À Na-akwali Gị Ime Ihe Dị Ka A Kwaliri Jisọs?
À Na-akwali Gị Ime Ihe Dị Ka A Kwaliri Jisọs?
“O wee . . . hụ oké ìgwè mmadụ, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha: O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.”—MAK 6:34.
1. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwere nghọta na ndị mmadụ na-egosipụta àgwà ndị dị mma?
N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị mmadụ n’otu n’otu egosipụtawo àgwà ndị dị mma. Ị pụrụ ịghọta ihe kpatara ya. Jehova Chineke nwere ma na-egosipụta ịhụnanya, obiọma, mmesapụ aka, na àgwà ndị ọzọ anyị ji akpọrọ ihe. E kere ndị mmadụ n’onyinyo Chineke. Ya mere, anyị pụrụ ịghọta ihe mere ọtụtụ ndị ga-eji gosipụta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịhụnanya, obiọma, ọmịiko, na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ, ọbụna dị ka ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-egosipụta ọnọdụ akọ na uche. (Jenesis 1:26; Ndị Rom 2:14, 15) Otú ọ dị, ị pụrụ ịchọpụta na ụfọdụ na-adị njikere igosipụta àgwà ndị a karịa ndị ọzọ.
2. Olee ụfọdụ ọrụ ọma ndị mmadụ pụrụ ịrụ, ikekwe na-eche na ha na-eṅomi Kraịst?
2 Ma eleghị anya ị maara ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị na-eletakarị ndị ọrịa ma ọ bụ na-enyere ha aka, na-emere ndị ọrụsị ọmịiko, ma ọ bụ na-emesapụrụ ndị ogbenye aka. Cheekwa banyere ndị ọmịiko ha na-akwali itinye ndụ ha n’ịrụ ọrụ n’ógbè ndị ekpenta ma ọ bụ n’ogige ụmụ mgbei, ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ebe a na-elekọta ndị na-arịakarị ọrịa, ma ọ bụ ndị na-agbalịsi ike inyere ndị na-enweghị ebe obibi ma ọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ aka. Ma eleghị anya, ụfọdụ Mak 1:34; 8:1-9; Luk 4:40) Ngosipụta Jisọs gosipụtara ịhụnanya, ịdị nro, na ọmịiko na-eme ka “uche nke Kraịst” pụta ìhè, bụ́ onye n’aka nke ya nọ na-eṅomi Nna ya nke eluigwe.—1 Ndị Kọrint 2:16.
n’ime ha na-eche na ha na-eṅomi Jisọs, bụ́ onye setịpụụrụ ndị Kraịst ụkpụrụ ahụ. Anyị na-agụ n’Oziọma ndị ahụ na Kraịst gwọrọ ndị ọrịa ma nye ndị agụụ na-agụ nri. (3. Iji nwee echiche ziri ezi banyere ọrụ ọma ndị Jisọs rụrụ, gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịtụle?
3 Otú ọ dị, ị̀ chọpụtawo na ọtụtụ n’ime ndị nwere mmasị taa n’ịhụnanya na ọmịiko Jisọs leghaara akụkụ bụ́ isi nke uche nke Kraịst anya? Anyị pụrụ ịghọta nke a site n’iji nlezianya tụlee Mak isi nke 6. Anyị na-agụ n’ebe ahụ na ndị mmadụ duteere Jisọs ndị ọrịa ka o wee gwọọ ha. N’ihe a na-ekwu banyere ya, anyị matakwara na mgbe Jisọs hụrụ na agụụ ejidela ọtụtụ puku ndị bịakwutere ya, o nyere ha nri n’ụzọ ọrụ ebube. (Mak 6:35-44, 54-56) Ịgwọ ndị ọrịa na inye ndị agụụ na-agụ nri bụ ngosipụta pụtara ìhè nke ọmịiko ịhụnanya, ma hà bụ ụzọ ndị bụ́ isi Jisọs si nyere ndị ọzọ aka? Oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya zuru okè nke ịhụnanya, obiọma, na ọmịiko, ọbụna dị ka o si ṅomie Jehova?
