Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àjà Ndị Tọrọ Chineke Ụtọ

Àjà Ndị Tọrọ Chineke Ụtọ

Àjà Ndị Tọrọ Chineke Ụtọ

“A na-edo onyeisi nchụàjà ọ bụla iche onyinye na àjà dị iche iche n’ihu Chineke.”—NDỊ HIBRU 8:3.

1. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji ahụ mkpa ọ dị ichigharịkwuru Chineke?

“ỊCHỤ àjà yiri nnọọ ‘ihe mmadụ bu pụta ụwa’ dị nnọọ ka ọ dị ikpe ekpere; otu na-egosipụta ihe ọ na-eche banyere onwe ya, nke ọzọ na-egosipụta ihe ọ na-eche banyere Chineke,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Bible bụ́ Alfred Edersheim, na-ede. Site n’oge mmehie batara n’ụwa, o wetawo ihe mgbu nke obi amamikpe, nkewapụ n’ebe Chineke nọ, na enweghị enyemaka. Ọ dị mkpa inweta ahụ efe pụọ ná mmetụta ndị a. Ọ dị mfe ịghọta na mgbe ndị mmadụ hụtara onwe ha n’ọnọdụ enweghị olileanya dị otú ahụ, ha na-ahụ mkpa ọ dị ichigharịkwuru Chineke maka enyemaka.—Ndị Rom 5:12.

2. Ihe ndekọ dị aṅaa nke àjà ndị mbụ a chụụrụ Chineke ka anyị na-achọta na Bible?

2 Ihe ndekọ mbụ nke Bible banyere onyinye ndị e nyere Chineke bụ nke metụtara Ken na Ebel. Anyị na-agụ, sị: “O ruo, n’ọgwụgwụ ụbọchị ụfọdụ, na Ken wetara ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala ịbụ onyinye ịnata ihu ọma e nyere Jehova. Ebel kwa, ya onwe ya wetakwara ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya, na ụfọdụ n’ime iberibe ha mara abụba.” (Jenesis 4:3, 4) Ọzọ, anyị na-ahụ na a kpaliri Noa, bụ́ onye Chineke chebere gabiga oké Iju Mmiri ahụ bibiri ajọ ọgbọ nke oge ya, ‘isure àjà nsure ọkụ n’ebe ịchụàjà’ nye Jehova. (Jenesis 8:20) Ọtụtụ mgbe, ohu Chineke Kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́kwa enyi Ya, bụ́ Abraham, onye nkwa na ngọzi Chineke kpaliri, ‘wuru ebe ịchụàjà, kpọkuo aha Jehova.’ (Jenesis 12:8; 13:3, 4, 18) E mesịa, e lere okwukwe Abraham ule kasịnụ mgbe Jehova gwara ya ka ọ chụọ nwa ya bụ́ Aịsak n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ. (Jenesis 22:1-14) Ihe ndekọ ndị a, n’agbanyeghị na ha dị nkenke, na-amụkwasị ìhè dị ukwuu n’ihe banyere àjà, dị ka anyị ga-ahụ.

3. Òkè dị aṅaa ka àjà na-ekere n’ofufe?

3 Site n’ihe ndekọ ndị a na ndị ọzọ dị na Bible, o doro anya na ịchụ ụdị àjà ụfọdụ bụ akụkụ bụ́ isi nke ofufe eri oge tupu Jehova enye iwu a kapịrị ọnụ banyere ya. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, otu akwụkwọ na-akọwa “àjà” dị ka “ememe okpukpe bụ́ nke a na-achụ ihe n’àjà na ya nye ihe bụ́ chi iji malite, nọgide na-enwe, ma ọ bụ weghachi mmekọrịta dị mma n’etiti mmadụ na ihe o weere dị ka ihe dị nsọ.” Ma nke a na-ewelite ajụjụ ụfọdụ dị mkpa bụ́ ndị kwesịrị ka anyị lebara ha anya, dị ka: N’ihi gịnị ka àjà ji dị mkpa n’ofufe? Ụdị àjà ndị dị aṅaa ka Chineke na-anakwere? Gịnịkwa ka àjà ndị a chụrụ n’oge ochie pụtara nye anyị?

