Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dị Nso?
Ndị mmadụ ekwuola ọtụtụ ugboro na ụwa ga-agwụ, ma ọ gwụbeghị ruo ugbu a. N’ihi ya, ọgwụgwụ ụwa ọ̀ bụ akụkọ ifo ka ọ̀ bụ ihe ga-eme eme?
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
Olee otú ụwa ga-esi agwụ?
Olee mgbe ọ ga-agwụ?
Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara ibibi gị mgbe ọ ga-agwụ?
Olee otú ihe ga-adị n’ụwa mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume?
A kọwara ihe Baịbụl zara n’ajụjụ ndị a n’Ụlọ Nche a. Ihe ọ zara nwere ike ịtụ gị n’anya, kasiekwa gị obi.
Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ka ị mụtakwuo ihe Chineke bu n’obi kee ụwa.