ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 39
Na-akwado Ụmụnna Nwaanyị
“Ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.”—ỌMA 68:11.
ABỤ NKE 137 Ụmụ Nwaanyị Ndị Nwere Okwukwe
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee ihe dị iche iche ụmụnna nwaanyị na-eme n’ọgbakọ, ma olee nsogbu ọtụtụ n’ime ha na-enwe? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
OBI dị anyị ụtọ na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ha na-aza ajụjụ ma na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha na-enye aka elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-egosikwa na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. Ma, ha na-enwekwa nsogbu. Ụfọdụ n’ime ha na-elekọta ndị nne na nna ha mere agadi. Ndị ezinụlọ ụfọdụ n’ime ha na-emegide ha. Ụfọdụ ndị naanị ha na-azụ ụmụ na-agbalịkwa elekọta ụmụ ha.
2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbaa mbọ na-akwado ụmụnna nwaanyị?
2 Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwado ụmụnna anyị ndị nwaanyị? Ọ bụ n’ihi na ụwa anaghị enyecha ụmụ nwaanyị nsọpụrụ ruuru ha. Ihe ọzọ bụ na Baịbụl sịrị ka anyị na-akwado ha. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara ọgbakọ nọ na Rom ka ha nabata Fibi, ‘nyekwara ya aka n’ihe ọ bụla enyemaka ha pụrụ ịdị ya mkpa.’ (Rom 16:1, 2) Mgbe Pọl bụ onye Farisii, ọ ga-abụ na o so ná ndị kweere na ụmụ nwaanyị abachaghị uru. Ma ugbu a ọ ghọrọ Onye Kraịst, o ṅomiri Jizọs, na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù ma na-enwere ha obiọma.—1 Kọr. 11:1.
3. Olee otú Jizọs si mesoo ụmụ nwaanyị ihe? Oleekwa otú o si were ụmụ nwaanyị na-eme uche Chineke?
3 Jizọs kwanyeere ụmụ nwaanyị niile ùgwù. (Jọn 4:27) O weereghị ụmụ nwaanyị otú ndị isi okpukpe e nwere n’oge ahụ si were ha. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “Jizọs ekwughị ihe ọ bụla iji kparịa ụmụ nwaanyị.” Jizọs kwanyekwaara ụmụ nwaanyị mere uche Nna ya ùgwù pụrụ iche. O weere ha ka ụmụnne ya ndị nwaanyị na ndị ezinụlọ ya.—Mat. 12:50.
4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
4 Jizọs dị njikere mgbe ọ bụla inyere ụmụ nwaanyị na-efe
Chineke aka. O ji ha kpọrọ ihe, gbachitekwara ha. Ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi na-eṅomi Jizọs n’ichebara ụmụnna nwaanyị echiche.NA-ECHEBARA ỤMỤNNA NWAANYỊ ECHICHE
5. Gịnị mere o nwere ike iji siere ụmụnna nwaanyị ụfọdụ ike inweta ezigbo ndị enyi?
5 Anyị niile, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, chọrọ ezigbo ndị enyi. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri ụmụnna nwaanyị ike inweta ezigbo ndị enyi. N’ihi gịnị? Legodị ihe ụfọdụ ụmụ nwaanyị kwuru. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jordan * sịrị: “Ebe ọ bụ na alụbeghị m di, ọ na-adị m ka abaghị m uru n’ọgbakọ, na-adịkwa m ka esoghị m ná ndị nọ n’ọgbakọ.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kristen bụ ọsụ ụzọ. Ọ kwagara ebe ọzọ ka o nwee ike izikwu ndị mmadụ ozi ọma. O kwuru, sị: “Ị gafee n’ọgbakọ ọzọ, owu nwere ike ịna-ama gị ná mmalite.” O nwekwara ike ịna-adị ụmụnna nwoke otú ahụ. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ mmadụ abụghị ndị Jehova, o nwere ike isiri onye ahụ ike iso ha na-emekọ ihe. O nwekwara ike ịdị ya ka ndị nọ n’ọgbakọ hà nọ ya ebe dị anya. O nwekwara ụmụnna nwaanyị owu na-ama n’ihi na ọrịa emeela ka ha gharazie ịna-apụta èzí. Owu nwekwara ike ịna-ama ndị na-elekọta ha. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Annette kwuru, sị: “A kpọọ m òkù ịbịa nnọkọ, anaghị m agali n’ihi na ọ bụ m na-elekọta mama m.”
