyị baptizim. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ịna-eme ya.
4. Olee àgwà ga-enyere gị aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ? Kọwaa. (Ndị Filipaị 1:9)
4 Na-ahụkwu Jehova n’anya. Ị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ma, i nwere ike ịhụkwu ya n’anya. Olee otú i nwere ike isi eme ya? Pọl onyeozi kwuru gbasara otu ụzọ n’akwụkwọ Ndị Filipaị 1:9. (Gụọ ya.) Pọl kpere ekpere ka ịhụnanya ụmụnna nọ na Filipaị “na-abakwu ụba.” N’ihi ya, anyị nwere ike ịhụkwu Jehova n’anya. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Ọ bụ ‘ịna-amatakwu uche Chineke nke ọma ma na-aghọtacha uche ya.’ Ọ bụrụ na anyị ana-amatakwu onye Jehova bụ, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya, àgwà ya na otú o si eme ihe ana-amasịkwa anyị. Anyị ga na-achọsi ike ịna-eme ya obi ụtọ. Anyị agatụdịghị achọ ime ihe ga-akpasu ya iwe. Anyị ga-agbalịsi ike ghọta ihe ọ chọrọ ka anyị mee na otú anyị ga-esi eme ya.
5-6. Olee otú anyị ga-esi na-ahụkwu Jehova n’anya? Kọwaa.
5 Anyị nwere ike ịhụkwu Jehova n’anya ma anyị mata Ọkpara ya nke ọma. Jizọs na-akpa nnọọ àgwà ka Nna ya. (Hib. 1:3) Otú kacha mma anyị ga-esi mata Jizọs nke ọma bụ ịmụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ọ bụrụ na i bidobeghị ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, ọ ga-adị mma ka i bido ugbu a. Ka ị na-agụ akwụkwọ Baịbụl anọ ndị ahụ, lekwasị anya n’àgwà ndị Jizọs nwere. Dị ka ihe atụ, obi na-adị ndị mmadụ ụtọ ịbịakwute ya ma na-agwa ya okwu. O nwere mgbe o kuuru ụmụntakịrị. (Mak 10:13-16) Jizọs dị obiọma ma na-emesapụ ihu. Ụjọ atụghị ndị na-eso ụzọ ya ịgwa ya otú obi dị ha. (Mat. 16:22) Anyị ma na Jizọs na-eme ka Nna ya. N’ihi ya, anyị mụtara na ọ dị mfe ịgakwuru Jehova ma gwa ya okwu. Anyị nwere ike ịgwa ya otú obi dị anyị na ihe niile anyị na-eche ma anyị kpewe ekpere. Obi siri anyị ike na ọ gaghị ama anyị ikpe. Ọ hụrụ anyị n’anya, ihe banyere anyị na-emetụkwa ya n’obi.—1 Pita 5:7.
6 Jizọs meteere ndị mmadụ ebere. Matiu onyeozi kwuru, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o meteere ha ebere, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Olee otú obi dị Jehova gbasara ụdị ihe a? Jizọs sịrị: “Otú ahụ kwa ka ọ na-adịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.” (Mat. 18:14) Ihe a na-eme anyị obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-amatakwu Jizọs nke ọma, anyị ga na-ahụkwu Jehova n’anya.
7. Olee uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na gị na ụmụnna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ana-akpakọrịta?
7 I nwekwara ike ịmụta ịna-ahụkwu ndị ọzọ n’anya ma na-emekwu nke ọma ma ị na-ewepụta oge ka gị na ụmụnna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ unu na-anọrị. Chọpụta na obi bụ ha sọ aṅụrị. Ha anaghị akwa mmakwaara gbasara ozi ha na-ejere Jehova. Jụọ ha ka ha kọtụrụ gị ihe ndị merela n’ozi ha. E nwee ihe dị mkpa ị chọrọ ikpebi ime, gwa ha ka ha nye gị ndụmọdụ. Echefula na “ihe na-aga nke ọma ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”—Ilu 11:14.
