Gịnị Mere Anyị Ji Na-aka Nká Ma Na-Anwụ Anwụ?
CHINEKE achọghị ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. Nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv zuru okè mgbe Chineke kere ha. Ha gakwaara adị ndụ ruo taa. Ihe Jehova gwara Adam banyere otu osisi dị n’ogige Iden mere ka anyị mata na ihe a bụ eziokwu.
Chineke gwara Adam, sị: “N’ụbọchị i riri mkpụrụ si [n’osisi ahụ], ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:17) Ọ bụrụ na Chineke kere Adam ka ọ kaa nkà ma nwụọ, ọ garaghị enye ya iwu a. Adam makwa na ọ bụrụ na ya erighị mkpụrụ osisi ahụ na ya agaghị anwụ.
CHINEKE ACHỌGHỊ KA ỤMỤ MMADỤ NA-ANWỤ ANWỤ
Agụụ agaghị agụgbu Adam na Iv ma ọ bụrụ na ha erighị mkpụrụ si n’osisi ahụ n’ihi na e nwere osisi ndị ọzọ na-amị mkpụrụ juru n’ogige ahụ. (Jenesis 2:9) Ha gaara egosi na ha na-erubere Onye nyere ha ndụ isi ma a sị na ha erighị mkpụrụ osisi ahụ. Ọ gakwaara egosi na ha ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha.
IHE MERE ADAM NA IV JI NWỤỌ
Ka anyị nwee ike ịghọta ihe mere Adam na Iv ji nwụọ, anyị ga-atụle otu mkparịta ụka kpataara anyị nsogbu. Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ ghaa otu okpookpo ụgha. Baịbụl kwuru, sị: “Agwọ kasị dị akọ n’ime anụ ọhịa niile Jehova bụ́ Chineke kere. O wee malite ịgwa nwaanyị ahụ, sị: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?’”—Jenesis 3:1.
Iv zara ya, sị: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a. Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a, Chineke sịrị: ‘Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.’” Agwọ ahụ gwaziri ya, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” Ihe Setan na-ekwu bụ na Jehova bụ onye ụgha, nakwa na ọ chọghị ka Adam na Iv nweta ihe ga-abara ha uru.—Jenesis 3:2-5.
Iv kwetara ihe agwọ ahụ gwara ya. O lewere osisi ahụ anya, ya adị ya mma n’anya, gụwakwa ya agụụ. O weere ụfọdụ n’ime mkpụrụ osisi ahụ, malite iri ya. Baịbụl kwuru ihe mechara mee. Ọ sịrị: “E mesịa, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, o wee rie.”—Jenesis 3:6.
Chineke gwara Adam, sị: “N’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.”—JENESIS 2:17
O doro anya na o wutere Chineke mgbe ụmụ ya ọ hụrụ n’anya kpachaara anya nupụrụ ya isi. Gịnị ka o meziri? Ọ gwara Adam, sị: ‘Ị ga-alaghachi n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.’ (Jenesis 3:17-19) Gịnị meziri? Baịbụl kwuru, sị: “Ụbọchị niile Adam dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri atọ, o wee nwụọ.” (Jenesis 5:5) Mgbe Adam nwụrụ, ọ gaghị eluigwe ma ọ bụ ebe ọzọ. O nweghị ebe ọ dịbu ndụ tupu Jehova esi n’ájá kee ya. N’ihi ya, mgbe ọ nwụrụ, ọ ghọrọ ájá. Ọ dịghịzi adị. Leenụ ihe ha mere onwe ha.
IHE MERE NA ANYỊ EZUGHỊ OKÈ
Ebe ọ bụ na Adam na Iv kpachaara anya nupụrụ Chineke isi, ha ezuzighị okè, ha enweghịzikwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ahụ́ ha gbanwere, ha aghọọ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie. Ma, ọ bụghị naanị ha ka nnupụisi ha kpataara nsogbu. Ụmụ niile ha ga-amụ agaghị ezu okè. Ndị Rom 5:12 kwuru, sị: “Dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”
Baịbụl kwuru na mmehie na ọnwụ dị ka “ihe mkpuchi nke kpuchiri ndị niile, na ákwà a kpara akpa nke kpuchiri mba niile.” (Aịzaya 25:7) Ihe mkpuchi a kpuchiri ụmụ mmadụ nke na ha agaghị enwe ike isi na ya pụta. N’eziokwu, “mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam.” (1 Ndị Kọrịnt 15:22) Anyị na-ajụzi ụdị ajụjụ Pọl onyeozi jụrụ. Ọ jụrụ, sị: “Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a?” È nwere onye ga-anapụtali anyị?—Rom 7:24.