Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Onye Chineke Bụ?

Olee Ụdị Onye Chineke Bụ?

Ka anyị na-amụtakwu àgwà mmadụ, ka anyị na-amatakwu ụdị onye onye ahụ bụ. Ọ ga-emekwa ka anyị na onye ahụ dịkwuo ná mma. Otú ahụkwa, ka anyị na-amatakwu àgwà Chineke, ka anyị na-amatakwu onye ọ bụ. N’ime àgwà niile Chineke nwere, anọ kacha pụta ìhè, ha bụ: ike, amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya.

CHINEKE DỊ IKE

“Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, ọ bụ gị ji ike ukwu gị na ogwe aka ị gbatịrị agbatị kee eluigwe na ụwa.”JEREMAYA 32:17.

Ihe ndị Chineke kere na-egosi na ọ dị ike. Dị ka ihe atụ, olee otú ọ na-adị gị ma ọ bụrụ na ị nọrọ n’èzí mgbe anwụ na-acha? Ahụ́ ga-ekporo gị ọkụ. Ihe ọ na-egosi bụ na Jehova nwere ike dị ukwuu. Olee otú anyanwụ siruru n’ike? N’etiti ya, okpomokụ ya na-adị ihe dị ka 15,000,000 degrees Celsius. Ike anyanwụ na-emepụta na tinkọm tinkọm ọ bụla hà ka nke ọtụtụ narị nde bọmbụ nuklia na-emepụta ma ha gbawaa.

Ma, anyanwụ dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ n’ime narị puku ijeri kpakpando ndị e nwere na mbara ígwé. Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na kpakpando kachanụ a na-akpọ UY Scuti ji ihe dị ka okpukpu otu puku na narị asaa ka anyanwụ ibu. Ọ bụrụ na kpakpando a adịrị n’ebe anyanwụ dị, ọ ga-ekpuchi ụwa, kpuchiekwa ọkara Jupita. Ihe a nwere ike inyere anyị aka ịghọtakwu ihe Jeremaya kwuru. O kwuru na Jehova Chineke ji ike ya dị ukwuu kee eluigwe na ụwa.

Olee otú ike Chineke si abara anyị uru? Ọ bụ ihe ndị Chineke kere, dị ka anyanwụ na ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya dị n’ụwa, na-eme ka anyị dịrị ndụ. Chineke na-ejikwa ike ya na-enyere anyị aka n’otu n’otu. Olee otú o si eme ya? N’oge Jizọs nọ n’ụwa, Chineke nyere ya ike o ji rụọ ọrụ ebube dị iche iche. Baịbụl sịrị: “Ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwọrọ na-ejekwa ije, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ.” (Matiu 11:5) Oleekwanụ maka taa? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike. . . . Ma ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike.” (Aịzaya 40:29, 31) Chineke nwere ike inye anyị “ike karịrị ike nkịtị” ka anyị nwee ike idi ihe ndị na-enye anyị nsogbu ná ndụ. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịbụ enyi Chineke onye hụrụ anyị n’anya ma na-ejikwa ike ya na-enweghị atụ enyere anyị aka?

CHINEKE NWERE AMAMIHE

“Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ! I ji amamihe rụọ ha niile.”ABỤ ỌMA 104:24.

Ka anyị na-amụtakwu gbasara ihe ndị Chineke kere, ka anyị na-achọpụta na amamihe ya dị ukwuu. Ndị mmadụ na-aga mụọ gbasara ihe ndị Chineke kere, lere ya anya mezikwuo ihe ndị nke ha rụpụtara, ma ọ̀ bụ ihe ndị dị obere ka ihe e ji akpọchi ihe ma ọ̀ bụ ihe ndị buru ibu ka ụgbọelu.