8. Gịnị ka i nwere ike ime ma i nwewe obi abụọ n’ihe ndị Baịbụl na-akụzi?
8 Kwụsị inwe obi abụọ. Dị ka anyị kwuru na paragraf nke abụọ, Setan ga-agba mbọ ime ka ị kwụsị ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Otu ụzọ o nwere ike isi eme ya bụ ime ka i nwewe obi abụọ ma ihe ụfọdụ ị mụtara na Baịbụl hà bụkwa eziokwu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịgbalị ime ka i kweta na ọ bụghị Chineke kere anyị, kama na anyị nọkatara pụta. O nwere ike ịbụ na kemgbe ị dị obere, i chebeghị gbasara ya, ma ya abụrụ na a na-akụziri gị ya n’ụlọ akwụkwọ ugbu a. Ihe ndị nkụzi gị kwuru iji kwado ya nwere ike iyi eziokwu. Ma, ọ ga-abụ na ha agbalịbeghị chebara ihe ndị gosiri na e nwere Onye kere ihe niile echiche. Cheta ihe e dere n’Ilu 18:17. Ebe ahụ sịrị: “Mmadụ na ibe ya nwee okwu, ọ na-adị ka ọ̀ bụ onye bu ụzọ kwuo ihe na-ese na-ekwu eziokwu ruo mgbe onye nke ọzọ bịara gbaa ya ajụjụ.” Kama ikwere ihe niile a kụziiri gị n’ụlọ akwụkwọ, i kwesịrị ịmụ eziokwu ndị dị na Baịbụl nke ọma. Jiri akwụkwọ ndị nzukọ Jehova wepụtara mee nchọnchọ. Gị na ụmụnna ndị kweburu na ihe niile nọkatara pụta kwurịta ya. Jụọ ha ihe mere ha ji kweta na e nwere Onye hụrụ anyị n’anya kere ihe niile. Ikwu gbasara ihe ndị a ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị gosiri na e nwere Onye kere ihe niile.
9. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Melissa?
9 E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Melissa. b Nchọnchọ o mere gbasara ihe ndị e kere eke mere ka ọ kwụsị inwe obi abụọ. Ọ sịrị: “N’ụlọ akwụkwọ, otú ndị nkụzi si akọwa na ihe niile nọkatara pụta na-eme ka ndị mmadụ chee na ọ bụ eziokwu. Achọbughị m ime nchọnchọ banyere ya n’ihi na ụjọ ji m na m ga-achọpụta na ihe niile nọkatara pụta. Ma m chetara na Jehova chọrọ ka e nwee ezigbo ihe mere anyị ji kwere ihe ndị anyị kweere. N’ihi ya, m malitere ime nchọnchọ. Agụrụ m akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who na brọshọ bụ́ Cares About You?Was Life Created? na The Origin of Life —Five Questions Worth Asking. Ha nyeere m nnọọ ezigbo aka. A sị na m ma, m gaara eme nchọnchọ a tupu oge ahụ m mere ya.”
10-11. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịjụ omume rụrụ arụ? (1 Ndị Tesalonaịka 4:3, 4)
10 Jụ omume rụrụ arụ. Mgbe ị na-eto eto, o nwere ike ịna-agụsi gị agụụ ike inwe mmekọahụ. Ndị ọzọ nwekwara ike ịna-enye gị nsogbu ka i mee omume rụrụ arụ. Setan chọrọ ka i mee ihe ọ bụla na-agụ gị agụụ. Gịnị nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ime omume rụrụ arụ? (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:3, 4.) I kpewe ekpere, gwa Jehova otú obi dị gị, rịọkwa ya ka o mee ka ị dị ike. (Mat. 6:13) Cheta na Jehova chọrọ inyere gị aka, ọ bụghị ịma gị ikpe. (Ọma 103:13, 14) Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka. Melissa anyị kwuru okwu ya ná mmalite gbalịrị kwụsị iche ihe rụrụ arụ. Ọ sịrị: “Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị nyeere m aka ịlụso ihe na-adịghị mma na-agụ m ọgụ. O chetaara m na abụ m nke Jehova nakwa na m chọrọ ife ya.”—Ọma 119:9.
11 Agbalịla idozi nsogbu gị naanị gị. Mee ka nne na nna gị mata ihe gị na ya na-alụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịcha mfe ikwu gbasara ihe ụfọdụ, ma ọ ga-abara gị ezigbo uru ma i mee otú ahụ. Nwanna Nwaanyị Melissa kwuru, sị: “Arịọrọ m Jehova ka o nye m obi ike, mụ na papa m ekwuzie gbasara nsogbu m nwere. Ka anyị kwurịtachara ya, obi bịara ruo m ala. Ama m na ihe ahụ m mere mere Jehova obi ụtọ.”