A Kpaliri Ya Ilebara Mkpa Ime Mmụọ Anya
4. Olee ebe ihe ndekọ ahụ dị na Mak 6:30-34 mere?
4 Jisọs nwere ọmịiko n’ebe ndị nọ ya gburugburu nọ n’ụzọ bụ́ isi n’ihi mkpa ime mmụọ ha. Mkpa ndị ahụ dị mkpa n’ụzọ bụ́ isi, karịa nnọọ mkpa anụ ahụ. Tụlee ihe ndekọ dị na Mak 6:30-34. Ihe e dekọrọ n’ebe ahụ mere n’ikperé mmiri nke Osimiri Galili, mgbe oge Ememe Ngabiga nke 32 O.A. na-eru nso. Ndị ozi ahụ nwere oké mmasị, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. N’ịbụ ndị ka mesịrị nnọọ njem sara mbara, ha bịakwutere Jisọs, obi abụọ adịghị ya na ha nwere oké mmasị ịgwa ya ahụmahụ ha nwere. Otú ọ dị, ìgwè mmadụ gbakọrọ. O buru nnọọ ibu nke na Jisọs na ndị ozi ya apụghị iri ihe ma ọ bụ zuo ike. Jisọs gwara ndị ozi ahụ, sị: “Unu onwe unu bịa iche n’ebe bụ́ ọhịa, ka unu zuru ike nke nta.” (Mak 6:31) N’ịbanye n’otu ụgbọ, ma eleghị anya na nso Kapanọm, ha seere gaa n’ebe dara jụụ n’ofé Osimiri Galili. Ma ìgwè mmadụ ahụ gbara ọsọ n’ogologo ikperé mmiri ahụ ma buru ụgbọ ahụ ụzọ ruo. Olee otú Jisọs ga-esi meghachi omume? Ò were iwe na e nyere ya nsogbu mgbe ọ chọrọ ịnọrọ nanị ya? Ọ dịghị ma ọlị!
5. Olee mmetụta Jisọs nwere n’ebe ìgwè mmadụ ahụ bịakwutere ya nọ, oleekwa otú o si meghachi omume?
5 Ọhụhụ Jisọs hụrụ ìgwè a nke ọtụtụ puku mmadụ mejupụtara, gụnyere ndị ọrịa, bụ́ ndị ji oké mmasị na-echere ya, metụrụ ya n’obi. (Matiu 14:14; Mak 6:44) N’ilekwasị anya n’ihe kpaliri ọmịiko Jisọs na n’otú o si meghachi omume, Mak dere, sị: “O wee . . . hụ oké ìgwè mmadụ, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha: O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Jisọs hụrụ ihe karịrị ìgwè mmadụ. Ọ hụrụ ndị mmadụ nwere mkpa ime mmụọ. Ha dị ka atụrụ na-akpafu akpafu n’enweghị enyemaka, n’enweghị onye ọzụzụ atụrụ iduzi ha gaa n’ala ahịhịa ndụ ma ọ bụ ichebe ha. Jisọs maara na ndị ndú okpukpe ahụ obi tara mmiri, bụ́ ndị kwesịrị ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, na-elelị ndị nkịtị anya n’ezie ma na-eleghara mkpa ime mmụọ ha anya. (Ezikiel 34:2-4; Jọn 7:47-49) Jisọs ga-emeso ha ihe n’ụzọ dị iche, na-emere ha ihe ọma kasịnụ dị ka o kwere mee. Ọ malitere ịkụziri ha banyere Alaeze Chineke.
6, 7. (a) Gịnị ka Oziọma ndị ahụ na-ekpughe na e butere ụzọ n’ụzọ Jisọs si gboo mkpa ndị mmadụ? (b) Gịnị kwaliri Jisọs ime nkwusa na izi ihe?
