Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”

“Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”

“Nwee obi ike, dị ike, meekwa ihe. Atụla egwu, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova . . . nọnyeere gị.”​—1 IHE 28:20.

ABỤ: 60, 29

1, 2. (a) Olee ọrụ dị ezigbo mkpa e nyere Solomọn? (b) Gịnị mere Devid ji na-echegbu onwe ya banyere Solomọn?

E NYERE Solomọn ọrụ pụrụ iche. Jehova họọrọ ya ka ọ rụọrọ ya ụlọ nsọ na Jeruselem. Ụlọ a bụ otu n’ime ụlọ kachanụ a rụtụrụla. Ụlọ nsọ ahụ “ga-adị ebube nke ukwuu, maakwa mma pụrụ iche n’ala niile.” Ihe kacha mkpa bụ na ụlọ nsọ ahụ ga-abụ “ụlọ Jehova bụ́ ezi Chineke.” Jehova kwuru na Solomọn ga-ahụ maka ihe ndị a ga-arụ.​—⁠1 Ihe 22:​1, 5, 9-11.

2 Obi siri Devid ike na Chineke ga-akwado Solomọn. Ma, Solomọn “bụ obere nwa, isi akabeghịkwa ya.” Ọ̀ ga-enwe obi ike ọ ga-eji rụọ ụlọ nsọ a? Obere nwa ọ bụ, nakwa isi na-akabeghị ya, ọ̀ ga-eme ka obi ghara isi ya ike ịrụ ụlọ nsọ ahụ? Ka Solomọn nwee ike ịrụ ya, o kwesịrị inwe obi ike ma meekwa ihe.

3. Gịnị ka Solomọn mụtara n’aka nna ya gbasara inwe obi ike?

3 Ọ ga-abụrịrị na Solomọn mụtara inwe obi ike n’aka nna ya, Devid. Mgbe Devid na-eto eto, o gburu anụ ọhịa ndị bịara iburu atụrụ nna ya. (1 Sam. 17:​34, 35) O gosikwara na ya nwere obi ike mgbe ọ lụsoro otu dike gbara ajọ dimkpa ma na-emenye ụjọ, ọgụ. Chineke nyeere ya aka ya e jiri otu nkume gbagbuo Golayat.​—⁠1 Sam. 17:​45, 49, 50.

4. Gịnị mere Solomọn ji kwesị inwe obi ike?

4 Ị̀ hụlanụ ihe mere Devid ji kwesị ịgwa Solomọn ka o nwee obi ike ma rụọ ụlọ nsọ ahụ. (Gụọ 1 Ihe E Mere 28:20.) Ọ bụrụ na Solomọn enweghị obi ike, ụjọ nwere ike ime ka ọ ghara ịmalite ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Nke a kadị njọ karịa na ọ rụwara ya ma ọ rụchaghị ya.

5. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike?

5 Anyị chọrọ ka Jehova nyere anyị aka inwe obi ike ma rụchaa ọrụ o nyere anyị otú ahụ o meere Solomọn. N’ihi ya, ka anyị tụlee gbasara ụfọdụ ndị nwere obi ike n’oge gara aga. Anyị nweziri ike iche otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere obi ike, ma rụchaa ọrụ Jehova nyere anyị.

NDỊ NWERE OBI IKE

6. Olee ihe tọrọ gị ụtọ n’otú Josef si nwee obi ike?

6 Chegodị gbasara ụdị obi ike Josef nwere mgbe nwunye Pọtịfa nwara ya ọnwụnwa ka ya na ya kwaa iko. Ọ ga-abụrịrị na ọ ma na ọ ga-ata ahụhụ ma ọ jụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o mere ihe gosiri na o nwere obi ike ma jụ ka ha kwaa iko.​—⁠Jen. 39:​10, 12.

