Ụwa Ọhụrụ Dị Anyị Mkpa
Odeakwụkwọ Ukwu Òtù Mba Ụwa aha ya bụ António Guterres kwuru, sị, “Nsogbu juru n’ụwa anyị a.” Ihe a o kwuru ọ́ bụghị eziokwu?
Anyị na-anụkarị akụkọ gbasara
Ọrịa dị iche iche
Ọdachi ndị na-emere onwe ha
Ịda ogbenye na agụụ
Imetọ ụwa na oké okpomọkụ
Arụrụala, tigbuo zọgbuo, na nrụrụaka
Agha
O doro anya na ụwa ọhụrụ dị anyị mkpa, ya bụ, ụwa
Ahụ́ ga-agbasi onye ọ bụla ike na ya
Ahụ́ ga-eru onye ọ bụla ala
Nri ga-abụ atụrụ tawa
A na-enweghị ebe ruru unyi
A na-enweghị onye a ga-emegbu
Udo zuru ebe niile
Ma, oleekwanụ ihe ụwa ọhụrụ pụtara?
Gịnị ga-eme ụwa a anyị bi n’ime ya?
Olee ihe anyị ga-eme ka anyị biri n’ụwa ọhụrụ?
Ụlọ Nche a ga-esi na Baịbụl zaa ajụjụ ndị a nakwa ajụjụ ndị ọzọ yiri ha. Ihe ọ zara ga-akasikwa gị obi.