I Nwere Ike Ịbụ Enyị Chineke
ỤFỌDỤ NDỊ NA-ECHE NA . . .
Chineke enwechaghị mmasị n’ebe anyị nọ, na ọ dị elu, dị nsọ, nakwa na anyị enweghị ike ịbịaru ya nso.
IHE BAỊBỤL KWURU
“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.
“Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.
OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị BỤRỤENYI CHINEKE?
Na-akọrọ ya mkpa gị.—Abụ Ọma 145:18, 19.
Na-ege ya ntị.—Abụ Ọma 32:8.
Na-eme ihe ọ gwara gị.—Ilu 3:5, 6.
Adala mbà ná mbọ ị na-agba ka gị na Chineke bụrụ enyi.—Matiu 7:7, 8.