7. Olee otú Rehab si gosi na o nwere obi ike? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Rehab bụkwa onye ọzọ nwere obi ike. Mgbe ndị nledo bụ́ ndị Izrel bịara n’ụlọ ya dị na Jeriko, ụjọ gaara atụ ya, ya aghara inyere ha aka. Ma, ebe ọ bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi, o ji obi ike zoo ụmụ nwoke abụọ ahụ ma nyere ha aka, ha agbapụ n’enweghị ihe mere ha. (Jọsh. 2:​4, 5, 9, 12-16) Rehab kwetara na Jehova bụ ezi Chineke. Obi sikwara ya ike na Jehova ga-enye ndị Izrel ala ahụ. Ọ tụghị eze Jeriko na ndị obodo ha ụjọ. O ji obi ike chebe ndị nledo ahụ, ya emee ka e chebe ya na ezinụlọ ya.​—⁠Jọsh. 6:​22, 23.

8. Olee otú obi ike Jizọs nwere si nyere ndịozi ya aka?

Ndịozi Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi nwekwara ezigbo obi ike. Ha hụrụ ihe Jizọs mere nke gosiri na o nwere obi ike. (Mat. 8:​28-32; Jọn 2:​13-17; 18:​3-5) Nke a nyekwaara ha aka inwe obi ike. Mgbe ndị Sadusii gbalịrị ka ha kwụsị ha ịkụzi banyere Jizọs, ha jụwapụrụ isi.​—⁠Ọrụ 5:​17, 18, 27-29.

9. Olee otú 2 Timoti 1:7 si nyere anyị aka ịghọta onye na-enye anyị obi ike?

9 Josef, Rehab, Jizọs, na ndịozi kpebisiri ike ime ihe ziri ezi. Obi ike ha nwere abụghị n’ihi na ha tụkwasịrị onwe ha obi, kama ọ bụ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi. E nwere mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị inwe obi ike. N’oge ndị ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi, kama ịtụkwasị onwe anyị obi. (Gụọ 2 Timoti 1:⁠7.) Ka anyị leba anya n’ebe abụọ anyị kwesịrị inwe obi ike. Ha bụ n’ezinụlọ anyị, nakwa n’ọgbakọ.

MGBE A CHỌRỌ KA ANYỊ NWEE OBI IKE

10. Gịnị mere Ndị Kraịst na-eto eto ji kwesị inwe obi ike?

10 E nwere ọtụtụ ebe ndị na-eto eto kwesịrị igosi na ha nwere obi ike n’ozi ha na-ejere Jehova. Ha nwere ike ịmụta ihe n’aka Solomọn, bụ́ onye kpebiri ime ihe dị mma, ya bụ, ịrụcha ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ eziokwu na ndị mụrụ ha nwere ike ịgwa ha ihe ndị ha ga-eme, ma ha nwekwara ihe ndị dị mkpa ha kwesịrị iji aka ha kpebie. (Ilu 27:11) Ha kwesịrị inwe obi ike ma ha họrọwa ndị ga-abụ ndị enyi ha, ntụrụndụ ndị ha ga na-enwe, otú ha ga-esi gbaara omume rụrụ arụ ọsọ, nakwa mgbe ha ga-eme baptizim. Ha kwesịkwara inwe obi ike n’ihi na ihe ha na-eme na-akpasu Setan iwe, bụ́ onye na-akwa Chineke emo.

11, 12. (a) Olee otú Mozis si gosi na o nwere obi ike? (b) Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi mee ka Mozis?

11 Otu ihe dị mkpa ndị na-eto eto kwesịrị ikpebi bụ ihe ndị ha ga-eme ná ndụ ha. N’obodo ụfọdụ, a na-enye ndị na-eto eto nsogbu ka ha gaa mahadum, nakwa ka ha chọta ọrụ a ga na-akwụ ha ezigbo ụgwọ. N’ihi otú ihe si sie ike n’obodo ụfọdụ, ndị na-eto eto nwere ike kpebie na ihe kacha mkpa ha ga-eme bụ ịrụ ọrụ ka ha nweta ego ha ga-eji nyere ndị ezinụlọ ha aka. Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a abịara gị, cheta ihe Mozis mere. Mozis gaara ekpebi ime ihe ga-eme ka ọ baa ọgaranya ma ọ bụ bụrụ onye a ma ama ebe ọ bụ ada Fero zụrụ ya. Chegodị otú ezinụlọ zụrụ ya n’Ijipt, ndị nkụzi ya, nakwa ndị ndụmọdụ eze si nyee ya nsogbu ka ọ bụrụ ọgaranya na onye a ma ama. Ma Mozis ekweghị ka ha megharịa ya anya, kama o nwere obi ike ma kpebie ife Jehova. Mgbe Mozis hapụrụ akụ̀ ndị dị n’Ijipt, o nwere obi ike na Jehova ga-enyere ya aka. (Hib. 11:​24-26) Ọ bụ ya mere Jehova ji gọzie ya n’oge ahụ. O doro anya na ọ ga-agọzikwa ya n’ọdịnihu.