6. Dị ka e kwuru na Luk 10:38-42, olee otú Jizọs si nyere Meri na Mata aka?
6 Jizọs wepụtara oge ka ya na ụmụ nwaanyị na-eso ụzọ ya nọrịa. Ọ bụkwaara ha ezigbo enyi. Chee banyere otú ya na Meri na Mata si bụrụ ezigbo enyi. O nwekwara ike ịbụ na Meri na Mata alụbeghị di mgbe ahụ. (Gụọ Luk 10:38-42.) O doro anya na okwu ọnụ Jizọs na omume ya mere ka ahụ́ ruo ha ala. Obi ruru Meri ala ịnọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs otú ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eme. * O sighịrị Mata ike ịgwa Jizọs na obi adịghị ya mma maka na Meri achọghị inyere ya aka. Jizọs ji ohere ahụ kụziere ha ihe dị ezigbo mkpa. Ọ gakwara leta ha na nwanne ha Lazarọs n’oge ndị ọzọ. Ihe a gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. (Jọn 12:1-3) Ọ bụ ya mere na mgbe Lazarọs dara ọrịa, Meri na Mata ma na ha nwere ike ịkpọ Jizọs ka ọ bịa nyere ha aka.—Jọn 11:3, 5.
7. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi gbaa ụmụnna nwaanyị ume?
7 Ọ bụ n’ọmụmụ ihe ka ụfọdụ ụmụnna nwaanyị na ụmụnna ha kacha anọrị. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ohere ahụ mee ka ahụ́ ruo ha ala, soro ha kwurịta okwu, meekwa ka ha mara na anyị na-eche banyere ha. Jordan anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Obi na-atọ m ezigbo ụtọ ma ndị ọzọ kwuo okwu ọma banyere ajụjụ m zara, kwuo ka mụ na ha rụọ n’ozi ọma, ma ọ bụkwanụ si n’ụzọ ọzọ gosi na ha na-eche banyere m.” Anyị kwesịrị ime ka ụmụnna anyị nwaanyị mara na ha dị anyị mkpa. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kia sịrị: “Ọ bụrụ na mụ abịaghị ọmụmụ ihe, m ma na e nwere onye ga-ezitere m ozi n’ekwentị ka ọ mara ma m̀ dịkwa mma. Ihe a na-eme ka m mara na ụmụnna m na-eche banyere m.”
8. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs?
8 Ka anyị ṅomie Jizọs, na-ewepụta oge ka anyị na ụmụnna anyị ndị nwaanyị na-anọrị. Anyị nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa soro anyị Rom 1:11, 12) Ndị okenye kwesịrị ịna-eme ka Jizọs. Ọ ma na mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye agaghị adịrị ụfọdụ ndị mfe. Ma, o mere ka o doo anya na ịlụ di na nwunye ma ọ bụ ịmụ ụmụ abụghị ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Luk 11:27, 28) Kama nke ahụ, ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ onye ahụ ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ ná ndụ ya.—Mat. 19:12.
rie nri n’ụlọ anyị ma ọ bụ ka ha soro anyị gaa tụrụ ndụ. N’oge ndị a, anyị kwesịrị ịna-agwa ha ihe ndị na-agba ume. (9. Olee ihe ndị okenye nwere ike ime iji nyere ụmụnna nwaanyị aka?
