Ijegharị N’amamihe N’ebe Ụwa Nọ
Ijegharị N’amamihe N’ebe Ụwa Nọ
“Na-ejegharịnụ n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ.”—NDỊ KỌLỌSI 4:5.
1. Gịnị ka ndị Kraịst mbụ zutere, oleekwa ndụmọdụ Pọl nyere ọgbakọ dị na Kọlọsi?
NDỊ Kraịst mbụ bi n’obodo ukwu dị iche iche nke ụwa ndị Rom bụ ndị ikpere arụsị, ịchọ ihe ụtọ nke omume rụrụ arụ, na ihe omume na omenala ndị ọgọ mmụọ chere ihu mgbe nile. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị biri na Kọlọsị, bụ́ obodo nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke etiti Asia Minor, zutere ofufe chi nne na mgbaasị nke ndị obodo Frijia, nkà ihe ọmụma nke ndị ala ọzọ si Gris, na okpukpe ndị Juu nke ógbè ndị Juu. Pọl onyeozi nyere ọgbakọ ndị Kraịst ndụmọdụ ka ha ‘na-ejegharị n’amamihe’ n’ebe ndị dị otú ahụ “nọ n’èzí” nọ.—Ndị Kọlọsi 4:5.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị Ndịàmà Jehova n’oge a mkpa ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ?
2 Taa, Ndịàmà Jehova na-ezutekwa omume ndị na-adịghị mma yiri ndị ahụ, ọbụna karị. Ya mere, ọ dịkwa ha mkpa iji amamihe mee ihe ná mmekọrịta ha na ndị na-anọghị n’ezi ọgbakọ ndị Kraịst. Ọtụtụ ndị n’ụlọ ọrụ dị iche iche nke okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi naeguzogide ha. Ụfọdụ n’ime ndị mmegide ndị a, site n’ime mwakpo pụtara ìhè ma ọ bụ, dị ka o si adịkarị, site n’apụtaghị ìhè kpọmkwem, na-agba mbọ imebi aha Ndịàmà Jehova ma kpalie ịkpọasị megide ha. Dị nnọọ ka e lere ndị Kraịst mbụ anya n’ụzọ ezi Ọrụ 24:14; 1 Pita 4:4.
ikpe na-adịghị ya, dị ka ndị na-anụbiga ọkụ ókè n’obi na ọbụna “ịrọ òtù” nke dị ize ndụ, Ndịàmà Jehova nke oge a na-anatakarị ịkpọasị na nghọtahie.—Imeri Ịkpọasị
3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ụwa na-agaghị eji hụ ezi ndị Kraịst n’anya mgbe ọ bụla, ma gịnị ka anyị kwesịrị ịgba mbọ ime? (b) Gịnị ka otu onye na-ede akwụkwọ dere banyere Ndịàmà Jehova e ji eji n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi?
3 N’eziokwu, ndị Kraịst adịghị atụ anya ịbụ ndị ụwa hụrụ n’anya, bụ́ nke, dị ka Jọn onyeozi si kwuo, “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Otú o sina dị, Bible na-agba ndị Kraịst ume ka ha gbalịsie ike ịtọghata ndị mmadụ bịakwute Jehova na ofufe ya dị ọcha. Nke a ka anyị na-eme site n’ịgba àmà kpọmkwem na site n’ezi àgwà anyị. Pita onyeozi dere, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:12.
4 N’akwụkwọ ya bụ́ Forgive—But Do Not Forget, onye na-ede akwụkwọ bụ́ Sylvia Salvesen kwuru banyere ndị inyom bụ́ Ndịàmà ndị ha na ya nọkọrọ n’ụlọ mkpọrọ n’otu ogige ịta ahụhụ ndị Nazi, sị: “Ha abụọ, Käthe na Margarethe, na ọtụtụ ndị ọzọ, nyeere m aka nke ukwuu, ọ bụghị nanị site n’okwukwe ha, kama n’ụzọ pụtara ìhè. Ha nwetaara anyị nkịrịka ákwà ndị mbụ dị ọcha anyị nwere maka ọ́nyá anyị . . . N’ikwu ya ná mkpirikpi, anyị chọtara onwe anyị n’etiti ndị chọrọ ka ihe gaziere anyị, ndị gosikwara mmetụta enyi ha site n’omume ha.” Lee aha ezi àmà ọ bụ site n’ọnụ “ndị nọ n’èzí”!