12 Otú ahụkwa ka Jehova ga-esi gọzie ndị na-eto eto ji obi ike kpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova, ma buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ọ ga-enyere ha aka igbo mkpa ndị ezinụlọ ha. N’oge ndịozi Jizọs, nwa okorobịa bụ́ Timoti ji ndụ ya jeere Chineke ozi. I nwekwara ike ime otú ahụ. *—⁠Gụọ Ndị Filipaị 2:​19-22.

Ì kpebiela inwe obi ike n’ihe niile ị na-eme ná ndụ gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 17)

13. Olee otú inwe obi ike si nyere otu nwanna nwaanyị aka ime ihe o kpebiri ime mgbe ọ na-eto eto?

13 Otu nwanna nwaanyị bi n’Alabama dị n’Amerịka chọrọ obi ike ọ ga-eji kpebie ihe ndị ọ ga-eme n’ozi Jehova. O dere, sị: “Mgbe m na-eto eto, abụ m onye ihere. Ọ na-esiri m ike iso ndị mmadụ kwurịta okwu ma anyị gaa ọmụmụ ihe ma ya fọdụzie ịga kụọ aka n’ụzọ ndị m na-amaghị.” Ụmụnna na ndị mụrụ ya nyeere ya aka ime ihe ọ chọrọ ime, ya bụ, ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. O kwuru, sị: “Ụwa Setan a na-ewere mmadụ ịga mahadum, ịbụ onye a ma ama, ịchụ ego, na inwe akụnụba ka ihe dị mma mmadụ kwesịrị ime. Ọtụtụ mgbe ndị na-achụ ihe ndị a anaghị achụta ya. Kama, ọ na-akpatara ha obi mgbawa. N’ihi ya, ijere Jehova ozi emeela ka m na-enwe obi ụtọ, meekwa ka m ghọta na m ji ndụ m na-eme ihe bara uru.”

14. Olee mgbe ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị inwe obi ike?

14 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịkwara inwe obi ike. Dị ka ihe atụ, onye ị na-arụrụ ọrụ nwere ike ịgwa gị ka ị rụọ ọrụ mgbe a gbasara ọrụ nakwa ná ngwụcha izu, ya bụ, oge ndị i wepụtara ị ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ, na-aga ozi ọma, na ọmụmụ ihe. I kwesịrị inwe obi ike ị ga-eji gwa ya na ị gaghị e ji oge ndị ahụ arụ ọrụ ma si otú ahụ kụziere ụmụ gị inwe obi ike. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ ndị nne na nna nọ n’ọgbakọ hapụrụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe ụfọdụ ị na-achọghị ka nwa gị na-eme. Ndị nne na nna ndị ahụ nwere ike ịna-ajụ gị ihe mere na ị hapụghị nwa gị ka ọ na-eme ihe ndị ahụ. Ị̀ ga-akata obi ma jiri akọ kọwaara ha ihe mere i ji mee otú ahụ?

