ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33
ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ
Otú Jehova Chọrọ Ka Ọgbakọ Si Na-emeso Onye Mere Mmehie Dị Oké Njọ
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka.”—1 JỌN 2:1.
IHE A GA-AMỤ
Ihe ndị dị mkpa anyị ga-amụta n’ihe mere n’ọgbakọ dị na Kọrịnt mgbe otu nwanna mere mmehie dị oké njọ.
1. Gịnị ka Jehova chọrọ ka mmadụ niile mee?
JEHOVA kere ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. Anyị na-ekpebi ihe anyị na-eme n’ụbọchị ọ bụla. Mkpebi kacha mkpa mmadụ ga-eme bụ inyefe Jehova onwe ya ma soro n’ezinụlọ Jehova. Jehova chọrọ ka onye ọ bụla mee otú ahụ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, chọọkwa ihe ga-akacha baara ha uru. Ọ chọrọ ka ha na ya bụrụ ndị enyi, ha adịrị ndụ ebighị ebi.—Diut. 30:19, 20; Gal. 6:7, 8.
2. Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị mere mmehie na-echegharịbeghị mee? (1 Jọn 2:1)
2 Ma, Jehova anaghị amanye onye ọ bụla ife ya. Ọ na-ahapụ onye nke ọ bụla ka o kpebie ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụkwanụ na Onye Kraịst mere baptizim emebie iwu Jehova, mee mmehie dị oké njọ? Ọ bụrụ na o chegharịghị, a ga-ekewapụ ya n’ọgbakọ. a (1 Kọr. 5:13) N’agbanyeghị ya, Jehova ka chọsikwara ike ka onye ahụ mere mmehie chegharịa, ya na ya adịrịkwa ná mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na o so n’ihe dị mkpa mere o ji nye anyị ihe mgbapụta, ka e nwee ike ịgbaghara ndị mehierenụ ma chegharịa. (Gụọ 1 Jọn 2:1.) Jehova bụ Chineke nwere ịhụnanya. Ọ na-agba ndị mere mmehie dị oké njọ ume ka ha chegharịa.—Zek. 1:3; Rom 2:4; Jems 4:8.
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 Jehova na-agwa anyị otú obi na-adị ya gbasara mmehie nakwa ndị mere mmehie dị oké njọ. Ọ chọkwara ka ọ na-adị anyị otú ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu otú anyị ga-esi eme ya. Ka ị na-agụ isiokwu a, chọpụta (1) ihe e mere mgbe otu nwanna nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt mere mmehie dị oké njọ, (2) ihe Pọl gwara ọgbakọ ahụ ka ha mee mgbe nwoke ahụ chegharịrị, na (3) ihe Baịbụl na-agwa anyị gbasara otú obi na-adị Jehova gbasara Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ.
IHE E MERE MGBE OTU NWANNA MERE MMEHIE DỊ OKÉ NJỌ
4. Gịnị mere n’ọgbakọ dị na Kọrịnt? (1 Ndị Kọrịnt 5:1, 2)
4 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:1, 2. Mgbe Pọl na-eje ozi ala ọzọ ya nke atọ, ọ nụrụ ihe na-adịghị mma na-eme n’ọgbakọ dị na Kọrịnt. Otu nwanna nọ n’ọgbakọ na nwunye nna ya na-enwe mmekọahụ. Ụdị omume a na-awụ akpata oyi. “Ọ kadị nke ndị mba ọzọ . . . njọ.” Ma, ọgbakọ ahụ chere na o nweghị ihe o mere ma nwanna na-akpa ụdị àgwà a ka nọrọ n’ọgbakọ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ụmụnna chere na ọ na-egosi na ha na-eme ebere otú ahụ Jehova na-emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ma, Jehova achọghị ka ndị ya na-akpa àgwà ọjọọ. Àgwà a na-adịghị mma nwanna a nọ na-akpa nọ na-emebi aha ọgbakọ. O nwekwara ike ịbụ na ọ na-eme ka Ndị Kraịst ndị ọzọ ya na ha na-akpa mewe ka ya. N’ihi ya, gịnị ka Pọl gwara ọgbakọ ahụ ka ha mee?