9 Ndị okenye karịchaa kwesịrị ịna-emeso ụmụnna nwaanyị ihe dị ka ụmụnne ha ndị nwaanyị nakwa dị ka ndị nne ha. (1 Tim. 5:1, 2) Ndị okenye kwesịrị iwepụta oge tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara ka ha na ụmụnna nwaanyị kwurịta okwu. Nwanna Nwaanyị Kristen kwuru, sị: “Otu okenye chọpụtara na mụ anaghị enwe ohere ma chọọ ịma ihe ndị m na-eme. Obi dị m ụtọ na ọ chọrọ ịma otú ihe si dịrị m.” Ọ bụrụ na ndị okenye ana-ewepụta oge ka ha na ụmụnna ha ndị nwaanyị na-ekwurịta okwu, ọ ga-egosi na ha hụrụ ha n’anya. * Annette anyị kwuru okwu ya ná mmalite kwuru otu ihe mere o ji aba uru iso ndị okenye na-ekwurịta okwu mgbe niile. Ọ sịrị: “O mere ka m matakwuo ha, hanwa amatakwuokwa m. O mekwara ka ọ na-adịrị m mfe ịkpọtụrụ ha ka ha nyere m aka ma m nwee nsogbu.”
NA-AJA ỤMỤNNA NWAANYỊ MMA
10. Gịnị ga-eme ka obi na-atọ ụmụnna nwaanyị ụtọ?
10 Anyị niile, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, na-enwe obi ụtọ ma ndị ọzọ gosi na ha na-ahụ ọrụ anyị na-arụ ma jaa anyị mma maka ya. Ma, ọ bụrụ na ha na-eleghara ihe anyị na-eme anya, ọ na-eme ka obi na-ajọ anyị njọ. Otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Abigail kwuru na mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ya ka à na-eleghara ya anya. Ọ sịrị: “Ihe e ji mara m bụ nwanne onye dị otú a ma ọ bụ nwa onye dị otú a. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka o nweghị onye na-ahụ m.” Legodị ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Pam kwuru. O ji ọtụtụ afọ ọ nọ n’alụghị di jee ozi ala ọzọ. Mgbe e mechara, ọ laghachiri n’obodo ha ka ọ gaa lekọta nne na nna ya. Ọ dị afọ iri asaa na ụma ugbu a, ọ ka bụkwa ọsụ ụzọ oge niile. Nwanna nwaanyị Pam sịrị: “Ihe kacha enyere m aka bụ otú ndị ọzọ si aja m mma maka ihe m na-eme.”
11. Olee otú Jizọs si gosi na o ji ụmụ nwaanyị ndị so ya jee ozi kpọrọ ihe?
11 Obi tọrọ Jizọs ụtọ maka otú ụmụ nwaanyị ndị na-atụ egwu Chineke si jiri “ihe ha nwere” jeere ya ozi. (Luk 8:1-3) Ọ bụghị naanị na Jizọs nyere ha ohere ijere ya ozi, kama, ọ kụzikwaara ha eziokwu banyere Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ha na ọ ga-anwụ, a kpọlitekwa ya. (Luk 24:5-8) O mere ka ụmụ nwaanyị ndị a jikere maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ha otú ahụ o mekwaara ndịozi ya. (Mak 9:30-32; 10:32-34) Ọ dị mma ịmara na n’agbanyeghị na ndịozi Jizọs niile gbara ọsọ mgbe e jidere ya, ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị ahụ nọ ya mgbe Jizọs na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ.—Mat. 26:56; Mak 15:40, 41.
12. Olee ọrụ Jizọs nyere ụmụ nwaanyị?
12 Jizọs nyere ụmụ nwaanyị ọrụ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị inyom na-atụ egwu Chineke bụ ndị mbụ matara na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Jizọs gwara ha ka ha gaa gwa ndịozi ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ. (Mat. 28:5, 9, 10) N’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33, o nwere ike ịbụ na ụmụ nwaanyị so ná ndị a wụkwasịrị mmụọ nsọ Chineke. Ọ bụrụ na ha so, ọ ga-abụ na ụmụnna nwaanyị ndị a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ so gwa ndị ọzọ banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke” n’asụsụ dị iche iche.—Ọrụ 1:14; 2:2-4, 11.