15. Olee otú Abụ Ọma 37:25 na Ndị Hibru 13:5 ga-esi nyere ndị nne na nna aka?

15 Anyị kwesịrị inwe obi ike anyị ga-eji nyere ụmụ anyị aka ikpebi ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova, na inyere ha aka ime ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ha agaghị akata obi ịgwa ụmụ ha ka bụrụ ọsụ ụzọ, jewe ozi n’ebe e nwere mkpa, jewe ozi na Betel, ma ọ bụ soro ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ na-arụ ọrụ. Ụjọ nwere ike ịtụ ha na ụmụ ha agaghị elekọta ha ma ha mee agadi. Ma, ndị nne na nna ma ihe na-eme ihe gosiri na ha nwere obi ike, ma nwee okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere. (Gụọ Abụ Ọma 37:25; Ndị Hibru 13:⁠5.) Ndị nne na nna nwee obi ike ma tụkwasị Jehova obi, ụmụ ha ga-amụtakwa ime otú ahụ.​—⁠1 Sam. 1:​27, 28; 2 Tim. 3:​14, 15.

16. Olee otú ụfọdụ ndị nne na nna sirila nyere ụmụ ha aka ha ekpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova? Olee uru ọ baarala ụmụ ha?

16 Otu di na nwunye bi n’Amerịka nyeere ụmụ ha aka ikpebi ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova. Nwanna nwoke a kwuru, sị: “Tupu ụmụ anyị amalite ịga ije na ikwu okwu, anyị na-agwa ha gbasara obi ụtọ mmadụ na-enwe ma ọ sụwa ụzọ, nakwa ma ọ rụwa ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. Ugbu a, ọ bụzi ihe ha kpebiri ime. Ihe ndị ụmụ anyị kpebiri ime, na ime ha nyeere ha aka ịgbara ọnwụnwa ndị dị n’ụwa Setan a ọsọ, nakwa ilekwasị Jehova anya.” Otu nwanna nwoke nwere ụmụ abụọ kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị nne na nna na-agbasi mbọ ike na-eji ihe ha nwere hụ na ụmụ ha gara mahadum, hụkwa na ụmụ ha bụ azụ eru ala n’egwuregwu ụfọdụ. Ọ ga-akacha mma ka anyị gbasie mbọ ike jiri ihe ndị anyị nwere na-enyere ụmụ anyị aka ka ha mee ihe ga-eme ka ha na Jehova na-adị n’ezigbo mma. Ihe na-atọ anyị ụtọ abụghị naanị na ụmụ anyị na-eme ihe ha kpebiri ime n’ozi Jehova, kama ọ na-atọ anyị ụtọ na anyị na ha na-asụkọ ụzọ.” Jehova ga-agọzi ndị nne na nna nyeere ụmụ ha aka ikpebi ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova nakwa ime ihe ndị ahụ eme.

INWE OBI IKE N’ỌGBAKỌ

17. Olee mgbe anyị kwesịrị inwe obi ike n’ọgbakọ?

17 Anyị kwesịkwara inwe obi ike n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ndị okenye kwesịrị inwe obi ike mgbe ha na-ekpe nwanna mere ihe ọjọọ ikpe ma ọ bụ mgbe ha na-enyere ụmụnna nọ n’ọnụ ọnwụ n’ụlọ ọgwụ, aka. Ụfọdụ ndị okenye na-aga eleta ndị a tụrụ mkpọrọ ka ha mụọrọ ndị nwere mmasị ihe ma ọ bụ duzie ọmụmụ ihe. Ụmụnna nwaanyị ndị na-alụbeghị di, hà kwesịkwara inwe obi ike? E nwere ọtụtụ ihe ha ga-eme iji gosi na ha nwere obi ike ma na-ejere Jehova ozi. Ha nwere ike ịsụ ụzọ, kwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa, na-enyere ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka, ma ọ bụ tinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ụfọdụ agaala Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

