Ịga Àgwàetiti Ndị Dị na Pacific Ịrụ Ọrụ!
Ịga Àgwàetiti Ndị Dị na Pacific Ịrụ Ọrụ!
E NWERE oké mkpali n’ebe a na-anọ echere ụgbọelu n’ọdụ ụgbọelu mba nile ndị dị na Brisbane nakwa na Sydney, Australia, karịa ka a na-enwebu. Otu ìgwè nke mmadụ 46 mejupụtara jikeere ifega Samoa nke anwụ na-achasi ike na ya iji zute mmadụ 39 ndị ọzọ si New Zealand, Hawaii, na United States. Ibu ha kasị gbapụ iche—ihe ndị mejupụtara ha n’ụzọ bụ́ isi bụ ngwá ọrụ ndị dị ka hama, nkwọ osisi, na ihe e ji akpọpu osisi—ọ bụghị ụdị ihe mmadụ na-anọkata nnọọ jiri gawa njem n’àgwàetiti na-adọrọ mmasị dị na Pacific. Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, njem ha bụ nke dị ịrịba ama.
N’ịbụ ndị ga-ahụ maka mmefu ndị ha ga-eme, ha na-aga iji izu abụọ rụọ ọrụ dị ka ndị ọrụ afọ ofufo a na-agaghị akwụ ụgwọ n’usoro ọrụ ihe owuwu, nke Ụlọ Ọrụ Ihe Owuwu Ógbè n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Australia hụrụ maka ya. Usoro ihe owuwu ahụ, bụ́ nke e si n’onyinye afọ ofufo nweta ego e ji arụ ya, na-agụnye iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, na alaka ma ọ bụ ụlọ nsụgharị maka ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-amụba n’ike n’ike n’àgwàetiti ndị dị na Pacific. Ka anyị jekwuru ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ahụ, bụ́ ndị soworo n’ìgwè na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba nke ha.
Max, bụ́ onye na-akụchi ụlọ, si Cowra nke dị na New South Wales, Australia. Ọ lụrụ nwunye ma nwee ụmụ ise. Arnold si Hawaii. Ya na nwunye ya mụtara ụmụ nwoke abụọ, ọ bụkwa ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile. Dị ka Max, Arnold na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ dị n’obodo ya. O doro anya na ndị ikom a—ọnọdụ ha yikwara nke ihe ka ọtụtụ ná ndị so n’usoro ihe owuwu ahụ—abụghị ndị ọrụ afọ ofufo n’ihi na ọ dịghị ihe ha ji oge ha eme. Kama nke ahụ, ha na ezinụlọ ha hụrụ na e nwere mkpa, ha chọkwara ime ihe nile ha pụrụ ime iji nye aka.
Ndị Ọrụ Si Ọtụtụ Mba Egboo Oké Mkpa
Otu ebe a chọrọ nkà na ọrụ ha bụ na Tuvalu, bụ́ mba dị na Pacific nke ihe dị ka mmadụ 10,500 bi na ya, nke ìgwè àgwàetiti coral itoolu bụ́ ndị mmiri dị n’etiti ha, mejupụtara, bụ́ ndị dị nso n’akara equator nakwa n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Samoa. Nke ọ bụla n’ime àgwàetiti ndị ahụ dị square kilomita 2.5 ná nkezi. Ka ọ na-erule 1994, Ndịàmà 61 nọ ebe ahụ chọsiri Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ na ọfịs nsụgharị ka buo ibu, ike.
N’akụkụ a nke ebe na-ekpo ọkụ na Pacific, a ghaghị
ichepụta ma wuo ụlọ otú ọ ga-eguzogide oké mmiri ozuzo na oké ifufe ndị a na-enwe mgbe nile. Ma ngwá ọrụ ndị bụ́ ịgba e ji ewu ụlọ dị ole na ole n’àgwàetiti ndị ahụ. Gịnị ga-abụ ihe ngwọta ya? E si Australia jiri ụgbọ mmiri bubata ihe nile bụ́ isi a ga-eji arụ ọrụ—site na gbam gbam na ohiere ụlọ ruo n’arịa na ákwà mgbochi, efere ụlọ mposi na opi mmiri ịsa ahụ, ọbụna nọọtụ na ntú.Tupu ngwá ọrụ ndị ahụ abata, obere ìgwè ndị ọrụ e bu ụzọ zipụ, doziri ebe ahụ a na-aga iwu ihe owuwu ma tọọ ntọala ya. E mesịa, ndị ọrụ ahụ si mba ọzọ bịara iwuli ụlọ ndị ahụ, ite ha ágbá, na itinye ha arịa ndị dị mkpa.