5, 6. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Kraịst na-arụzu ugbu a, gịnịkwa ka anyị na-ekwesịghị ichezọ? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ndị ụwa nọ, n’ihi gịnịkwa?
5 Anyị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji kwụsị ịkpọasị site n’ụzọ amamihe anyị si eduzi onwe anyị n’ebe ndị nọ n’èzí nọ. N’eziokwu, anyị na-ebi n’oge mgbe Eze anyị na-achị achị, bụ́ Kraịst Jisọs, na-ekewasị ndị nke mba dị iche iche, “dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.” (Matiu 25:32) Ma echefula na ọ bụ Kraịst bụ Onye Ikpe; ọ bụ ya na-ekpebi ndị bụ “atụrụ” na ndị bụ “ụmụ ewu.”—Jọn 5:22.
6 Nke a kwesịrị ịmetụta àgwà anyị n’ebe ndị na-abụghị akụkụ nke nzukọ Jehova nọ. Anyị pụrụ iche banyere ha dị ka ndị ụwa. ma ha bụ akụkụ nke ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke “Chineke hụrụ . . . n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ ka mma nke ukwuu ile ndị mmadụ anya dị ka ndị ga-abụ atụrụ karịa iji mpako kpebie na ha bụ ewu. Ụfọdụ ndị jibu ime ihe ike na-emegide eziokwu ahụ bụzi Ndịàmà raara onwe ha nye ugbu a. Ọtụtụ n’ime ndị a bụkwa ndị e ji omume obi ọma rite n’uru na nke mbụ, tupu ha azaghachi n’ịgba àmà ọ bụla. Dị ka ihe atụ, lee foto dị na peji nke 18.
Ịnụ Ọkụ n’Obi, Ọ Bụghị Ime n’Ike
7. Nkọcha dị aṅaa ka popu kwupụtara, ma olee ajụjụ anyị pụrụ ịjụ?
7 Pope John Paul nke Abụọ kọchara ịrọ òtù n’ozuzu ya, nakwa Ndịàmà Jehova kpọmkwem, mgbe ọ sịrị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ịnụ ọkụ n’obi ime ihe n’ike nke ụfọdụ ndị ji achọta ndị òtù ọhụrụ, bụ́ ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma ọ bụ ịkwụsị ndị na-agafe agafe n’akụkụ ụzọ, bụ ịrọ òtù nke bụ ụzọ adịgboroja isi ṅomie ịnụ ọkụ n’obi ndị ozi na ije ozi ala ọzọ.” A pụrụ ịjụ sị, Ya bụrụ na nke anyị bụ “ụzọ adịgboroja isi ṅomie ịnụ ọkụ n’obi ndị ozi na ije ozi ala ọzọ,” ebee ka a pụrụ ịhụ ezi ịnụ ọkụ n’obi nke ikwusa ozi ọma? N’ezie,
ọ bụghị n’etiti ndị Katọlik nke o ji abụ n’etiti ndị Protestant ma ọ bụkwanụ ndị òtù chọọchị Orthodox.8. Olee otú anyị kwesịrị isi gbaa àmà ụlọ n’ụlọ n’anyị, na-enwe olileanya ka ihe dị aṅaa si na ya pụta?
