Chineke Ọ̀ Ma na Ị Nọ?
IHE IHE NDỊ CHINEKE KERE NA-AKỤZIRI ANYỊ
N’ime awa mbụ a mụrụ nwatakịrị, ọ dị ezigbo mkpa ka nne ya kuru ya ma na-emetụ ya aka. Ime otú ahụ ga-enyere nwa ahụ aka n’uto ya. *
Gịnị na-eme ka nwaanyị mụrụ nwa hụ nwa ọhụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya nke ọma? N’akwụkwọ bụ́ The Journal of Perinatal Education, otu ọkachamara aha ya bụ Jeannette Crenshaw kwuru ihe na-akpata ya. Ọ sịrị na e nwere ihe ahụ́ nwaanyị na-emepụta a na-akpọ oxytocin n’oge ahụ. Ihe a “na-eme ka nne na-ahụkwu nwa ya n’anya ka ọ na-ele nwa ahụ anya, na-emetụ ya aka ma ọ bụ na-enye ya ara.” E nwekwara ihe ọzọ ahụ́ nwaanyị na-emepụta na-eme “ka nwaanyị ahụ na-elekọta nwa ya, na-enye ya ihe ọ chọrọ.” Ọ na-emekwa ka ya na nwa ya dịrị n’ezigbo mma. Gịnị ka ihe a na-egosi?
Ọ bụ Jehova Chineke, onye kere anyị ma hụ anyị n’anya, mere ka nne na nwa ya na-adị ná mma otú a. * Eze Devid kwuru na ọ bụ Chineke “si n’afọ sepụta” ya, na ọ bụkwa Chineke mere ka obi ruo ya ala mgbe nne ya ku ya. Ọ gwara Jehova, sị: “E nyefere m n’aka gị malite n’oge m nọ n’akpa nwa; ị bụ Chineke m malite n’oge m nọ n’afọ nne m.”—Abụ Ọma 22:9, 10.
CHEGODỊ IHE A: Ebe ọ bụ na Chineke kere nwaanyị otú ọ ga-enwe ike ịhụ nwa ya n’anya ma lekọta ya nke ọma, ọ̀ bụ na o gosighị na ihe gbasara onye ọ bụla n’ime anyị, bụ́ “ndị Chineke mụrụ,” na-emetụ ya n’obi?—Ọrụ Ndịozi 17:29.
IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI GBASARA OTÚ CHINEKE SI ELEKỌTA ANYỊ
Jizọs Kraịst ma Onye kere anyị nke ọma karịa otú onye ọ bụla ọzọ ma ya. O kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ. Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29-31.
Ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime anyị na-anọ lewe ụmụ obere nnụnụ niile ha hụrụ, ma ya fọdụzie ịma mgbe otu n’ime ha dara n’ala. Ma, Nna anyị nke eluigwe na-ahụ nke ọ bụla n’ime ha. Ma, ọtụtụ ụmụ nnụnụ adịghịdị oké ọnụ ahịa n’anya ya karịa otu mmadụ. Ihe ihe a na-akụziri anyị doro anya. “Atụla egwu” na Chineke amaghị na ị nọ. Ọ na-eche banyere gị.
Ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi, anya ya dịkwa n’ebe anyị nọ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya
Baịbụl kwuru, sị:
-
“Anya Jehova dị n’ebe niile, na-elegide ndị ọjọọ na ndị ọma.”—ILU 15:3.
-
“Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.”—ABỤ ỌMA 34:15.
-
“M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’obiọma gị, n’ihi na ị hụwo mmekpa ahụ́ m; ị marawo ahụhụ mkpụrụ obi m na-ata.”—ABỤ ỌMA 31:7.
“M CHEBURU NA JEHOVA AHỤGHỊ M N’ANYA”
Ò nwere uru ọ ga-abara anyị ma anyị mata na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi, nakwa na anya ya dị n’ebe anyị nọ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya? Ehenụ. Otu nwaanyị onye Ịngland aha ya bụ Hannah * kwuru, sị:
“E nwere ọtụtụ mgbe m chere na Jehova ahụghị m n’anya, nakwa na ọ naghị aza ekpere m. Echere m na ọ bụ n’ihi na enweghị m okwukwe, cheekwa na ọ na-ata m ahụhụ ma ọ bụkwanụ na ọ naghị aza ekpere m n’ihi na e nweghị onye m bụ. M chere na ọ chọghị ịma gbasara m.”
Ma ugbu a, Hannah anaghịzi enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ na-aza ekpere ya nakwa ma ọ̀ hụrụ ya n’anya. Gịnị mere na ọ naghịzi enwe obi abụọ? Hannah kwuru, sị: “M ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ya. M chetara otu okwu ruru m n’obi e si na Baịbụl kwuo ọtụtụ afọ gara aga gbasara àjà mgbapụta Jizọs. Okwu ahụ mere ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya. Mgbe ọ bụla Jehova zara ekpere m, m na-adapụ n’ákwá n’ihi na achọpụtala m na Jehova hụrụ m n’anya. Ịmụ Baịbụl na ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova enyerela m aka ịmụtakwu gbasara Jehova, àgwà ya, na otú o si hụ anyị n’anya. Ugbu a, o doola m ezigbo anya na Jehova na-enyere anyị aka, na ọ hụrụ anyị niile n’anya, chọọkwa ilekọta onye ọ bụla n’ime anyị.”
Ihe a Hannah kwuru na-agba ume. Ma, olee otú obi nwere ike isi sie gị ike na Chineke na-aghọta ma na-echeta otú obi dị gị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.
^ para. 3 Ọ na-abụ ụmụ nwaanyị ụfọdụ mụọ nwa ọhụrụ, isi anaghị akpakọcha ha ọnụ, ya emee ka ha ghara ilekọta nwa ha otú nne kwesịrị isi elekọta nwa ya. Ma, ha ekwesịghị ichewe na o si ha n’aka. Otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka na-ahụ maka ahụ́ ike kwuru, sị: “Ihe ndị nwere ike ịkpata ya bụ ụfọdụ mgbanwe nwaanyị mụrụ nwa na-enwe n’ahụ́, nsogbu ndị nwaanyị ahụ nwere mgbe ọ dị ime na ihe ndị ọzọ . . . ọ bụghị ihe nne mụrụ nwa mere ma ọ bụ ihe ọ na-emeghị.” Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya gụọ isiokwu bụ́ “Understanding Postpartum Depression” Ọ gbara na Teta! (Bekee) nke Jun 8, 2003.
^ para. 5 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.
^ para. 15 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.