Ndị Na-eto Eto, Onye Kere Unu Chọrọ Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ
‘Ọ na-eme ka oge ndụ gị niile jupụta n’ihe ọma.’—ỌMA 103:5.
1, 2. Mgbe anyị na-ahọrọ ihe anyị chọrọ ime ná ndụ, gịnị mere o ji dị mma ige Onye Okike anyị ntị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
Ọ BỤRỤ na ị bụ onye na-eto eto, ọ ga-abụ na ndị mmadụ atụọrọla gị ọtụtụ aro gbasara ihe ị ga-achọ ime n’ọdịnihu. O nwekwara ike bụrụ na ndị nkụzi, ndị na-enye ndụmọdụ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ agbaala gị ume ka ị gaa mahadum ma ọ bụ mee ihe ọzọ ga-eme ka ị baa ọgaranya. Ma, Jehova na-agba gị ume ka i mee ihe dị iche. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova chọrọ ka ị mụta ihe a na-akụziri gị n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ịkpa afọ gị mgbe ị gụchara. (Kọl. 3:23) Ọ maara na ọ bụ ugbu a ị ka na-eto eto ka ị ga-eme mkpebi ndị dị mkpa ga-enyere gị aka ná ndụ. N’ihi ya, ọ chọrọ ka i jiri ihe ndị dị n’Okwu ya mee mkpebi ndị dị ya mma n’oge ikpeazụ a.—Mat. 24:14.
2 Cheta na Jehova maara ihe niile. Ọ ma ihe ga-eme ụwa ọjọọ a n’ọdịnihu, marakwa mgbe ọgwụgwụ ya ga-abịa. (Aịza. 46:10; Mat. 24:3, 36) Jehova maara gị nke ọma, marakwa ihe ndị ga-eme gị obi ụtọ na ihe ndị ga-eme gị obi ọjọọ. Ndụmọdụ mmadụ nyere nwere ike yie ihe dị mma, ma o nweghị uru ọ bụla ọ bara ma ọ bụrụ na o sighị n’Okwu Chineke.—Ilu 19:21.
“Ọ DỊGHỊ AMAMIHE . . . NKE PỤRỤ IGUZOGIDE JEHOVA”
3, 4. Olee otú ige ntị na ndụmọdụ ọjọọ si kpatara Adam, Iv na ụmụ ha nsogbu?
3 Ndụmọdụ ọjọọ malitere kemgbe oge Adam na Iv, mgbe Setan nyere Iv ndụmọdụ ọjọọ. Ọ gwara Iv na ha ga na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ejiri aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ndị masịrị ha. (Jen. 3:1-6) Ma, Setan bu ọdịmma nke ya n’obi nye Iv ndụmọdụ ahụ. Ihe ọ chọrọ bụ ka Adam na Iv na ụmụ ha na-efe ya, kama ife Jehova. Ma, ò nwere ihe Setan meerela ha? Mba. Ọ bụ Jehova nyere ha ihe niile ha ji biri. Ọ bụ ya mere ka ha bụrụ di na nwunye, dowe ha n’ogige mara mma, nyekwa ha ahụ́ zuru okè nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.
4 Ma, ọ dị mwute na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, si otú ahụ kewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ. Anyị ma na nsogbu ọ kpatara abụghị ihe e ji ọnụ akọ. Dị ka okooko osisi a kụtara n’osisi ya, ha ji nwayọọ nwayọọ kaa nká ma nwụọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụ ha. (Rom 5:12) N’agbanyeghị ihe ndị a, ọtụtụ ndị taa anaghị asọpụrụ Chineke otú ahụ Adam na Iv na-asọpụrụghị ya. Ha na-ebi ndụ otú masịrị ha. (Efe. 2:1-3) Ihe mechara mee gosiri na n’eziokwu “ọ dịghị amamihe . . . nke pụrụ iguzogide Jehova.”—Ilu 21:30.
5. Olee obi ike Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ? Olee ihe mere o ji nwee obi ike a?
5 Jehova ma na ụfọdụ ụmụ mmadụ, ma ọtụtụ ndị na-eto eto, ga-achọ ịmata ya ma fee ya. (Ọma 103:17, 18; 110:3) Ọ hụrụ ndị dị otú a n’anya. Ì so n’otu n’ime ha? Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na ị na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ọtụtụ ‘ihe ọma’ Chineke nyere gị. (Gụọ Abụ Ọma 103:5; Ilu 10:22) Ka anyị leba anya n’anọ n’ime ‘ihe ọma’ ndị ahụ. Ha bụ, ọtụtụ ihe Chineke na-akụziri anyị, ezigbo ndị enyi, ihe ndị anyị ga-achọ ime n’ofufe Chineke na nnwere onwe.
