Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Anaghị Alụ Agha n’Agbanyeghị na Ndị Izrel Oge Ochie Lụrụ Agha?

Gịnị Mere Anyị Anaghị Alụ Agha n’Agbanyeghị na Ndị Izrel Oge Ochie Lụrụ Agha?

MGBE a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, onye agha ndị Nazi ji olu ike gwa ụfọdụ Ndịàmà Jehova, sị: “Onye ọ bụla n’ime unu jụ ịlụso Frans ma ọ bụ Ịngland agha, unu niile ga-anwụrịrị.” N’agbanyeghị na ndị agha Nazi bucha égbè nọrọ nso chebiri ha, e nweghị otu nwanna kwere gaa agha. O gosiri na ha nwere ezigbo obi ike. O mere ka a mata otú Ndịàmà Jehova si were ịlụ agha. Anyị anaghị ekwe alụ agha ndị a na-alụ n’ụwa a. E kwugodị na a ga-egbu anyị ma anyị ekweghị aga agha, anyị anaghị ekwe.

Ma, ọ bụghị ndị niile sị na ha bụ Ndị Kraịst kwetara ihe a. Ọtụtụ ndị kweere na Onye Kraịst nwere ike ịlụrụ obodo ya agha, kwesịkwa ime otú ahụ. Ha nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ndị Izrel oge ochie bụ ndị Chineke. Ha lụkwara agha. Gịnịzi mere Ndị Kraịst taa ekwesịghị ịlụ agha?’ Gịnị ka ị ga-aza ụdị ndị ahụ? I nwere ike ịkọwara ha na otú ihe dịịrị ndị Izrel oge ochie dị ezigbo iche n’otú ihe dịịrị ndị Chineke taa. Ka anyị kwuo ụzọ ihe ise mere nke ha ji dị iche.

1. N’OGE AHỤ, NDỊ CHINEKE NIILE NỌ N’OTU MBA

N’oge ochie, Jehova họọrọ otu mba ka ha bụrụ ndị ya, ya bụ, mba Izrel. O kwuru na mba Izrel ga-abụrụ ya “ndị pụrụ iche n’ime ndị niile ọzọ.” (Ọpu. 19:5) E nwekwara ebe Chineke nyere ha ka ha niile biri. N’ihi ya, mgbe Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha lụsoo mba ndị ọzọ agha, ha anaghị egbu ndị ha na ha na-efekọ Jehova. a

Taa, ezigbo ndị na-efe Jehova “si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile.” (Mkpu. 7:9) Ọ bụrụ na ndị Chineke esoro gaa agha, ha nwere ike ịna-alụso ndị ha na ha na-efekọ Jehova agha ma ọ bụdị na-egbu ha.

2. JEHOVA NYERE NDỊ IZREL IWU KA HA GAA AGHA

N’oge ochie, ọ bụ Jehova na-ekpebi mgbe ndị Izrel kwesịrị ịga agha nakwa ihe mere ha ga-eji gaa. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara ndị Izrel ka ha lụọ agha iji taa ndị Kenan ahụhụ otú o kpebiri. Ihe e jikwanụ mara ndị Kenan bụ ife ndị mmụọ ọjọọ, mmekọahụ rụrụ arụ ma jọgbuo onwe ya, na iji ụmụaka achụ àjà. Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha kpochapụ ndị na-eme ihe ọjọọ ndị a n’Ala Nkwa ka ndị Izrel gharakwa imewe ka ha. (Lev. 18:​24, 25) Mgbe ndị Izrel banyechara n’Ala Nkwa, e nwere mgbe ụfọdụ Chineke nyere iwu ka ha lụọ agha ka ndị iro ha obi tara mmiri ghara imemila ha. (2 Sam. 5:​17-25) Ma, e nweghị mgbe ọ bụla Jehova kwere ka ndị Izrel jiri aka ha kpebie ịga agha. Mgbe ọ bụla ha nupụrụ isi gaa agha, ọ na-akpata ezigbo nsogbu.​—Ọnụ. Ọgụ. 14:​41-45; 2 Ihe 35:​20-24.

