Olee Mgbe Ụwa Ga-agwụ? Ihe Jizọs Kwuru
Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, mgbe Baịbụl kwuru gbasara ọgwụgwụ ụwa, ọ pụtaghị ọgwụgwụ ụwa a anyị bi na ya. Ọ pụtaghịkwanụ na a gaghịzi enwe ndị ga-ebi n’ụwa a. Kama, ihe ọ pụtara bụ na a ga-ebibi ndị ọjọọ niile. Ma Baịbụl, ò kwuru kpọmkwem mgbe a ga-ebibi ndị ọjọọ niile?
LEGODỊ IHE ABỤỌ JIZỌS KWURU GBASARA ỌGWỤGWỤ ỤWA:
“N’ihi ya, na-echenụ nche, maka na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge ọ ga-abụ.”—MATIU 25:13.
“Na-elenụ anya, mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị oge ọ ga-abụ.” —MAK 13:33.
N’ihi ya, o nweghị onye nọ n’ụwa ma kpọmkwem mgbe Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume n’ụwa. Ma Chineke nwere “oge” a kapịrị ọnụ ọ ga-ebibi ha, ya bụ, “ụbọchị na awa” ọ ga-eme otú ahụ. (Matiu 24:36) Ma ihe a ọ̀ pụtara na o nwetụdịghị otú mmadụ ga-esi ama na ọgwụgwụ adịla nso? Mbanụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe ga na-eme n’ụwa ha ga-eji ama na ọgwụgwụ adịla nso.
IHE NDỊ GA NA-EME N’ỤWA
Ihe ndị Jizọs kwuru ga na-eme n’ụwa ga-abụ ihe àmà “nke ọgwụgwụ oge a.” Jizọs kwuru, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:3, 7) O kwukwara na a ga-enwe “ọrịa na-efe efe” n’ebe dị iche iche. (Luk 21:11) Ị̀ na-ahụ ka ihe ndị a Jizọs kwuru na-emezu?
Taa, agụụ, agha, ala ọma jijiji, na ajọ ọrịa dị iche iche akpaala ndị mmadụ aka ọjọọ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2004, nnukwu ala ọma jijiji mere n’Oké Osimiri India gburu ihe dị ka narị puku mmadụ abụọ na puku iri abụọ na ise (225,000). N’ime afọ atọ, ọrịa koronavaịrọs tara isi ihe dị ka nde mmadụ isii na narị puku itoolu (6,900,000) n’ụwa niile. Jizọs kwuru na a ga-eji ụdị ihe ndị a ama na ọgwụgwụ ụwa adịla nso.
“OGE IKPEAZỤ”
Baịbụl kpọrọ oge a ga-enwe tupu ọgwụgwụ abịa ‘oge ikpeazụ.’ (2 Pita 3:3, 4) Baịbụl kwukwara na 2 Timoti 3:1-5 na ihe a ga-eji ama oge ikpeazụ bụ na àgwà ndị mmadụ ga-ajọgbu onwe ha. (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Ga Na-eme Tupu Ọgwụgwụ Abịa.”) Ị̀ na-ahụ ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ndị anyaukwu, ndị tigbuo zọgbuo, na ndị na-akpa àgwà ọjọọ ndị ọzọ taa? Ihe a ndị mmadụ na-eme so n’ihe ndị na-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị ezigbo nso.
Oge ikpeazụ, ọ̀ ga-anọ afọ ole? Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ‘ntakịrị oge.’ Ntakịrị oge ahụ gachaa, Chineke ebibie “ndị na-ebibi ụwa.”—Mkpughe 11:15-18; 12:12.
MGBE ỤWA GA-AGHỌ PARADAỊS DỊ NSO
Chineke ewepụtala ụbọchị na awa ọ ga-ebibi ndị ajọ omume. (Matiu 24:36) Ma e nwekwara ozi ọma ọzọ. Ozi ọma ahụ bụ na ‘o nweghị onye Chineke chọrọ ka e bibie.’ (2 Pita 3:9) Ọ na-enye anyị niile ohere ka anyị mata ya ma na-erubere ya isi. Gịnị mere o ji eme otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ chọghị ka e bibie anyị mgbe a ga-ebibi ndị ọjọọ, kama ọ chọrọ ka anyị biri n’ụwa ọhụrụ ya mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.
Chineke ahaziela ka e zie ndị bi ná mba niile ozi ọma ka ha mata ihe ha ga-eme ka ha nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ ya mgbe Alaeze ya ga na-achị ụwa. Jizọs sịrị na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’ebe niile n’ụwa.” (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-eji ọtụtụ ijeri awa ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha Baịbụl. Ozi ọma a na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya. Jizọs sịrị na a ga-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile tupu ọgwụgwụ abịa.
Oge ọchịchị ụmụ mmadụ ga-agwụ eruola eruo. Ma ozi ọma dịnụ bụ na e nwere ike ịzọpụta gị mgbe a ga-ebibi ụwa a, gị ebirikwa n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa. N’isiokwu ọzọ, anyị ga-eleba anya n’ihe ị ga-eme ka i nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ.
Ihe Jizọs kwuru gbasara “oge ikpeazụ” na-emesi anyị obi ike na ụwa ọhụrụ dị nso