5. Gịnị ka Pọl gwara ọgbakọ ahụ ka ha mee, gịnịkwa ka ihe ahụ o kwuru pụtara? (1 Ndị Kọrịnt 5:13) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
5 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:13. Jehova mere ka Pọl dee akwụkwọ ozi o ji kwuo ka e kewapụ onye ahụ mere mmehie dị oké njọ na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. Olee otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ ga-esi na-emeso ya? Pọl gwara ha ka ha na ya “kwụsị ịna-emekọrịta ihe.” Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Ọ sịrị na ọ pụtara na ha na ‘onye dị otú ahụ agaghị erikọ ihe.’ (1 Kọr. 5:11) Mmadụ na onye ọzọ irikọ nri nwere ike ime ka ya na ya na-anọkọ, na-ekwurịtakwa okwu. N’ihi ya, o doro anya na ihe Pọl bu n’obi bụ ka ya na ụmụnna ghara ịna-akpa. Ihe a ga-eme ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ ya. (1 Kọr. 5:5-7) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ha ezere ha na ya ịkpa, o nwere ike ime ka ọ chọpụta na ya emeela ihe gbawara Jehova obi, ihe o mere ewute ya, ya echegharịa.
6. Gịnị ka ụmụnna mere mgbe Pọl detaara ha akwụkwọ ozi, gịnịkwa ka akwụkwọ ozi ahụ mere ka nwoke ahụ mee?
6 Mgbe Pọl zigachaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt akwụkwọ ozi ahụ, ọ malitere iche ihe ụmụnna ndị ahụ ga-eme. Mana, Taịtọs mechara gwa ya ihe mere ya obi ụtọ. Ụmụnna ndị ahụ nabatara akwụkwọ ozi ahụ Pọl detaara ha. (2 Kọr. 7:6, 7) Ha mere ihe ọ gwara ha ma kewapụ nwoke ahụ n’ọgbakọ. Ihe ọzọ bụ na obere oge Pọl zigachaara ha akwụkwọ ozi ahụ, nwoke ahụ chegharịrị. Ọ gbanweela àgwà ya ma malite ime ihe Jehova kwuru. (2 Kọr. 7:8-11) Gịnị ka Pọl ga-agwazi ọgbakọ ahụ ka ha mee?
OTÚ ỤMỤNNA KWESỊRỊ ISI EMESO ONYE MMEHIE AHỤ CHEGHARỊRỊ ECHEGHARỊ
7. Gịnị ka nkewapụ e kewapụrụ onye mmehie ahụ n’ọgbakọ rụpụtara? (2 Ndị Kọrịnt 2:5-8)
7 Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 2:5-8. Pọl kwuru na ‘ahụhụ ha tara onye ahụ ezuola.’ Ihe ọ pụtara bụ na aka ná ntị ahụ a dọrọ ya arụọla ihe o kwesịrị ịrụ. Gịnị bụ ọrụ ahụ? Ime ka nwoke ahụ chegharịa.—Hib. 12:11.
8. Olee ihe ọzọ Pọl gwara ọgbakọ ahụ ka ha mee?
8 N’ihi ya, Pọl gwara ọgbakọ ahụ, sị: ‘Ihe unu kwesịrị ime ugbu a bụ ịgbaghara ya ma kasie ya obi. Gosinụ ya na unu hụrụ ya n’anya.’ Ị̀ chọpụtara na ihe Pọl chọrọ ka ọgbakọ ahụ mee abụghị naanị ịnabata nwoke ahụ n’ọgbakọ? Ọ chọrọ ka ha si n’okwu ọnụ ha na n’omume ha mee ka obi sie ya ike na ha agbagharala ya nakwa na ha hụrụ ya n’anya. Ha ga-esi otú ahụ mee ka o doo ya anya na obi dị ha ụtọ na ọ lọghachila n’ọgbakọ.