13. Olee ihe ụmụnna nwaanyị na-eme taa? Oleekwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ha na-eme?
13 Anyị kwesịrị ịna-aja ụmụnna nwaanyị mma maka ọrụ ha na-arụ n’ofufe Jehova. Ụfọdụ ọrụ ha na-arụ bụ ịrụ na ịrụzi ụlọ ndị nzukọ Jehova nwere, iso ndị ji asụsụ ọzọ ekwusa ozi ọma na inye aka n’ọrụ Betel. Ha na-eso agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, na-asụgharị akwụkwọ anyị, na-asụ ụzọ ma na-eje ozi ala ọzọ. Ụmụnna nwaanyị na-agakwa ụlọ akwụkwọ ụfọdụ ụmụnna nwoke na-aga, dị ka, ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze na Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ihe ọzọkwa bụ na ụmụnna nwaanyị na-akwado ndị di ha ná nnukwu ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ nakwa ná nzukọ Jehova. Ọ gakwaara esiri ụmụnna ndị a ike ịrụ ọrụ ha nke ọma dị ka ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” ma a sị na ndị nwunye ha anaghị akwado ha. (Efe. 4:8) Ì nwere ike iche ụzọ ndị i nwere ike isi nyere ụmụnna nwaanyị ndị a aka n’ọrụ ha na-arụ?
14. N’ihi ihe e kwuru n’Abụ Ọma 68:11, gịnị ka ndị okenye ma ihe na-eme?
Abụ Ọma 68:11.) N’ihi ya, ndị okenye na-agbalị ịmụta ihe n’aka ụmụnna nwaanyị ndị a. Abigail anyị kwuru okwu ya na mbụ na-enwe obi ụtọ ma ụmụnna nwoke jụọ ya ụzọ ndị kacha mma ọ na-esi ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ókèala ha. Ọ sịrị, “Ihe a na-enyere m aka ịma na Jehova jikwa m arụ ọrụ n’ọgbakọ ya.” Ndị okenye makwa na ụmụnna nwaanyị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ na-eme nke ọma ma a bịa n’inyere ụmụ agbọghọ aka imeri nsogbu ndị na-abịara ha. (Taị. 2:3-5) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị ndị nwaanyị n’anya ma na-aja ha mma.
14 O doro ndị okenye maara ihe anya na ụmụnna nwaanyị bụ “ìgwè dị ukwuu” dị njikere ịrụ ọrụ, nakwa na ha so ná ndị kacha agba mbọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. (GụọGBACHITERE ỤMỤNNA NWAANYỊ
15. Olee mgbe ụmụnna nwaanyị nwere ike ịchọ onye ga-agbachitere ha?
15 Mgbe ụfọdụ, ụmụnna nwaanyị nwee nsogbu, ha nwere ike ịchọ onye ga-agbachitere ha. (Aịza. 1:17) Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ onye ya na di ya gbara alụkwaghịm nwere ike ịchọ onye ga na-ekwuchitere ya ọnụ ya ma na-enyere ya aka eme ihe ndị di ya na-emeburu ya. Nwanna nwaanyị mere agadi nwere ike ịchọ onye ga-agwara ya dọkịta okwu. Nwanna nwaanyị na-asụ ụzọ ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ ná nzukọ Jehova nwere ike ịchọ onye ga-agbachitere ya ma ndị ọzọ na-akatọ ya na ọ naghị apụta ozi ka ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ. Olee ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi nyere ụmụnna nwaanyị aka? Ka anyị tụlee ihe ọzọ Jizọs mere.