Taa, Jehova agwaghị ndị mmadụ ka ha na-alụ agha. Mba dị iche iche na-alụ agha ka ha nweta ihe ndị mmadụ chọrọ, ọ bụghị ihe Chineke chọrọ. Ha nwere ike ibido ịlụ agha ka ha nwetakwuo ala ma ọ bụ ego, ma ọ bụkwanụ ka e mee ihe ọchịchị ha chọrọ. Ma, ndị na-asịkwanụ na ha na-alụrụ Chineke agha ka ha chebe okpukpe ha ma ọ bụ gbuo ndị iro Chineke? Jehova ga-echebe ndị na-efe ya otú ọ chọrọ ma bibie ndị iro ya niile n’agha a ga-alụ n’ọdịnihu, ya bụ, agha Amagedọn. (Mkpu. 16:​14, 16) Naanị ndị ga-alụ agha ahụ bụ ndị agha Chineke nọ n’eluigwe, ndị bụ́ mmụọ, ọ bụghị ụmụ mmadụ na-efe ya.​—Mkpu. 19:​11-15.

3. NDỊ AGHA IZREL EGBUGHỊ NDỊ NWERE OKWUKWE NA JEHOVA

È nwere mba Chineke na-alụrụ agha taa otú ahụ ọ lụụrụ mba Izrel mgbe ha lụsoro Jeriko agha?

N’oge ochie, ndị agha Izrel na-emere ndị gosiri na ha nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ ebere. Ha na-egbu naanị ndị Jehova mara ikpe ọnwụ. Legodị ihe atụ abụọ. N’agbanyeghị na Jehova gwara ndị Izrel ka ha bibie Jeriko, ha chebere Rehab na ezinụlọ ya n’ihi okwukwe ya. (Josh. 2:​9-16; 6:​16, 17) Mgbe e mechara, a hapụrụ ndị Gibiọn niile ndụ n’ihi na ha gosiri na ha na-akwanyere Chineke ùgwù.​—Josh. 9:​3-9, 17-19.

Taa, mba ndị na-alụ agha anaghị ahapụ igbu ndị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ. Mgbe ụfọdụ, ha na-egbudị ndị aka ha dị ọcha na-abụghị ndị agha.

4. NDỊ IZREL GA-ERUBERỊRỊ ISI N’IWU NDỊ CHINEKE NYERE MAKA ỊLỤ AGHA

N’oge ochie, ihe Jehova chọrọ n’aka ndị agha Izrel bụ ka ha na-erube isi n’iwu o nyere ha gbasara ịlụ agha. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ụfọdụ Chineke gwara ha ka ha gwa obodo ndị ha na-achọ ịlụso agha ‘ihe ha ga-eme ka ha na ha mee udo.’ (Diut. 20:10) Jehova chọkwara ka ndị agha Izrel debe onwe ha na ebe ha mara ụlọikwuu ọcha, nakwa ka ha ghara ịna-etinye aka n’omume rụrụ arụ. (Diut. 23:​9-14) Ndị agha obodo ndị gbara ha gburugburu na-eme ha merie obodo, ha edinaa ụmụ nwaanyị ha n’ike. Ma, Jehova nyesiri ndị agha Izrel iwu ike ka ha ghara ime otú ahụ. Ha agaghịdị alụ nwaanyị ọ bụla a dọtara n’agha ruo mgbe otu ọnwa ha meriri obodo ha gafere.​—Diut. 21:​10-13.

Taa, ọtụtụ mba agbakọọla aka tie iwu ndị ha ga na-edebe ma ha lụwa agha. N’agbanyeghị na iwu ndị ahụ bụ iji chebe ndị na-abụghị ndị agha, ọ dị mwute na ọtụtụ obodo na-ada iwu ndị ahụ.