N’ihi Gịnị Ka Àjà Ji Dị Mkpa?

4. Gịnị mere Adam na Iv mgbe ha mehiesịrị?

4 Mgbe Adam mehiere, ọ ma ụma mee otú ahụ. Mwere o weere ma rie mkpụrụ osisi ahụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ bụ omume nnupụisi ọ kpachaara anya mee. Ntaramahụhụ nke omume nnụpụisi ahụ bụ ọnwụ, dị ka Chineke kwuworo hoo haa, sị: “N’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) Adam na Iv mesịrị nweta ụgwọ ọrụ nke mmehie—ha nwụrụ.—Jenesis 3:19; 5:3-5.

5. N’ihi gịnị ka Jehova ji bute ụzọ n’ime ihe maka ọdịmma ụmụ Adam, gịnịkwa ka O meere ha?

5 Otú ọ dị, gịnị banyere ụmụ Adam? Ebe ọ bụ na ha eketawo mmehie site n’aka Adam, ha na-enweta otu nkewapụ n’ebe Chineke nọ, enweghị olileanya, na ọnwụ ahụ di na nwunye mbụ ahụ nwetara. (Ndị Rom 5:14) Otú ọ dị, ọ bụghị nanị na Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi na ike kamakwa ọ bụ—n’ezie, n’ụzọ bụ́ isi—nke ịhụnanya. (1 Jọn 4:8, 16) Ya mere, ọ na-ebute ụzọ n’ime ka ya na ha nwee mmekọrịta dị mma. Mgbe o kwusịrị na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” Bible gara n’ihu ikwu, sị, “ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

6. Gịnị bụ uche Jehova banyere mbibi mmehie Adam wetara?

6 Ihe Jehova Chineke mesịrị mee iji jide n’aka na a ga-enweta onyinye ahụ bụ iweta ihe ga-ekpuchi mfu nke na-esite ná njehie Adam pụta. N’asụsụ Hibru, okwu bụ́ ka·pharʹ na mbụ ma eleghị anya pụtara “kpuchie” ma ọ bụ ikekwe “hichapụ,” a na-asụgharịkwa ya ịbụ “mkpuchi mmehie.” * N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova wetara ihe kwesịrị ekwesị iji kpuchie mmehie e ketara n’aka Adam ma hichapụ mbibi si na ya pụta ka e wee nwee ike ịgbapụta ndị ruru eru inweta onyinye ahụ pụọ n’ikpe ọmụma nke mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 8:21.

7. (a) Olileanya dị aṅaa ka e wetara site n’ikpe Chineke mara Setan? (b) Ụgwọ dị aṅaa ka a na-aghaghị ịkwụ iji tọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmehie na ọnwụ?

7 Ozugbo di na nwunye mbụ ahụ mehiesịrị, e zoro aka n’olileanya nke mmadụ inwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. Jehova kwuru n’oge ọ na-ama Setan, bụ́ onye agwọ ahụ nọchiri anya ya, ikpe, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Site n’okwu amụma ahụ, olileanya bịara dịrị ndị nile ga-enwe okwukwe ná nkwa ahụ. Otú ọ dị, a ga-akwụ ụgwọ maka ntọhapụ ahụ. Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa agaghị abịa nnọọ ma bibie Setan; a ghaghị ichifịa Mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ, ya bụ, ọ ghaghị ịnwụ, ọ bụ ezie na ọ bụghị nke ga-adịgide adịgide.

8. (a) Olee otú Ken si ghọọ ihe mmechuihu? (b) N’ihi gịnị ka àjà Ebel ji bụrụ ihe dị mma n’anya Chineke?

