Ị Pụrụ Ịmara Ọdịnihu!
Ị Pụrụ Ịmara Ọdịnihu!
Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-echesi echiche ike banyere ọdịnihu. Ha na-enwe mmasị ime atụmatụ, itinye ego n’achụmnta ego n’ụzọ amamihe, na inwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a ga-esi ejide n’aka ihe ọdịnihu ga-abụ?
NÁ MGBALỊ iji chọpụta ihe ọdịnihu ga-abụ, ụmụ mmadụ anwalewo ụdị ihe dị iche iche. Ndị ọkà mmụta n’ihe metụtara ọha na eze bụ́ ndị a na-akpọ ndị ọkà mmụta banyere ọdịnihu na-enyocha ihe ndị na-eme n’oge a ma na-adabere na ha na-ekwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ndị ọkà mmụta akụ̀ na ụba na-emekwa otú ahụ ná ngalaba nke ha. Ndị na-agụ kpakpando na ndị na-ajụ ndị mmụọ ase na-elega anya ná nkọwa akara eluigwe, bọl crystal, na anwansi, ha nwekwara ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ha. Dị ka ihe atụ, onye France na-agụ kpakpando bụ́ Nostradamus anọgidewo na-ewu ewu, n’agbanyeghị na ọ nwụọla ọtụtụ narị afọ gara aga.
Ndị a nile bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị amụma abụwo ndị a na-apụtụghị ịtụkwasị obi na ndị na-akpata ndakpọ olileanya. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-eleghara Jehova Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible, anya. N’ihi nke a, ha adịghị azata ajụjụ ndị bụ́ isi dị ka ndị a: ‘N’ihi gịnị ka m pụrụ iji jide n’aka na ihe ndị e buru n’amụma n’ime Bible gaje imezu? Olee otú ha si kwekọọ ná nzube Chineke maka ụmụ mmadụ? Olee otú mụ na ezinụlọ m pụrụ isi rite uru site n’amụma ndị a?’ Bible na-aza ajụjụ ndị a.
Amụma Bible kakwa mma n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. N’adịghị ka amụma dị iche iche nke ndị na-agụ kpakpando, ọ na-eme ka mmadụ nwere onwe ya ime nhọrọ. N’ihi ya, ọ dịghị onye ndụ ya dabeere n’akara aka. (Deuterọnọmi 30:19) Ihe odide ndị dị ka ndị nke Nostradamus ekwughị ihe ọ bụla banyere ụkpụrụ omume, ha na-ejikwa ihe a na-apụghị ịghọta aghọta na ihe na-akpali akpali edochi anya nke a. Ma amụma Bible nwere ihe ndabere kwụ chịm nke ụkpụrụ omume. Ọ na-akọwa ihe mere Chineke ga-eji eme ihe dị ka o zubeworo. (2 Ihe E Mere 36:15) Amụma Jehova adịghịkwa ahapụ imezu mgbe ọ bụla, n’ihi na ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Taịtọs 1:2) N’ihi ya, ndị Okwu Chineke na-eduzi na-ebi ndụ ndị maara ihe, nke nwere nzube, na nke obi ụtọ n’alaghị oge na ihe onwunwe ha ndị dị oké ọnụ ahịa n’iyi ná nchụso ndị na-enweghị isi.—Abụ Ọma 25:12, 13.
A tụlewo ihe ndị a na ọtụtụ isi ihe ndị ọzọ ná Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1999/2000 bụ́ nke e nwere gburugburu ụwa. Okwu, ajụjụ ọnụ, ihe ngosi, na ihe nkiri sitere na Bible adọrọla uche ndị gere ntị gaa n’ihe nketa ime mmụọ dị ebube, nke ndị na-amụ ma na-etinye okwu amụma nke Chineke n’ọrụ nwere. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ụfọdụ na-akpali akpali bụ́ ndị pụtara ìhè ná mgbakọ ahụ.