16. Dị ka e kwuru na Mak 14:3-9, olee otú Jizọs si gbachitere Meri?
16 Jizọs egbughị oge ịgbachitere ụmụ nwaanyị ndị jeere Jehova ozi mgbe ndị ọzọ ghọtahiere ha. Dị ka ihe atụ, ọ gbachiteere Meri mgbe Mata katọrọ ya. (Luk 10:38-42) Ọ gbachitekwaara Meri nke ugboro abụọ ya mgbe ndị ọzọ katọrọ ya mgbe o mere ihe ha chere na ọ dịghị mkpa. (Gụọ Mak 14:3-9.) Jizọs ma ihe Meri bu n’obi ma jaa ya mma. Ọ gwara ha, sị: “O meere m ihe ọma. . . . O mere ihe o nwere ike ime.” Jizọs kwudịrị na a ga na-ekwu banyere ihe a o mere “n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa dum,” dị ka a na-ekwu ya ugbu a n’isiokwu a. Ọ dị mma ịmata na Jizọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ọma a Meri mere. O doro anya na ihe ahụ Jizọs kwuru mere ka obi sie Meri ike.
17. Nye ihe atụ na-egosi mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbachitere nwanna nwaanyị.
17 Ị̀ na-agbachitere ụmụnna nwaanyị mgbe ọ dị ha mkpa? Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe a. Ụmụnna na-ahụ na otu nwanna nwaanyị di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na-abịa ọmụmụ ihe n’azụ oge ma na-ala ozugbo a gbasara. Ha chọpụtakwara na ọ naghị akpọkarị ụmụ ya abịa ọmụmụ ihe. N’ihi ya, ha na-akatọ ya, na-asị na o kweghị eme ka di ya kweta ka ọ na-akpọ ụmụ ya abịa ọmụmụ ihe. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na nwanna nwaanyị a na-eme ihe niile o nwere ike ime. Ọ bụghị ya ka ihe niile ọ na-eme dị n’aka. Ọ bụghịkwa ya ga-ekpebi ihe niile banyere ụmụaka ahụ. Gịnị ka ị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Ọ bụrụ na ị jaa nwanna nwaanyị ahụ mma ma gwa ndị ọzọ na ọ na-eme nke ọma, o nwere ike ime ka ha kwụsị ikwu ihe na-adịghị mma banyere ya.
18. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi nyere ụmụnna nwaanyị aka?
18 Ọ bụrụ na anyị achọpụta ụzọ ndị anyị nwere ike isi nyere ụmụnna nwaanyị aka, 1 Jọn 3:18) Annette, nwanna nwaanyị ahụ lekọtara nne ya nọ n’ọrịa, sịrị: “Ụfọdụ ndị enyi m na-abịa enyere m aka elekọta nne m ka m nwee ike ime ihe ndị ọzọ, ha na-ewetakwara anyị nri mgbe ụfọdụ. Ihe a mere ka m mata na ha hụrụ m n’anya nakwa na m bara uru n’ọgbakọ.” E nyekwaara Jordan aka. Otu nwanna nwoke kụziiri ya otú ọ ga-esi na-arụzi ihe ụfọdụ n’ụgbọala ya. Jordan sịrị: “Obi dị m ụtọ ịmara na ụmụnna m hụrụ m n’anya nakwa na ha achọghị ka ihe ọ bụla mee m ma m nyawa ụgbọala.”
ọ ga-egosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. (19. Olee ụzọ ndị ọzọ ndị okenye nwere ike isi nyere ụmụnna nwaanyị aka?
