Mee Ka “Olileanya Nzọpụta” Gị Na-egbukepụ Egbukepụ!
Mee Ka “Olileanya Nzọpụta” Gị Na-egbukepụ Egbukepụ!
“Yikwasịsịa . . . okpu agha, bụ́ [olileanya] nzọpụta.”—1 NDỊ TESALỌNAỊKA 5:8.
1. Olee otú “olileanya nzọpụta” si enye aka n’ịtachi obi?
OLILEANYA nke ịbụ onye a ga-azọpụta pụrụ inyere mmadụ aka ịtachi obi ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike. Onye ụgbọ mmiri kpunahụrụ nke nọ n’elu tuubu a na-ekpunye n’olu ka mmiri ghara iri mmadụ, pụrụ ịtachi obi ruo ogologo oge karị ma ọ mara na a bịawala inyere ya aka. N’otu aka ahụ, ruo ọtụtụ puku afọ, inwe olileanya ná “nzọpụta Jehova” akwagidewo ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe n’oge nsogbu, ọ dịbeghịkwa mgbe olileanya a mere ka e nwee ndakpọ olileanya. (Ọpụpụ 14:13; Abụ Ọma 3:8; Ndị Rom 5:5; 9:33) Pọl onyeozi ji “olileanya nzọpụta” tụnyere “okpu agha” nke ihe agha ime mmụọ onye Kraịst. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8; Ndị Efesọs 6:17) Ee, anyị inwe obi ike na Chineke ga-azọpụta anyị na-echebe ikike iche echiche anyị, na-enyere anyị aka inwe anya udo n’agbanyeghị ahụhụ, mmegide, na ọnwụnwa.
2. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka “olileanya nzọpụta” si bụrụ ihe bụ́ isi nye ezi ofufe?
2 “Inwe olileanya maka ọdịnihu abụghị ihe e ji mara ndị na-ekpere arụsị,” bụ́ ndị gbara ndị Kraịst narị afọ mbụ gburugburu, ka The International Standard Bible Encyclopedia Ndị Efesọs 2:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Ma, “olileanya nzọpụta” bụ akụkụ bụ́ isi nke ezi ofufe. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, e jikọtara nzọpụta nke ndị ohu Jehova na aha ya. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Esaf kpere ekpere, sị: “Nyere anyị aka, Chineke nke nzọpụta anyị, n’ihi nsọpụrụ aha Gị: napụtakwa anyị.” (Abụ Ọma 79:9; Ezikiel 20:9) Ọzọkwa, inwe obi ike ná ngọzi ndị Jehova kwere ná nkwa dị mkpa iji soro ya na-enwe ezi mmekọrịta. Pọl si otú a kwuo ya: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọzọkwa, Pọl kọwara na isi ihe mere Jisọs ji bịa n’ụwa bụ iji zọpụta ndị nwere nchegharị. O kwupụtara, sị: “Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka a nara ya nke ọma n’ụzọ nile ọ bụla, na Kraịst Jisọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.” (1 Timoti 1:15) Pita onyeozi zokwara aka n’ebe nzọpụta dị, dị ka ‘ihe okwukwe anyị ga-eweta.’ (1 Pita 1:9) N’ụzọ doro anya, o kwesịrị ekwesị inwe olileanya nzọpụta. Ma gịnị n’ezie bụ nzọpụta? Gịnịkwa ka a chọrọ iji nweta ya?
na-ekwu. (Gịnị Bụ Nzọpụta?
3. Ụdị nzọpụta dị aṅaa ka ndị ohu Jehova n’oge ochie nwetara?
3 N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, 2 Samuel 22:2–4) Devid maara na Jehova na-ege ntị mgbe ndị ohu Ya na-ekwesị ntụkwasị obi na-ebeku Ya ákwá maka enyemaka.—Abụ Ọma 31:22, 23; 145:19.
“nzọpụta” na-apụtakarị nnapụta ma ọ bụ mgbapụta site ná mmegbu ma ọ bụ n’ịnwụ ọnwụ ike. Dị ka ihe atụ, n’ịkpọ Jehova “onye na-eme ka m gbapụ,” Devid kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke nke oké nkume m, . . . ebe mgbalaga m; Onye nzọpụta m, Ị na-azọpụta m n’ihe ike. Onye a na-eto eto ka Ọ bụ, ana m akpọku Jehova, e wee zọpụta m n’aka ndị iro m.” (4. Olileanya dị aṅaa maka ndụ n’ọdịnihu ka ndị ohu Jehova tupu oge ndị Kraịst nwere?