8 Obi abụọ adịghị ya na Adam na Iv chere nnọọ echiche nke ukwuu banyere onye Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abụ. Mgbe Iv mụrụ ọkpara ya, bụ́ Ken, o kwuru, sị: “Enwetawo m nwoke site n’inyeaka Jehova.” (Jenesis 4:1) Ọ̀ nọ na-eche na ma eleghị anya nwa ya nwoke ga-abụ Mkpụrụ ahụ? Ma ò chere otú ahụ ma ọ bụ na o cheghị otú ahụ, Ken, nakwa ihe ọ chụrụ n’àjà, gosipụtara onwe ha ịbụ ihe mmechuihu. N’aka nke ọzọ, nwanne ya nwoke bụ́ Ebel gosipụtara okwukwe ná nkwa Chineke, a kpalikwara ya ịchụrụ Jehova ụfọdụ n’ime ndị e buru ụzọ mụọ n’ìgwè atụrụ ya, n’àjà. Anyị na-agụ, sị: “Okwukwe ka Ebel ji chee àjà n’ihu Chineke nke ka àjà [Ken] chere mma, nke e sitere na ya gbaara ya àmà na ọ bụ onye ezi omume, ebe Chineke gbara àmà banyere onyinye ya nile: o sitekwa na nke ahụ na-ekwu okwu ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụrụ anwụ.”—Ndị Hibru 11:4.

9. (a) Na gịnị ka Ebel nwere okwukwe, oleekwa otú o si gosipụta ya? (b) Gịnị ka àjà Ebel chụrụ rụzuru?

9 Okwukwe Ebel abụghị nanị ikwere na Chineke dị, bụ́ nke Ken na-aghaghịkwa ikwereworị. Ebel nwere okwukwe ná nkwa Chineke kwere banyere Mkpụrụ iji zọpụta ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi. E kpugheghịrị ya otú a ga-esi mezuo nke ahụ, ma nkwa Chineke mere ka Ebel mara na ọ dị onye a na-aghaghị ichifịa n’ikiri ụkwụ. Ee, ihe àmà na-egosi na o kwubiri na a ghaghị ịwụsị ọbara—kpọmkwem echiche àjà na-enye. Ebel chụụrụ Isi Iyi nke ndụ àjà nke gụnyere ndụ na ọbara, ma eleghị anya ọ bụ dị ka ngosipụta nke ọchịchọ ọ na-achọsi ike ka nkwa Jehova mezuo na atụmanya siri ike o nwere maka ya. Ọ bụ ngosipụta okwukwe a mere ka àjà Ebel tọọ Jehova ụtọ, n’ụzọ a kpakwaara ókè, o gosipụtara ihe àjà bụ n’ezie—ụzọ ụmụ mmadụ na-emehie emehie pụrụ isi jekwuru Chineke iji nweta ihu ọma ya.—Jenesis 4:4; Ndị Hibru 11:1, 6.

10. Olee otú e si mee ka ihe àjà pụtara doo anya site na Jehova ịgwa Abraham ka ọ chụọ Aịsak n’àjà?

10 E mere ka ihe miri emi àjà pụtara doo nnọọ anya mgbe Jehova nyere Abraham iwu ịchụ nwa ya nwoke bụ́ Aịsak n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ. Ọ bụ ezie na a chụghị àjà ahụ n’ụzọ nkịtị, o sere onyinyo ihe Jehova n’onwe ya ga-emecha mee—ịchụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’àjà dị ka àjà kasịnụ a chụtụrụla, iji mezuo nzube Ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. (Jọn 3:16) Jehova ji àjà na onyinye ndị e nyere n’okpuru Iwu Mosis setịpụ ụkpụrụ ndị e buru n’amụma iji zie ndị ya ọ họpụtara ahọpụta ihe ha na-aghaghị ime iji bụrụ ndị a gbaghaara mmehie ha na iji mee ka olileanya ha nwere maka nzọpụta sikwuo ike. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndị a?

Àja Ndị Jehova Na-anakwere

11. Ụzọ àjà abụọ dị aṅaa ka onyeisi nchụàjà Israel chụrụ, n’ihi nzube ndị dịkwa aṅaa?

11 “A na-edo onyeisi nchụàjà ọ bụla iche onyinye na àjà dị iche iche n’ihu Chineke,” ka Pọl onyeozi na-ekwu. (Ndị Hibru 8:3) Riba ama na Pọl na-ekewa ihe ndị onyeisi nchụàjà nke Israel oge ochie chụrụ n’àjà ụzọ abụọ, ha bụ, “onyinye” na “àjà,” ma ọ bụ “àjà dị iche iche n’ihi mmehie.” (Ndị Hibru 5:1) Ndị mmadụ n’ozuzu ha na-enye onyinye iji gosipụta ịhụnanya na ekele, nakwa iji zụlite ọbụbụenyi, iji nweta ihu ọma, ma ọ bụ iji bụrụ ndị a nabatara. (Jenesis 32:20; Ilu 18:16) N’otu aka ahụ, a pụrụ ile ọtụtụ n’ime onyinye ndị Iwu ahụ kwuru ka e nye anya dị ka “onyinye” e nyere Chineke iji bụrụ ndị ọ nabatara na ndị nwetara ihu ọma ya. * Mmebi nke Iwu ahụ chọrọ na a ga-akwụ ụgwọ, ijikwa mee ka ihe dịghachi mma, a chụrụ “àjà dị iche iche n’ihi mmehie.” Pentateuch, karịsịa akwụkwọ Ọpụpụ, Levitikọs, na Ọnụ Ọgụgụ, na-enye ihe ọmụma buru ibu banyere ụdị dị iche iche nke àjà na onyinye ndị e nwere. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụrụ anyị nnọọ ihe ịma aka ịghọta na icheta nkọwa nile e nyere, isi ihe ụfọdụ banyere àjà ndị dịgasị iche a chụrụ kwesịrị ka anyị lebara ha anya.

12. Ole ebe na Bible ka anyị pụrụ ịhụ ntụle dị mkpirikpi banyere àjà, ma ọ bụ onyinye dị iche iche, n’Iwu ahụ?

12 Anyị pụrụ ịrịba ama na na Levitikọs isi nke 1 ruo 7, a kọwara ụzọ onyinye ise bụ́ isi—àjà nsure ọkụ, onyinye ịnata ihu ọma, àjà udo, àjà mmehie, na àjà ikpe ọmụma—n’otu n’otu, n’agbanyeghị na n’ezie, a chụkọtara ụfọdụ n’ime ha ọnụ. Anyị na-arịbakwa ama na a kọwara àjà ndị a ugboro abụọ n’isiakwụkwọ ndị a, na-ebu nzube dịgasị iche n’obi: otu ugbo, na Levitikọs 1:2 ruo 6:7, na-akọwazu ihe ndị a ga-achụ n’àjà n’ebe ịchụàjà, nke abụọ, na Levitikọs 6:8 ruo 7:36, na-egosi òkè ndị e wepụụrụ ndị nchụàjà na ndị e wepụrụ iche maka onye wetara ihe ịchụ àjà. E mesịa, n’Ọnụ Ọgụgụ isi nke 28 na 29, anyị na-ahụ ihe a pụrụ ile anya dị ka usoro ọgụgụ oge zuru ezu, na-egosipụta ihe ndị a ga-achụ n’àjà kwa ụbọchị, kwa izu, kwa ọnwa, nakwa n’ememe ndị a na-eme kwa afọ.

