Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Obi E Doziri Edozi Achọ Jehova

Iji Obi E Doziri Edozi Achọ Jehova

Iji Obi E Doziri Edozi Achọ Jehova

ONYE Israel bụ́ Ezra onye nchụàjà bụ onye nchọpụta, ọkà mmụta, odeakwụkwọ, na onye nkụzi pụtara ìhè nke Iwu ahụ. Nye ndị Kraịst nke oge a, ọ bụkwa ezi onye nlereanya nke ije ozi sitere ná mkpụrụ obi dum. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na ọ nọgidere na-asọpụrụ Chineke ọbụna n’oge o bi na Babilọn, bụ́ obodo nke chi ụgha na ofufe mmụọ ọjọọ jupụtara.

Nsọpụrụ Ezra na-asọpụrụ Chineke amaliteghị na mberede. Ọ rụrụ ọrụ na ya. N’ezie, ọ na-agwa anyị na ya “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ezra 7:10.

Dị ka Ezra, ndị Jehova taa na-achọ ime ihe nile Jehova gwara ha ka ha mee ka ha na-ebi n’ụwa nke na-ebuso ezi ofufe iro. Ya mere ka anyị tụlee ụzọ ndị anyị onwe anyị pụrụ isi dozie obi anyị, mmadụ ime ahụ—gụnyere echiche, àgwà, ọchịchọ, na mkpali anyị—“ịchọ iwu Jehova, na ime ya.”

Idozi Obi Anyị

“Idozi” pụtara “ịkwadebe tupu oge eruo maka nzube ụfọdụ: ime ka ihe dị n’ọnọdụ dị mma maka iji ya mee ihe, itinye ya n’ọrụ, ma ọ bụ ịtụfu ya.” N’ezie, ọ bụrụ na i nwewo ezi ihe ọmụma banyere Okwu Chineke, rarakwa ndụ gị nye Jehova, mgbe ahụ obi gị egosipụtawo n’ezie na ọ nọ n’ọnọdụ e doziri edozi, a pụkwara iji ya tụnyere ‘ala ahụ dị mma’ nke Jisọs kwuru banyere ya n’ilu ya banyere ọgha mkpụrụ.—Matiu 13:18-23.

Ka o sina dị, obi anyị chọrọ ka a na-elebara ya anya ma na-anụcha ya mgbe nile. N’ihi gịnị? N’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, n’ihi na dị ka ahịhịa ndị dị n’ugbo, ọchịchọ ndị na-emerụ ahụ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ n’ụzọ dị mfe, karịsịa na “mgbe ikpeazụ” a bụ́ mgbe “ikuku” nke usoro ihe Setan jupụtara ná mkpụrụ ọjọọ nke echiche anụ ahụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (2 Timoti 3:1-5; Ndị Efesọs 2:2, NW) Ihe nke abụọ metụtara ala n’onwe ya. Ọ bụrụ na a hapụ ya n’elekọtaghị ya anya, n’oge na-adịghị anya, ala ahụ pụrụ ịkpọ nkụ, sie ike, ma ghọọ nke na-adịghị emepụta ihe. Ma ọ bụ, ọtụtụ mmadụ pụrụ isi n’ugbo ahụ gafere n’ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe ma zọgide ala ahụ ụkwụ ruo mgbe o siri ike. Ala ihe atụ nke obi anyị yiri ya. Ọ pụrụ ịghọ nke na-adịghị emepụta ihe ma ọ bụrụ na e leghara ya anya ma ọ bụ bụrụ nke ndị na-enweghị mmasị ọ bụla n’ọdịmma ime mmụọ anyị zọgidere ụkwụ.

Mgbe ahụ, lee mkpa ọ dị ka anyị nile tinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, nke bụ́: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”—Ilu 4:23.

Ihe Ndị Na-eme Ka “Ala” nke Obi Anyị Na-emepụta Ihe

Ka anyị tụlee ihe, ma ọ bụ àgwà ụfọdụ, ndị ga-eme ka “ala” nke obi anyị na-eme ihe ka o wee mee ka anyị na-eto n’ụzọ dị mma. N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka obi anyị ka mma, ma n’ebe a anyị ga-atụle isii: ịghọta mkpa ime mmụọ anyị, ịdị umeala n’obi, ime ihe n’eziokwu, egwu Chineke, okwukwe, na ịhụnanya.

“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha,” ka Jisọs kwuru. (Matiu 5:3, NW) Dị ka agụụ anụ ahụ nke na-echetara anyị mkpa ọ dị anyị iri ihe, anyị ịmara mkpa ime mmụọ anyị na-eme ka agụụ nri ime mmụọ na-agụ anyị. Site n’okike, ụmụ mmadụ nwere agụụ maka nri dị otú ahụ n’ihi na ọ na-eme ka ndụ baa uru ma nwee nzube. Nrụgide ndị sitere n’usoro ihe Setan ma ọ bụ ịdị umengwụ kpọmkwem n’ihe banyere ịmụ ihe pụrụ ibelata ọmụma anyị maara mkpa a. Ya bụrụgodị otú ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.”—Matiu 4:4.

N’ụzọ nkịtị, iri nri dị mma, nke kwesịrị ekwesị ugboro ugboro na-akwalite ahụ ike, ha na-emekwa ka ahụ nwee agụụ maka nri nke ọzọ mgbe oge ya ruru. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ụzọ ime mmụọ. E nwere ike ị gaghị ele onwe gị anya dị ka onye na-amụchi ihe anya, ma ọ bụrụ na i mee ka ọ bụrụ àgwà gị ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-amụchi mbipụta ndị dabeere na Bible anya, ị ga-achọpụta na agụụ gị ga-arị elu. N’ezie, ị ga-eji oké mmasị na-atụ anya oge ọmụmụ Bible gị. Ya mere, akwụsịla n’echetụghị echetụ; rụsie ọrụ ike iji zụlite agụụ ime mmụọ kwesịrị ekwesị.

Ịdị Umeala n’Obi Na-eme Ka Obi Dị Nro

Ịdị umeala n’obi bụ akụkụ dị mkpa n’inwe obi e doziri edozi n’ihi na ọ na-eme ka anyị bụrụ ndị a pụrụ izi ihe, na-enyekwara anyị aka ịdịkwu njikere ịnakwere ndụmọdụ na mgbazi. Tụlee ezi ihe nlereanya nke Eze Josaịa. N’oge ọchịchị ya, a hụrụ akwụkwọ bu Iwu Chineke nke e nyere site n’aka Mosis. Mgbe Josaịa nụrụ okwu nke Iwu ahụ ma ghọta ókè nna nna ya hà kpafururu site n’ofufe dị ọcha, ọ dọwara uwe ya ma kwaa ákwá n’ihu Jehova. Gịnị mere Okwu Chineke ji metụ eze ahụ n’obi n’ụzọ miri nnọọ emi? Ihe ndekọ ahụ kwuru na obi ya dị “nro,” nke na o wedara onwe ya n’ala ozugbo ọ nụrụ ihe ndị Jehova kwuru. Jehova rịbara obi dị umeala, nke na-anabata ihe nke Josaịa nwere, ama, ma gọzie ya n’ihi ya.—2 Ndị Eze 22:11, 18-20.

Ịdị umeala n’obi mere ka ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị “na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ hie nne” nwee ike ịghọta na itinye eziokwu ime mmụọ n’ọrụ bụ́ nke “ndị amamihe na ndị nwere nghọta,” kama nanị ‘n’ụzọ anụ ahụ,’ na-amụtaghị. (Ọrụ 4:13; Luk 10:21; 1 Ndị Kọrint 1:26) Ndị nke abụọ a adịghị njikere ịnabata okwu Jehova n’ihi na nganga mere ka obi ha sie ike. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na Jehova kpọrọ nganga asị?—Ilu 8:13; Daniel 5:20.

Ime Ihe n’Eziokwu na Egwu Chineke

Jeremaịa onye amụma dere na “obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) Aghụghọ a na-egosipụta onwe ya n’ụzọ dịgasị iche, dị ka mgbe anyị na-agọpụrụ onwe anyị n’oge anyị mere ihe na-ezighị ezi. Ọ na-apụtakwa ìhè mgbe anyị na-akọwa ajọ ntụpọ ndị anyị nwere n’àgwà anyị dị ka ndị ziri ezi. Otú ọ dị, ime ihe n’eziokwu ga-enyere anyị aka imeri obi dị aghụghọ site n’inyere anyị aka ịnabata ihe bụ́ eziokwu banyere onwe anyị ka anyị wee nwee ike imeziwanye ihe. Ọbụ abụ ahụ gosipụtara ime ihe n’eziokwu dị otú ahụ mgbe o kpere ekpere sị: “Nwaa m, Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m.” N’ụzọ doro anya, ọbụ abụ ahụ doziri obi ya ịnabata nnụcha na nnwale site n’aka Jehova, n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịpụtawo ikweta na o nwere àgwà ndị dị ka nchara, ka o wee nwee ike imeri ha.—Abụ Ọma 17:3; 26:2.

Egwu Chineke, bụ́ nke na-agụnye “ịkpọ ihe ọjọọ asị,” bụ ihe enyemaka dị ike n’usoro nnụcha a. (Ilu 8:13) Ka ọ na-enwe ekele maka ebere ịhụnanya na ịdị mma Jehova, onye na-atụ egwu Jehova n’ezie na-amara mgbe nile na Jehova nwere ike nke inye ndị na-enupụrụ ya isi ntaramahụhụ, ọbụna ime ka ha nwụọ. Jehova gosipụtara na ndị na-atụ egwu ya ga-erubekwara ya isi mgbe o kwuru banyere Israel, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mkpụrụ obi ha dị ha otú a, ịtụ egwu m, na idebe ihe nile M nyere n’iwu ụbọchị nile, ka o wee dịrị ha mma, dịkwara ụmụ ha, ruo mgbe ebighị ebi!”—Deuterọnọmi 5:29.

N’ụzọ doro anya, nzube nke egwu Chineke abụghị iji tinye anyị n’ọnọdụ nke iji ụjọ nọrọ n’okpuru ya, kama iji kwalie anyị irubere Nna anyị na-ahụ n’anya, bụ́ onye anyị maara na o bu ọdịmma anyị kasịnụ n’obi, isi. N’ezie, egwu Chineke dị otú ahụ na-ewuli elu, ọbụnakwa na-akpali ọṅụ, bụ́ nke Jisọs Kraịst n’onwe ya gosipụtara n’ụzọ dị ukwuu.—Aịsaịa 11:3; Luk 12:5.

Obi E Doziri Edozi Na-ejupụta n’Okwukwe

Obi nke siri ike n’okwukwe maara na ihe ọ bụla Jehova sịrị ka e mee ma ọ bụ nye ntụziaka ya site n’Okwu ya na-ezi ezi mgbe nile, bụrụkwa maka ọdịmma anyị kasịnụ. (Aịsaịa 48:17, 18) Onye nwere obi dị otú ahụ na-enweta afọ ojuju dị ukwuu site n’itinye ndụmọdụ ahụ dị n’Ilu 3:5, 6 n’ọrụ, bụ́ nke na-asị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” Otú ọ dị, obi nke na-enweghị okwukwe agaghị enwe ọchịchọ ịtụkwasị Jehova obi, karịsịa ma ọ bụrụ na ime otú ahụ gụnyere ịchụ ihe n’àjà, dị ka ime ka ndụ mmadụ dị mfe iji lekwasị anya n’ọdịmma Alaeze. (Matiu 6:33) E nwere ezi ihe mere Jehova ji ele obi na-enweghị okwukwe anya dị ka nke dị ‘njọ.’—Ndị Hibru 3:12.

Okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-apụta ìhè n’ọtụtụ ụzọ, gụnyere n’ihe ndị anyị na-eme n’ime ụlọ anyị bụ́ ebe ndị mmadụ na-anọghị. Were dị ka ihe atụ, ụkpụrụ ahụ dị ná Ndị Galetia 6:7: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” Okwukwe anyị nwere n’ebe ụkpụrụ a dị ga-apụta ìhè n’ihe banyere ụdị sịnịma ndị anyị na-ekiri, akwụkwọ ndị anyị na-agụ, otú anyị na-enweru ọmụmụ Bible, nakwa n’ekpere anyị. Ee, okwukwe siri ike nke na-akwali anyị ịgha mkpụrụ “nye Mmụọ Nsọ” bụ akụkụ bụ́ isi n’inwe obi e doziri edozi ịnakwere Okwu Jehova na irube isi na ya.—Ndị Galetia 6:8.

Ịhụnanya—Àgwà Kachasịnụ

Karịa àgwà nile ọzọ, ịhụnanya na-eme ka ala nke obi anyị na-anabata Okwu Jehova n’ezie. N’ihi ya, mgbe Pọl onyeozi ji ya na-atụnyere okwukwe na olileanya, ọ kọwara ịhụnanya dị ka “nke kachasị [n’àgwà] ndị a.” (1 Ndị Kọrint 13:13) Obi nke jupụtara n’ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na-enweta afọ ojuju na ọṅụ dị ukwuu site n’irubere ya isi; n’ezie ọ dịghị ewe iwe n’ihi ihe ndị Chineke chọrọ. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) N’otu aka ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m: Nna m ga-ahụkwa ya n’anya.” (Jọn 14:23) Rịba ama na a na-egosigwara ịhụnanya dị otú ahụ. Ee, Jehova na-ahụ ndị ji ịhụnanya na-abịakwute ya, n’anya n’ụzọ miri emi.

Jehova maara na anyị ezughị okè, na-emehiekwa megide ya ugboro ugboro. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị anọpụ ebe dị anya site n’ebe anyị nọ. Ihe Jehova na-achọ n’ebe ndị ohu ya nọ bụ “obi zuru okè,” nke na-akwali anyị iji ọchịchọ obi were “mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ” na-ejere ya ozi. (1 Ihe E Mere 28:9) N’ezie, Jehova maara na ọ na-ewe anyị oge na mgbalị iji zụlite ezi àgwà n’obi anyị ma si otú ahụ na-amị mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ihi ya, ọ na-atachiri anyị obi, “n’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) N’igosipụta otu omume ahụ, ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs katọrọ ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ siri ike n’ihi emezighị emezi ha kama o ji ndidi nyere ha aka ma gbaa ha ume. Ọ̀ bụ na ịhụnanya, ebere, na ndidi dị otú ahụ nke Jehova na Jisọs adịghị akwali gị ịhụkwu ha n’anya?—Luk 7:47; 2 Pita 3:9.

Ọ bụrụ na ị na-ahụta ya mgbe ụfọdụ dị ka ihe siri ike ifopụta àgwà ndị yiri ahịhịa gbanyemiri mkpọrọgwụ ma ọ bụ ịkụpịasị ụfọdụ àgwà ndị siri ike, ndị dị ka ụrọ, adala mbà n’obi ma ọ bụ nwee nkụda mmụọ. Kama nke ahụ, nọgide na-emeziwanye ya ka ị ‘na-anọgidesi ike n’ekpere,’ gụnyere ịrịọ Jehova arịrịọ ugboro ugboro maka mmụọ ya. (Ndị Rom 12:12) Site n’enyemaka o ji ọchịchọ obi enye, ị ga-enwe ihe ịga nke ọma dị ka Ezra n’inwe obi e doziri nke ọma “ịchọ iwu Jehova, na ime ya.”

[Foto dị na peeji nke 31]

Ezra nọgidere na-asọpụrụ Chineke ọbụna na Babilọn

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Garo Nalbandian