6 Rịba ama usoro na echiche e nyere banyere ihe ndị bu ụzọ mee bụ́ nke pụtara ìhè n’ihe ndekọ yiri ya. Ọ bụ Luk, bụ́ onye dibịa nke nwekwara mmasị dị ukwuu n’ọdịmma ndị ọzọ, dere nke a. “Ìgwè mmadụ nile . . . sooro [Jisọs]: O wee nara ha nke ọma, wee gwa ha okwu banyere alaeze Chineke, na-emekwa ka ahụ dị ha ike, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e mee ka ahụ ha dị ike.” (Luk 9:11, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; Ndị Kọlọsi 4:14) Ọ bụ ezie na ọ dịghị otú ahụ n’ihe ndekọ nile banyere ọrụ ebube, na nke a, gịnị ka ihe ndekọ Luk dere n’ike mmụọ nsọ bu ụzọ rịba ama? Ọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na Jisọs kụziiri ndị ahụ ihe.
Mak 6:34. Amaokwu ahụ na-egosi n’ụzọ doro anya otú e si kpalie Jisọs n’ụzọ bụ́ isi igosipụta ọmịiko ya. Ọ ziri ndị ahụ ihe, na-egbo mkpa ime mmụọ ha. N’oge bu ụzọ n’ozi ya, Jisọs kwuru, sị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.” (Luk 4:43) Otú ọ dị, anyị na-ehie ụzọ ma ọ bụrụ na anyị echee na Jisọs kpọsara ozi Alaeze ahụ nanị dị ka ọrụ dịịrị ya, dị ka a ga-asị na ọ na-arụ ọrụ nkwusa ahụ ọ na-aghaghị ịrụ, iji mezuo iwu. Ee e, ọmịiko ịhụnanya ya n’ebe ndị mmadụ nọ bụ isi ihe kwaliri ya isoro ha kerịta ozi ọma ahụ. Ihe ọma kasịnụ nke Jisọs pụrụ ime—ọbụna nye ndị ọrịa, ndị ndị mmụọ ọjọọ na-emekpa ahụ, ndị ogbenye, ma ọ bụ ndị agụụ na-agụ—bụ inyere ha aka ịmara, ịnakwere, na inwe mmasị n’eziokwu banyere Alaeze Chineke. Eziokwu ahụ dị oké mkpa n’ụzọ bụ́ isi n’ihi ókè Alaeze ahụ na-ekere n’iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta nakwa n’iwetara ụmụ mmadụ ngọzi na-adịgide adịgide.
7 Nke a kwekọrọ n’ezie n’ihe ahụ e mesiri ike bụ́ nke anyị na-ahụ na8. Olee mmetụta Jisọs nwere banyere ime nkwusa na izi ihe ya?
8 Ime nkwusa dị irè banyere Alaeze ahụ bụ isi ihe mere Jisọs ji bịa n’ụwa. Ná ngwụsị nke ozi elu ala ya, Jisọs gwara Paịlet, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke sitere n’eziokwu ahụ na-anụ olu m.” (Jọn 18:37) Anyị arịbawo ama n’isiokwu abụọ ndị bu ụzọ na Jisọs bụ onye nwere mmetụta miri emi—onye na-eche banyere ndị ọzọ, onye dị mfe njekwuru, onye na-echebara ndị ọzọ echiche, onye na-atụkwasị ndị ọzọ obi, karịsịakwa, onye na-ahụ n’anya. Anyị kwesịrị inwe ekele maka akụkụ ndị ahụ nke àgwà ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ịghọta uche nke Kraịst. Ọ dịkwa mkpa ịghọta na uche nke Kraịst gụnyere mbute o butere ọrụ nkwusa na izi ihe ya ụzọ.
Ọ Gbara Ndị Ọzọ Ume Ịgba Àmà
9. Nye ole ndị ka ime nkwusa na izi ihe ga-ebute ụzọ?
9 Ibute ime nkwusa na izi ihe ụzọ—dị ka ngosipụta nke ịhụnanya na ọmịiko—adịrịghị nanị Jisọs. Ọ gbara ụmụazụ ya ume iṅomi ebumnobi ya, ihe ndị o butere ụzọ, na ihe ndị o mere. Dị ka ihe atụ, mgbe Jisọs họpụtasịrị ndị ozi 12 ya, gịnị ka ha ga-eme? Mak 3:14, 15 na-agwa anyị, sị: “O wee mee ndị ikom iri na abụọ, ka Ya na ha wee biri, ka O wee na-ezipụkwa ha ikwusa ozi ọma, na inwe ike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ị̀ hụrụ ihe ọ bụla ndị ozi ahụ ga-ebute ụzọ?