13. Kọwaa àjà ndị a chụrụ n’afọ ofufo dị ka onyinye nye Chineke.

13 N’ime àjà ndị a chụrụ n’afọ ofufo dị ka onyinye ma ọ bụ dị ka ụzọ isi jekwuru Chineke iji nweta ihu ọma ya bụ àjà nsure ọkụ, onyinye ịnata ihu ọma, na àjà udo. Ndị ọkà mmụta ụfọdụ kweere na okwu Hibru e ji mee ihe maka “àjà nsure ọkụ” pụtara “àjà nrịgo” ma ọ bụ “àjà na-arịgo arịgo.” Nke a dabara adaba n’ihi na n’àjà nsure ọkụ, a na-esure anụ ahụ e gburu egbu n’ọkụ n’ebe ịchụàjà, ísì ụtọ na-arịgokwuru Chineke n’eluigwe. Akụkụ pụrụ iche nke àjà nsure ọkụ ahụ bụ na mgbe e fesasịrị ọbara ya gburugburu ebe ịchụàjà ahụ, a na-achụ anụ ahụ dum n’àjà nye Chineke. Ndị nchụàjà ‘na-esuresị anụ ahụ nile ọkụ ịbụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, bụ́ àjà ọkụ nke ihe ísì ụtọ a na-achụrụ Jehova.’—Levitikọs 1:3, 4, 9; Jenesis 8:21.

14. Olee otú e si nye onyinye ịnata ihu ọma ahụ?

14 A kọwara onyinye ịnata ihu ọma na Levitikọs isi nke 2. Ọ bụ onyinye afọ ofufo nke ụtụ ọka flour mejupụtara, bụ́ nke a na-etinyekarị mmanụ na frankincense. “[Onyeisi nchụàjà] ga-esi n’ime ya wejuo mweju aka ya sitere n’ụtụ ọka flour ya, sitekwa ná mmanụ ya, tinyere frankincense nke ya nile; onye nchụàjà ga-esurekwa ihe ncheta ya ọkụ ịbụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà, ọ bụ àjà ọkụ nke ihe ísì ụtọ a na-achụrụ Jehova.” (Levitikọs 2:2) Frankincense bụ otu n’ime ihe ndị e ji mee ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ dị nsọ bụ́ nke a na-esure n’ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke dị n’ụlọikwuu na n’ụlọ nsọ ahụ. (Ọpụpụ 30:34-36) Ihe àmà na-egosi na Eze Devid bu nke a n’uche mgbe o kwuru, sị: “Ka e dozie ekpere m dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Gị; ka nchịli ọbụ aka m bụrụ onyinye ịnata ihu ọma nke anyasị.”—Abụ Ọma 141:2.

15. Gịnị bụ nzube e ji achụ àjà udo?

15 Onyinye afọ ofufo ọzọ bụ àjà udo, bụ́ nke a kọwara na Levitikọs isi nke 3. N’asụsụ Hibru, okwu bụ́ “udo” pụtara ihe ndị ọzọ ma e wezụga enweghị agha na ọgba aghara. “Na Bible, ọ pụtara nke a, nakwa ọnọdụ ma ọ bụ mmekọrịta udo n’ebe Chineke nọ, ọganihu, ọṅụ, na obi ụtọ,” ka akwụkwọ bụ́ Studies in the Mosaic Institutions na-ekwu. N’ihi ya, a na-achụ àjà udo, ọ bụghị iji soro Chineke nọrọ n’udo, dị ka a ga-asị na ọ bụ iji mee ka obi ya dajụọ, kama ọ bụ iji gosipụta ekele, ma ọ bụ iji gosi afọ ojuju maka ọnọdụ a gọziri agọzi nke iso Chineke nọrọ n’udo bụ́ nke ndị na-eme ihe ọ na-achọ na-enwe. Ndị nchụàjà na onye wetara àjà ahụ na-eri ihe ahụ a chụrụ n’àjà mgbe a chụsịrị ọbara na abụba ya n’àjà nye Jehova. (Levitikọs 3:17; 7:16-21; 19:5-8) N’ụzọ mara mma na nke ihe atụ, onye wetara àjà ahụ, ndị nchụàjà, na Jehova Chineke nọ na-eri ihe bụ́ nke na-egosipụta mmekọrịta udo dị n’etiti ha.