Ọ dabara na ọrụ a nile a rụrụ na Tuvalu kpasuru otu onye ụkọchukwu nọ n’ógbè ahụ oké iwe, o wee si na redio kpọsaa na Ndịàmà ahụ na-ewu “Ụlọ Elu Bebel”! Otú ọ dị, olee nke bụ́ eziokwu? “Mgbe ndị na-ewu Ụlọ Elu Bebel ahụ dị na Bible chọpụtara na ha apụghịzi ịghọta ibe ha n’ihi na Chineke ghagburu asụsụ ha, ha gbahapụru ọrụ ha n’ewuchaghị ụlọ elu ahụ ewucha,” ka onye ọrụ afọ ofufo bụ́ Graeme na-ekwu. (Jenesis 11:1-9) “Ọrụ a na-arụrụ Jehova Chineke na-adị nnọọ iche. N’agbanyeghị ndịrịta iche nke asụsụ na ọdịbendị, a na-arụcha ya mgbe nile.” Otú ahụ ka nke a dịkwa—nanị n’izu abụọ. N’ezie, mmadụ 163, gụnyere nwunye praịm minista, gara ememe nraranye e mere.
Ka Doug, bụ́ onye nlekọta ihe owuwu ahụ, na-atụgharị uche n’ahụmahụ ahụ, o kwuru, sị: “Ọ bụ ihe ọṅụ iso ndị ọrụ afọ ofufo si mba ọzọ rụkọọ ọrụ. Ụzọ anyị si eme ihe dịgasị iche, aha anyị ji mara ihe ụfọdụ dịgasị iche, ọbụna usoro anyị ji atụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a kpatara nsogbu.” Ka o kerewooro òkè ugbu a n’ọtụtụ ihe owuwu dị otú ahụ, ọ na-agbakwụnye, sị: “Nke a na-emesi ya ike n’uche m na site ná nkwado Jehova, ndị ya pụrụ iwu ihe owuwu n’ebe ọ bụla n’ụwa, n’agbanyeghị otú ebe ahụ dịpụruru adịpụ ma ọ bụ taa akpụ. N’ezie, anyị nwere ọtụtụ ndị ikom nwere nkà, ma, ọ bụ mmụọ Jehova na-eme ka o kwe omume.”
Mmụọ Chineke kpalikwara ezinụlọ Ndịàmà nọ n’àgwàetiti ahụ inye ihe oriri na ebe obibi, bụ́ nke bụụrụ ụfọdụ n’ime ha ịchụ àjà dị ukwuu. Ndị ahụ e lere ọbịa dị otú ahụ nwekwara ekele dị ukwuu maka ya. Ken, bụ́ onye si Melbourne, Australia, ekerewo òkè n’ọrụ ihe owuwu yiri nke ahụ na French Polynesia. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị bịara dị ka ndị ohu, ma e mesoro anyị ihe dị ka ndị eze.” N’ebe o kwere mee, Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ nyekwara aka n’ọrụ ihe owuwu ahụ. Na Solomon Islands, ndị inyom ji aka ha gwaa kọnkịrị. Otu narị ndị ikom na ndị inyom rịrị elu ugwu ndị mmiri ozuzo derela ma si ebe ahụ budata osisi karịrị tọn 40. Ndị na-eto eto nyekwara aka. Otu onye ọrụ si New Zealand, na-echeta, sị: “Ana m echeta otu nwanna nwoke na-eto eto bi n’àgwàetiti ahụ bụ́ onye buru akpa simenti abụọ ma ọ bụ atọ n’otu mgbe. O jikwa shọvel kuo ajịrịja nkume n’ogologo ụbọchị nile ahụ n’anwụ nakwa ná mmiri ozuzo.”
Òkè Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ keere n’ọrụ ahụ wetara abamuru ọzọ. Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Samoa na-akọ, sị: “Ụmụnna ndị nọ n’àgwàetiti ahụ amụtawo nkà ndị ha pụrụ iji mee ihe n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na n’ịrụzi nakwa n’iwugharị ihe ndị oké ifufe mebiri. Ọ pụkwara inyere ha aka inweta ihe e ji ebi ndụ n’ógbè ebe nke ahụ na-esiri ọtụtụ ndị ike.”
Usoro Ihe Owuwu ahụ Agbaa Àmà Dị Mma
Colin nọ na Honiara hụ ka a na-ewu Ụlọ Mgbakọ nke dị na Solomon Islands. N’ịbụ onye a kpaliri mmasị ya, o degaara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’ógbè ahụ ozi a na brokin: “Ha nile nwere otu obi, ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ha dị obi ọjọọ, ha bụkwa otu ezinụlọ.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ọ lọghachiri n’obodo nta ya dị n’Aruligo, nke dị kilomita 40 site n’ebe ahụ, ya na ezinụlọ ya wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha. E mesịa, ha zigaara alaka ụlọ ọrụ ahụ ozi ọzọ, sị: “Anyị arụchaala Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, tinyere ọbụna ikpo okwu ya, ya mere, ànyị pụrụ ịnọ n’ebe a na-enwe nzukọ ụfọdụ?” E mere ndokwa maka nke ahụ ozugbo, ihe karịrị mmadụ 60 na-agachikwa ya anya.