JEHOVA MAARA MKPA IME MMỤỌ ANYỊ
6. Gịnị mere i kwesịrị iji chọọ ịmata banyere Jehova? Olee otú Jehova si enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sie ike?
6 Ụmụ anụmanụ enweghị mkpa maka ife Chineke. Ma, anyịnwa ma na ọ dị mkpa ife ya. (Mat. 4:4) Ọ bụrụ na anyị egee Chineke ntị, anyị ga-enwe nghọta, amamihe na obi ụtọ. Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Mat. 5:3) Chineke na-esi n’Okwu ya nakwa ọtụtụ ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ewepụtara anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Mat. 24:45) N’eziokwu, Chineke na-akụziri anyị ọtụtụ ihe, ha na-abakwara anyị ezigbo uru.—Aịza. 65:13, 14.
7. Olee uru ụfọdụ anyị ga-erite ma anyị na-ege ntị n’ihe Chineke na-akụziri anyị?
7 Ihe Chineke na-akụziri anyị ga-eme ka anyị nweta amamihe, meekwa ka anyị na-eche echiche nke ọma. Ihe ndị a ga-echebe anyị n’ụzọ dị iche iche. (Gụọ Ilu 2:10-14.) Dị ka ihe atụ, ha ga-eme ka ị mata nkụzi ụgha dị iche iche, dị ka ụgha kwuru na o nweghị Onye Okike dịnụ. Ha ga-emekwa ka ị ghara ikwere n’ụgha ahụ bụ́ na ihe ga-akacha eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ inwe ego na ọtụtụ ihe onwunwe. Ha ga-enyekwara gị aka ịmata na izere ọchịchọ ọjọọ na àgwà ndị nwere ike ịkpatara gị nsogbu. N’ihi ya, na-achọ amamihe Chineke na ikike iche ichiche ma were ha ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. I nweta ha, ọ ga-eme ka ị mata na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ chọrọ ka ihe gaziere gị.—Ọma 34:8; Aịza. 48:17, 18.
8. Gịnị mere i kwesịrị iji bịaruo Chineke nso ugbu a? Olee otú ọ ga-esi baara gị uru n’ọdịnihu?
Hab. 3:2, 12-19) Ugbu a bụ oge i kwesịrị iji bịaruo Nna gị nke eluigwe nso ma mee ka gị na ya dịrị ná mma. (2 Pita 2:9) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, n’agbanyeghị ihe ọ bụla na-eme n’ebe ị nọ, obi ga-adị gị otú ahụ ọ dị Devid, onye kwuru sị: “Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile. N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.”—Ọma 16:8.
8 N’oge na-adịghị anya, ụwa ekwensu a ga-ala n’iyi. Ọ bụ naanị Jehova ga-echebe anyị ma na-egboro anyị mkpa anyị, ma nri anyị ga na-eri. (JEHOVA ENYELA GỊ EZIGBO NDỊ ENYI
9. (a) Gịnị ka Jọn 6:44 kwuru Jehova na-eme? (b) Olee ihe na-adị iche ma anyị hụ Ndịàmà Jehova ibe anyị?
9 Jehova na-adọta ndị nwere ezi obi ka ha soro n’ezinụlọ ndị na-efe ya. (Gụọ Jọn 6:44.) Mgbe mbụ ị hụrụ onye na-abụghị Onyeàmà Jehova, ị̀ na-ama ọtụtụ ihe banyere ya? Mba. Ọ bụ naanị ihe ole na ole ka ị ga-ama banyere ya, dị ka, aha ya na otú ọ dị. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ na-adị mgbe mbụ ị hụrụ Onyeàmà Jehova. Ọ bụrụgodị na onye ahụ si mba ọzọ, na-asụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ nwee omenala dị iche na nke gị, ị marala ọtụtụ ihe gbasara ya, yanwa amarakwa nke gị.
10, 11. Gịnị ka ndị Jehova niile nwekọrọ ọnụ, oleekwa otú o si na-abara anyị uru?
10 Dị ka ihe atụ, ozugbo ị hụrụ Onyeàmà Jehova ibe gị, ị ma na unu abụọ na-asụ otu ụdị “asụsụ,” ya bụ, “asụsụ dị ọcha.” (Zef. 3:9) Unu abụọ ma, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ihe onye nke ọ bụla kweere banyere Chineke, àgwà dị mma n’anya Chineke, nakwa olileanya onye nke ọ bụla nwere maka ọdịnihu. Ihe ndị a bụ ihe ndị kacha mkpa mmadụ kwesịrị ịma banyere onye ọzọ. Ha ga-eme ka unu tụkwasịkwuo onwe unu obi, meekwa ka unu nọgide na-abụ ezigbo ndị enyi.
11 N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-efe Jehova, i nwere ike ikwu na i nwere ọtụtụ ezigbo ndị enyi. I nwere ndị enyi n’ụwa niile, n’agbanyeghị na ị hụbeghị ọtụtụ n’ime ha. Ò nwere ndị ọzọ nwere ndị enyị otú a ka ndị Jehova?