9. Gịnị nwere ike ime ka o siere ụfọdụ ndị ike ịgbaghara onye mmehie ahụ chegharịrị echegharị?
9 È nwere ndị o siiri ike ịnabata onye mmehie ahụ chegharịrị echegharị? Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị. Ma, ọ ga-abụ na e nwere. A sị ka e kwuwe, ihe o mere kpataara ọgbakọ ahụ nsogbu. Ọ ga-abụkwa na e nwere ndị ihe ahụ gbawara obi karịchaa. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ agbalịsiela ike ka ha rubere iwu Jehova isi. N’ihi ya, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọ dịghị mma ka a hapụ onye mere mmehie dị otú ahụ ka ọ lọghachi n’ọgbakọ. (I nwere ike ịtụle Luk 15:28-30.) Ma, olee ihe mere o ji dị mkpa ka ụmụnna gosi ya na ha hụrụ ya n’anya?
10-11. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ndị okenye jụrụ ịgbaghara onye mmehie ahụ chegharịrị echegharị?
10 Chegodịnụ ihe nwere ike ime ma ndị okenye ekweghị anabata nwoke ahụ mere mmehie dị oké njọ mgbe o chegharịrị, ụmụnna agharakwa igosi ya na ha hụrụ ya n’anya. Pọl kwuru na “otú ọnọdụ ya si ewute” ya nwere ike ime “ka ọ daa mbà.” O nwere ike iche na nke ya agwụla. O nweziri ike ghara ịgbalị ka ya na Jehova dị ná mma ọzọ.
11 Nke kadị njọ bụ na ọ bụrụ na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ajụ ịgbaghara nwoke ahụ mere mmehie chegharịrịnụ, hanwa na-eme ihe nwere ike ime ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụghị otú ahụ ka Jehova na-esi emeso ndị mmehie chegharịrị echegharị. Kama, ọ bụ Setan, bụ́ onye obi ọjọọ, bụ onye na-anaghị eme ebere. Ime otú ahụ na-egosikwa na ha na-ekwe ka Ekwensu jiri ha kwara ngwá ọrụ ọ ga-eji mee ka nwoke ahụ na Jehova ghara ịdị ná mma.—2 Kọr. 2:10, 11; Efe. 4:27.
12. Olee otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ ga-esi eme ka Jehova?
12 Ma, olee otú ụmụnna nọ na Kọrịnt ga-esi eme ka Jehova, ghara ime ka Setan? Ọ bụ ịgbaghara onye mmehie chegharịrị echegharị otú Jehova na-eme. Ka anyị chọpụta ihe ụfọdụ ndị so dee Baịbụl kwuru banyere Jehova. Devid sịrị: “Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Ọma 86:5) Maịka dere, sị: “Olee Chi dị ka gị, Onye na-agbaghara mmehie?” (Maị. 7:18) Aịzaya sịrị: “Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ọjọọ ọ na-eso. Ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ. Ya lọghachikwute Jehova, onye ga-emere ya ebere. Ya lọghachikwute Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya kpamkpam.”—Aịza. 55:7.
13. Gịnị mere o ji dị mma ka a nabata onye mmehie ahụ chegharịrị echegharị n’ọgbakọ? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Olee Mgbe A Nabatara Nwoke Ahụ?”)