Onye ndụmọdụ nke Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe hụrụ ọrụ ahụ a rụrụ na Tuvalu. “Echere m na onye ọ bụla na-agwa unu otu ihe a,” ka ọ gwara otu onye ọrụ, “ma nye m, nke a bụ nnọọ ọrụ ebube!” Otu nwanyị na-arụ n’ụlọ ọrụ telifon jụrụ otu onye ọrụ afọ ofufo ọzọ si esi bịa, sị: “Gịnị mere unu nile ji nwee obi ụtọ? Ebe a na-ekpo nnọọ ọkụ!” Ha ahụtụbeghị ebe a na-egosipụta àgwà nke Iso Ụzọ Kraịst n’ụzọ dị irè na n’ụzọ ịchụ onwe onye n’àjà dị otú ahụ.
Àjà Ndị A Chụrụ n’Akwaghị Ụta
“Onye werekwa ngọzi na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi,” ka Bible na-ekwu ná 2 Ndị Kọrint 9:6. Ndị ọrụ ahụ, ezinụlọ ha, na ọgbakọ ha na-anọgide na-eji ngọzi agha mkpụrụ n’inyere Ndịàmà ibe ha nọ na Pacific aka. “Ọgbakọ m nyere m otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ego m ji gbaa ụgbọelu,” ka Ross, bụ́ onye okenye si Kincumber, nke dị nso na Sydney na-ekwu, “nwanne nwunye m nke nwoke, bụ́ onye sokwa bịa, nyere m $500.” Onye ọrụ ọzọ rere ụgbọala ya iji kwụọ ụgwọ njem ya. Onye ọrụ ọzọkwa rere ụfọdụ ala ya. Ọ dị Kevin mkpa inwetakwu $900, n’ihi ya o kpebiri ire kpalakwukwu 16 ya ndị dị afọ abụọ. O si n’aka onye ọ maara nweta onye chọrọ ịzụ ya bụ́ onye kwetara ịkwụ ya kpọmkwem $900 maka ha!
“Ihe unu mefuru n’ịgba ụgbọelu na ụgwọ a na-akwụghị unu n’ọrụ unu rụrụ, bụ́ nke ọnụ ahịa ha ruru ihe dị ka $6,000 ná ngụkọta ò kwesịrị ya?” ka a jụrụ Danny na Cheryl. “Ee! Anyị mefugodị ego ha otú ahụ okpukpu abụọ, ọ ga-ekwesịwo ya ma gafee,” ka ha zaghachiri. Alan, bụ́ onye si Nelson, New Zealand, na-agbakwụnye, sị: “Aga m eji ihe m mefuru iji gaa Tuvalu gaa Europe ma nweekwa ego ga-afọdụ. Ma m̀ gaara enwetawo ngọzi ndị m nwetara, ma ọ bụ nweta ọtụtụ ndị enyi nwere nzụlite dịgasị iche, ma ọ bụ rụọrọ onye ọzọ ọrụ kama ịrụrụ ya onwe m? Ee e! N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ọ bụla m nyere ụmụnna anyị nọ n’àgwàetiti ahụ, ha nyere m ihe karịrị nnọọ nke ahụ.”
Isi ihe ọzọ mere ka e nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ ahụ bụ nkwado ezinụlọ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nwunye so di ha gaa, ọbụna nyekwa aka n’ọrụ ahụ, ndị ọzọ nwere ụmụaka toruworo ịga akwụkwọ ma ọ bụ achụmnta ego ezinụlọ, ha ga-elekọta. “Njikere nwunye m dị ilekọta ụmụ anyị na ụlọ anyị mgbe m na-anọghị ya,” ka Clay kwuru, “bụ ịchụ àjà dị nnọọ ukwuu karịa nke m.” N’ezie, ndị bụ́ di bụ́ ndị na-enweghị ike ịkpọ nwunye ha gaa, ga-eji obi ha nile sị “Amen” n’okwu ahụ!
Kemgbe e wusịrị ihe owuwu ahụ na Tuvalu, ndị ọrụ afọ ofufo ewuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, na ọfịs nsụgharị na Fiji, Tonga, Papua New Guinea, New Caledonia, na n’ebe ndị ọzọ. A ka na-eme atụmatụ maka ọtụtụ ihe owuwu, gụnyere ụfọdụ ndị a ga-ewu n’ebe dị iche iche n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia. À ga-enwezu ndị ọrụ?
Ihe àmà na-egosi na nke ahụ agaghị abụ nsogbu. “Onye ọ bụla nọ ebe a nke kerewooro òkè n’ọrụ ihe owuwu ná mba ọzọ na-arịọ ka e cheta ya mgbe a ga-eme atụmatụ iwu ihe owuwu ọzọ,” ka alaka ụlọ ọrụ Hawaii na-ede. “Ozugbo ha lọtara, ha na-amalite ichekwa ego maka ya.” Olee otú ihe omume ahụ na-apụghị iji gaa nke ọma mgbe i weere ngọzi Jehova na-enye n’ụba tụkwasị ná nraranye achọghị ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ?
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ngwá ọrụ ndị e ji rụọ ọrụ ahụ
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ndị ọrụ n’ebe ahụ a na-ewu ihe owuwu
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ka ihe owuwu ahụ bịara ná njedebe, anyị ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ihe mmụọ Chineke rụzuru