5. Ọ BỤ CHINEKE LỤỤRỤ NDỊ YA AGHA

Ndị na-alụ agha taa hà na-ahapụ igbu ndị nwere okwukwe na Jehova otú ahụ ndị Jehova hapụrụ igbu Rehab na ezinụlọ ya?

N’oge ochie, Jehova lụụrụ ndị Izrel agha. Ọ rụrụ ọrụ ebube ọtụtụ mgbe mee ka ha merie n’agha. Dị ka ihe atụ, olee otú Jehova si nyere ndị Izrel aka ha emerie Jeriko? Mgbe ndị Izrel mere ihe Jehova gwara ha, ya bụ, mgbe ha tiri “ezigbo mkpu agha, mgbidi obodo ahụ dara, daruo ala,” mezie ka ọ dịrị ha mfe iweghara obodo ahụ. (Josh. 6:20) Oleekwa otú ha si merie ndị Amọraịt? “Jehova mere ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé si n’eluigwe na-adagbu ha . . . Ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ gburu dị ọtụtụ karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha gbuo.”​—Josh. 10:​6-11.

Taa, Jehova anaghị alụrụ mba ọ bụla nọ n’ụwa a agha. Alaeze ya, nke Jizọs bụ Eze ya, “abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Ọ bụ Setan ka ọchịchị ụmụ mmadụ niile dị n’aka. Agha obi ịta mmiri anyị na-ahụ n’ụwa taa na-egosi na obi tara ya mmiri.​—Luk 4:​5, 6; 1 Jọn 5:19.

EZIGBO NDỊ KRAỊST NA-AGBA MBỌ KA HA NA NDỊ ỌZỌ DỊ N’UDO

Anyị ahụla na otú ihe si dị taa dị ezigbo iche n’otú ọ dị n’oge ụmụ Izrel. Ma, ọ bụghị naanị ihe ndị a dị iche mere na anyị anaghị aga agha. E nwere ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Chineke buru amụma na n’oge ikpeazụ, ndị Jehova kụziiri ihe agaghịkwa “amụ otú e si alụ agha,” ma ya fọdụzie itinye aka n’agha. (Aịza. 2:​2-4) Ihe ọzọkwa bụ na Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” Ha agaghị na-etinye aka n’agha.​—Jọn 15:19.

E nwekwara ihe ọzọ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha zere. Ọ bụ àgwà ndị nwere ike ime ka ha chọọ imegwara ihe ọjọọ e mere ha, iwe iwe, ma ọ bụ ịlụ agha. (Mat. 5:​21, 22) Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha “na-eme udo” nakwa ka ha ‘hụ ndị iro ha n’anya.’​—Mat. 5:​9, 44.

Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi na-eme ihe a? O nwere ike ịbụ na anyị achọghị iso lụọ agha, ma è nwere onye nọ n’ọgbakọ anyị anyị na-ewere ka onye iro anyị? Ka anyị gbalịsie ike na-ewepụ ụdị echiche ahụ n’obi anyị.​—Jems 4:​1, 11.

Kama ịna-etinye aka n’agha, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ka udo dịrị, anyị ana-ahụkwa ụmụnna anyị n’anya. (Jọn 13:​34, 35) Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị etinye aka n’agha, na-atụsi anya ike mgbe Jehova ga-eme ka agha kwụsị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.​—Ọma 46:9.

a Mgbe ụfọdụ, ebo ụmụ Izrel lụsoro ụmụnne ha ọgụ n’agbanyeghị na ọ dịghị Jehova mma n’obi. (1 Eze 12:24) Ma, e nwere mgbe ụfọdụ Jehova kwere ka ha lụso ibe ha agha maka na ebo ụfọdụ gbakụtara ya azụ ma ọ bụ mee mmehie ndị ọzọ dị oké njọ.​—Ikpe 20:​3-35; 2 Ihe 13:​3-18; 25:​14-22; 28:​1-8.