16. (a) Gịnị bụ nzube e ji achụ àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma? (b) Olee otú ha si dị iche n’àjà nsure ọkụ?

16 Àjà ndị a na-achụ iji chọọ mgbaghara mmehie ma ọ bụ iji kpuchie ọdịda a dara Iwu ahụ na-agụnye àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma. N’agbanyeghị na àjà ndị a na-agụnyekwa isure ihe n’ọkụ n’ebe ịchụàjà, ha dị iche n’àjà nsure ọkụ n’ihi na a naghị achụrụ Chineke anụ ahụ dum n’àjà, nanị abụba ya na akụkụ ya ụfọdụ ka a na-achụ n’àjà. A na-atụfu ihe ndị ọzọ fọdụrụ n’anụ ahụ ná mpụga nke ọmụma ụlọikwuu ahụ ma ọ bụ n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị nchụàjà erie ya. Ọdịiche a nwere ihe ọ pụtara. A na-achụ àjà nsure ọkụ dị ka onyinye nye Chineke iji kwe ka a bịakwute ya, n’ihi ya ọ bụ nanị Chineke ka a na-achụrụ ha nile. Ọ dị mma ịmara na àjà mmehie ma ọ bụ àjà ikpe ọmụma na-ebutekarị àjà nsure ọkụ ụzọ, na-egosi na iji mee ka Chineke nakwere onyinye nke onye mmehie, mgbaghara mmehie dị mkpa.—Levitikọs 8:14, 18; 9:2, 3; 16:3, 5.

17, 18. Gịnị ka e ji maka ya guzobe àjà mmehie, nzube dịkwa aṅaa ka e ji achụ àjà ikpe ọmụma?

17 A na-anakwere àjà mmehie ahụ nanị maka mmehie e mere megide Iwu ahụ n’amaghị ama, bụ́ mmehie e mere n’ihi adịghị ike nke anụ ahụ. “Mgbe mmadụ ga-emehie n’amaghị ama megide ihe ọ bụla n’ime ihe Jehova nyere n’iwu, sị, Emela ha,” mgbe ahụ, onye mmehie ahụ ga-achụ àjà mmehie dị ka ọnọdụ, ma ọ bụ ọkwá ya, n’obodo si dị. (Levitikọs 4:2, 3, 22, 27) N’aka nke ọzọ, a na-ebipụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị; ọ dịghị àjà dịịrị ha.—Ọpụpụ 21:12-15; Levitikọs 17:10; 20:2, 6, 10; Ọnụ Ọgụgụ 15:30; Ndị Hibru 2:2.

18 E mere ka ihe àjà ikpe ọmụma ahụ pụtara na nzube ya doo anya na Levitikọs isi nke 5 na 6. Mmadụ pụrụ imehiewo n’amaghị ama. Ma, njehie ya pụrụ imewo ka ọ daa iwu megide ihe ndị ruuru mmadụ ibe ya ma ọ bụ Jehova Chineke, a ghaghịkwa idozi ma ọ bụ mezie ihe ahụ e mebiri. A kpọtụrụ ụdị mmehie dị iche iche aha. Ụfọdụ bụ mmehie mmadụ mere megide onwe ya (5:2-6), ụfọdụ bụ mmehie e mere megide “ihe nsọ nile nke Jehova” (5:14-16), ụfọdụkwa, ọ bụ ezie na ha abụchaghị n’amaghị ama, bụ mmehie ndị e mere n’ihi ọchịchọ na-ezighị ezi ma ọ bụ adịghị ike nke anụ ahụ (6:1-3). Tụkwasị n’ikwupụta mmehie ndị dị otú ahụ, a chọrọ ka onye ahụ mehierenụ kwụọ ụgwọ n’ebe o kwesịrị ịkwụ ụgwọ, e mesịzie, ya achụọrọ Jehova àjà ikpe ọmụma.—Levitikọs 6:4-7.

