Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú A Ga-esi Emeri Onye Iro Anyị Bụ́ Ọnwụ?

Olee Otú A Ga-esi Emeri Onye Iro Anyị Bụ́ Ọnwụ?

N’AGBANYEGHỊ na isi ahụ nne na nna anyị mbụ nupụụrụ Chineke mere ka ụmụ mmadụ bụrụ ndị mmehie ma na-anwụ anwụ, ọ gbanweghị ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Chineke kwuru ọtụtụ ebe na Baịbụl na nzube ya agbanwebeghị.

  • “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”Abụ Ọma 37:29.

  • “Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.”Aịzaya 25:8.

  • “Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.”1 Ndị Kọrịnt 15:26.

  • “Ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”Mkpughe 21:4.

Olee otú Chineke ga-esi ‘eloda ọnwụ’ ma ọ bụ mee ka ọnwụ “ghara ịdị irè”? Dị ka anyị kwuru na mbụ, Baịbụl kwuru na ‘ndị ezi omume ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’ Ma o kwukwara na “e nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe.” (Ekliziastis 7:20) Ọ̀ pụtara na Chineke ga-ahapụ ihe o kwuru na Baịbụl, gharazie ịtụ anya ka ndị mmadụ mee ihe o nyere n’iwu ka o nwee ike imeri ọnwụ? Mbanụ. Chineke agaghị eme ihe dị otú ahụ n’ihi na ‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’ (Taịtọs 1:2) Gịnịzi ka Chineke ga-eme iji mezuo ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ?

CHINEKE “GA-ELODA ỌNWỤ RUO MGBE EBIGHỊ EBI.”—AỊZAYA 25:8

O NYERE IHE MGBAPỤTA IJI MERIE ỌNWỤ

Jehova Chineke meere anyị ihe ọma nye anyị ihe mgbapụta iji napụta anyị n’aka ọnwụ. Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ maka ihe e mebiri ma ọ bụ iwu a dara. Ụgwọ a na ihe e mebiri ga-aha. Ebe ọ bụ na mmadụ niile bụ ndị mmehie, bụrụkwa ndị a mara ikpe ọnwụ, Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ ịnapụta nwanne ya ma ọlị, ọ dịghịkwa nke pụrụ inye Chineke ihe mgbapụta maka ya; (Ihe mgbapụta a ga-akwụ maka mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ nke na ọ dịghị adị ruo mgbe ebighị ebi).”—Abụ Ọma 49:7, 8.

Mmadụ na-ezughị okè nwụọ, ọ na-akwụ ụgwọ mmehie nke ya naanị, ọ gaghị agbapụtali onwe ya ma ọ bụ kwụọ ụgwọ mmehie nke onye ọzọ. (Ndị Rom 6:7) N’ihi ya, ọ bụ onye zuru okè nke na-enweghị mmehie ga-enye ndụ ya iji gbapụta anyị ná mmehie.—Ndị Hibru 10:1-4.

Ihe a ka Chineke si n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs meere anyị. O si n’eluigwe zite ya ka a mụọ ya n’ụwa dị ka mmadụ zuru okè na-enweghị mmehie. (1 Pita 2:22) Jizọs kwuru na ọ bịara ka ‘o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mak 10:45) Ọ nwụrụ ka ọ kwụọ ụgwọ mmehie anyị ma gbapụta anyị n’aka ọnwụ.—Jọn 3:16.

OLEE MGBE A GA-EMERI ỌNWỤ?

Anyị na-ahụ ka amụma Baịbụl buru na “a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ” na-emezu taa. Ọ na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ” nke ụwa ọjọọ a. (2 Timoti 3:1) Oge ikpeazụ a ga-agwụ ‘n’ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.’ (2 Pita 3:3, 7) Ma, a gaghị ebibi ndị hụrụ Chineke n’anya, a ga-ejikwa “ndụ ebighị ebi” gọzie ha.—Matiu 25:46.

Jizọs bịara ka ‘o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’—Mak 10:45

Ọtụtụ nde mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-enwe ohere ịdị ndụ ebighị ebi. Jizọs kpọlitere mmadụ n’ọnwụ mgbe ọ gara n’obodo Nen. N’ebe ahụ, otu mkpụrụ nwa nke otu nwaanyị di ya nwụrụ nwụnahụrụ ya. Jizọs “nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ” ma kpọlitere ya nwa ya n’ọnwụ. (Luk 7:11-15) Pọl onyeozi kwukwara, sị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” Olileanya mbilite n’ọnwụ bụ otú Chineke si gosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwu.—Ọrụ Ndịozi 24:15.

Ọtụtụ ijeri mmadụ ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) N’oge ahụ, ha ga-enwe ezigbo obi ụtọ ịhụ mgbe okwu Pọl kwuru ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga na-emezu. Ọ sịrị: “Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?” (1 Ndị Kọrịnt 15:55) Mgbe ahụ ka a ga-emeri ọnwụ, bụ́ onye iro na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala.