Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Krisendọm Si Ghọọ Akụkụ Ụwa Nke A

Otú Krisendọm Si Ghọọ Akụkụ Ụwa Nke A

Otú Krisendọm Si Ghọọ Akụkụ Ụwa Nke A

KA OGE na-aga, Alaeze Ukwu Rom, bụ́ ebe Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ malitere, dakpọrọ. Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-asị na ndakpọ ahụ bụkwa oge mmeri ikpeazụ nke Iso Ụzọ Kraịst meriri ikpere arụsị. N’ikwupụta echiche dị iche, onye bishọp Anglikan bụ́ E. W. Barnes dere, sị: “Ka mmepeanya nke oge ochie na-adakpọ, Iso Ụzọ Kraịst kwụsịrị ịbụ okwukwe dị ebube nke Jisọs bụ́ Kraịst ahụ: ọ ghọrọ okpukpe nke bara uru dị ka ihe nkekọ ọha mmadụ nke ụwa tisara etisa.”​—⁠The Rise of Christianity.

Tupu ndakpọ ahụ, n’oge narị afọ nke abụọ, nke atọ, na nke anọ O.A., akụkọ ihe mere eme na-edekọ na n’ọtụtụ ụzọ, ndị ahụ na-asị na ha na-eso Jisọs debere onwe ha iche pụọ n’ụwa nke ndị Rom. Ma ọ na-ekpughekwa mmalite nke ịdapụ n’ezi ofufe n’ihe banyere nkwenkwe, omume, na nzukọ, dị nnọọ ka Jisọs na ndị ozi ya buworo n’amụma. (Matiu 13:​36-⁠43; Ọrụ 20:29, 30; 2 Tesalọnaịka 2:3-⁠12; 2 Timoti 2:16-⁠18; 2 Pita 2:​1-3, 10-⁠22) N’ikpeazụ, a malitere ikwenyere ụwa nke ndị Grik na Rom, ụfọdụ ndị sịkwa na ha bụ ndị Kraịst nakweere ikpere arụsị nke ụwa (dị ka ememe ya dị iche iche na ofufe chi nne na chi isi atọ), nkà ihe ọmụma ya (dị ka ikwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi), na usoro inye nduzi ya (nke a na-ahụ ná mbilite nke òtù ndị ndú okpukpe). Ọ bụ ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke a e merụrụ emerụ bụ ihe dọtara ìgwè ndị nkịtị na-ekpere arụsị ma bụrụkwa ihe ndị ọchịchị alaeze ukwu nke Rom bu ụzọ gbalịa ikpochapụ, kama mesịa nabata ya ma gbalịsie ike iji ya mee ihe maka ọdịmma nke onwe ha.

Ụwa Meriri Ya

Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme nke chọọchị, bụ́ Augustus Neander gosiri ihe ize ndụ ndị dị ná mmekọrịta ọhụrụ nke a nke “Iso Ụzọ Kraịst” na ụwa. Ọ bụrụ na ndị Kraịst e jiri ịnọpụ iche ha n’ụwa chụọ àjà, “ihe ga-esi na ya pụta ga-abụ aghọtaghị nke bụ chọọchị na nke bụ ụwa . . . nke ga-eme na chọọchị ga-akwụsị inwe ịdị ọcha ya, a ga-emerikwa ya, ọ bụ eziokwu na o yiri ka ọ bụ ya na-emeri,” ka o dere​—⁠General History of the Christian Religion and Church, Mpịakọta nke 2, peji nke 161.

Nke a bụ ihe merenụ. Ná mmalite narị afọ nke anọ, onye ọchịchị alaeze ukwu Rom, bụ́ Constantine gbalịrị iji okpukpe “ndị Kraịst” nke oge ya mee ihe n’ijikọ alaeze ukwu ya nke na-ekewasị ekewasị. Iji mee nke a, o nyere ndị ahụ sị na ha bụ ndị Kraịst nnwere onwe nke okpukpe ma nyefee òtù ndị ndú okpukpe ha ihe ùgwù ụfọdụ òtù ndị nchụàjà nke ndị na-ekpere arụsị jibu. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-asị: “Constantine wepụtara chọọchị ahụ site ná nkewapụ o kewapụrụ onwe site n’ụwa bịa n’ịnabata ibu ọrụ nke mmekọrịta ọha mmadụ ma nye aka ịtọghata ọha mmadụ ndị na-ekpere arụsị bata na chọọchị ahụ.”

Okpukpe Obodo

Mgbe Constantine nwụsịrị, Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Julian (361-363 O.A.) nwara iguzogide Iso Ụzọ Kraịst ma weghachite ikpere arụsị. Ma ọ kụrụ afọ n’ala, n’ihe dịkwa ka 20 afọ n’ihu, Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Theodosius nke Mbụ machibidoro ikpere arụsị iwu ma manye “Iso Ụzọ Kraịst” nke Atọ n’Ime Otu dị ka okpukpe Obodo nke Alaeze Ukwu Rom. N’ikwu ya kpọmkwem otú o si mee, onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Henri Marrou dere, sị: “N’ọgwụgwụ nke ọchịchị Theodosius, Iso Ụzọ Kraịst, ma ọ bụ n’ikwu kpọmkwem ihe ọ bụ, okpukpe Katọlik nke na-agbaso ụkpụrụ ochie, ghọrọ okpukpe bụ isi nke ụwa nile Rom na-achị.” Okpukpe Katọlik nke na-agbaso ụkpụrụ ochie anọchiwo ezi Iso Ụzọ Kraịst ma ghọọkwa “akụkụ nke ụwa.” Okpukpe Obodo ahụ dị nnọọ iche nke ukwuu pụọ n’okpukpe nke ndị mbụ soro ụzọ Jisọs, bụ́ ndị ọ gwara, sị: “Unu abụghị akụkụ nke ụwa.”​—⁠Jọn 15:19NW.

Onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme na onye ọkà ihe ọmụma, bụ́ Louis Rougier dere, sị: “Ka ọ na-agbasapụ, Iso Ụzọ Kraịst mere mgbanwe ndị dị mgbagwoju anya ruo n’ókè nke ịghọ nke a na-amataghịkwa nke bụ ihu na azụ ya. . . . Chọọchị oge gboo nke ụmụ ogbenye, bụ́ nke dabeere n’onyinye ndị mmadụ, ghọrọ chọọchị na-enwe mmeri nke ya na ike ọchịchị ndị e nwere na mgbe ahụ malitere ịdị ná mma mgbe ọ na-enweghị ike ibuda ha n’okpuru onwe ya.”

Ná mmalite narị afọ nke ise O.A., “Saint” Augustine nke Roman Katọlik dere akwụkwọ ya bụ isi, bụ́ The City of God. N’ime ya, ọ kọwara obodo abụọ, “nke Chineke na nke ụwa.” Akwụkwọ nke a ò mesiri okwu ike banyere nkewa n’etiti ndị Katọlik na ụwa? Ọ dịchaghị otú ahụ. Professor Latourette na-ekwu, sị: “Augustine ji obi eziokwu, nakwere [na] obodo abụọ ahụ, bụ́ nke ụwa na nke eluigwe, bụ nke gwakọrịtara ọnụ.” Augustine kụziri na “Alaeze Chineke amaliteworị n’ụwa nke a site ná nguzobe nke chọọchị [Katọlik].” (The New Encyclopædia Britannica, Macropædia, Mpịakọta nke 4, peji 506) Otú a, n’agbanyeghị ihe ọ bụla nzube mbụ nke Augustine pụrụ ịbụworị, nchepụta echiche ndị o wepụtara nwere mmetụta nke ime ka Chọọchị Katọlik bamiwanye n’ihe omume dị iche iche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa.

Alaeze Ukwu nke E Kewara Ekewa

N’afọ 395 O.A., mgbe Theodosius nke Mbụ nwụrụ, e kewara Alaeze Ukwu nke Rom ụzọ abụọ. Alaeze Ukwu nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ma ọ bụ Byzantine, nwere isi obodo ya na Constantinople (nke a na-akpọbu Byzantium, nke bụ Istanbul ugbu a), Alaeze Ukwu nke Ebe Ọdịda Anyanwụ nwekwara isi obodo ya (mgbe 402 O.A. gasịrị) na Ravenna, Ịtali. Dị ka ihe si na ya pụta, Krisendọm ghọrọ nke e kewara ekewa n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’ụzọ okpukpe. N’ihe banyere mmekọrịta dị n’etiti Chọọchị na Obodo, chọọchị nke dị n’Alaeze Ukwu Ebe Ọwụwa Anyanwụ gbasoro nchepụta echiche nke Eusebius nke Sizarịa (bụ́ onye dịrị ndụ n’oge Constantine Onye Ukwu). N’ileghara ụkpụrụ ndị Kraịst nke ịnọpụ iche n’ụwa anya, Eusebius tụgharịrị uche na ọ bụrụ na onye ọchịchị alaeze ukwu nakwa alaeze ukwu ahụ ghọọ ndị Kraịst, Chọọchị na Obodo ga-aghọ otu ọha mmadụ nke ndị Kraịst, ebe onye ọchịchị alaeze ukwu ga na-eme ihe dị ka onye nnọchianya Chineke n’ụwa. N’ozuzu ya, chọọchị dị iche iche nke Eastern Orthodox agbasowo mmekọrịta nke a dị n’etiti Chọọchị na Obodo eri ọtụtụ narị afọ. N’akwụkwọ ya bụ́ The Orthodox Church, Timothy Ware, bụ́ onye bishọp nke chọọchị Orthodox, gosiri ihe si na ya pụta: “Ịhụ mba n’anya abụrụwo ihe na-egbu chọọchị Orthodox eri narị afọ iri ndị ka gara aga.”

N’ebe Ọdịda Anyanwụ, agbụrụ ndị Germany nke na-eme mwakpo chụturu onye ọchịchị alaeze ukwu Rom nke ikpeazụ n’ọkwa na 476 O.A. Nke a kara ọgwụgwụ Alaeze Ukwu Rom nke Ebe Ọdịda Anyanwụ akara. Banyere oghere nke sochiri n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, The New Encyclopædia Britannica na-asị: “E guzobere ike ọchịchị ọhụrụ: Chọọchị Rom, bụ́ chọọchị onye bishọp nke Rom. Chọọchị nke a lere onwe ya anya ịbụ onye nọchiri anya nke Alaeze Ukwu Rom ahụ pụworo n’anya.” Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ gara n’ihu ịsị: “Ndị popu Rom . . . gbasawanyere nzọrọ na-emetụtaghị okpukpe nke gọọmenti chọọchị ahụ gabiga ókè nile nke njikọ chọọchị na obodo ma zụlite ihe ahụ a kpọrọ nkà nchepụta nke mma agha abụọ, na-asị na Kraịst nyere popu, ọ bụghị nanị ike ime mmụọ n’ebe chọọchị ahụ nọ kamakwa ike ọchịchị n’ebe alaeze dị iche iche nke ụwa dị.”

Chọọchị Protestant nke Obodo

N’oge nile Ụwa Na-emepechabeghị anya, ma okpukpe Orthodox ma Okpukpe Roman Katọlik nọgidere na-etinye aka nke ukwuu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ime ihe aghụghọ nke ụwa, na agha dị iche iche. Nhazigharị Ụkpụrụ okpukpe Protestant nke narị afọ nke 16 ọ̀ kara nlọghachi bịa n’ezi Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ ịdị iche site n’ụwa, akara?

Ee e. Anyị na-agụ na The New Encyclopædia Britannica, sị: “Ndị Nhazigharị Ụkpụrụ Okpukpe Protestant ndị gbasoro omenala nke Luther, nke Calvin, na nke Anglikan . . . nọgidere na-ejigidesi echiche nke Augustine aka ike, bụ́ onye ha nwere mmetụta pụrụ iche nke ịbụ ndị e jikọrọ gaa na nkà mmụta okpukpe ya. . . . Nke ọ bụla n’ime omenala atọ ndị ahụ bụ isi nke Protestant nke Europe narị afọ nke 16 . . . nwetara nkwado n’aka ọchịchị obodo ndị e nwere na Saxony [ebe etiti Germany], Switzerland, na England ma guzosie ike n’otu ọnọdụ ahụ ma e jiri ya tụnyere obodo dị ka chọọchị oge mbụ mere.”

Kama ime ka e nwee nlọtaghachi n’ezi Iso Ụzọ Kraịst, Nhazịgharị Ụkpụrụ ahụ wetara ọtụtụ chọọchị mba na nke ógbè ndị nwetaworo ihu ọma n’ebe obodo nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ma nye ha nkwado siri ike n’agha ha dị iche iche. N’ezie, ma chọọchị Katọlik ma nke Protestant akwalitewo agha okpukpe dị iche iche. N’akwụkwọ ya bụ An Historian’s Approach to Religion, Arnold Toynbee dere banyere ụdị agha ndị dị otú ahụ, sị: “Ha gosiri ndị Katọlik na ndị Protestant na France, Netherlands, Germany, na Ireland, nakwa iro òtù ndị mmegide nke Protestant n’England na Scotland, n’ihe omume obi ọjọọ nke ịgbalị iji ike nke ngwa agha na-abịadarịta ibe ha.” Mburịta agha e nwere ugbu a ndị na-ekewasị Ireland na ebe bụbu Yugoslavia na-egosi na chọọchị Roman Katọlik, Orthodox, na Protestant ka bamikwara abami n’ihe omume nke ụwa nke a.

Ihe a nile ọ̀ pụtara na ezi Iso Ụzọ Kraịst nke dị iche site n’ụwa adịkwaghị ọzọ n’elu ala? Isiokwu na-eso ga-aza ajụjụ ahụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10, 11]

OTÚ “ISO ỤZỌ KRAỊST” SI GHỌỌ OKPUKPE OBODO

Ọ DỊGHỊ mgbe ọ bụla e mere iso ụzọ Kraịst ka ọ bụrụ akụkụ ụwa nke a. (Matiu 24:​3, 9; Jọn 17:16) Ma, akwụkwọ dị iche iche nke akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na na narị afọ nke anọ O.A., “Iso Ụzọ Kraịst” ghọrọ okpukpe Obodo nke e ji mara Alaeze Ukwu nke Rom. Olee otú nke a si mee?

Malite n’oge Nero (54-68 O.A.) ruokwa n’ime narị afọ nke atọ O.A., ndị ọchịchị alaeze ukwu nile nke Rom kpagbusiri ndị Kraịst ike ma ọ bụ kwere ka a kpagbuo ha. Gallienus (253-268 O.A.) bụ onye ọchịchị alaeze ukwu mbụ nke Rom nyere iwu nke ikwe ka ha nọrọ. N’agbanyeghị nke a, Iso Ụzọ Kraịst bụ okpukpe a machibidoro iwu n’alaeze ukwu ahụ nile. Mgbe Gallienus nwụsịrị, mkpagbu ahụ gara n’ihu, ọbụna na ọ kawanyere njọ n’okpuru Diocletian (284-305 O.A.) na ndị sochiri ya.

Oge mgbanwe bịara ná mmalite narị afọ nke anọ mgbe e nwere ihe ahụ a kpọrọ ntọghata nke Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Constantine nke Mbụ bịa n’Iso Ụzọ Kraịst. Banyere “ntọghata” nke a, akwụkwọ French bụ́ Théo​—⁠Nouvelle encyclopédie catholique (Théo​—⁠New Catholic Encyclopedia) na-akọ, sị: “Constantine sịrị na ya bụ onye ọchịchị alaeze ukwu bụ́ onye Kraịst. N’ezie, ọ bụ nanị mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ ka e mere ya baptism.” Otú o sina dị, na 313 O.A., Constantine na onye ya na ya na-achịkọ alaeze ukwu, bụ́ Licinius, nyere iwu nke nyere ma ndị Kraịst ma ndị ọgọ mmụọ nnwere onwe nke okpukpe. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-asị: “Mgbasapụ Constantine gbasapụrụ inwe onwe ife ofufe ka o rutere ndị Kraịst, bụ́ nke gosiri na a matara Iso Ụzọ Kraịst dị ka religio licita [okpukpe iwu kwadoro] ma e wezụga ikpere arụsị, bụ ihe omume nke oké mgbanwe.”