13 Ọ bụrụ na ụmụnna nọ na Kọrịnt chọrọ ime ka Jehova, ha kwesịrị ịnabata nwoke ahụ mere mmehie chegharịrị echegharị ma mee ka obi sie ya ike na ha hụrụ ya n’anya. Mgbe ụmụnna mere ihe Pọl gwara ha ma nabata onye ahụ chegharịrị echegharị, ha gosiri na ha “na-erube isi n’ihe niile.” (2 Kọr. 2:9) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ naanị ọnwa ụfọdụ gafere kemgbe e kewapụrụ nwoke ahụ n’ọgbakọ, ma aka ná ntị a dọrọ ya emeela ka o chegharịa. N’ihi ya, ọ baghị uru igbuwe oge ịnabata ya n’ọgbakọ.
OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EME EBERE MA NA-EKPE IKPE ZIRI EZI KA JEHOVA
14-15. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe mere n’ọgbakọ dị na Kọrịnt oge ochie? (2 Pita 3:9) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
14 E dere akụkọ ihe ahụ mere na Kọrịnt oge ochie na Baịbụl ka e jiri ya “kụziere anyị ihe.” (Rom 15:4) Anyị si n’akụkọ ahụ mụta na Jehova anaghị achọ ka onye mere mmehie dị oké njọ na-achọghị ichegharị ka nọrọ n’ọgbakọ. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ebe ọ bụ na Jehova dị obi ebere, ọ ga-ekwe ka onye na-echegharịghị nọrọ n’ọgbakọ. Mana, ọ bụghị otú ahụ ka Jehova si eme ebere. Jehova na-eme ebere, mana ọ sịghị onye ọ bụla mewe otú sọrọ ya. Ọ naghịkwa agbanwe ihe ndị o kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jud 4) N’eziokwu, ime otú ahụ agaghị abụ ime ebere, n’ihi na ọ ga-etinye ndị niile nọ n’ọgbakọ ná nsogbu.—Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33.
15 Ma, anyị na-amụtakwa na Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla. Ọ chọrọ ka a zọpụta ndị mmadụ mgbe ọ bụla o kwere omume. Ọ na-emekwara ndị mmadụ ebere ma ọ bụrụ na ha echegharịa ma gbaa mbọ ka ha na ya bụrụkwa enyi. (Ezik. 33:11; gụọ 2 Pita 3:9.) N’ihi ya, mgbe nwoke ahụ nọ na Kọrịnt chegharịrị, gbanwee omume ọjọọ ya, Jehova ji Pọl kọwaara ụmụnna nọ na Kọrịnt na ha kwesịrị ịgbaghara nwoke ahụ ma nabata ya.
16. Olee otú obi dị gị gbasara otú e si meso nwoke ahụ mere mmehie dị oké njọ na Kọrịnt?
16 Ihe mere n’ọgbakọ dị na Kọrịnt anyị lebara anya na ya enyerela anyị aka ịhụ na Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ bụ Chineke ezi omume, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. (Ọma 33:5) Anyị na-ekele Jehova maka àgwà ọma ndị a o nwere. A sị ka e kwuwe, anyị niile bụ ndị mmehie. Anyị chọkwara ka ọ gbaghara anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ịna-ekele Jehova maka ihe mgbapụta ahụ n’ihi na ọ bụ ya mere ka o nwee ike ịgbaghara anyị. Ịmata na Jehova hụrụ ndị ya n’anya, chọọkwa ka ihe dịrị ha ná mma, na-akasi anyị ezigbo obi.
17. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu abụọ na-eso nke a?
17 Gịnịkwanụ ka a na-eme taa ma nwanna mee mmehie dị oké njọ? Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka Jehova, gosi onye ahụ na ha hụrụ ya n’anya ma nyere ya aka ichegharị? Gịnị ka ụmụnna nọ n’ọgbakọ kwesịrị ime ma ndị okenye kpebie na a ga-ekewapụ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụ na a nabatala onye e kewapụrụ n’ọgbakọ? Anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a n’isiokwu abụọ na-eso nke a.
ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya
a Anyị agaghịzi na-ekwu na a chụrụ ndị ahụ n’ọgbakọ. Dị ka Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 5:13, anyị ga na-ekwuzi na e kewapụrụ ha n’ọgbakọ.