8 Otú o sina dị, iji gosipụta ịbụ okwu ụgha nke ebubo ọ bụla e boro anyị banyere ime ihe n’ike n’ịgba àmà anyị, anyị kwesịrị mgbe nile ịdị ebere, ịdị na-akwanye ùgwù, na inwe olu ọma mgbe anyị na-agakwuru ndị mmadụ. Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ònye bụ onye amamihe nke na-aghọtakwa ihe n’etiti unu? ya site n’ibi obi ọma ya gosi ọrụ ya nile n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe.” (Jemes 3:13) Pọl onyeozi na-agbakwa anyị ume ka anyị “ghara ikwulu onye ọ bụla.” (Taịtọs 3:2) Dị ka ihe atụ, kama ịkatọsị ihe onye anyị na-agbara àmà kwere na ha ozugbo, gịnị mere na i jighị obi eziokwu gosi mmasị n’ihe ndị bụ echiche ya? Mgbe ahụ gwa onye ahụ ihe bụ ozi ọma dị ka e dere ya na Bible. Site n’iji ezi uche na-ezute ndị mmadụ na ịkwanyere ndị nwere nkwenkwe ndị dị iche ùgwù ruuru ha, anyị ga-enyere ha aka inwe ọnọdụ uche ka mma iji gee anyị ntị, eleghịkwa anya ha ga-aghọta uru nke ozi Bible. Ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịbụ na ụfọdụ ga-abịa “nye Chineke otuto.”—1 Pita 2:12.
9. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl (a) ná Ndị Kọlọsi 4:5? (b) ná Ndị Kọlọsi 4:6, n’ọrụ?
9 Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Na-ejegharịnụ n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ, na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile.” (Ndị Kọlọsi 4:5) N’ịkọwa okwu nke a kpe azụ, J. B. Lightfoot dere, sị: “Ekwela ka ohere ọ bụla gafenahụ gị iji kwuo ma mee ihe ga-akwalite ụzọ nke Chineke.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụzọ dị iche.) Ee, anyị aghaghị ịdị njikere na-enwe okwu nakwa omume n’oge ziri ezi. Amamihe dị otú ahụ gụnyere ịhọrọ oge kwesịrị ekwesị n’ụbọchị ịga n’ụlọ ndị mmadụ. Ọ bụrụ na a jụ ozi anyị, ọ̀ bụ n’ihi na ndị mmadụ enweghị mmasị na ya, ka ọ̀ bụ n’ihi na anyị bịara n’oge yikarịrị ka ọ bụ na o zighị ezi? Pọl dekwara, sị: “Ka okwu unu di n’amara mgbe nile, ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Nke a na-ewe ibu ụzọ chee echiche nakwa ezi ịhụnanya maka onye agbata obi. Ka anyị na-eche ozi Alaeze ahụ n’ihu mmadụ mgbe nile n’ụzọ dị amara.
Ịdị Na-akwanye Ùgwù na Ịbụ “Ndị E Doziworo Ịrụ Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla”
10. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst bi na Krit? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova siworo bụrụ ihe nlereanya n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl?
10 Anyị apụghị iji ihe ọzọ gbanwere ụkpụrụ Bible. N’aka nke ọzọ, anyị ekwesịghị ịrụ Taịtọs 3:1, 2) Onye ọkà mmụta Bible bụ́ E. F. Scott dere banyere akụkụ okwu nke a, sị: “Ọ bụghị nanị na ndị Kraịst ga-erubere ndị na-achị achị isi, kama ha aghaghị ịdị njikere maka ezi ọrụ ọ bụla. Nke a . . . pụtara na, mgbe ọnọdụ chọrọ ya, ndị Kraịst kwesịrị iso ná ndị na-ebute ụzọ n’igosi mmụọ nke imere ọha ihe ọma. A ga na-enwe ntiwapụ nke ọkụ ọgbụgba, ihe otiti, ọdachi dịgasị iche iche, mgbe ndị ezi ụmụ amaala nile ga-achọ inyere ndị agbata obi ha aka.” N’ụwa nile, e nwewo ọtụtụ oge mgbe ọdachi dara, Ndịàmà Jehova wee sorokwa ná ndị mbụ rụrụ ọrụ enyemaka. He enyeworo, ọ bụghị nanị ụmụnna ha aka, kama ndị nọ n’èzí.