Otú ọ dị, The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ọ [Constantine] meghị Iso Ụzọ Kraịst okpukpe nke alaeze ukwu ahụ.” Onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Jean-Rémy Palanque, bụ́ onye òtù nke Institute of France na-ede, sị: “Otú ọ dị, Obodo Rom . . . nọgidere bụrụ nke e ji ikpere arụsị mara. Constantine kwa, akwụsịghị ọnọdụ ahụ mgbe ọ na-anabata okpukpe nke Kraịst.” N’akwụkwọ bụ́ The Legacy of Rome, Professor Ernest Barker kwuru, sị: “[Mmeri Constantine] emeghị ka e guzobe Iso Ụzọ Kraịst ozugbo dị ka okpukpe nke Obodo. Afọ juru Constantine n’iwere Iso Ụzọ Kraịst dị ka otu n’ime ụzọ ife ofufe ọha mmadụ nke alaeze ukwu ahụ. Ruo iri afọ asaa sonụ, a na-eme ememe ikpere arụsị ndị ahụ meworo ochie na Rom.”

Ya mere ka ọ dị ugbu a, “Iso Ụzọ Kraịst” bụ okpukpe iwu kwadoro n’Alaeze Ukwu nke Rom. Olee mgbe ọ ghọrọ, n’echiche nile nke okwu ahụ, okpukpe Obodo? Anyị na-agụ n’akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia, sị: “Ndị sochiri [Constantine] nọgidere na-agbaso ụkpụrụ ya ma e wezụga Julian [361-363 O.A.], bụ́ onye mkpagbu ọ kpagburu Iso Ụzọ Kraịst bịara ná njedebe mberede site n’ọnwụ ya. N’ikpeazụ, n’akụkụ ngwụsị nke narị afọ nke 4, Theodosius Onye Ukwu [379-395 O.A.] mere Iso Ụzọ Kraịst okpukpe nke e ji mara Alaeze Ukwu ahụ ma bịadaa ofufe ikpere arụsị nke ọha mmadụ.”

N’imesi nke a ike na ikpughe ihe okpukpe Obodo nke a bụ n’ezie, onye ọkà mmụta na ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Bible, bụ́ F. J. Foakes Jackson dere, sị: “N’okpuru Constantine e jikọrọ Iso Ụzọ Kraịst na alaeze ukwu Rom ọnụ. N’okpuru Theodosius e mere ka ha bụrụ otu. . . . Site na mgbe ahụ gaa n’ihu ùtú aha ahụ bụ́ Katọlik bụ nke a ga-edebere ndị ji ùgwù hà nhata na-asọpụrụ Nna, Ọkpara na Mmụọ Nsọ. E duziri iwu okpukpe nile nke onye ọchịchị alaeze ukwu nke a iji hụ na nke a nwere isi, o mekwara ka Okpukpe Katọlik ghọọ nanị okpukpe iwu kwadoro nke ndị Rom.”

Jean-Rémy Palanque dere, sị: “Theodosius, ebe ọ na-ebuso ikpere arụsị agha, pụtakwara ná nkwado nke Chọọchị [Katọlik]; iwu ya nke 380 O.A. manyere ndị nile ọ na-achị ka ha kwenye n’okwukwe nke Pope Damasus na bishọp [Atọ n’Ime Otu] nke Alexandria ma napụ ndị jụrụ nnwere onwe nke ife ofufe. Kansụl ukwu nke Constantinople (381) kagbukwara inwe okwukwe dị iche, onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ hụkwara na ọ dịghị bishọp ọ bụla ga-akwado ha. Iso Ụzọ Kraịst [Atọ n’Ime Otu] nke Nicea aghọwo n’ezie okpukpe Obodo . . . Chọọchị ahụ bụ nke e mere ka ya na Obodo bụrụ otu n’ụzọ chiri anya ma bụrụ nke ọ kwadoro nanị ya.”

Otú a, ọ bụghị Iso Ụzọ Kraịst nke a na-emerụghị emerụ e nwere n’oge ndị ozi bụ nke ghọrọ okpukpe Obodo nke Alaeze Ukwu Rom. Ọ bụ okpukpe Katọlik Atọ n’Ime Otu nke narị afọ nke anọ, nke Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Theodosius nke Mbụ manyere n’ike, nke Chọọchị Roman Katọlik na-agbasokwa, bụ́ nke bụ akụkụ ụwa nke a n’oge ahụ dị ka ọ bụ ugbu a.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Theodosius: Real Academia de la Historia, Madrid (Foto Oronoz)

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Scala/Art Resource, N.Y.