12. Gịnị nwere ike inyere gị aka ikpebi ime ihe dị mma?
12 Ka ihe Baịbụl kwuru na-eduzi gị. Ka ị na-etokwu, mama gị na papa gị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-ahapụ gị ka ị na-ekpebiri onwe gị ihe ụfọdụ. Ma, a ka nwere ọtụtụ ihe ị na-amaghị. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ime ihe ga-eme ka gị na Jehova gharazie ịdị ná mma? (Ilu 22:3) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kari kwuru ihe nyeere ya aka ime ihe dị mma. Ọ ghọtara na e kwesịghị inye Onye Kraịst tozuru etozu iwu n’ihe niile ọ na-eme ná ndụ. O kwuru, sị: “Ihe m kwesịrị ime bụ ịghọta otú Jehova si ele ihe anya, ọ bụghị naanị ịna-eme ihe iwu kwuru.” Ị gụwa Baịbụl, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka amaokwu a na-agwa m banyere otú Jehova si eche echiche? È nwere ihe o kwuru ga-enyere m aka ime ihe dị mma? Ọ bụrụ na e nwere, olee uru ime ya ga-abara m?’ (Ọma 19:7; Aịza. 48:17, 18) Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ị na-agụ echiche, ọ ga-adịrị gị mfe ikpebi ime ihe ndị na-amasị Jehova. Ọ bụrụ na ị na-emekwu nke ọma, ị ga-achọpụta na e kwesịghị inye iwu n’ihe niile n’ihi na ị ga-aghọta otú Jehova si ele ihe anya.
13. Olee otú ezigbo ndị enyi nwere ike isi enyere gị aka? (Ilu 13:20)
13 Na-emeta ndị hụrụ Jehova n’anya enyi. Dị ka anyị kwuburu, ndị enyi gị nwere ike inyere gị aka ịbụ Onye Kraịst ma nke a na-akọ. (Gụọ Ilu 13:20.) E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sara. E nwere mgbe ọ na-anaghịzi enwe obi ụtọ. Ma, e nwere ihe merenụ nyeere ya aka inwewekwa obi ụtọ. Ọ sịrị: “M nwetara ezigbo ndị enyi n’oge ha dị m nnọọ ezigbo mkpa. Mụ na otu nwanna nwaanyị bụ́ nwa agbọghọ na-anọkọ na-amụ Ụlọ Nche kwa izu. Enyi m ọzọ nyekwaara m aka ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ndị enyi m ahụ mere ka m jiri ịmụ ihe n’onwe m na ikpe ekpere kpọrọkwuo ihe. Mụ na Jehova malitere ịdị n’ezigbo mma, mụ ebidokwa ịna-enwe obi ụtọ.”
14. Olee otú Nwanna Julien si mete ezigbo ndị enyi?
14 Olee otú i nwere ike isi meta ezigbo ndị enyi ga-abara gị uru? E nwere otu nwanna bụzi okenye ugbu a aha ya bụ Julien. Ọ sịrị: “Mgbe m ka dị obere, ndị mụ na ha na-agakọ ozi ọma ghọrọ ezigbo ndị enyi m. Ha na-anụ ọkụ n’obi. Ha mekwara ka ịga ozi ọma na-atọ m ezigbo ụtọ. Ije ozi oge niile malitere gụsiwe m agụụ ike. Ọ bịakwara doo m anya na ihe mere na enwechaghị m ezigbo ndị enyi n’oge mbụ bụ na m na-emeta naanị ndị ọgbọ m enyi. Ka oge na-aga, emetakwara m ezigbo ndị enyi na Betel. Ihe ndị m mụtara n’aka ha nyeere m aka ịhọrọ ihe ndị dị mma m ji atụrụ ndụ. O mere ka mụ na Jehova dịrịkwuo ná mma.”