JEHOVA NA-EME KA I NWEE IHE NDỊ Ị GA-ACHỌ IME N’OFUFE YA
12. Olee ihe ndị ị na-achọ ime n’ozi Jehova?
12 Gụọ Ekliziastis 11:9–12:1. Ò nwere ihe ndị ị na-achọ ime n’ozi Jehova ị na-agbalị ka i bido ime ha? O nwere ike ịbụ na ị na-agbalị ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, ma ọ bụ ịmụtakwu otú e si ekwu okwu na otú e si akụzi ihe. Olee otú obi na-adị gị ma ị chọpụta na ị na-emezi nke ọma, ma ọ bụkwanụ ma ndị ọzọ jaa gị mma na ị na-eme nke ọma? O doro anya na obi ga-atọ gị ụtọ maka mgbalị ndị i mere iji nwee ọganihu ndị ahụ. I kwesịrị inwe ezigbo obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na i mere ihe Chineke chọrọ ka i mee, otú ahụ Jizọs mere.—Ọma 40:8; Ilu 27:11.
13. Gịnị mere ijere Chineke ozi ji dị mma karịa ịchụso ihe nke ụwa?
13 Ọ bụrụ na i tinye uche gị n’ozi Jehova, obi ga-atọ gị ụtọ n’ihi na ị ma na mbọ ị na-agba agaghị efu ọhịa. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Guzosienụ ike, bụrụnụ ndị kwụ chịm, ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 15:58) Ma, ọ bụrụ na mmadụ etinye uche ya n’ịchụ ego ma ọ bụ n’ịchọ ịbụ onye a ma ama, ọ gaghị enwe obi ụtọ. Ọ bụrụgodị na ihe agaziere ya, e mechaa ọ ga-ahụ na o ji ndụ ya mee ihe na-enweghị isi. (Luk 9:25) Ihe ndị mere Eze Sọlọmọn gosiri na ihe a bụ eziokwu.—Rom 15:4.
14. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe Sọlọmọn chọpụtara?
14 Sọlọmọn bụ́ eze dị ike ma baa ezigbo ọgaranya mere nchọpụta. Ọ sịrị: ‘Ka m nwalee ịṅụrị ọṅụ, hụkwa ihe ọma ga-esi na ya pụta.’ (Ekli. 2:1-10) Ọ rụrụ ọtụtụ ụlọ, rụọ ogige ọma dị iche iche, meekwa ihe ọ bụla masịrị ya. N’ikpeazụ, ihe ndị ahụ niile ò mere ka Sọlọmọn nwee obi ụtọ ná ndụ ya? Mbanụ. Sọlọmọn kwuru, sị: “Mụ onwe m tụgharịrị lee ọrụ niile aka m rụrụ, . . . , lee! ihe niile bụ ihe efu, . . . ọ dịghịkwa ihe ọ bụla bara uru.” (Ekli. 2:11) Ị̀ mụtara ihe n’ihe a Sọlọmọn chọpụtara?
15. Gịnị mere okwukwe ji dị mkpa? Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 32:8, olee uru okwukwe bara?
15 Jehova achọghị ka i mee ihe ndị ị ga-emecha kwaara mmakwaara. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ okwukwe ga-eme ka anyị na-erubere Chineke isi ma mee ka ime uche Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ anyị. Okwukwe a bara ezigbo uru, ị gaghị akwakwa mmakwaara ma i nwee ya. N’eziokwu, Jehova emekataghị chefuo “ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Hib. 6:10) N’ihi ya, gbalịsie ike mee ka okwukwe gị sie ezigbo ike. I mee otú ahụ, ị ga-ahụ na Nna gị nke eluigwe chọrọ ka ihe gaziere gị.—Gụọ Abụ Ọma 32:8.
CHINEKE NA-ENYE GỊ EZIGBO NNWERE ONWE
16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji jiri nnwere onwe anyị kpọrọ ihe ma jiri ya mee ihe bara uru?
16 Pọl dere, sị: “Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.” (2 Kọr. 3:17) Jehova hụrụ nnwere onwe n’anya. O kekwara anyị ka anyị hụ nnwere onwe n’anya. Ọ chọkwara ka i jiri nnwere onwe gị mee ihe bara uru ka o nwee ike ichebe gị. O nwere ike ịbụ na ị ma ụfọdụ ndị na-eto eto na-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụ na-akwa iko, na-eme egwuregwu ndị nwere ike ịta isi ha, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ na-aṅụbiga mmanya ókè. N’eziokwu, ihe ndị ahụ nwere ike ịna-atọ ha ụtọ naanị nwa oge. Ma, mgbe e mechara ha ga-ata ahụhụ ya. Ha nwere ike bute ọrịa, bụrụ ndị ịṅụ mmanya na ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ ma ọ bụdị nwụọ. (Gal. 6:7, 8) O doro anya na ụdị “nnwere onwe” ha a abụghị nke ezigbo ya.—Taị. 3:3.