4 Ndị ohu Jehova tupu oge ndị Kraịst nwekwara olileanya ịdị ndụ n’ọdịnihu. (Job 14:13–15; Aịsaịa 25:8; Daniel 12:13) N’ezie, ọtụtụ n’ime nkwa nnapụta ndị a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ amụma nke nzọpụta ka ukwuu—nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. (Aịsaịa 49:6, 8; Ọrụ 13:47; 2 Ndị Kọrint 6:2) N’oge Jisọs, ọtụtụ ndị Juu nwere olileanya maka ndụ ebighị ebi, ma ha jụrụ ịnakwere Jisọs dị ka onye ha ga-esi n’aka ya nweta ihe ha na-ele anya ya. Jisọs gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya, sị: “Unu na-enyocha ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, n’ihi na unu onwe unu na-eche na unu na-enwe ndụ ebighị ebi n’ime ha; ha onwe ha bụkwa ihe na-agbara m àmà.”—Jọn 5:39.
5. Gịnị ka nzọpụta pụtara n’ụzọ bụ́ isi?
5 Chineke si n’aka Jisọs kpughee ihe nile nzọpụta pụtara. Ọ na-agụnye ntọhapụ pụọ ná nchịkwa nke mmehie, pụọ n’agbụ nke okpukpe ụgha, pụọ n’ụwa nke Setan na-achị, pụọ n’egwu mmadụ, ọbụnakwa pụọ n’egwu ọnwụ. (Jọn 17:16; Ndị Rom 8:2; Ndị Kọlọsi 1:13; Mkpughe 18:2, 4) N’ụzọ bụ́ isi, nye ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, nzọpụta si n’aka Chineke apụtaghị nanị mgbapụta pụọ ná mmegbu na n’ahụhụ kamakwa ọ pụtara inwe ohere nke inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:40; 17:3) Jisọs kụziri na nye “ìgwè atụrụ nta,” nzọpụta pụtara ha ịbụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe iso Kraịst chịa n’Alaeze. (Luk 12:32) Nye ndị ọzọ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, nzọpụta pụtara mweghachi gaa ná ndụ zuru okè na iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta bụ́ ndị Adam na Iv nụrụ ụtọ ha n’ogige Iden tupu ha emehie. (Ọru 3:21; Ndị Efesọs 1:10) Ịdị ndụ ebighị ebi n’ọnọdụ paradaịs dị otú ahụ bụ nzube mbụ nke Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 1:28; Mak 10:30) Otú ọ dị, olee otú mweghachi gaa n’ọnọdụ dị otú ahụ ga-esi kwe omume?
Ihe Ndabere Maka Nzọpụta —Ihe Mgbapụta Ahụ
6, 7. Òkè dị aṅaa ka Jisọs na-ekere ná nzọpụta anyị?
6 Nzọpụta ebighị ebi ga-ekwe omume nanị site n’àjà mgbapụta Kraịst. N’ihi gịnị? Bible na-akọwa na mgbe Adam mehiere, o ‘renyere’ onwe ya na ụmụ ndị ọ ga-amụ n’ọdịnihu, tinyere anyị, ná mmehie—si otú a na-eme ka a chọọ ihe mgbapụta ma ọ bụrụ na ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe ezi olileanya ọ bụla. (Ndị Rom 5:14, 15; 7:14) Àjà ụmụ anụmanụ ahụ a chụrụ n’okpuru Iwu Mosis gosipụtara na Chineke ga-eweta ihe mgbapụta maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 10:1–10; 1 Jọn 2:2) Jisọs bụ onye àjà ya mezuru ihe ndị ahụ e buru n’amụma. Tupu a mụọ Jisọs, mmụọ ozi Jehova mara ọkwa, sị: “Ya onwe ya ga-azọpụta ndị nke Ya ná mmehie nile ha.”—Matiu 1:21; Ndị Hibru 2:10.
7 Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri mụrụ Jisọs n’ụzọ ọrụ ebube, dịkwa ka Ọkpara Chineke, o ketaghị ọnwụ n’aka Adam. Eziokwu a nakwa ụzọ ndụ ya nke ikwesị ntụkwasị obi n’ụzọ zuru okè mere ka ndụ ya ruo ọnụ ahịa a chọrọ iji zụtaghachi ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. (Jọn 8:36; 1 Ndị Kọrint 15:22) N’adịghị ka mmadụ nile ọzọ, a maghị Jisọs ikpe ịnwụ n’ihi mmehie. Ọ kpachapụrụ anya bịa n’ụwa “ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) N’ịbụ onye meworo otú ahụ, Jisọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilie, nke e chiwokwara eze, nọ n’ọnọdụ nke ịzọpụta ndị nile na-eme ihe Chineke na-achọ.—Mkpughe 12:10.
Gịnị Ka A Chọrọ Iji Nweta Nzọpụta?
8, 9. (a) Olee otú Jisọs si zaa ajụjụ otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya jụrụ ya banyere nzọpụta? (b) Olee otú Jisọs si jiri ohere a kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe?
8 N’otu oge, otu nwoke Israel bụ́ onye ọchịchị Mak 10:17) Ajụjụ ya pụrụ igosipụtawo echiche na-ewu ewu n’etiti ndị Juu nke oge ya—na Chineke na-achọ ka mmadụ na-arụ ezi ọrụ ụfọdụ nakwa na site n’ịrụzu ọrụ ndị ahụ, mmadụ pụrụ inweta nzọpụta site n’aka Chineke. Ma ofufe dị otú ahụ pụrụ ịbụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpalite. Ọrụ ndị dị otú ahụ emeghị ka e nwee olileanya e ji n’aka maka nzọpụta, ebe ọ bụ na ọ dịghị mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ iru ụkpụrụ Chineke n’ezie.
bara ọgaranya jụrụ Jisọs, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” (9 N’ịza ajụjụ nwoke ahụ, Jisọs chetaara ya nnọọ na o kwesịrị irube isi n’ihe Chineke nyere n’iwu. Nwoke ahụ bụ́ onye ọchịchị mesiri Jisọs obi ike ozugbo na ya anọgidewo na-eme ha site n’okorobịa. Azịza ya kpaliri Jisọs inwe ịhụnanya n’ebe ọ nọ. Jisọs gwara ya, sị: “Otu ihe fọdụụrụ gị ime: lawa, ree ka ihe i nwere hà, nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe: bịakwa, soo m.” Otú ọ dị, nwa okorobịa ahụ lara ná mwute, “n’ihi na ọ bụ onye nwere ihe hie nne.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs gwasiri ndị na-eso ụzọ ya ike na inwe nkekọ gabigara ókè n’ebe ihe onwunwe ụwa a dị na-egbochi mmadụ inweta nzọpụta. Ọ gbakwụnyere na ọ dịghị onye pụrụ inweta nzọpụta site ná mgbalị nke aka ya. Ma Jisọs gara n’ihu imesighachi ha obi ike, sị: “N’ebe mmadụ nọ ọ bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ bụghị n’ebe Chineke nọ: n’ihi na a pụrụ ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:18–27; Luk 18:18–23) Olee otú nzọpụta ga-esi kwe omume?
10. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ime iji nweta nzọpụta?
10 Nzọpụta bụ onyinye sitere n’aka Chineke, ma ọ dịghị abịa n’onwe ya. (Ndị Rom 6:23) E nwere ihe ụfọdụ bụ́ isi mmadụ ọ bụla na-aghaghị ime iji ruo eruo inweta onyinye ahụ. Jisọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Jọn onyeozi gbakwụnyekwara, sị: “Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; ma onye na-ekweghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ.” (Jọn 3:16, 36) N’ụzọ doro anya, Chineke na-achọ okwukwe na nrubeisi n’aka onye ọ bụla nke na-enwe olileanya inweta nzọpụta ebighị ebi. Onye nke ọ bụla aghaghị ime mkpebi ịnakwere ihe mgbapụta ahụ na ịgbaso nzọụkwụ Jisọs.
11. Olee otú onye na-ezughị okè pụrụ isi nweta nnwapụta Jehova?
11 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, nrubeisi abụghị àgwà anyị bu pụta ụwa, ọ dịghịkwa ekwe anyị omume irube isi n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ ya mere Jehova ji weta ihe mgbapụta iji kpuchie mmehie anyị. Otú o sina dị, anyị aghaghị ịnọgide mgbe nile na-agbalịsi ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụzọ Chineke. Dị ka Jisọs gwara nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya, anyị aghaghị idebe ihe Chineke nyere n’iwu. Ọ bụghị nanị na ime otú ahụ na-eweta nnwapụta Chineke kamakwa ọ na-eweta ọṅụ dị ukwuu, n’ihi na “ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ”; ha bụ “ihe na-enye ume ọhụrụ.” (1 Jọn 5:3; Ilu 3:1, 8, NW) Ma, ọ dịghị mfe ịnọgide na-enwe olileanya nzọpụta.
“Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe Ahụ”
12. Olee otú olileanya nzọpụta si ewusi onye Kraịst ike iguzogide ọnwụnwa dị iche iche nke omume rụrụ arụ?
12 Jud onye na-eso ụzọ chọrọ idegara ndị Kraịst oge mbụ akwụkwọ banyere “nzọpụta ahụ a zọpụtakọrọ [ha].” Otú ọ dị, omume ọjọọ nke jupụtara ebe nile mere ka ọ dụọ ụmụnna ya ọdụ ‘ịgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ.’ Ee, iji nweta nzọpụta, o zughị ezu inwe okwukwe, ịnọgidesi ike n’ezi okwukwe ndị Kraịst, na irube isi nanị mgbe ihe nile na-agazi agazi. Nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova aghaghị isi ike n’ụzọ zuru ezu iji nyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa na mmetụta ndị rụrụ arụ. Ma, mmekọahụ gabigara ókè na nke na-ezighị ezi, enweghị nkwanye ùgwù maka ịbụisi, nkewa, na obi abụọ, nọ na-emerụ mmụọ e nwere n’ọgbakọ narị afọ mbụ. Iji nyere ha aka ịlụso ọchịchọ ndị dị otú ahụ ọgụ, Jud gbara ndị Kraịst ibe ya ume iburu nzube ha n’uche nke ọma: “Ndị m hụrụ n’anya, n’iwuli onwe unu elu dị ka ụlọ n’elu okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ, n’ikpekwa ekpere n’ime Mmụọ Nsọ, debe onwe unu Jud 3, 4, 8, 19–21) Olileanya inweta nzọpụta pụrụ iwusi ha ike na mgba ha na-agba iji nọgide na-adị ọcha n’omume.
n’ihụnanya Chineke, na-eche ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ruo ndụ ebighị ebi.” (13. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị anaraghị amara Chineke n’efu?
13 Jehova Chineke na-atụ anya ka ndị ọ ga-azọpụta na-eme omume kwesịrị nṅomi. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Otú ọ dị, ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume ọma nke Chineke apụtaghị ịghọ onye na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Ọ bụghị anyị ka ọ dị n’aka ikpebi ọdịnihu ebighị ebi nke ụmụ mmadụ ibe anyị. Kama, ọ bụ Chineke ga-eme nke ahụ, dị ka Pọl gwara ndị Gris nọ n’Atens, sị: “O [debewo] otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu Nwoke Ọ kara aka”—Jisọs Kraịst. (Ọrụ 17:31; Jọn 5:22) Ọ bụrụ na anyị esite n’okwukwe n’ihe mgbapụta Jisọs na-adị ndụ, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ụbọchị ikpe na-abịanụ. (Ndị Hibru 10:38, 39) Ihe dị mkpa bụ ka anyị ghara ma ọlị “ịnara amara Chineke [anyị ịbụ ndị e mere ka anyị na ya dịghachi ná mma site n’ihe mgbapụta ahụ] n’efu” site n’ikwe ka a nwata anyị gaa n’iche echiche na ime omume na-ezighị ezi. (2 Ndị Kọrint 6:1) Ọzọkwa, site n’inyere ndị ọzọ aka inweta nzọpụta, anyị na-egosi na anyị anaraghị amara Chineke n’efu. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka?
Ikerịta Olileanya Nzọpụta
14, 15. Olee ndị Jisọs nyere ọrụ ikwusa ozi ọma nke nzọpụta?
14 N’ihota Joel onye amụma, Pọl dere, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” Mgbe ahụ, ọ gbakwụnyere, sị: “Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha aka-ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha aka-anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?” N’amaokwu ole na ole na-esonụ, Pọl na-eme ka ọ pụta ìhè na okwukwe adịghị abịara onwe ya; kama nke ahụ, ọ ‘na-esi n’ọnụnụ apụta,’ ya bụ, ‘okwu Kraịst.’—Ndị Rom 10:13, 14, 17; Joel 2:32.
15 Olee ndị ga-ewegara mba nile ‘okwu Kraịst’? Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ahụ—ndị a kụziwooro ‘okwu’ ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Jọn 17:20) Mgbe anyị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ, anyị na-eme nnọọ ihe Pọl onyeozi dere banyere ya, na nke ugbu a, ọ na-ehota Aịsaịa, sị: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” Ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị adịghị anabata ozi ọma anyị na-ezi, ụkwụ anyị ka ‘mara mma’ n’anya Jehova.—Ndị Rom 10:15; Aịsaịa 52:7.
16, 17. Nzube abụọ dị aṅaa ka ọrụ nkwusa anyị na-emezu?
16 Ịrụzu ọrụ a na-emezu nzube abụọ dị mkpa. Nke mbụ, a ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ ka e wee bulie aha Chineke elu, ka ndị chọrọ nzọpụta wee marakwa ebe ha ga-eche ihu. Pọl ghọtara akụkụ a nke ọrụ ahụ. O kwuru, sị: “N’ihi na otú a ka Onyenwe anyị nyeworo anyị iwu, sị, Edebewo m [Gị] ka Ị bụrụ ìhè nke mba nile, ka I wee dị inye nzọpụta ruo nsọtụ ụwa.” N’ihi ya, dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ikere òkè n’iwegara ndị mmadụ ozi nzọpụta ahụ.—Ọrụ 13:47; Aịsaịa 49:6.
17 Nke abụọ, nkwusa nke ozi ọma ahụ na-atọ ntọala maka ikpe ezi omume Chineke. Jisọs kwuru banyere ikpe ahụ, sị: “Ma mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ Matiu 25:31–46.
na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.” Ọ bụ ezie na ikpe ikpe ahụ na nkewapụta ahụ ga-ewere ọnọdụ “mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya,” ọrụ nkwusa ahụ na-enye ndị mmadụ ohere taa ịmata ụmụnna ime mmụọ nke Kraịst nakwa ịrụ ọrụ n’ịkwado ha maka nzọpụta ebighị ebi nke ha onwe ha.—Nọgide ‘Na-enwezu Olileanya Ahụ’
18. Ànyị pụrụ isi aṅaa mee ka “olileanya nzọpụta” anyị na-egbukepụ egbukepụ?
18 Anyị ikeresi òkè ike n’ọrụ nkwusa ahụ bụkwa otu ụzọ isi nyere anyị aka ime ka olileanya anyị na-egbukepụ egbukepụ. Pọl dere, sị: “Ọ na-agụ anyị agụụ ka unu nile n’otu n’otu wee na-egosi otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ ka unu wee nwezuo olileanya anyị ruo ọgwụgwụ ihe nile.” (Ndị Hibru 6:11) Mgbe ahụ, ka onye ọ bụla n’ime anyị yikwasị “okpu agha, bụ́ olileanya nzọpụta,” si otú a na-echeta na “Chineke edebeghị anyị ịnata iwe, kama inweta nzọpụta site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8, 9) Ka anyị burukwa agbamume Pita n’uche: “Keenụ ihe okike a n’úkwù nke uche unu, nweekwanụ anya udo, lezuokwanụ anya okè n’amara nke a na-ewetara unu.” (1 Pita 1:13) Ndị nile mere otú ahụ ga-ahụ ka e mezuchara “olileanya nzọpụta” ha!
19. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Ka ọ dịgodị, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele oge fọdụụrụ usoro ihe a anya? Olee otú anyị pụrụ isi jiri oge ahụ nweta nzọpụta nke anyị na nke ndị ọzọ? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji mee ka “olileanya nzọpụta” anyị na-egbukepụ egbukepụ?
• Gịnị ka nzọpụta gụnyere?
• Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta onyinye nke nzọpụta?
• Gịnị ka ọrụ nkwusa anyị na-arụzu n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Nzọpụta pụtara ihe karịrị nanị mgbapụta pụọ ná mbibi