Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Maara Banyere Amoosu?

Gịnị Ka Ị Maara Banyere Amoosu?

Gịnị Ka Ị Maara Banyere Amoosu?

AMOOSU! Gịnị ka okwu ahụ na-echetara gị?

Nye ọtụtụ ndị, ọ bụ akụkụ bụ́ isi nke nkwenkwe ụgha na echiche efu, ọ bụghị ihe a ga-eji kpọrọ ihe. Nye ha, amoosu bụ nanị ihe a na-echepụta n’echiche—ndị amoosu merela agadi bụ́ ndị na-eyi uwe na-ekpuchi isi ha bụ́ ndị na-etinye nku ụsụ n’ime ite mmiri ọkụ na-agbọ agbọ, na-eme ka ndị mmadụ ghọọ awọ, na-azọkwasịkwa ụkwụ ná mkpụrụ azịza wee na-efegharị na mbara igwe n’abalị ka ha na-achị ọchị arụrụala.

Nye ndị ọzọ, amoosu abụghị ihe a ga-eji gwurie egwu. Ndị nchọpụta ụfọdụ na-asị na ihe karịrị ọkara nke ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ n’ụwa kweere na ndị amoosu dị adị n’ezie, na ha pụkwara imetụta ndụ ndị ọzọ. Ọtụtụ nde mmadụ kweere na amoosu bụ ihe ọjọọ, ihe dị ize ndụ, na ihe e kwesịrị ịtụ egwu nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ banyere okpukpe ndị Africa na-ekwu, sị: “Ikwere n’ọrụ na n’ihe ize ndụ nke majik ọjọọ, ịgba afa na amoosu gbanyesiri mkpọrọgwụ ike ná ndụ ndị Africa . . . Ndị amoosu na ndị dibịa afa bụ ndị a kasị akpọ asị n’ógbè ha. Ọbụna ruo taa, e nwere ebe na mgbe ndị ọzọ na-akụgbu ha.”

Otú ọ dị, n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, amoosu aghọziela ihe a na-akwanyere ùgwù. Akwụkwọ, telivishọn, na ihe nkiri sịnịma emewo ihe dị ukwuu iji belata egwu nke amoosu. Otu onye na-akọwa ntụrụndụ bụ́ David Davis na-ekwu, sị: “Na mberede, ndị amoosu na-adịzi nwata nwata, na-adọrọkwa adọrọ karị, ha na-adọrọ nnọọ adọrọ. Hollywood na-adị ngwa n’ịnabata ihe ndị na-ewu ewu. . . . Site n’ime ka ndị amoosu dịkwuo mma n’anya ma na-adọrọ adọrọ karị, ha pụrụ ịmasị ihe ka ukwuu ná ndị na-ekiri ha, gụnyere ndị inyom na ụmụaka.” Hollywood maara otú e si eme ka ihe na-ewu ewu ghọọ ihe na-eweta uru.

Ụfọdụ na-asị na amoosu aghọwo otu n’ime òtù okpukpe kasị eto ngwa ngwa na United States. Gbaa gburugburu mba ndị mepere emepe, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ, bụ́ ndị òtù ndị na-achọ ihe ruuru ndị inyom kpaliri nakwa ndị na-enweghịzi mmasị n’okpukpe ndị bụ́ isi, na-achọ afọ ojuju ime mmụọ n’ụdị amoosu dịgasị iche. N’ezie, e nwere nnọọ ụdị amoosu dị ukwuu nke na ndị mmadụ adịghị ekwekọrịta ọbụna n’ihe okwu ahụ bụ́ “amoosu” pụtara. Otú ọ dị, ndị sị na ha bụ ndị amoosu na-akọwakarị onwe ha dị ka Wicca—nke a kọwara n’otu akwụkwọ ọkọwa okwu dị ka “okpukpe nwere ọdịdị ikpere arụsị bụ́ nke malitere n’ebe ọdịda anyanwụ Europe tupu oge ndị Kraịst, bụrụkwa nke a na-atụteghachi na narị afọ nke 20.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-akpọ onwe ha ndị ọgọ mmụọ ma ọ bụ ndị ọgọ mmụọ ọgbara ọhụrụ.

N’akụkọ ihe mere eme nile, a kpọwo ndị amoosu asị, kpagbuo ha, mekpọọ ha ọnụ, ọbụna gbuo ha. Ka a sịkwa ihe mere ndị amoosu oge a ji achọsi ike ime ka ọdịdị ha ka mma. N’otu nnyocha, a jụrụ ọtụtụ ndị amoosu ozi ha kasị chọọ izi ọha na eze. Azịza ha, bụ́ nke onye nchọpụta bụ́ Margot Adler chịkọtara, bụ: “Anyị abụghị ndị ọjọọ. Anyị adịghị efe Ekwensu. Anyị adịghị emerụ ndị mmadụ ahụ ma ọ bụ rafuo ha. Anyị adịghị ize ndụ. Anyị bụ ụmụ mmadụ nkịtị dị ka unu. Anyị nwere ezinụlọ, ọrụ, olileanya, na atụmanya. Anyị abụghị òtù nzuzo. Anyị agbapụghị iche. . . . Unu atụla anyị egwu. . . . Anyị na unu yiri nnọọ karịa otú unu chere.”

A nakwerewo ozi ahụ n’ụzọ na-arị elu. Ma nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ihe mere a ga-eji nwee nchegbu banyere amoosu? Ka anyị tụlee ajụjụ ahụ n’isiokwu na-esonụ.