ụka n’ụzọ na-adịghị mkpa n’elu ajụjụ ndị na-emetụtaghị nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Kraịst. Pọl onyeozi dere, sị: “Na-echetara ha [ndị Kraịst bi na Krit] ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị isi, n’okpuru ndị nwere ike, ka ha na-ekwenye ekwenye, ka ha bụrụ ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla, ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka ha nwee obi ọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (11, 12. (a) Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi mee omume n’ebe ndị na-achị isi nọ? (b) Gịnị ka ido onwe onye n’okpuru ndị na-achị isi gụnyere n’ihe banyere iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze?
11 Otu akụkụ okwu nke a sitere n’akwụkwọ ozi Pọl degaara Taịtọs na-egosikwa mkpa nke inwe àgwà nke ịkwanyere ndị na-achị isi ùgwù. Ndị Kraịst ka na-eto eto bụ́ ndị na-apụta n’ihu ndị ọkà ikpe n’ihi nnọpụ iche ha kwesịkarịsịrị iburu n’uche ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ. Ha pụrụ ime ihe dị ukwuu n’imezi ma ọ bụkwanụ ibibi aha ndị Jehova site n’otú ha dị n’ile anya, àgwà ha, na otú ha si agwa ndị isi dị otú ahụ okwu. Ha kwesịrị ‘ịsọpụrụ . . . onye ha ji ụgwọ nsọpụrụ,’ ma jiri nkwanye ùgwù dị omimi mee ngọpụ ha.—Ndị Rom 13:1-7; 1 Pita 2:17; 3:15.
12 “Ndị na-achị isi” gụnyere ndị ọrụ ọchịchị ime obodo. Ugbu a a na-ewuwanye ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, iso ndị isi ime obodo na-emekọrịta ihe bụ ihe a na-apụghị izere ezere. Mgbe mgbe, ndị okenye na-ezute ịkpọasị. Ma a chọpụtawo na n’ebe ndị nnọchianya ọgbakọ guzobere ezi mmekọrịta n’ebe ndị ahụ na-achị isi nọ ma na-ekwenyere òtù na-atụpụta ụkpụrụ ewumewu n’obodo, a pụrụ ịkwụsị ịkpọasị dị otú a. Mgbe mgbe a na-agba ezi àmà nye ndị maara ihe dị nta ma ọ bụ ghara ịma ihe ọ bụla na mbụ banyere Ndịàmà Jehova na ozi ha.
‘A Sị na Ọ Bụ Ihe Ga-ekwe, Unu na Mmadụ Nile Na-adị n’Udo’
13, 14. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere ndị Kraịst nọ na Rom, oleekwa otú anyị pụrụ isi tinye ya n’ọrụ ná mmekọrịta anyị na ndị nọ n’èzí?
13 Pọl nyere ndị Kraịst bi n’obodo naekpere arụsị bụ́ Rom ndụmọdụ na-esonụ: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Burunụ ụzọ na-eche ihe ọma n’ihu mmadụ nile. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọbọ, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọbọ; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru. Ma ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, naazụ ya; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, gị mee ka ọ ṅụọ mmiri: n’ihi na n’ime nke a ị ga-agụkwasị icheku na-ere ọkụ n’isi ya. Ekwela ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17-21.
14 Ná mmekọrịta anyị na ndị nọ n’èzí, anyị dị ka ezi ndị Kraịst apụghị izere izute ndị mmegide. N’akụkụ okwu nke dị n’elu, Pọl na-egosi na ụzọ nke amamihe bụ ịgbalịsi ike imeri mmegide site n’ime omume obi ọma. Dị ka icheku ọkụ, omume obi ọma ndị a pụrụ ịgbaze ibu iro ahụ ma mee ka e rite onye mmegide ahụ n’uru bịa n’àgwà nke inwe obi ọma karị n’ebe ndị Jehova nọ, eleghị anya ọbụna kpalie mmasị n’ozi ọma ahụ. Mgbe nke a mere, a na-eji ihe ọma merie ihe ọjọọ.
15. Olee mgbe ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya karịsịa ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ?