19 Ndị okenye kwesịkwara ịchọpụta ihe bụ́ mkpa ụmụnna nwaanyị. Ha ma na Jehova ejighị otú e si emeso ụmụnna nwaanyị egwu egwu. (Jems 1:27) Ndị okenye kwesịrị ịna-echebara ụmụnna nwaanyị echiche ka Jizọs. Ha ekwesịghị ịna-eme iwu mgbe ha kwesịrị ime ebere ma ghọta otú ihe si dịrị ha. (Mat. 15:22-28) Ọ bụrụ na ndị okenye ana-enyere ụmụnna nwaanyị aka, ọ ga-eme ka ụmụnna nwaanyị mata na Jehova na ọgbakọ ya ji ha kpọrọ ihe. Mgbe onye nlekọta ìgwè ozi ubi Nwanna Nwaanyị Kia chọpụtara na ọ chọrọ ịkwaga ebe ọzọ, ọ haziri otú a ga-esi nyere ya aka ozugbo. Kia sịrị: “O mere ka ihe kara m mfe. Ndị okenye ji okwu ọma ha na ihe ndị ha meere m gosi m na m dị mkpa n’ọgbakọ nakwa na m nwere ndị ga-enyere m aka n’oge nsogbu.”
ANYỊ KWESỊRỊ ỊKWADO ỤMỤNNA NWAANYỊ
20-21. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ụmụnna nwaanyị n’anya?
20 N’ọgbakọ anyị dị iche iche, e nwere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị na-arụsi ọrụ ike anyị kwesịrị ịna-akwado. Dị ka anyị mụtara n’aka Jizọs, anyị nwere ike inyere ụmụnna nwaanyị ndị a aka ma anyị wepụta oge ka anyị na ha nọrịa ma matakwuo ha nke ọma. Ka anyị na-aja ha mma maka ihe ndị ha na-eme n’ozi Jehova. Ka anyị gbachitekwara ha mgbe ọ bụla ọ dị mkpa ka anyị mee otú ahụ.
21 Ná ngwụcha akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ụmụnna nọ na Rom, ọ kpọrọ ụmụnna nwaanyị itoolu aha. (Rom 16:1, 3, 6, 12, 13, 15) O doro anya na obi tọrọ ụmụnna nwaanyị ndị ahụ ụtọ mgbe ha nụrụ otú o si kelee ha ma jaa ha mma. Ka anyịnwa gbalịakwa kwadoo ụmụnna nwaanyị nọ n’ọgbakọ. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị weere ha ka ndị ezinụlọ anyị.
ABỤ NKE 136 Ka Jehova Kwụọ Gị “Ụgwọ Ọrụ Zuru Ezu”
^ par. 5 E nwere ọtụtụ nsogbu na-abịara ụmụnna nwaanyị. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi eṅomi Jizọs ma a bịa n’ịkwado ụmụnna nwaanyị. Anyị ga-amụta ihe n’otú Jizọs si wepụta oge ka ya na ụmụ nwaanyị nọrịa, otú o si gosi na o ji ha kpọrọ ihe, na otú o si gbachitere ha.
^ par. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 6 Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ndị na-eso ụzọ na-anọ n’akụkụ ụkwụ ndị nkụzi ha. Ndị na-eso ụzọ na-eme nke ọma na-emecha bụrụ ndị nkụzi. Mana, ụmụ nwaanyị anaghị abụ ndị nkụzi. . . . Ọ ga-abụ na ọ tụrụ ọtụtụ ụmụ nwoke ndị Juu n’anya mgbe Meri bịara nọrọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs na-ege ya ntị kama ịnọ na-arụ ọrụ dịịrị ụmụ nwaanyị.”
^ par. 9 Ndị okenye kwesịrị ịkpachara anya ma ha na-enyere ụmụnna nwaanyị aka. Dị ka ihe atụ, otu okenye ekwesịghị ịga naanị ya leta nwanna nwaanyị.
^ par. 65 NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna nwoke na-egosi na ha na-eche banyere ụmụnna nwaanyị otú ahụ Jizọs mere. Otu nwanna nwoke na-enyere ụmụnna nwaanyị abụọ aka imezi ụgbọala ha. Nwanna nwoke nke ọzọ gara leta nwanna nwaanyị nọ n’ọrịa. E nwekwara nwanna nwoke ọzọ ya na nwunye ya gara soro otu nwanna nwaanyị na nwa ya nwaanyị nwee ofufe ezinụlọ.