15. Gịnị ka Pọl gwara Timoti gbasara ndị ha na ya kwesịrị ịna-akpakọrịta? (2 Timoti 2:20-22)
15 Gịnị ka i kwesịrị ime ma ị chọpụta na e nwere onye nọ n’ọgbakọ ga-emebi gị ma gị na ya kpawa? Pọl ma na e nwere ụfọdụ ndị nọ ọgbakọ n’oge ahụ echiche ha ma ọ bụ àgwà ha na-adịghị ka nke Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere o ji gwa Timoti ka ọ gbaara ndị dị otú ahụ ọsọ. (Gụọ 2 Timoti 2:20-22.) Anyị anaghị eji adịm ná mma anyị na Jehova egwu egwu. Anyị gbara ezigbo mbọ tupu anyị na Jehova adịrị ná mma. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka onye ọ bụla mee ka anyị na Nna anyị nke eluigwe ghara ịdị ná mma.—Ọma 26:4.
OLEE OTÚ INWE IHE Ị GA-ACHỌ IME N’OZI JEHOVA GA-ESI NYERE GỊ AKA ỊNA-EMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ?
16. Olee ụdị ihe ndị i kwesịrị ikpebi ime?
16 Nwee ihe ndị bara uru ị ga-achọ ime n’ozi Jehova. Kpebie ime ihe ndị ga-eme ka okwukwe gị na-esikwu ike ma mee ka ị na-emekwu nke ọma. (Efe. 3:16) Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikpebi ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-amụkwu ihe n’onwe gị. (Ọma 1:2, 3) I nwekwara ike ịhụ na i kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile nakwa isi n’obi gị na-ekpe ya. O nwere ike ịbụ na i kwesịrị ịkpacharakwu anya ma ị họrọwa ihe ndị i ji atụrụ ndụ, nakwa awa ole ị na-eji eme ya. (Efe. 5:15, 16) Ọ bụrụ na Jehova ahụ na ị na-agbalịsi ike ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ, obi ga-adị ya ụtọ.
17. Olee otú inyere ndị ọzọ aka ga-esi eme ka ị na-enwe obi ụtọ?
17 Ị ga na-emekwu nke ọma ma ị na-enyere ndị ọzọ aka. Jizọs kwuru, sị: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ ma i jiri oge gị na ike gị na-enyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikpebi ịna-enyere ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị nọ n’ọgbakọ unu aka. O nwere ike ịbụ ịgara ha ahịa ma ọ bụkwanụ inyere ha aka ka ha mụta otú ha ga-esi na-apị ekwentị ma ọ bụ kọmputa ha. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, gbalịa ka ị bụrụ ohu na-eje ozi, ka i nwee ike ịna-enyekwuru ụmụnna gị aka. (Fil. 2:4) Ọ bụrụkwa na ị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke, o gosiri na ị hụrụ ha n’anya. (Mat. 9:36, 37) Ọ bụrụ na o kwere omume, gbalịa ka ị banye ozi oge niile.
18. Olee otú ozi oge niile ga-esi nyere gị aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ?
18 Ozi oge niile ga-eme ka gị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Ị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile, o nwere ike ime ka i ruo eruo ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. I nwere ike ije ozi na Betel ma ọ bụ soro na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. E nwere otu nwa agbọghọbịa bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Kaitlyn. O kwuru, sị: “Mụ na ụmụnna ma nke a na-akọ ịrụ n’ozi ọma nyeere m aka ịna-emekwu nke ọma mgbe e mechara m baptizim. Otú ha si eme mere ka m wepụtakwuo oge na-amụ Baịbụl, meekwa ka otú m si akụzi Baịbụl kakwuo mma.”
19. Olee ihe ọma ndị ga-emere gị ma ị na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ?
19 Ka ị na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ, Jehova ga na-emere gị ọtụtụ ihe ọma. Ị gaghị na-eji ume gị eme ihe ndị na-abaghị uru. (1 Jọn 2:17) Ị gaghị na-enwe obi mgbawa ime ihe na-adịghị mma na-akpata. Kama nke ahụ, ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ, ihe ana-agazikwara gị. (Ilu 16:3) Àgwà ọma gị ga na-agbakwa ụmụnna niile ume. (1 Tim. 4:12) Nke ka nke, obi ga-eru gị ala n’ihi na gị na Jehova dị ná mma, ihe gị ga na-amasịkwa ya.—Ilu 23:15, 16.
ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
a Ọ bụrụ na ndị na-eto eto emee baptizim, obi na-atọ ndị niile na-efe Jehova ụtọ. O doro anya na ndị e mere baptizim ọhụrụ kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Isiokwu a ga-enyere anyị niile aka ịmata ụzọ dị iche iche ndị e mere baptizim ọhụrụ nwere ike isi na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ.
b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.