17, 18. (a) Olee otú irubere Chineke isi si eme ka anyị nwere onwe anyị? (b) Olee otú o si bụrụ na Adam na Iv nweere onwe ha karịa ụmụ mmadụ taa?
17 Ma, mmadụ ole ka ị maara butere ọrịa n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru? Nke bụ́ eziokwu bụ na irubere Jehova isi na-eme ka ahụ́ doo mmadụ, na-emekwa ka anyị nwere onwe anyị. (Ọma 19:7-11) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na i jiri nnwere onwe gị na-eme ihe ndị bara uru, ya bụ, na-eme ihe iwu Chineke kwuru, ma Chineke ma ndị mụrụ gị ga-atụkwasị gị obi, ha ga-enyekwukwa gị nnwere onwe. Chineke chọsiri ike ime ka ndị ohu ya nwere onwe ha kpamkpam. Baịbụl sịrị na ọ bụ “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Rom 8:21.
18 E nwere mgbe Adam na Iv nwere ụdị nnwere onwe a. Iwu ole ka Chineke nyere ha n’ogige Iden? Ọ bụ naanị otu. Chineke gwara ha erila mkpụrụ nke otu osisi. (Jen. 2:9, 17) Ị̀ ga-asị na iwu ahụ siri oké ike idebe? Mbanụ. Iwu ahụ Chineke nyere Adam na Iv enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ iwu ndị mmadụ na-amanye ibe ha idebe.
19. Olee otú Jehova na Jizọs si na-akụziri anyị ihe ndị ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?
19 Jehova na-emeso ndị ohu ya ihe otú gosiri na o nwere amamihe. Kama inye anyị ọtụtụ iwu, o ji ndidi na-akụziri anyị ịhụnanya ya. Ọ chọrọ ka anyị na-eme ihe iwu ya kwuru ma kpọ ihe ọjọọ asị. (Rom 12:9) Ozizi Elu Ugwu Jizọs bụ otu ụzọ o si kụziere anyị iwu ya, n’ihi na o mere ka anyị ghọta ihe mere ndị mmadụ ji eme ajọ omume. (Mat. 5:27, 28) N’ụwa ọhụrụ, Jizọs bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, ga anọgide na-akụziri anyị ihe ruo mgbe anyị ga-elewe ihe ọma na ihe ọjọọ anya otú yanwa si ele ha. (Hib. 1:9) Ọ ga-emekwa ka ahụ́ anyị na echiche anyị zuo ókè. Chegodị otú ọ ga-adị mgbe ọ na-enweghị ihe ga-eme ka i mehie ma ọ bụ taa ahụhụ n’ihi mmehie. Mgbe ahụ, ị ga-aṅụrị ọṅụ ná “nnwere onwe dị ebube” Jehova kwere gị ná nkwa.
20. (a) Olee otú Jehova si eji nnwere onwe ya arụ ọrụ? (b) Olee otú iṅomi ya ga-esi baara anyị uru?
20 Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-enwere onwe anyị ime ihe ọ bụla masịrị anyị mgbe ahụ. Ihe ga na-eduzi nnwere onwe anyị bụ ịhụnanya anyị nwere maka Chineke na mmadụ ibe anyị. Anyị na-eṅomi Jehova ma ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ. N’agbanyeghị na Jehova nweere onwe ya ime ihe masịrị ya, o kwere ka ịhụnanya ya na-eduzi otú o si na-emeso ụmụ mmadụ ihe. (1 Jọn 4:7, 8) N’ihi ya, nnwere onwe anyị ga-aka aba uru ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ịhụnanya Chineke na-eduzi ya.
21. (a) Olee otú obi dị Devid banyere Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 Ì nwere obi ụtọ maka ọtụtụ ‘ihe ọma’ Jehova meere gị, dị ka, ọtụtụ ihe Chineke na-akụziri gị, ezigbo ndị enyi o mere ka i nweta, ihe ndị ị ga-achọ ime n’ofufe ya, nakwa nkwa o kwere ime ka anyị nwere onwe anyị kpamkpam n’ọdịnihu? (Ọma 103:5) Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-eji obi ụtọ kwuo ihe dị n’Abụ Ọma 16:11. Ọ sịrị: “Ị ga-eme ka m mara ụzọ ndụ. Ịṅụrịju ọṅụ afọ dị n’ihu gị; Ịdị mma dị n’aka nri gị ruo mgbe ebighị ebi.” N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta n’Abụ Ọma 16. Ihe ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịhụ ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi na-ebi ndụ kacha mma.