Ihe Ka Mma Ga-abịa

19. N’agbanyeghị na ụmụ Israel nwere Iwu ahụ na àjà ndị mejupụtara ya, n’ihi gịnị ka ha na-ejighị nweta ihu ọma Chineke?

19 E nyere ụmụ Israel Iwu Mosis, nke gụnyere ọtụtụ àjà na onyinye, iji mee ka ha nwee ike ịbịakwute Chineke iji nweta ma nọgide na-enwe ihu ọma na ngọzi ya ruo mgbe Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abịarute. Pọl onyeozi, bụ́ onye Juu n’ọmụmụ, si otú a kwuo ya: “Iwu ahụ aghọwo onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst, ka e wee site n’okwukwe gụọ anyị ná ndị ezi omume.” (Ndị Galetia 3:24) N’ụzọ dị mwute, mba Israel anabataghị ozizi ahụ kama ha ji ihe ùgwù ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi ya, ọtụtụ àjà ha ghọrọ ihe ịsọ oyi nye Jehova, bụ́ onye kwuru, sị: “Afọ ejuwo m n’àjà nsure ọkụ nile e ji ebulu chụọ, na abụba ụmụ ehi e mere ka ha maa abụba; ọzọ, ọbara oké ehi na nke ụmụ atụrụ na nke mkpi atọghị m ụtọ.”—Aịsaịa 1:11.

20. Gịnị mere na 70 O.A. ma a bịa n’ihe banyere Iwu ahụ na àjà ndị mejupụtara ya?

20 Na 70 O.A., usoro ihe ndị Juu, tinyere ụlọ nsọ na òtù ndị nchụàjà ya, bịara ná njedebe. Mgbe nke ahụ gasịrị, o kweghịzi omume ịchụ àjà dị iche iche n’ụzọ Iwu ahụ setịpụrụ. Nke a ọ̀ pụtara na àjà ndị ahụ, dị ka akụkụ dị mkpa nke Iwu ahụ, enweghịzi ihe ọ pụtara nye ndị na-efe Chineke taa? Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, na-akọwa, sị: “Dị ka e si jiri ya mee ihe n’ime Bible, ‘mkpuchi mmehie’ nwere echiche bụ́ isi nke ‘kpuchie’ ma ọ bụ ‘gbanwee,’ ihe e nyekwara iji gbanwere, ma ọ bụ ‘kpuchie’ ihe ọzọ aghaghị ịbụ ihe ya na ya bụ otu. . . . Iji nwee mkpuchi mmehie kwesịrị ekwesị n’ihi ihe Adam tụfuru, a ghaghị ịchụ àjà mmehie nke ya na ọnụ ahịa ndụ mmadụ zuru okè hà nhata.”

^ par. 11 Okwu Hibru a na-asụgharịkarị ịbụ “onyinye” bụ qor·banʹ. Ka Mak na-edekọ nkatọ Jisọs katọrọ omume enweghị ụkpụrụ nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ọ kọwara na “Kọban” pụtara “ihe e nyere Chineke.”—Mak 7:11.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị kpaliri ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie ịchụrụ Jehova àjà?

• N’ihi gịnị ka àjà ji dị mkpa?

• Ụdị àjà ndị dị aṅaa bụ́ isi ka a chụrụ n’okpuru Iwu ahụ, gịnịkwa bụ nzube ha?

• Dị ka Pọl si kwuo, nzube bụ́ isi dị aṅaa ka Iwu ahụ na àjà ndị mejupụtara ya na-emezu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 14]

Àjà Ebel chụrụ bụ nke a nabatara n’ihi na o gosipụtara okwukwe o nwere ná nkwa Jehova

[Foto dị na peeji nke 15]

Ị̀ na-aghọta ihe ihe na-eme n’ebe a pụtara?