E kere anya anyị n’ụzọ dị ịtụnanya

Ihe kacha egosi na Chineke nwere amamihe dị ukwuu bụ otú o si kee mmadụ. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara otú nwa e bu n’afọ si eto. Ọ na-amalite n’otu mkpụrụ ndụ nke ihe niile gbasara otú nwa ahụ ga-adị dị n’ime ya. Mkpụrụ ndụ ahụ na-ekewa ọtụtụ ụzọ ma yie ibe ha. Mgbe oge ruru, mkpụrụ ndụ ndị ahụ na-amalite ịghọ ụdị mkpụrụ ndụ dị iche iche, dị ka nke na-emepụta ọbara, nke na-emepụta akwara, na nke na-emepụta ọkpụkpụ. Ka oge na-aga, akụkụ ahụ́ dị iche iche na-amalite ịrụ ọrụ. Naanị n’ime ọnwa itoolu, mkpụrụ ndụ mbụ ahụ na-aghọ nwa ọhụrụ nwere ọtụtụ ijeri mkpụrụ ndụ. Otú ahụ nwa nọ n’afọ si eto gosiri na Chineke nwere ezigbo amamihe. O meekwala ka ọtụtu ndị kweta na ihe otu onye so dee Baịbụl kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube. Ọrụ gị dị ebube.”—Abụ Ọma 139:14.

Olee otú amamihe Chineke si abara anyị uru? Onye Kere anyị ma ihe ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ebe ọ bụ na o nwere amamihe dị ukwuu, ihe ọ na-agwa anyị na Baịbụl ga-abara anyị uru. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị, sị: “Na-agbaghara ibe unu kpamkpam.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ bara uru? Ee. Ndị dọkịta achọpụtala na mmadụ ịgbaghara onye mejọrọ ya nwere ike ime ka ọ na-ehi ụra nke ọma, belata ọbara mgbali elu, mee ka mmadụ ghara ịda mbà n’obi, meekwa ka ọ ghara ịna-arịakarị ọrịa. Chineke dị ka enyi hụrụ anyị n’anya, onye na-enye anyị ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru mgbe niile. (2 Timoti 3:16, 17) Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka ụdị onye a bụrụ enyi gị?

CHINEKE NA-EKPE IKPE ZIRI EZI

“Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.”ABỤ ỌMA 37:28.

Chineke na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. N’eziokwu, Baịbụl sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.” (Job 34:10) Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Otu ọbụ abụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ị ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe ziri ezi.” (Abụ Ọma 67:4) Ebe ọ bụ na “Jehova na-ahụ ihe dị n’obi,” mmadụ agaghị ejili omume ihu abụọ megharịa ya anya. Kama, ọ ma nke bụ́ eziokwu mgbe niile ma na-ekpe ikpe ziri ezi. (1 Samuel 16:7) Ihe ọzọkwa bụ na Chineke na-ahụ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọjọọ na ikpe na-ezighị ezi dị n’ụwa. O kwekwara nkwa na n’oge na-adịghị anya, “a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa.”—Ilu 2:22.

Ma, Chineke abụghị onyeikpe obi kpọrọ nkụ nke na-achọ onye ọ ga-ata ahụhụ. Ọ na-eme ebere mgbe o kwesịrị ime ebere. Baịbụl kwuru na “Jehova dị ebere, na-emekwa amara.” Ọ na-emedịrị ndị mmehie ji obi ha niile chegharịa ebere. Ọ̀ bụ na nke ahụ abụghị ikpe ikpe ziri ezi?—Abụ Ọma 103:8; 2 Pita 3:9.

Olee otú ikpe ziri ezi Chineke si abara anyị uru? Pita onyeozi kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi na-abara anyị uru n’ihi na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Anyị na Chineke nwere ike ịdị ná mma, ya ana-anabatakwa ofufe anyị na-efe ya n’agbanyeghị ebe anyị si, otú anyị gụruru akwụkwọ ma ọ bụ ọkwà anyị.

Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. N’ihi ya, o nwere ike imere anyị ihe ọma n’agbanyeghị ebe anyị si, otú anyị gụruru akwụkwọ ma ọ bụ ọkwà anyị

Ihe mere Chineke ji nye anyị akọnuche bụ ka anyị ghọta otú o si ekpe ikpe ziri ezi, ka ọ baakwara anyị uru. Baịbụl kọwara akọnuche dị ka iwu ‘dị n’obi mmadụ,’ nke “na-agba àmà” ma ànyị na-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Ndị Rom 2:15) Olee otú o si abara anyị uru? Ọ bụrụ na anyị azụọ akọnuche anyị nke ọma, o nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe ọjọọ ma ọ bụ kpee ikpe na-ezighị ezi. Ọ bụrụkwa na anyị emee ihe na-adịghị mma, o nwere ike ime ka anyị chegharịa ma mee ihe maka ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị aghọta otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi, ọ ga-enyere anyị aka ịbịaru ya nso.

CHINEKE BỤ ỊHỤNANYA

“Chineke bụ ịhụnanya.”1 JỌN 4:8.

Chineke nwere ike na amamihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ma Baịbụl asịghị na ọ bụ ike, amamihe, ma ọ bụ ikpe ziri ezi. Ọ sịrị na Chineke bụ ịhụnanya. Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ ike Chineke na-eme ka o nwee ike ime ihe ndị ọ na-eme. Amamihe ya na ikpe ziri ezi ya na-eduzi ihe ọ na-eme. Ma ihe na-akpali ya ime ihe niile ọ na-eme bụ ịhụnanya. Ihe niile ọ na-eme gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya.

Ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe kọrọ Chineke, ịhụnanya o nwere mere o ji kee ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe na ụmụ mmadụ bi n’ụwa, ndị ọ ga na-elekọta ma hụ n’anya. O kere ụwa a otú ọ ga-adị mma ka ụmụ mmadụ biri na ya. Ọ ka na-ahụkwa ụmụ mmadụ n’anya, ọ bụ ya mere o ji eme “ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.”—Matiu 5:45.

Ihe ọzọkwa bụ na “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Ọ na-ahụkwa ndị na-agba mbọ ka ha na ya dịrị ná mma n’anya. Chineke maara ha n’otu n’otu. N’eziokwu, ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.

Olee otú ịhụnanya Chineke si abara anyị uru? Ọ bụrụ na anyị ahụ ka anyanwụ na-apụta n’ụtụtụ, obi na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-eme anyị obi ụtọ ma anyị hụ ka nwatakịrị na-achị ọchị. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na ndị ezinụlọ anyị adịrị ná mma. Ọ bụ eziokwu na anyị ka nwere ike ịdị ndụ ma ọ bụrụ na ihe ndị a adịghị, ma ọ ga-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ.

Ekpere bụ ụzọ ọzọ anyị si erite uru n’ịhụnanya Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” Jehova chọrọ ka anyị bịakwute ya ma kọọrọ ya mkpa anyị niile, otú ahụ nna hụrụ nwa ya n’anya na-achọ. Ebe ọ bụ na ọ hurụ anyị n’anya, o kwere anyị nkwa na ọ ga-enye anyị “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ihe ndị a anyị kwuru gbasara àgwà Chineke ndị pụtara ìhè, ya bụ, ike, amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya ya, ò meela ka ị matakwuo ya nke ọma? Iji nyere gị aka ịhụkwu Chineke n’anya, anyị na-agba gị ume ka ị gụọ isiokwu ndị na-esonụ ka ịhụ ihe ndị Chineke mere n’oge gara aga, nakwa ihe ndị ọ ga-emere gị n’ọdịnihu.

OLEE ỤDỊ ONYE CHINEKE BỤ? Ọ bụ Jehova kacha ike, mara ihe ma na-ekpe ikpe ziri karịa onye ọ bụla. Ma, àgwà ya nke kacha amasị anyị bụ ịhụnanya