10, 11. (a) Mgbe Jisọs na-ezipụ ndị ozi ahụ, gịnị ka ọ gwara ha ka ha mee? (b) N’ihe banyere izipụ ndị ozi ahụ, gịnị ka e lekwasịrị anya?
10 Ka oge na-aga, Jisọs mere ka mmadụ 12 ahụ nwee ike ịgwọ ndị ọzọ na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Matiu 10:1; Luk 9:1) O zipụziri ha ijekwuru “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel.” Iji mee gịnị? Jisọs nyere ha ntụziaka, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, Alaeze eluigwe dị nso. Meenụ ndị ahụ ha na-adịghị ike ka ahụ dị ha ike, meenụ ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 10:5-8; Luk 9:2) Gịnị n’ezie ka ha mere? “Ha wee pụọ, [1] kwusaa ka mmadụ chegharịa. [2] Ha na-achụpụkwa ọtụtụ mmụọ ọjọọ, werekwa mmanụ olive tee ọtụtụ ndị nrịanrịa, wee mee ka ahụ dị ha ike.”—Mak 6:12, 13.
11 Ebe ọ bụ na ọ bụghị oge nile ka e bu ụzọ kpọtụ izi ihe aha, ịrịba usoro ahụ dị n’elu ama ọ̀ ga-abụ iji ihe banyere ibute ihe ụzọ ma ọ bụ ebumnobi ndị ọ gụnyere, kpọbigara ihe ókè? (Luk 10:1-8) Anyị ekwesịghị ibelata ugboro ole e bu ụzọ kpọtụ izi ihe aha tupu ọgwụgwọ. Tụlee ihe a na-ekwu banyere ya n’okwu a. Ntakịrị oge tupu Jisọs ezipụ ndị ozi 12 ahụ, ọnọdụ nke ìgwè mmadụ ahụ metụrụ ya n’ahụ. Anyị na-agụ, sị: “Jisọs wee na-ejegharị n’obodo na obodo nta ha nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịanrịa nile dị iche iche. Ma mgbe Ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, O nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Mgbe ahụ Ọ sị ndị na-eso ụzọ Ya, Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.”—Matiu 9:34-38.
12. Olee nzube ọzọ ọrụ ebube nke Jisọs na ndị ozi pụrụ imezu?
12 Site n’ịnọnyere ya, ndị ozi ahụ pụrụ inwetatụ uche nke Kraịst. Ha pụrụ ịhụ na ha ịdị na-ahụ n’anya ma na-enwe ọmịiko n’ezie n’ebe ndị mmadụ nọ gụnyere ime nkwusa na izi ihe banyere Alaeze ahụ—nke ahụ ga-abụ akụkụ bụ́ isi nke ọrụ ọma ha. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ọrụ ọma a rụrụ n’ụzọ anụ ahụ, dị ka ịgwọ ndị ọrịa, rụzuru ihe karịrị nanị inyere ndị nọ ná mkpa aka. Dị ka ị pụrụ iche n’echiche, a pụrụ iji ọgwụgwọ na inye nri n’ụzọ ọrụ ebube dọta ụfọdụ ndị. (Matiu 4:24, 25; 8:16; 9:32, 33; 14:35, 36; Jọn 6:26) Otú ọ dị, e wezụga ịbụ enyemaka n’ụzọ anụ ahụ, ọrụ ndị ahụ kpaliri ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’ezie ịghọta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nakwa “onye amụma ahụ” nke Mosis buru n’amụma.—Jọn 6:14; Deuterọnọmi 18:15.
