Gịnị Bụ Paradaịs ahụ Jisọs Kwere Onye Ajọ Omume ahụ Nwụrụ n’Akụkụ Ya ná Nkwa?
Gịnị Bụ Paradaịs ahụ Jisọs Kwere Onye Ajọ Omume ahụ Nwụrụ n’Akụkụ Ya ná Nkwa?
IHE ndekọ Luk na-egosi na otu onye ajọ omume, nke a na-egbukọ ya na Jisọs Kraịst, gbachiteere Jisọs ma rịọ ka Jisọs cheta ya mgbe ọ ‘ga-abịa n’alaeze ya.’ Nzaghachi Jisọs bụ: “N’ezie asị m gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:39-43, NW) N’ezie, akara edemede e gosiri ná nsụgharị nke okwu ndị a aghaghị ịdabere n’otú onye nsụgharị si ghọta ihe Jisọs bu n’uche n’okwu ya, ebe ọ bụ na ọ dịghị akara edemede e ji mee ihe n’ihe odide Grik mbụ ya. A machaghị ụdị akara edemede e ji eme ihe n’oge a nke ọma tupu ihe dị ka narị afọ nke itoolu O.A. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nsụgharị na-etinye rịkọm tupu okwu ahụ bụ́ “taa” wee si otú ahụ na-enye echiche na onye ajọ omume ahụ banyere na Paradaịs n’otu ụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ nke a ga-eji akwado nke a. Jisọs n’onwe ya nwụrụ ma nọrọ n’ili ruo n’ụbọchị nke atọ, a kpọlitezie ya n’ọnwụ dị ka “mkpụrụ mbụ” nke mbilite n’ọnwụ. (Ọrụ 10:40; 1 Ndị Kọrint 15:20; Ndị Kọlọsi 1:18) Ọ rịgooro n’eluigwe ụbọchị 40 mgbe nke ahụ gasịrị.—Jọn 20:17; Ọrụ 1:1-3, 9.
Ya mere, ihe àmà na-egosi na ojiji Jisọs ji okwu ahụ bụ́ “taa” mee ihe abụghị iji kwuo oge onye ajọ omume ahụ ga-anọ na Paradaịs, kama nke ahụ, ọ bụ iji dọrọ uche gaa n’oge a nọ na-ekwe nkwa ahụ, bụkwa oge onye ajọ omume ahụ gosipụtatụrụ okwukwe n’ebe Jisọs nọ. Ọ bụ ụbọchị ndị ndú okpukpe nọ n’ọkwá kasị elu nke obodo Jisọs jụrụ ya ma maa ya ikpe, e mesịakwa, ndị ọchịchị Rom amaa ya ikpe ọnwụ. A kparịwo ya, kwaakwa ya emo. Ya mere onye ajọ omume ahụ nọ n’akụkụ ya egosipụtawo àgwà kwesịrị nrịba ama na ọnọdụ obi kwesịrị ịja mma site n’ịghara isonyere ìgwè mmadụ ahụ ma, kama nke ahụ, na-agbachitere Jisọs, na-ekwupụtakwa nkwere o kweere n’Ọbụbụeze ya na-abịanụ. N’ịghọta na ihe e mesiri ike n’ụzọ ziri ezi bụ oge a nọ na-ekwe nkwa ahụ kama ịbụ oge ọ ga-emezu, nsụgharị ndị ọzọ, dị ka ndị nke Rotherham na Lamsa sụgharịrị gaa n’asụsụ Bekee, ndị Reinhardt na W. Michaelis sụgharịrị gaa n’asụsụ German, nakwa ndị Cureton sụgharịrị gaa n’asụsụ Syriac na narị afọ nke ise O.A., sụgharịrị akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ n’ụdị yiri otú e si agụ ya na New World Translation, bụ́ nke e hotara n’isiokwu a.
Banyere ịmata Paradaịs ahụ nke Jisọs kwuru banyere ya, o doro anya na ya na Alaeze eluigwe nke Kraịst abụghị otu ihe. Tupu mgbe ahụ n’otu ụbọchị ahụ, Luk 22:28-30; 23:40, 41) O doro anya na onye ajọ omume ahụ abụbeghị onye ‘a mụrụ ọzọ,’ onye e ji mmiri na mmụọ nsọ mụọ, bụ́ ihe Jisọs gosipụtara na ọ dị oké mkpa iji banye n’Alaeze eluigwe. (Jọn 3:3-6) Onye ajọ omume ahụ abụghịkwa otu n’ime ‘ndị ahụ na-emeri emeri’ bụ́ ndị Kraịst Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube kwuru na ha ga-eso ya nọrọ n’ocheeze eluigwe ya, bụkwa ndị nwere òkè ná “mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ.”—Mkpughe 3:11, 12, 21; 12:10, 11; 14:1-4; 20:4-6.
e kwuwo na ịbanye n’alaeze eluigwe bụ atụmanya dịịrị ndị ozi Jisọs kwesịrị ntụkwasị obi, ma ọ bụ ná ndabere nke ha ịbụ ndị ‘sowooro ya n’ọnwụnwa ya nile,’ bụ́ ihe onye ajọ omume ahụ na-emetụbeghị, ọnwụ ọ nwụrụ n’elu osisi n’akụkụ Jisọs bụ nnọọ n’ihi mpụ ya onwe ya mere. (Akwụkwọ ụfọdụ e ji eme nnyocha na-enye echiche na Jisọs nọ na-ezo aka na paradaịs dị na Hedis ma ọ bụ Sheol, bụ́ nke e weere na ọ bụ akụkụ e kewapụrụ iche n’ebe ahụ nke dịịrị ndị nwere ihu ọma Chineke. A na-azọrọ na ndị rabaị ndị Juu nke oge ahụ kụziri na e nwere paradaịs dị otú ahụ maka ndị nwụrụnụ ma na-echere mbilite n’ọnwụ. Banyere nkụzi ndị rabaị, akwụkwọ bụ́ Dictionary of the Bible, nke Hastings dere, na-ekwu, sị: “Nkà mmụta okpukpe ndị Rabaị dị ka o si rute anyị aka, na-egosipụta ngwakọta pụrụ iche nke echiche dị iche iche e nwere banyere ajụjụ ndị a, n’ihe banyere ọtụtụ n’ime ha kwa, o siri ike ịmara akara ụbọchị a ga-ekwu na ha malitere. . . . N’iwere akwụkwọ ahụ dị ka o si dị, ọ pụrụ iyi ka ụfọdụ ndị hà weere Paradaịs dị ka ihe dị n’ụwa, ndị ọzọ ewere ya dị ka akụkụ nke Sheol, ebe ndị ọzọkwa weere ya dị ka ihe na-adịghị n’ụwa ma ọ bụ n’okpuru ụwa, kama n’eluigwe . . . Ma e nwere obi abụọ ụfọdụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, banyere akụkụ ya ụfọdụ. N’ezie, ọ bụ n’okpukpe ndị Juu nke dịrị mgbe nke a gasịrị ka a na-ahụ echiche a dịgasị iche. Ha pụtara n’ụzọ a kasị kapịa ọnụ, n’ụzọ kasị zuo ezu n’okpukpe ndị Juu nke Cabala n’oge ụwa na-emepechabeghị anya . . . Ma a maghị mgbe a pụrụ ikwu na ihe ndị a malitere. Nkà mmụta okpukpe ka ochie nke ndị Juu, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ . . . yiri ka ọ nabatachaghị echiche nke Paradaịs nke dị n’etiti. Ọ na-ekwu banyere Gehinnom maka ndị ajọ omume, nakwa Gan Eden, ma ọ bụ ogige Iden, maka ndị ezi omume. O doghị anya ma ọ̀ gabigara echiche ndị a ma na-ekwu banyere Paradaịs nke dị na Sheol.”—1905, Mpịakọta nke Atọ, pp. 669, 670.
Ọ bụrụgodị na ha kụziri ihe dị otú ahụ, ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịtụghị na ya ikwere na Jisọs ga-agbasa echiche dị otú ahụ, n’ihi nkatọ ọ katọrọ ọdịnala okpukpe nke ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ́ nke Bible na-akwadoghị. (Matiu 15:3-9) O yikarịrị ka paradaịs onye Juu ahụ dara iwu bụ́ onye Jisọs gwara okwu, maara nke ọma n’ezie bụ Paradaịs elu ala nke a kọwara n’akwụkwọ mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ Paradaịs nke Iden. Ebe ọ dị otú ahụ, nkwa Jisọs na-ezo aka n’ụzọ ezi uche dị na ya, ná mweghachi nke ọnọdụ ụwa paradaịs dị otú ahụ. Ya mere, nkwa o kwere onye ajọ omume ahụ na-enye olileanya siri ike nke ịkpọlite onye ajọ omume dị otú ahụ n’ọnwụ gaa n’ohere nke ịdị ndụ n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri.—Tụlee Ọrụ 24:15; Mkpughe 20:12, 13; 21:1-5; Matiu 6:10.