15 Ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ dị mkpa karịsịa n’ụlọ otu n’ime di na nwunye na-anabatabeghị eziokwu. Idebe ụkpụrụ Bible na-eme ka e nwee ndị bụ ezi di karị, ndị bụ ezi nwunye karị, ndị bụ ezi nna karị, ndị bụ ezi nne karị, na ụmụ na-erube isi karị ma na-amụsi ihe ike karị n’ụlọ akwụkwọ. Onye na-ekweghị ekwe kwesịrị inwe ike ịhụ mmetụta mara mma ụkpụrụ Bible na-enwe n’ahụ onye kwere ekwe. Otú a, a pụrụ ‘irite ụfọdụ n’uru ebe a na-ekwughị okwu site n’ibi obi’ nke ndị òtù ezinụlọ rarawooro onwe ha nye.—‘Ịrụ Ezi Ọrụ n’Ebe Mmadụ Nile Nọ’
16, 17. (a) Àjà ndị dị aṅaa na-atọ Chineke ezi ụtọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi “na-arụ ezi ihe” n’ebe ụmụnna anyị nakwa ndị nọ n’èzí nọ?
16 Ọrụ kasị mma anyị pụrụ ịrụrụ onye agbata obi anyị bụ iwetara ya ozi nke ndụ ma kụziere ya banyere ime ka adịghachi n’otu n’ebe Jehova nọ site na Jisọs Kraịst. (Ndị Rom 5:8-11) Ya mere Pọl onyeozi na-agwa anyị, sị: “Ka anyị site n’aka ya [Kraịst] na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya.” (Ndị Hibru 13:15) Pọl kwukwara, sị: “Ma unu echezọla ime ihe dị mma na ime ka unu na ndị ọzọ nwekọọ ihe unu: n’ihi na àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 13:16) Tụkwasị n’ịgba àmà ihu ọha anyị, anyị ekwesịghị ichezọ “ime ihe dị mma.” Ọ bụ akụkụ dị mkpa nke àjà ndị na-atọ Chineke ezi ụtọ.
17 Dị ka o si adịkarị, anyị na-emere ụmụnna ime mmụọ anyị ihe ọma, bụ́ ndị pụrụ inwe mkpa nke mmetụta uche, ime mmụọ, elu ahụ, ma ọ bụ nke ihe onwunwe. Pọl gosiri nke a mgbe o dere, sị: “Otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10; Jemes 2:15, 16) Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ichefu okwu ndị ahụ bụ́, “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.” Otu mmeso obi ọma n’ebe onye ikwu anyị, onye agbata obi, ma ọ bụ onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ nọ, pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ịkwụsị ịkpọasị megide anyị ma meghee obi onye ahụ n’ebe eziokwu dị.
18. (a) Ihe ize ndụ ndị aṅaa ka anyị kwesịrị izere? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ịdị mma ndị Kraịst anyị mee ihe dị ka ihe nkwado maka ọrụ ịgba àmà ihu ọha anyị?
18 Iji mee nke a, ọ dịghị anyị mkpa ime ndị nọ n’èzí ezi ndị enyi. Ụdị mkpakọrịta ndị dị otú ahụ na-adị ize ndụ. (1 Ndị Kọrint 15:33) E nweghịkwa nzube ọ bụla dị n’ịbụ ndị enyi nke ụwa. (Jemes 4:4) Ma ịdị mma ndị Kraịst anyị pụrụ ịkwado nkwusa anyị. N’ala ụfọdụ, ọ na-aghọ ihe na-esiwanye ike ịgwa ndị mmadụ okwu n’ụlọ ha. E ji ngwá ọrụ na ụzọ ụfọdụ ndị na-egbochi anyị irute ndị bi n’ụlọ chebe ụlọ obibi ụfọdụ. Ná mba ndị mepere anya telifon na-enye otu ụzọ nke ime nkwusa. N’ihe ka ọtụtụ ná mba dị iche iche, a pụrụ ịgba àmà okporo ụzọ. Ma, ná mba nile, ime mmadụ obi ụtọ, inwe olu ọma, ịdị ebere, na ịdị na-enye aka na-emeghe ohere dị iche iche iji kwụsị ịkpọasị ma gbaa ezi àmà.