13. Amụma ahụ dị na Deuterọnọmi 18:18 na-eme ka ọrụ dị aṅaa dịịrị “onye amụma ahụ” nke gaje ịbịa pụta ìhè?
13 N’ihi gịnị ka o ji pụta ìhè na Jisọs bụ “onye amụma ahụ”? Gịnị bụ ọrụ bụ́ isi e buru n’amụma na onye ahụ ga-arụ? “Onye amụma ahụ” ọ̀ ga-abụ onye a ma ama maka ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube ma ọ bụ iji obi ọmịiko enye ndị agụụ na-agụ nri? Deuterọnọmi 18:18 buru n’amụma, sị: “M ga-eme ka onye amụma, nke dị ka gị [Mosis], biliere ha site n’etiti ụmụnne ha; M ga-etinyekwa okwu m nile n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha okwu nile nke M ga-enye ya n’iwu.” Ka ndị ozi ahụ na-amụta inwe na igosipụta mmetụta miri emi, ha pụrụ ikwubi na uche nke Kraịst ga-apụtakwa ìhè n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe ha. Nke ahụ ga-abụ ihe kasị mma ha pụrụ imere ndị mmadụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ndị ọrịa na ndị ogbenye pụrụ inweta abamuru ndị na-adịgide adịgide, ọ bụghị nanị ndị ahụ ga-adịrụ nanị ná mkpirikpi oge mmadụ na-adịru ndụ ma ọ bụ n’oge otu nri ma ọ bụ abụọ.—Jọn 6:26-30.
Zụlite Uche nke Kraịst Taa
14. Olee ụzọ inwe uche nke Kraịst si metụta ime nkwusa anyị?
14 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke ga-ele uche nke Kraịst anya dị ka nke dịrị nanị narị afọ mbụ—nye Jisọs na ndị na-eso ụzọ nke oge mbụ bụ́ ndị Pọl onyeozi dere banyere ha, sị: “Anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Anyị ga-ekwetakwa ngwa ngwa na iwu ji anyị ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ma, ọ bara uru ịtụgharị uche n’ebumnobi anyị ji na-arụ ọrụ ahụ. O kwesịghị ịbụ nanị n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị anyị. Ịhụnanya n’ebe Chineke nọ bụ isi ihe mere anyị ji ekere òkè n’ozi, ịdịkwa ka Jisọs n’ezie gụnyere ịbụ ndị ọmịiko kpaliri ime nkwusa na izi ihe.—Matiu 22:37-39.
15. N’ihi gịnị ka ọmịiko ji bụrụ akụkụ kwesịrị ekwesị nke ozi ihu ọha anyị?
15 N’eziokwu, ọ dịghị adịcha mfe inwe ọmịiko n’ebe ndị na-ekweghị ihe anyị kweere nọ, karịsịa mgbe anyị zutere enweghị mmasị, ọjụjụ, ma ọ bụ mmegide. Ma, ọ bụrụ na anyị ahapụ inwe ịhụnanya na ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ, anyị agaghịzi enwe mkpali dị mkpa maka ikere òkè n’ozi ndị Kraịst. Oleezi otú anyị pụrụ isi zụlite ọmịiko? Anyị pụrụ ịgbalị ile ndị mmadụ anya Matiu 9:36) Nke ahụ ọ̀ dịghị akọwa ọtụtụ ndị taa? Ndị ọzụzụ atụrụ okpukpe ụgha elegharawo ha anya, meekwa ka ha kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ha amaghị banyere nduzi ahụ bụ́ ịgba nke a na-achọta n’ime Bible, ha amaghịkwa banyere ọnọdụ Paradaịs ndị Alaeze Chineke ga-eweta n’isi nso n’elu ala anyị. Ha na-eche nsogbu nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị ihu—gụnyere ịda ogbenye, adịghị n’otu nke ezinụlọ, ọrịa, na ọnwụ—n’enweghị olileanya nke Alaeze ahụ. Anyị nwere ihe dị ha mkpa: ozi ọma Alaeze Chineke nke e guzobeworo ugbu a n’eluigwe!
dị ka Jisọs si lee ha, dị ka ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chọọ isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ?
16 Mgbe i chere echiche banyere mkpa ime mmụọ nke ndị nọ gị gburugburu, obi gị ọ́ dịghị akwali gị ịchọ ime ihe nile ị pụrụ ime iji gwa ha banyere nzube ịhụnanya nke Chineke? Ee, ọrụ anyị bụ ọrụ ọmịiko. Mgbe anyị nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ dị ka Jisọs nwere, ọ ga-apụta ìhè n’ụda olu anyị, n’ọdịdị ihu anyị, n’ụzọ anyị si ezi ihe. Ihe ndị ahụ nile ga-eme ka ozi anyị masịkwuo ndị ahụ “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48.