18. Olee otú ụmụnna nwaanyị ndị katarala ahụ́ nwere ike isi gosi na ha nwere obi ike?

18 Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ụmụnna nwaanyị katarala ahụ́ n’ọgbakọ. Anyị hụrụ ụmụnna nwaanyị ndị a n’anya. Ụfọdụ nwere ike ha agaghị na-eme otú ha si emebu n’ozi Jehova, ma ha kwesịkwara inwe obi ike ma meekwa ihe. (Gụọ Taịtọs 2:​3-5.) Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị katarala ahụ́ kwesịrị inwe obi ike ma ndị okenye gwa ya ka ọ gwa nwanna nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ gbasara uwe ndị na-adịghị mma ọ na-eyi. Ọ gaghị abara nwanna nwaanyị ahụ mba maka uwe ndị ọ na-eyi, kama ọ ga-eji obiọma mee ka o chebara otú uwe ọ na-eyi nwere ike isi kpaa ndị ọzọ aka ọjọọ. (1 Tim. 2:​9, 10) Ọ bụrụ na ụmụnna nwaanyị katarala ahụ́ egosi na ha hụrụ ụmụnna nwaanyị ndị a n’anya, ọ ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ.

19. (a) Olee otú ụmụnna nwoke merela baptizim ga-esi nwee obi ike? (b) Olee otú Ndị Filipaị 2:13; 4:13 ga-esi nyere ụmụnna nwoke aka inwe obi ike?

19 Ndị ọzọ kwesịrị inwe obi ike ma meekwa ihe bụ ụmụnna nwoke ndị merela baptizim. Ọ bụrụ na ha adịrị njikere ịghọ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye, ọ ga-abara ọgbakọ ezigbo uru. (1 Tim. 3:⁠1) Ma, ụfọdụ nwere ike ịna-egbu oge ime otú ahụ. O nwere ike bụrụ na nwanna mere mmehie n’oge gara aga, ma ugbu a, ya ana-eche na o rughị eru ịghọ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Nwanna ọzọ nwere ike ịna-eche na ya agaghị arụli ọrụ a chọrọ ka ọ rụọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, Jehova ga-enyere gị aka inwe obi ike. (Gụọ Ndị Filipaị 2:13; 4:13.) Cheta na o nwere mgbe Mozis chere na o rughị eru ịrụ otu ọrụ Jehova gwara ya ka ọ rụọ. (Ọpụ. 3:11) Ma, Jehova nyeere ya aka inwe obi ike ma rụọ ọrụ ahụ. Nwanna nwoke nwekwara ike inwe obi ike. Otú ọ ga-esi enwe ya bụ iji obi ya niile rịọ Chineke ka o nyere ya aka, nakwa ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ihe ọzọ ga-enyere ya aka bụ ịna-agụ akụkọ gbasara ndị nwere obi ike. O nwere ike iji obi umeala gakwuru ndị okenye ka ha zụọ ya, ma wepụta oge na-enye aka na-arụ ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ. Anyị na-agba ụmụnna niile merela baptizim ume ka ha nwee obi ike ma rụsie ọrụ ike n’ọgbakọ.

“JEHOVA . . . NỌNYEERE GỊ”

20, 21. (a) Gịnị ka Devid chetaara Solomọn? (b) Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike?

20 Eze Devid chetaara Solomọn na Jehova ga-anọnyere ya ruo mgbe a rụchara ụlọ nsọ ahụ. (1 Ihe 28:20) O doro anya na Solomọn chebaara ihe ndị ahụ echiche. O kweghị ka obere nwa ọ bụ, nakwa isi na-akabeghị ya mee ka ọ ghara ịrụ ọrụ ahụ. O gosiri na o nwere obi ike ma rụọkwa ọrụ. Jehova nyekwaara ya aka iji afọ asaa na ọnwa isii rụchaa ụlọ nsọ ahụ dị ebube.

21 Otú ahụ Jehova si nyere Solomọn aka ka ọ ga-esikwa nyere anyị aka inwe obi ike anyị ga-eji rụọ ọrụ anyị n’ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ. (Aịza. 41:​10, 13) Ọ bụrụ na anyị enwee obi ike n’ozi anyị na-ejere Jehova, obi ga-esi anyị ike na ọ ga-agọzi anyị ugbu a, nakwa n’ọdịnihu. N’ihi ya, “nwee obi ike . . . meekwa ihe.”

^ para. 12 Ị ga-achọta ụfọdụ ihe ndị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova n’isiokwu bụ́ “Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche July 15, 2004.