Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú isiokwu bụ́ “Ka E Doo Aha Gị Nsọ” nke gbara n’Ụlọ Nche Jun 2020 si kọwakwuo ihe anyị kweere gbasara ido aha Jehova nsọ na igosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị?
N’isiokwu ahụ, anyị mụtara na e nwere naanị otu ihe dị ezigbo mkpa gbasara mmadụ niile na ndị mmụọ ozi niile. Ihe ahụ bụ ido aha ukwu Jehova nsọ. Igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị nakwa na ọchịchị ya kacha mma bụ otu ụzọ e si edo aha ya nsọ. Ma mmadụ ọ̀ na-erubere Jehova isi ma ọ bụ na ọ naghị erubere ya gbasakwara okwu ahụ dị ezigbo mkpa.
Gịnị mere anyị ji ekwu na ihe kacha mkpa bụ ido aha Jehova nsọ na igosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị? Ka anyị leba anya n’ihe atọ kpatara ya.
Nke mbụ, Ekwensu kwutọrọ aha Jehova n’ogige Iden. Ajụjụ Setan jụrụ Iv gosiri na ọ na-ekwu na Jehova anaghị emesapụ aka, nakwa na ọ na-enye ndị ọ na-achị iwu na-enweghị isi na ọdụ. Setan kwuziri ihe dị iche n’ihe Jehova kwuru, si otú ahụ kpọọ Jehova onye ụgha. Ihe ahụ o mere bụ ikwutọ aha Jehova. Ọ bụ otú ahụ ka o si ghọọ “Ekwensu,” nke pụtara “onye nkwutọ.” (Jọn 8:44) Iv nupụụrụ Jehova isi n’ihi na o kwetara ụgha Ekwensu ahụ. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ chọghị ka Chineke na-achị ya. (Jen. 3:1-6) Kemgbe ahụ, Ekwensu ka na-ekwutọ aha Chineke, na-agbasa ihe na-abụghị eziokwu gbasara ụdị onye Jehova bụ. Ndị kwetara ụgha ndị ahụ na-enupụkarịrị Jehova isi. N’ihi ya, ndị Jehova weere ya na nkwutọ a a na-ekwutọ aha nsọ Jehova bụ ihe jọgburu onwe ya. Ọ bụ ya kpatara ahụhụ na obi ọjọọ juru n’ụwa a.
Nke abụọ, Jehova kpebiri ime ka e doo aha ya nsọ, meekwa ka a kwụsị ịna-akọcha ya. Ọ bụ ya kacha Jehova mkpa. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “M ga-eme ka mmadụ niile mara na aha m nke dị ebube dị nsọ.” (Ezik. 36:23) Jizọs mekwara ka a ghọta ihe kwesịrị ịkacha ndị Jehova niile mkpa ma ha kpewe ekpere. Ọ sịrị: “Ka e doo aha gị nso.” (Mat. 6:9) Baịbụl kwukwara ọtụtụ ugboro na ọ dị mkpa ka e too aha Jehova. Legodị ụfọdụ n’ime ha: “Toonụ aha Jehova dị ebube.” (1 Ihe 16:29; Ọma 96:8) “Bụọnụ abụ iji too aha ya dị ebube.” (Ọma 66:2) “M ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 86:12) Otu n’ime oge ndị Jehova n’onwe ya si n’eluigwe kwuo okwu bụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem mgbe Jizọs sịrị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Jehova kwuziri, sị: “Emeela m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”—Jọn 12:28. a
Nke atọ, nzube Jehova niile gbasara aha ya. Chegodị ihe a: Ọ bụrụ na ule ikpeazụ a ga-ele ndị mmadụ ma Jizọs chịchaa otu puku afọ gachaa, gịnịzi ga-eme? Olee otú obi ga-adị mmadụ niile na ndị mmụọ ozi niile gbasara ido aha Jehova nsọ? Iji nyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ, ka anyị cheta ihe abụọ yiri ibe ha, ya bụ, ụmụ mmadụ irubere Jehova isi na igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị.
Ọ̀ ka ga na-esiri ndị mmadụ ike irubere Jehova isi mgbe ha gafecharala ule ikpeazụ? Mba. A nwaala ha, ha zukwara okè. Ha ga-adị ndụ ebighị ebi. À ka ga na-ekwu gbasara onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa, ma ọ bụ ya ana-akpata nkewa? Mba. Ọ gaghịzi adị mkpa igosi na ọ bụ otú Jehova si achị kacha mma. Ndị niile nọ ma n’eluigwe ma n’ụwa ga-adị n’otu, kwetakwa ka Jehova na-achị ha. Ma, ido aha Jehova nsọ ọ̀ ka ga-abụ ihe kacha ndị ya mkpa?N’oge ahụ, e doola aha Jehova nsọ kpamkpam, e nweghịzikwa onye ga na-ekwutọ ya. Ma, ido aha Jehova nsọ ka ga-abụ ihe kacha ndị niile na-efe ya mkpa ma n’eluigwe ma n’ụwa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ga na-ahụ ka Jehova na-eme ihe ndị dị ebube. Chegodị ihe a: Ebe ọ bụ na Jizọs ga-enye Jehova ọchịchị niile, Chineke ga “na-achịzi ihe niile.” (1 Kọr. 15:28) Nke ahụ gachaa, ụmụ mmadụ nọ n’ụwa ga na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha ‘ga-enwere onwe ha n’ụzọ dị ebube ka ụmụ Chineke.’ (Rom 8:21) Jehova ga-emezukwa nzube ya kemgbe ụwa, ya bụ, ime ka ụmụ ya niile nọ n’eluigwe na n’ụwa dịrị n’otu, na-emekọkwa ihe ọnụ.—Efe. 1:10.
Olee otú obi ga-adị ndị niile so n’ezinụlọ Jehova n’eluigwe na n’ụwa ma ihe ndị a mechaa? O doro anya na ọ ka ga na-agụsi anyị agụụ ike ịna-eto Jehova. Devid si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Ka e too Jehova Chineke . . . Ka e too aha ya dị ebube ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 72:18, 19) Anyị ga na-ahụ ihe ọhụrụ ga na-atọ anyị ụtọ ga-eme ka anyị na-eto Jehova ruo mgbe ebighị ebi.
Aha Jehova nọchiri anya ihe niile gbasara ya. Aha ya kacha echetara anyị otú o si hụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:8) Anyị ga na-echeta mgbe niile na Jehova kere anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, na o mere ka Ọkpara ya nwụọ maka anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, nakwa na otú o si achị ziri ezi, gosikwa na ọ hụrụ anyị n’anya. Ma, anyị ga na-ahụ otú Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya mgbe niile. Ruo mgbe ebighị ebi, ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịbịarukwu Nna anyị nso, nakwa ịna-abụrụ ya abụ iji too aha ya dị ebube.—Ọma 73:28.