17. (a) Olee ụfọdụ ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya na ọmịiko anyị n’ebe ndị ọzọ nọ? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ okwu banyere ma ọ́ bụghị na a rụrụ ọrụ ọma ọ bụrụ na e keere òkè n’ozi ihu ọha?
17 Ịhụnanya na ọmịiko anyị kwesịrị, n’ezie, ịpụta ìhè n’ụzọ ndụ anyị nile. Nke a gụnyere anyị inwe obiọma n’ebe ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ndị ọrịa, na ndị ogbenye nọ—na-eme ihe anyị pụrụ ime n’ụzọ ezi uche dị na ya iji belata ahụhụ ha. Ọ gụnyere mgbalị anyị n’okwu na n’omume iji wepụ iru ùjù nke ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo. (Luk 7:11-15; Jọn 11:33-35) Ma, ngosipụta ndị dị otú ahụ nke ịhụnanya, obiọma, na ọmịiko agaghị aghọ ebe ọrụ ọma anyị nile hiwere isi karịsịa, dị ka ha ghọwooro ụfọdụ ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ. Mgbalị ndị inwe àgwà Chineke ndị yiri ndị ahụ kwaliri, bụ́ ndị a na-egosipụta n’òkè a na-ekere n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe ndị Kraịst, bara uru n’ụzọ na-adịgide adịgide karịsịa. Cheta ihe Jisọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe ndị Juu, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpa akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na anise na cummin, unu ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe: ma ọ dị mkpa ka unu mee ihe ndị a, ka unu gharakwa ịhapụ ihe ahụ.” (Matiu 23:23) Nye Jisọs, ọ bụghị ihe banyere ma a họrọghị nke a a họrọ nke a—ma ọ́ bụghị inyere ndị mmadụ aka ná mkpa anụ ahụ ha ọ bụrụ izi ha ihe ime mmụọ ndị na-enye ndụ. Jisọs mere ha abụọ. Ma, o doro anya na ọrụ izi ihe ya butere ụzọ n’ihi na ezi ihe ọ rụzuru pụrụ ịbụ ihe enyemaka na-adịru ebighị ebi.—Jọn 20:16.
18. Anyị ịtụle uche nke Kraịst kwesịrị ịkwali anyị ime gịnị?
18 Lee ekele anyị pụrụ inwe na Jehova ekpugheworo anyị uche nke Kraịst! Site n’Oziọma ndị ahụ, anyị pụrụ ịbịa mara n’ụzọ ka mma echiche, mmetụta, àgwà, ihe omume nke nwoke ahụ kasị ukwuu nke dịworo ndụ, nakwa ihe ndị o butere ụzọ. Ọ dịịrị anyị ịgụ, ịtụgharị uche, na itinye n’ọrụ ihe Bible na-ekpughe banyere Jisọs. Cheta na ọ bụrụ n’ezie na anyị ga-eme dị ka Jisọs, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta iche echiche, inwe mmetụta, na ịtụle ihe dị ka o mere, ruo n’ókè ike kwere anyị dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ka anyị kpebisizie ike ịzụlite na igosipụta uche nke Kraịst. Ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma isi bie ndụ, ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma isi mesoo ndị mmadụ ihe, ọ dịghịkwa ụzọ ọzọ ka mma anyị na ndị ọzọ pụrụ isi bịaruo onye ahụ ọ na-eṅomi n’ụzọ zuru ezu, bụ́ Chineke anyị nke nwere ọmịiko, bụ́ Jehova, nso.—2 Ndị Kọrint 1:3; Ndị Hibru 1:3.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Nghọta dị aṅaa ka Bible na-enye banyere otú Jisọs si na-elebarakarị ndị nọ ná mkpa anya?
• Gịnị ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè n’inye ụmụazụ ya ntụziaka?
• Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta “uche nke Kraịst” n’ihe ndị anyị na-eme?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
[Foto dị na peeji nke 24]
Olee ihe ọma kasịnụ nke ndị Kraịst pụrụ imere ndị ọzọ?