Imechi Ọnụ nke Ndị Mmegide
19. (a) Ebe anyị na-adịghị eme ka ọ ga-atọ mmadụ ụtọ, gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi gbasoo ihe ilereanya Daniel ma tinye ndụmọdụ Pita n’ọrụ?
19 Ndịàmà Jehova abụghị ndị na-eme otú ọ ga-atọ mmadụ ụtọ ma ọ bụ ndị na-atụ egwu mmadụ. (Ilu 29:25; Ndị Efesọs 6:6) Ha matara nke ọma na n’agbanyeghị mgbalị ha nile ịbụ ndị na-atụ ụtụ isi na ezi ụmụ amaala bụ ihe nlereanya, ndị mmegide ga-akpọsa okwu ụgha jọgburu onwe ya ma kwuo okwu mkparị banyere ha. (1 Pita 3:16) Ebe ha maara nke a, ha na-agbalị iṅomi Daniel, bụ́ onye ndị iro ya kwuru banyere ya, sị: “Anyị agaghị achọpụta ihe ebubo iji bo Daniel nke a, ma a sị na anyị achọpụtaghị ya n’ahụ ya n’iwu nke Chineke ya.” (Daniel 6:5) Anyị agaghị ahapụ ụkpụrụ Bible mgbe ọ bụla iji mee ihe ga-atọ mmadụ ụtọ. N’aka nke ọzọ, anyị adịghị achọsi ike ịbụ ndị e gburu n’ihi okwukwe ha. Anyị na-agbalịsi ike ibi obi n’udo ma gee ntị na ndụmọdụ onyeozi ahụ, bụ́: “Otú a ka ọchịchọ nke Chineke si dị, ka unu site n’ime ezi ihe mee ka amaghị ihe nke ndị na-enweghị uche kpuchie ọnụ.”—1 Pita 2:15.
20. (a) Banyere gịnị ka obi siri anyị ike, oleekwa ndụmọdụ Jisọs nyere anyị? (b) Olee otú anyị pụrụ isi na-ejegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ?
20 Anyị ji n’aka na ọnọdụ anyị nke ịdị iche site n’ụwa kwekọrọ na Bible kpam kpam. Akụkọ ihe mere eme nke ndị Kraịst narị afọ mbụ na-akwado ya. A na-emesi anyị obi ike site n’okwu Jisọs, bụ́: “N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) Anyị adịghị atụ egwu. “Ònye bụkwa onye ahụ nke ga-emejọ unu, ma ọ bụrụ na unu ghọrọ ndị na-anụ ọkụ n’obi n’iso ezi ihe? Ma ọ bụrụkwa na unu ahụ ahụhụ n’ihi ezi omume, ngọzi na-adịrị unu: ma unu atụla egwu ahụ ha na-akpata, obi alọkwala unu mmiri; kama doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka onyenwe unu; bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:13-15) Mgbe anyị na-eme ihe n’ụzọ dị otú a, anyị ga na-ejegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ.
Iji Tụgharịa Uche
□ N’ihi gịnị ka o ji dị Ndịàmà Jehova mkpa ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ?
□ N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst na-apụghị iji tụọ anya na ụwa ga-ahụ ha n’anya, ma gịnị ka ha kwesịrị ịgbalị ime?
□ Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ndị ụwa nọ, n’ihi gịnịkwa?
□ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji “na-arụ ezi ihe” ọ bụghị nanị n’ebe ụmụnna anyị nọ, kamakwa n’ebe ndị nọ n’èzí nọ?
□ Olee otú anyị ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ pụrụ isi nyere anyị aka n’ọrụ ịgba àmà ihu ọha anyị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 18]
N’aka ekpe: Ezi ndị Kraịst na France ka ha na-enyere ndị agbata obi ha aka mgbe e nwesịrị idei mmiri
[Foto dị na peeji nke 20]
Omume obi ebere ndị Kraịst pụrụ ime ihe dị ukwu n’ịkwụsị ịkpọasị
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ “ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla”