Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Zọpụta Onwe Gị, Zọpụtakwa Ndị Na-anụ Olu Gị’

‘Zọpụta Onwe Gị, Zọpụtakwa Ndị Na-anụ Olu Gị’

‘Zọpụta Onwe Gị, Zọpụtakwa Ndị Na-anụ Olu Gị’

“Rịba onwe gị na ozizi gị ama. . . . N’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.”—1 TIMOTI 4:16.

1, 2. Gịnị na-akwali ezi ndị Kraịst ịnọgide n’ọrụ ha na-azọpụta ndụ?

N’OTU obodo nta dịpụrụ adịpụ n’ebe ugwu Thailand, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova nwalere iji nkà asụsụ ha mụtara ọhụrụ mee ihe n’ebe ndị otu agbụrụ bi n’elu ugwu nọ. Iji soro ndị bi n’obodo nta ahụ kerịta ozi ọma Alaeze Chineke, di na nwunye ahụ amalitewo ịmụ asụsụ Lahu n’oge na-adịbeghị anya.

2 “O siri ike ịkọwa ọṅụ na afọ ojuju anyị na-enwe n’isoro ndị a anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ na-arụkọ ọrụ,” ka nke bụ́ di na-akọwa. “N’ezie, anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-ekere òkè ná mmezu nke Mkpughe 14:6, 7, na-ezisara ‘mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla’ ozi obi ụtọ. E nwere ókèala ole na ole fọdụrụnụ bụ́ ebe ozi ọma ahụ na-erubeghị, nke a bụkwa otu n’ime ha n’ezie. Ọ fọrọ nke nta ka anyị nwee ọmụmụ Bible ndị anyị na-apụghị iduzicha.” N’ụzọ doro anya, di na nwunye a na-enwe olileanya ịzọpụta ọ bụghị nanị onwe ha kamakwa ndị na-anụ olu ha. Dị ka ndị Kraịst, ọ̀ bụ na anyị nile adịghị enwe olileanya ime otu ihe ahụ?

Rịba Onwe Gị Ama’

3. Iji zọpụta ndị ọzọ, gịnị ka anyị na-aghaghị ibu ụzọ mee?

3 Pọl onyeozi dụrụ Timoti ọdụ, sị, “Rịba onwe gị na ozizi gị ama,” nke a metụtakwara ndị Kraịst nile. (1 Timoti 4:16) N’ezie, iji nyere ndị ọzọ aka inweta nzọpụta, anyị aghaghị ibu ụzọ rịba onwe anyị ama. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Nke mbụ, anyị aghaghị ịnọ na nche banyere oge anyị bi na ya. Jisọs nyere ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara ka ụmụazụ ya wee nwee ike ịma mgbe “ọgwụgwụ oge a” na-eru nso. Ma, Jisọs kwukwara na anyị agaghị ama kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-eru. (Matiu 24:3, 36) Ànyị kwesịrị isi aṅaa meghachi omume n’ebe eziokwu ahụ dị?

4. (a) Olee àgwà anyị kwesịrị inwe n’ebe oge fọdụụrụ usoro ihe a dị? (b) Olee àgwà anyị kwesịrị izere?

4 Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Àna m eji oge ọ bụla fọdụụrụ usoro ihe a eme ihe iji zọpụta onwe m na ndị na-anụ olu m? Ka m na-eche, sị, “Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-eru, agaghị m etinye uche m na ya”?’ Àgwà nke abụọ ahụ dị ize ndụ. Ọ na-emegide nnọọ agbamume Jisọs, bụ́: “Unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:44) N’ezie, ugbu a abụghị oge ibelata ịnụ ọkụ n’obi anyị na-anụrụ ozi Jehova ma ọ bụ ilegara ụwa anya maka inweta nchebe ma ọ bụ afọ ojuju.—Luk 21:34–36.

5. Ihe nlereanya ndị dị aṅaa ka ndị àmà Jehova dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst setịpụrụ?

5 Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi na-egosi na anyị na-arịba onwe anyị ama bụ site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi dị ka ndị Kraịst. Ndị ohu Chineke n’oge ochie nọgidere na-atachi obi, ma hà tụrụ anya na mgbapụta ga-abịa ozugbo ma ọ bụ na ha atụghị. Mgbe Pọl hotasịrị ihe atụ nke ndị àmà dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst dị ka Ebel, Inọk, Noa, Abraham, na Sera, o kwuru, sị: “Ha anataghị nkwa ahụ, kama ha hụrụ ha rịị, sikwa n’ebe dị anya kelee ha, wee kwupụta na ha bụ ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa n’elu ụwa.” Ha adabaghị n’inwe ọchịchọ ọ bụla maka ndụ ntụsara ahụ, ha ekweghịkwa ka nrụgide dị iche iche nke omume rụrụ arụ bụ́ ndị gbara ha gburugburu merie ha, kama ha tụsiri anya ike ‘ịnata nkwa ahụ.’—Ndị Hibru 11:13; 12:1.

6. Olee otú echiche ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nwere banyere nzọpụta si metụta ụzọ ndụ ha?

6 Ndị Kraịst narị afọ mbụ hụtakwara onwe ha dị ka “ndị ọbịa” n’ụwa a. (1 Pita 2:11) Ọbụna mgbe a zọpụtasịrị ha gabiga mbibi nke Jerusalem na 70 O.A., ezi ndị Kraịst akwụsịghị ime nkwusa ma ọ bụ tinye isi n’ibi ndụ ndị ụwa. Ha maara na nzọpụta dị ebube na-echere ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ezie, na 98 O.A. bụ́ ogologo oge mgbe nke a gasịrị, Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17, 28.

7. Olee otú Ndịàmà Jehova siworo gosipụta ntachi obi n’oge a?

7 N’oge a, Ndịàmà Jehova anọgidesiwokwa ike n’ọrụ ndị Kraịst, n’agbanyeghị na ha enwetawo mkpagbu jọgburu onwe ya. Ntachi obi ha ọ̀ bụ na nkịtị? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na Jisọs mesiri anyị obi ike, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta,” ọ sọ nke ahụ ya bụrụ ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a ma ọ bụ ọgwụgwụ nke ndụ onye ahụ. Ná mbilite n’ọnwụ, Jehova ga-echeta ma kwụghachi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwụworonụ, ụgwọ ọrụ.—Matiu 24:13; Ndị Hibru 6:10.

8. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka ntachi obi nke ndị Kraịst nke oge gara aga?

8 Ọzọkwa, obi dị anyị ụtọ na ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara aga echegbughị onwe ha nanị banyere nzọpụta nke ha. N’ezie, anyị onwe anyị bụ́ ndị siworo ná mgbalị ha mata banyere Alaeze Chineke na-enwe ekele na ha tachiri obi n’ịrụ ọrụ Jisọs nyere ha: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ọ bụrụhaala na anyị ka nọgidere na-enwe ohere ime otú ahụ, anyị pụrụ igosipụta ekele anyị site n’ime nkwusa nye ndị ọzọ bụ́ ndị na-anụbeghị ozi ọma ahụ. Otú ọ dị, ime nkwusa bụ nanị nzọụkwụ mbụ na-eduga n’ime ndị na-eso ụzọ.

‘Rịba Ozizi Gị Ama’

9. Olee otú inwe echiche ziri ezi pụrụ isi nyere anyị aka ịmalite ọmụmụ Bible?

9 Ọrụ e nyere anyị na-agụnye ọ bụghị nanị ime nkwusa kamakwa izi ihe. Jisọs nyere anyị ọrụ izi ndị mmadụ ka ha debe ihe nile o nyere n’iwu. N’eziokwu, n’ókèala ụfọdụ, ọ bụ mmadụ ole na ole yiri ka ha chọrọ ịmụta banyere Jehova. Ma inwe echiche na-ezighị ezi banyere ókèala anyị pụrụ ibelata mgbalị ndị anyị na-eme ịmalite ọmụmụ Bible. Yvette, bụ́ onye ọsụ ụzọ nọ n’otu ókèala nke ụfọdụ ndị kpọworo nke na-adịghị amị mkpụrụ, chọpụtara na ndị si esi bịa n’ógbè ahụ, bụ́ ndị na-enweghị echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ, malitere ọmụmụ Bible ebe obibi. Mgbe Yvette n’onwe ya malitesịrị inwe echiche zikwuru ezi, ọ hụrụ ndị chọrọ ịmụ Bible.

10. Olee ọrụ bụ́ isi anyị nwere dị ka ndị nkụzi Bible?

10 Ụfọdụ ndị Kraịst pụrụ ịla azụ ịgwa ndị nwere mmasị ka ha na ha mụọ Bible n’ihi na ha echeghị na ha pụrụ iduzi ọmụmụ ihe. N’eziokwu, ikike anyị nwere dịgasị iche. Ma anyị agaghị enwerịrị nkà dị ukwuu iji nwee ihe ịga nke ọma dị ka ndị nkụzi nke Okwu Chineke. Ozi dị ọcha nke Bible dị ike, Jisọs kwukwara na ndị yiri atụrụ maara olu ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ ma ha nụ ya. Mgbe ahụ, ọrụ anyị bụ nanị izi ozi Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs, n’ụzọ doro nnọọ anya otú anyị nwere ike.—Jọn 10:4, 14.

11. Olee otú ị pụrụ isi dịkwuo irè n’inyere onye ị na-amụrụ Bible aka?

11 Olee otú ị pụrụ isi zie ozi Jisọs n’ụzọ dị irè karị? Iji malitegodị, mara nke ọma ihe Bible na-ekwu banyere isiokwu ahụ a na-atụle. I kwesịrị ịghọta ihe n’onwe gị tupu i nwee ike ịkụziri ya ndị ọzọ. Ọzọkwa, gbalịa ịhụ na e nwere ọnọdụ dị ùgwù ma bụrụ nke omume enyi n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Ndị a na-amụrụ ihe, gụnyere ndị ka bụ́ nnọọ ụmụaka, na-aka amụta ihe mgbe ahụ ruru ha ala, onye ozizi ana-egosikwa ha nkwanye ùgwù na obiọma.—Ilu 16:21.

12. Ị̀ pụrụ isi aṅaa jide n’aka na onye ị na-amụrụ ihe na-aghọta ihe ị na-akụziri ya?

12 Dị ka onye ozizi, ọ gaghị adị mma nanị ka ị gwa onye ị na-amụrụ ihe ihe ndị bụ́ eziokwu ka o kwughachi ha n’isi. Nyere ya aka ịghọta ihe ọ na-amụ. Agụmakwụkwọ nke onye ị na-amụrụ ihe, ahụmahụ o nwere ná ndụ, na otú ọ maruuru Bible ga-emetụta otú o si aghọta ihe ị na-ekwu. Ya mere, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ ghọtara uru akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ ahụ a na-amụ bara?’ Ị pụrụ iji ajụjụ ndị a na-apụghị iji nanị ee ma ọ bụ ee e aza, kama ndị chọrọ nkọwa, mee ka o kwuo ihe dị ya n’obi. (Luk 9:18–20) N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị a na-amụrụ ihe na-ala azụ ịjụ onye na-amụrụ ha ihe ajụjụ. N’ihi ya, ha pụrụ ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ n’aghọtaghị ihe a na-akụziri ha nke ọma. Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-ajụ gị ajụjụ nakwa ka ọ gwa gị mgbe ọ na-aghọtachaghị isi ihe ụfọdụ.—Mak 4:10; 9:32, 33.

13. Olee otú ị pụrụ isi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọ onye ozizi?

13 Otu nzube dị mkpa e ji eduzi ọmụmụ Bible bụ inyere onye a na-amụrụ ihe aka ịghọ onye ozizi. (Ndị Galetia 6:6) Iji mezuo nke ahụ, dị ka ntụleghachi nke ihe unu mụrụ, ị pụrụ ịgwa ya ka o jiri okwu ndị dị mfe kọwaara gị otu isi ihe, dị ka a ga-asị na ọ na-akọwara ya onye na-anụtụbeghị ya mbụ. E mesịa, mgbe ọ ghọrọ onye ruru eru ikere òkè n’ozi, ị pụrụ ịkpọ ya ka o sonyere gị n’ubi. O yikarịrị ka ọ ga-enwe ahụ iru ala iso gị na-arụ ọrụ, ahụmahụ ahụ ga-enyekwara ya aka inwekwu obi ike ruo mgbe ọ ga-adị njikere ịga ozi n’onwe ya.

Nyere Onye Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ịghọ Enyi Jehova

14. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ gị bụ́ isi dị ka onye ozizi, gịnịkwa ga-atụnye ụtụ n’ime ka i nwee ihe ịga nke ọma n’iru ya?

14 Ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi nke onye Kraịst ọ bụla bụ́ onye ozizi bụ inyere onye ọ na-amụrụ ihe aka ịghọ enyi Jehova. Ị ga-emezu nke a ọ bụghị nanị site n’okwu gị kamakwa site n’ihe nlereanya gị. Iji ihe nlereanya na-ezi ihe na-enwe mmetụta dị ike n’obi ndị a na-amụrụ ihe. Omume pụrụ n’ezie ikwu okwu karịa okwu ọnụ, karịsịa ma a bịa n’ịkụnye ụkpụrụ omume ọma na ịkpali ịnụ ọkụ n’obi n’ime onye a na-amụrụ ihe. Ọ bụrụ na ọ na-ahụ na okwu na omume gị na-esite n’ezi mmekọrịta gị na Jehova nwere, ọ pụrụ ịbụ onye a kwalikwuru ịzụlite mmekọrịta dị otú ahụ n’onwe ya.

15. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka onye ị na-amụrụ ihe zụlite ezi ebumnobi maka ijere Jehova ozi? (b) Olee otú ị pụrụ isi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ?

15 Ị chọrọ ka onye ị na-amụrụ ihe na-ejere Jehova ozi ọ bụghị nanị n’ihi na ọ chọghị ka a laa ya n’iyi n’Amagedọn kama n’ihi na ọ hụrụ Ya n’anya. Site n’inyere ya aka iwulite ezi ebumnobi dị otú ahụ, ị ga na-eji ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba bụ́ ndị ga-eguzogide ule nke okwukwe ya, na-ewuli ya. (1 Ndị Kọrint 3:10–15) Inwe ebumnobi na-ezighị ezi, dị ka ọchịchọ a na-achịkwaghị achịkwa nke ịṅomi gị ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ, agaghị enye ya ikike iguzogide mmetụta ndị na-ekwesịghị ndị Kraịst ma ọ bụ obi ike iji mee ihe ziri ezi. Cheta na ị gaghị abụ onye ozizi ya ruo mgbe ebighị ebi. Ebe ọ bụ na i nwere ohere ya, ị pụrụ ịgba ya ume ịbịarukwu Jehova nso mgbe nile site n’ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na iche echiche banyere ya. N’ụzọ dị otú a, ọ ga-anọgide na-enweta “ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ” site na Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, ruo ogologo oge mgbe ị mụsịịrị ya ihe.—2 Timoti 1:13.

16. Ị̀ pụrụ isi aṅaa kụziere onye ị na-amụrụ ihe ikpe ekpere sitere n’obi?

16 Ị pụkwara inyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịbịarukwu Jehova nso site n’ịkụziri ya ikpe ekpere sitere n’obi. Ị̀ pụrụ isi aṅaa mee nke a? Ikekwe ị pụrụ igosi ya ekpere nlereanya Jisọs, nakwa ọtụtụ ekpere ndị sitere n’obi bụ́ ndị e dekọrọ n’ime Bible, dị ka ndị ahụ dị n’abụ ọma. (Abụ Ọma nke 17, 86, 143; Matiu 6:9, 10) Ọzọkwa, mgbe onye ị na-amụrụ ihe nụrụ ka ị na-ekpe ekpere iji meghee ma mechie ọmụmụ ihe ahụ, ọ ga-ahụ mmetụta i nwere n’ebe Jehova nọ. N’ihi ya, ekpere gị kwesịrị mgbe nile ịbụ nke e kpere n’obi eziokwu na n’ụzọ a na-ezochighị ihe ọ bụla, nakwa nke na-egosipụta ezi nguzo ime mmụọ na nke mmetụta uche.

Ịrụ Ọrụ Iji Zọpụta Ụmụ Gị

17. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịnọgide n’okporo ụzọ na-eduga ná nzọpụta?

17 N’ezie, ndị òtù ezinụlọ anyị so ná ndị anyị chọrọ ịzọpụta. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ nke ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst bụ ndị nwere obi eziokwu ma “dị ike n’okwukwe.” Otú ọ dị, ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị eziokwu ahụ na-agbanyesighị mkpọrọgwụ ike n’obi ha. (1 Pita 5:9; Ndị Efesọs 3:17; Ndị Kọlọsi 2:7) Ọtụtụ n’ime ndị a na-eto eto na-ahapụ ụzọ ndị Kraịst mgbe ha mewere ma ọ bụ mgbe ha mere okenye. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, gịnị ka ị pụrụ ime iji gbochie ihe dị otú ahụ ime? Nke mbụ, ị pụrụ ịrụ ọrụ n’ime ka ọnọdụ ezinụlọ gị bụrụ nke na-ewuli elu. Ndụ ezinụlọ dị mma na-atọ ntọala maka ile ịbụisi anya n’ụzọ ziri ezi, inwe ekele maka àgwà ndị kwesịrị ekwesị, na iso ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta obi ụtọ. (Ndị Hibru 12:9) N’ụzọ dị otú a, inwe nkekọ chiri anya n’ime ezinụlọ pụrụ ịbụ isi ihe ga-eme ka ọbụbụenyi nwantakịrị na Jehova mie emie. (Abụ Ọma 22:10) Ezinụlọ ndị siri ike na-emekọ ihe ọnụ dị ka otu ndị—ọbụna ma a sị na ndị nne na nna aghaghị ịchụ oge ha pụrụ iji mee ihe ga-abara ha onwe ha uru n’àjà. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ iji ihe nlereanya gị kụziere ụmụ gị ime mkpebi ndị ziri ezi ná ndụ. Ndị nne na nna, ihe ụmụ unu chọrọ n’aka unu karịsịa abụghị ihe onwunwe, kama ọ bụ unu—oge, ume ọrụ, na ịhụnanya unu. Ùnu na-enye ụmụ unu ihe ndị a?

18. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị nne na nna na-aghaghị inyere ụmụ ha aka ịza?

18 Ya adịtụla mgbe ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ga-eche na ụmụ ha kwa ga-aghọrịrị ndị Kraịst. Daniel, bụ́ onye okenye nwere ụmụ ise, kwuru, sị: “Ndị nne na nna aghaghị iwepụta oge iji mee ka ụmụ ha wepụ obi abụọ ha na-aghaghị inwetawo site n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ. Ha aghaghị iji ndidi nyere ụmụ ha aka ịchọta azịza nye ajụjụ ndị dị ka: ‘Ànyị bi na mgbe ọgwụgwụ n’ezie? È nwere nanị otu ezi okpukpe n’ezie? N’ihi gịnị ka otu nwa akwụkwọ ibe m nke yiri ezigbo mmadụ na-ejighị dị mma maka mkpakọrịta? Ọ̀ dị njọ mgbe nile inwe mmekọahụ tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye?’” Ndị nne na nna, unu pụrụ ilegara Jehova anya ịgọzi mgbalị ndị unu na-eme, n’ihi na ya onwe ya nwekwara mmasị n’ọdịmma nke ụmụ unu.

19. N’ihi gịnị ka o ji kachasịa mma ka ndị nne na nna na-amụrụ ụmụ ha ihe n’onwe ha?

19 Ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ iche na ha erughị eru ma a bịa n’ịmụrụ ụmụ ha ihe. Otú ọ dị, unu ekwesịghị iche otú ahụ, n’ihi na ọ dịghị onye nọ n’ọnọdụ ka mma ịkụziri ụmụ unu ihe karịa unu onwe unu. (Ndị Efesọs 6:4) Ịmụrụ ụmụ unu ihe ga-eme ka unu mara ihe dị ha n’obi na n’uche. Azịza ha ọ̀ na-esi n’obi ka ọ̀ na-egosi enweghị mmasị? Hà kweere n’ihe ha na-amụ n’ezie? Jehova ọ̀ dị adị n’ezie nye ha? Unu pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a na ndị ọzọ dị mkpa nanị ma ọ bụrụ na unu na-amụrụ ụmụ unu ihe n’onwe unu.—2 Timoti 1:5.

20. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ bụrụ ihe na-atọ ụtọ ma baa uru?

20 Olee otú unu pụrụ isi nọgide na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ozugbo unu malitere ya? Joseph, bụ́ onye okenye nwere otu nwa nwoke na otu nwa nwanyị, na-ekwu, sị: “Dị ka ọmụmụ Bible nile ọzọ, ọmụmụ ihe ezinụlọ kwesịrị ịdị ụtọ, bụrụ ihe onye ọ bụla ga na-atụ anya ya. Iji mezuo nke ahụ n’ezinụlọ anyị, anyị apụghị iti iwu siri ike n’ihe banyere oge. Ọmụmụ ihe anyị pụrụ iwe otu awa, ma ọ bụrụgodị na mgbe ụfọdụ anyị nwere nanị minit iri, anyị na-amụkwarị ihe. Otu ihe na-eme ka ọmụmụ ihe anyị bụrụ ihe na-akpali akpali n’izu nye ụmụ anyị bụ na anyị na-eme ihe ngosi nke akụkọ ndị dị n’Akwukwọm nke Akukọ Bible. * Mmetụta na nghọta dị omimi ọ na-arụpụta dị nnọọ mkpa karịa paragraf ole anyị mụrụ.”

21. Olee mgbe ndị nne na nna pụrụ ịkụziri ụmụ ha ihe?

21 N’ezie, ọ bụghị nanị n’oge unu ji akwụkwọ amụ ihe ka unu kwesịrị ịkụziri ụmụ unu ihe. (Deuterọnọmi 6:5–7) Onyeàmà ahụ nọ na Thailand bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekwu, sị: “Ana m echeta nke ọma otú papa m si eji ịnyịnya ígwè anyị eburu m aga ọrụ nkwusa n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ nke ókèala ọgbakọ anyị. N’ezie, ọ bụ ezi ihe nlereanya nke nne na nna anyị na ihe ha kụziiri anyị n’ọnọdụ nile nyeere anyị aka ikpebi ịbanye n’ozi oge nile. Ihe ndị anyị mụtara anọgidewo na-adị irè. Aka m na-arụ ọrụ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ nke ubi ahụ!”

22. Gịnị ga-esi ‘n’ịrịba onwe gị na ozizi gị ama’ pụta?

22 Otu ụbọchị n’isi nso, kpọmkwem mgbe oge ya ruru, Jisọs ga-abịa imezu ihe Chineke kpere n’ikpe n’ebe usoro ihe a dị. E mesịa, oké ihe omume ahụ ga-aghọ ihe a na-akọ n’akụkọ n’eluigwe na ala, ma ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ga-anọgide na-ejere ya ozi, na-eburu nzọpụta ebighị ebi n’uche. Ị̀ na-enwe olileanya iso n’etiti ha, tinyere ụmụ gị na ndị ị na-amụrụ Bible? Mgbe ahụ, cheta: “Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.”—1 Timoti 4:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị, ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem oge ikpe Chineke ga-abịa?

• Ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi ‘rịba ozizi anyị ama’?

• Ị̀ pụrụ isi aṅaa nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọ enyi Jehova?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị nne na nna wepụta oge iji kụziere ụmụ ha ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọnọdụ dị ùgwù ma bụrụ nke omume enyi na-akwalite mmụta

[Foto dị na peeji nke 18]

Ime ihe ngosi nke akụkọ ndị dị na Bible, dị ka mgbe Solomọn na-ekpe ndị akwụna abụọ ikpe, na-eme ka ọmụmụ ihe ezinụlọ dị ụtọ